Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ezigbo Onye Nkwusa Alaeze:

Weregodị ya na i so ná ndịozi Jizọs guzo n’Ugwu Oliv. Jizọs pụtara n’ihu gị. Ma, ozugbo ọ chọrọ ịla eluigwe, ọ sịrị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu. Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Gịnị ka ị ga-eme?

O nwere ike ịdị gị ka ọrụ a ọ̀ karịrị akarị. I nwere ike ịna-eche, sị, ‘Olee otú anyị ga-esi gbaa àmà ruo “n’ebe kacha anya n’ụwa” ebe ọ bụ na anyị dị ole na ole?’ I nwere ike icheta ihe Jizọs kwuru n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ. Ọ sịrị: “Ohu anaghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha mere ihe m kwuru, ha ga-emekwa ihe unu kwuru. Ma ha ga-eme unu ihe niile a n’ihi aha m n’ihi na ha amaghị Onye zitere m.” (Jọn 15:20, 21) Ka ị na-echebara ihe a o kwuru echiche, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee otú m ga-esi na-agba àmà nke ọma ebe ọ bụ na a ga-emegide m ma kpagbuo m?’

Anyị na-ajụkwa ụdị ajụjụ a n’oge anyị a. Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, ọrụ e nyere anyị bụ ịgbara “ndị mba niile” àmà nke ọma ruo “n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Mat. 28:19, 20) Olee otú anyị ga-esi rụọ ọrụ a ebe ọ bụkwanụ na e kwuola na a ga-akpagbu anyị?

Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọrọ akụkọ magburu onwe ya banyere otú Jehova si nyere ndịozi na Ndị Kraịst ibe ha aka n’oge ndịozi ịrụ ọrụ e nyere ha. E dere akwụkwọ a ị na-agụ ugbu a ka o nyere gị aka ileba anya n’ihe dị iche iche mere Ndị Kraịst ahụ. Ị ga-ahụkwa otú obi si tọọ ha ụtọ ịhụ ka ọrụ ikwusa ozi ọma na-aga n’ihu n’ihu. Ọ ga-eju gị anya ịhụ na e nwere ọtụtụ ụzọ Ndị Kraịst oge mbụ na Ndị Kraịst nke oge a si yie. Ị ga-achọpụtakwa na ọ bụghị naanị na ọrụ e nyere anyị yiri nke e nyere ha, kama otú e si hazie anyị ịrụ ọrụ a yikwara otú e si hazie ha. Ọ bụrụ na i chebara ebe ndị a anyị na ha si yie echiche, obi ga-esikwu gị ike na Jehova Chineke ka na-eduzi ndị nọ n’ụwa so ná nzukọ ya.

Ekpere anyị na olileanya anyị bụ ka akwụkwọ Ọrụ Ndịozi a ị ga-eleba anya mee ka obi sikwuo gị ike na Jehova ga-enyere gị aka, nakwa na mmụọ nsọ ya ga na-akwado gị. Ka ihe ndị ị ga-amụta na ya gbaa gị ume ịnọgide ‘na-agba àmà nke ọma’ banyere Alaeze Chineke ma na-enyere ndị ọzọ aka ịbata n’ụzọ na-eduga ná ndụ.​—Ọrụ 28:23; 1 Tim. 4:16.

Ụmụnna gị,

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova