ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA
IHE ỌMỤMỤ NKE 4
Dịrị Umeala n’Obi
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.”—Fil. 2:3.
Ihe Pọl Mere
1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Ọrụ Ndịozi 26:2, 3. Zazie ajụjụ ndị a:
-
Olee otú Pọl si gosi na ọ dị umeala n’obi n’otú o si gwa Eze Agrịpa okwu?
-
Olee otú Pọl si mee ka Agrịpa chewe gbasara Jehova na Akwụkwọ Nsọ kama ichewe gbasara yanwa?—I nwere ike ịgụ Ọrụ Ndịozi 26:22.
Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Pọl?
2. Okwu anyị ga-aka amasị ndị mmadụ ma anyị kwuo ya otú gosiri na anyị dị umeala n’obi ma na-akwanyere ha ùgwù.
Na-eme Ka Pọl
3. Kwuo okwu otú ga-egosi na ị na-akwanyere onye ahụ ùgwù. Ekwula okwu otú ga-eme ka o chewe na ị ma ihe niile nakwa na o nweghị ihe yanwa ma.
4. Mee ka o doo onye ahụ anya na ọ bụ na Baịbụl ka eziokwu ị na-akụzi si. Okwu Chineke nwere ike iru ndị mmadụ n’obi. Ọ bụrụ na ihe anyị na-akụzi agbakwasị ụkwụ na Baịbụl, o nwere ike ime ka okwukwe ha sie ike.
5. Dịrị nwayọọ. Esila ọnwụ ka mmadụ kweta ihe ị na-ekwu. Anyị achọghị ka anyị na ndị mmadụ na-arụ ụka. Dịrị nwayọọ iji gosi na ị dị umeala n’obi, marakwa mgbe i kwesịrị ịhapụ onye ahụ. (Ilu 17:14; Taị. 3:2) I wetuo obi kwuo okwu, o nwere ike ime ka onye ahụ gee gị ntị mgbe ọzọ.