‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’

Akwụkwọ a kọrọ otú e si hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi nakwa otú o si gbasa anyị taa.

Map

Map ndị na-egosi mba Izrel na ebe ndị Pọl gara kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ.

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Gịnị mere obi ga-eji esi anyị ike na Chineke kwụ anyị n’azụ ka anyị ‘na-agba àmà nke ọma’ banyere Alaeze Chineke?

ISI NKE 1

“Gaanụ Mee . . . Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”

Jizọs buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ná mba niile. Ma olee otú e si na-ekwusa ya?

ISI NKE 2

‘Unu Ga-abụ Ndị Àmà M’

Olee otú Jizọs si kwadebe ndịozi ya ka ha bute ụzọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma?

ISI NKE 3

‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’

Olee ọrụ mmụọ nsọ Chineke rụrụ iji mee ka ọgbakọ Ndị Kraịst malite?

ISI NKE 4

“Ha Bụ Ndị Nkịtị Na-agụghị Akwụkwọ”

Ndịozi Jizọs katara obi, Jehova agọzie ha.

ISI NKE 5

“Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ”

Ndịozi Jizọs mere ihe ezigbo Ndị Kraịst niile ga na-eme.

ISI NKE 6

“Chineke Meere Stivin Amara, Nyekwa Ya Ike”

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Stivin si jiri obi ike gbaa àmà n’ụlọikpe ndị Juu kacha elu?

ISI NKE 7

Izisa “Ozi Ọma Banyere Jizọs”

Filip gosiri na ọ bụ onye e ji ama atụ n’ikwusa ozi ọma.

ISI NKE 8

‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’

Sọl, onye obi tara mmiri na-akpagbu ọgbakọ, ghọrọ onye ozi na-anụ ọkụ n’obi.

ISI NKE 9

“Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”

E zisaara ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ozi ọma.

ISI NKE 10

“Okwu Jehova Nọ Na-agbasa”

A napụtara Pita, mkpagbu emeghịkwa ka a kwụsị ikwusa ozi ọma.

ISI NKE 11

Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”

Anyị na-amụta ihe n’ihe Pọl mere mgbe ndị mmegide na-achọghị ịnụ ozi ọma kpagbuwere ya.

ISI NKE 12

‘Jehova Na-enye Ha Ike, Ha Ana-ekwu Okwu Ya n’Atụghị Egwu’

Pọl na Banabas dị umeala n’obi, ha tachiri obi, ha gbanwekwara otú ha si ezi ozi ọma mgbe ọ dị mkpa ka ha mee otú ahụ.

ISI NKE 13

‘Ha Nwere Nghọtahie’

E wegaara òtù na-achị isi okwu gbasara ibi úgwù.

ISI NKE 14

“Anyị Ji Otu Olu Kwekọrịta”

Ị ga-amụta otú òtù na-achị isi si kpebie ihe a ga-eme n’okwu gbasara ibi úgwù nakwa otú mkpebi ha si mee ka ọgbakọ niile dịrị n’otu.

ISI NKE 15

Ha Nọ “Na-eme Ka Ọgbakọ Ndị Dị Ebe Ahụ Sie Ike n’Okwukwe”

Ndị ozi na-ejegharị ejegharị na-enyere ọgbakọ dị iche iche aka ka ha sie ike n’okwukwe.

ISI NKE 16

“Bịa na Masedonia Nyere Anyị Aka”

A gọziri ọtụtụ ndị maka na Pọl na ndị ibe ya nabatara ọrụ e nyere ha, jirikwa ọṅụ die mkpagbu.

ISI NKE 17

‘Ọ Nọ Na-enyere Ha Aka Ịghọta Akwụkwọ Nsọ’

Pọl gbaara ndị Juu àmà nke ọma na Tesalonaịka nakwa na Beria.

ISI NKE 18

‘Ha Chọọ Chineke, Ha Ga-achọta Ya’

Pọl ji ihe ya na ndị mmadụ kweere otu ihe na ya gwa ha okwu. Olee otú ihe a si mee ka o nwee ike izi ha ozi ọma?

ISI NKE 19

“Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”

Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Pọl si jee ozi ya na Kọrịnt nke ga-enyere anyị aka ịgba àmà nke ọma gbasara Alaeze Chineke?

ISI NKE 20

‘Okwu Jehova Na-agbasa ma Na-akpa Ike’ n’Agbanyeghị Mmegide

Ị ga-amụta otú Apọlọs na Pọl si nyere ndị ọzọ aka ka ha nụ ozi ọma.

ISI NKE 21

“Ọbara Onye Ọ Bụla A Na-azọpụtaghị Adịghị M n’Isi”

Pọl nụrụ ọkụ n’obi n’ozi ọma, nyekwa ndị okenye ndụmọdụ.

ISI NKE 22

“Ka Uche Jehova Mee”

Pọl gara Jeruselem maka na o kpebisiri ike ime uche Chineke.

ISI NKE 23

“Geenụ M Ntị Ka M Gwa Unu Ihe Merenụ”

Pọl gbachiteere eziokwu n’ihu ìgwè mmadụ iwe ji nakwa n’ihu ndị Sanhedrin.

ISI NKE 24

“Obi Sie Gị Ike”

A napụtara Pọl mgbe ndị Juu kpara nkata igbu ya, ọ zakwaara ọnụ ya n’ihu Gọvanọ Feliks.

ISI NKE 25

“Achọrọ M Ka Siza Kpee Ikpe A”

Pọl gosiri na ọ bụ onye e ji ama atụ n’ịgbachitere ozi ọma.

ISI NKE 26

“O Nweghị Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”

Ụgbọ Pọl nọ na ya kpuru. O gosiri na okwukwe ya siri ezigbo ike nakwa na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya.

ISI NKE 27

‘Ịgba Àmà nke Ọma’

A tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, ma ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma.

ISI NKE 28

‘Ruo n’Ebe Kacha Anya n’Ụwa’

Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst malitere n’oge ndịozi.

Foto Ndị Dị n’Akwụkwọ A

Ebe e gosiri foto ndị bụ́ isi dị n’akwụkwọ a.