Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA

IHE ỌMỤMỤ NKE 3

Dịrị Obiọma

Dịrị Obiọma

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Ịhụnanya dị obiọma.’​—1 Kọr. 13:4.

Ihe Jizọs Mere

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 9:1-7. Zazie ajụjụ ndị a:

  1.    Ihe Jizọs bu ụzọ mee ọ̀ bụ ịgwọ onye ìsì ahụ, ka ọ̀ bụ izi ya ozi ọma?​—I nwere ike ịgụ Jọn 9:35-38.

  2.   Olee ihe i chere mere nwoke ahụ ji gee Jizọs ntị?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Mmadụ ga-aka ege anyị ntị ma ọ chọpụta na anyị ji ya kpọrọ ihe.

Na-eme Ka Jizọs

3. Metere onye ahụ ebere. Gbalịa ghọta otú obi dị ya.

  1.    Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị nwere ike ịna-echegbu ya? Olee ihe nwere ike inyere ya aka, masịkwa ya?’ Ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka isi n’obi gị mee ihe ga-egosi na i nweere ya obiọma.

  2.   Gee mmadụ ntị iji gosi na ihe gbasara ya na-emetụ gị n’obi. Ọ gwa gị ihe o chere gbasara otu ihe ma ọ bụ nsogbu o nwere, ahapụla ihe ahụ o kwuru kwuwe ihe ọzọ.

4. Meda obi gwa ya okwu, kwanyekwara ya ùgwù. Ọ bụrụ na ị na-emetere ya ebere, chọọkwa inyere ya aka, ọ ga-esi n’otú i si ekwu okwu chọpụta ya. Kpachara anya n’ihe ị na-ekwu na otú i si ekwu ya. Ekwukwala ihe nwere ike ịkpasu ya iwe.

5. Nyere ya aka. Chọpụta ohere dabara adaba ị ga-eji enyere ya aka. Imere mmadụ ihe ọma nwere ike ime ka anyị na onye ahụ kparịta ụka.

I NWEKWARA IKE ỊGỤ