N’OGE ỌZỌ
IHE ỌMỤMỤ NKE 8
Na-enwe Ndidi
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ịhụnanya na-enwe ndidi.”—1 Kọr. 13:4.
Ihe Jizọs Mere
1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Jọn 7:3-5 na 1 Ndị Kọrịnt 15:3, 4, 7. Zazie ajụjụ ndị a:
Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
2. Anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi n’ihi na ọ na-ewe ụfọdụ ndị oge ịnabata ozi ọma karịa ndị ọzọ.
Na-eme Ka Jizọs
3. Si n’ụzọ ọzọ gwa ya maka ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na mmadụ ekwetaghị ozugbo ka ị mụwara ya Baịbụl, amanyekwala ya. Mgbe ọ bụla dabara adaba, jiri vidio ma ọ bụ isiokwu ndị ọzọ nyere ya aka ịghọta otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa uru ọ ga-abara ya.
4. Ejikwala ya atụnyere ndị ọzọ. Onye nke ọ bụla dị iche. O siere onye ezinụlọ gị ma ọ bụ onye ị na-agara nletaghachi ike ikweta ka ị mụwara ya Baịbụl ma ọ bụkwanụ ikweta otu ihe Baịbụl na-akụzi, chọpụta ihe nwere ike ịkpata ya. È nwere ihe ndị chọọchị ha na-akụzi ọ na-anaghị eji egwu egwu? Ndị ezinụlọ ya na ndị agbata obi ya, hà na-enye ya nsogbu? Nye ya oge ka o chebara ihe ndị i kwuru echiche nakwa ka ọ hụ otú ihe Baịbụl kwuru si baa uru.
5. Kpee ekpere maka onye ahụ nwere mmasị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ịda mbà nakwa ka ị dịrị akọ. Rịọkwa ya ka o nyere gị aka ịchọpụta mgbe i kwesịrị ịkwụsị ịkpọtụrụ onye na-enweghị mmasị.—1 Kọr. 9:26.