Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 28

‘Ruo n’Ebe Kacha Anya n’Ụwa’

‘Ruo n’Ebe Kacha Anya n’Ụwa’

Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst malitere n’oge ndịozi

1. Olee otú Ndịàmà Jehova n’oge a si yie Ndị Kraịst oge mbụ?

 NDỊ Kraịst oge mbụ ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma. Ha kwere ka mmụọ nsọ nyere ha aka ma duzie ha. Mkpagbu emeghị ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Chineke gọzikwara ha nke ukwuu. Ndịàmà Jehova na-eme ka ha n’oge anyị a.

2, 3. Gịnị mere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ji pụọ iche?

2 O doro anya na ọmarịcha akụkọ ndị na-eme ka okwukwe mmadụ sie ike e dere n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi agbaala gị ume. Akwụkwọ a pụrụ iche n’ihi na ọ bụ naanị ya bụ akwụkwọ Baịbụl kọrọ gbasara ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs oge mbụ mere mgbe ọ lachara n’eluigwe.

3 Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kpọrọ aha mmadụ iri itoolu na ise, ndị si ná mba iri atọ na abụọ, obodo iri ise na anọ, na agwaetiti itoolu. Ọ kọrọ akụkọ na-atọ ụtọ banyere ndị mmadụ, ma ndị nkịtị, ma ndị dị mpako na-ekpe okpukpe ụgha, ma ndị ọchịchị onwe ha na-ebu isi, ma ndị kpagburu Ndị Kraịst mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Nke kachanụ bụ na ọ kọrọ banyere ụmụnna gị ndị dịrị ndụ n’oge ndịozi, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu dị iche iche bịaara ha.

4. Gịnị mere na anyị ejighị Pọl onyeozi, Dọkas, nakwa ndịàmà ndị ọzọ a tụkwasịrị obi n’oge ndịozi egwu egwu?

4 Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na puku afọ abụọ (2,000) agafeela kemgbe Ndị Kraịst oge mbụ jechara ozi ha, ndị dị ka Pita onyeozi na Pọl onyeozi, ndị ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi, Luk, ọgwọ ọrịa a hụrụ n’anya, Banabas, onye na-emesapụ aka, Stivin onye nwere obi ike, Tabita nwaanyị dị obiọma, Lidia nwaanyị na-ele ọbịa nke ọma, nakwa ọtụtụ ndịàmà ndị ọzọ a tụkwasịrị obi. N’agbanyeghị na ọ dịla anya ha nwụrụ, anyị ejighị ha egwu egwu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e nyere anyị ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs otú e nyere ha. (Mat. 28:19, 20) Anyị bụ ndị a gọziri agọzi na anyị so na-arụ ọrụ a.

‘Ruo n’ebe kacha anya n’ụwa.’—Ọrụ 1:8

5. Ebee ka ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere ikwusa ozi ọma n’oge ochie?

5 Chegodị banyere ọrụ ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị ha: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu. Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Mmụọ nsọ bu ụzọ nye ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ịgba àmà “na Jeruselem.” (Ọrụ 1:1–8:3) Mmụọ nsọ mechara duzie ha ịga gbaa àmà “na Judia na Sameria.” (Ọrụ 8:4–13:3) Ha mechakwara malite ikwusa ozi ọma “n’ebe kacha anya n’ụwa.”​—Ọrụ 13:4–28:31.

6, 7. Olee ihe ndị anyị nwere taa anyị ji ekwusa ozi ọma ụmụnna anyị n’oge ndịozi na-enweghị?

6 Ụmụnna gị ndị kwusara ozi ọma n’oge ndịozi ejighị Baịbụl zuru ezu kwusaa ya. Ọ ga-abụ n’afọ 41 O.N.K. ka e dechara Ozi Ọma Matiu. Pọl dere ụfọdụ akwụkwọ ozi ya tupu e dechaa akwụkwọ Ọrụ Ndịozi n’ihe dị ka afọ 61 O.N.K. Ma, Ndị Kraịst oge mbụ enweghị Akwụkwọ Nsọ zuru ezu nke ha, ha enweghịkwa akwụkwọ dị iche iche ha ga-enye ndị ha ziri ozi ọma. Tupu ndị Juu abụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha na-anụ ka a na-agụpụta Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ụlọ nzukọ ha. (2 Kọr. 3:14-16) Ma, ha kwesịrị ịmụsi Akwụkwọ Nsọ ike n’ihi na ọ ga-abụ na ha na-ebu amaokwu ndị ha ji agwa ndị mmadụ okwu n’isi.

7 Taa, ọtụtụ n’ime anyị nwere Baịbụl nke anyị, nweekwa ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Anyị na-arụ ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị mba abụọ na iri anọ (240) nakwa n’ọtụtụ asụsụ.

Mmụọ Nsọ Na-enye Anyị Ike

8, 9. (a) Gịnị ka mmụọ nsọ nyere ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ime? (b) Olee ihe mmụọ nsọ na-enyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ime?

8 Mgbe Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikwusa ozi ọma, ọ gwara ha, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.” Mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ya, ga-enyere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka ikwusa ozi ọma n’ụwa niile. Mmụọ nsọ mere ka Pita na Pọl gwọọ ndị ọrịa, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, kpọlitedị ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ma, e nwere ihe ka mkpa mmụọ nsọ nyere ha ike ime. O mere ka ndịozi na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ nyere ndị mmadụ aka ịmata ezi Chineke na Jizọs Kraịst iji nweta ndụ ebighị ebi.​—Jọn 17:3.

9 Na Pentikọst afọ 33 O.N.K., ndị na-eso ụzọ Jizọs kwuru okwu “n’asụsụ dị iche iche, n’ihi na mmụọ nsọ nọ na-enye ha ike ikwu okwu.” N’ihi ya, ha gbara àmà banyere “ọrụ ebube dị iche iche Chineke rụrụ.” (Ọrụ 2:1-4, 11) Taa, mmụọ nsọ Chineke anaghị enye anyị ike ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Ma, ọ na-enyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ. Dị ka ihe atụ, a na-ebipụta ọtụtụ nde Ụlọ Nche na Teta! kwa ọnwa. Na jw.org, bụ́ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, e nwere akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl nakwa vidio n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Ihe ndị a niile na-eme ka anyị na-akọrọ ndị si ná mba niile na ebo niile na asụsụ niile “ọrụ ebube dị iche iche Chineke rụrụ.”​—Mkpu. 7:9.

10. Kemgbe 1989, gịnị ka e merela gbasara ịsụgharị Baịbụl?

10 Kemgbe afọ 1989, ohu ahụ na-agbalịsi ike ịhụ na e nwere Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ọtụtụ asụsụ. A sụgharịala ya n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ (200), bipụtakwa ya ọtụtụ nde. A ka ga-ebipụtakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ bụ naanị Chineke na mmụọ ya na-eme ka ihe a kwe omume.

11. Olee otú e si na-asụgharị akwụkwọ Ndịàmà Jehova?

11 Ọtụtụ puku Ndị Kraịst ndị wepụtara onwe ha nọ n’ihe karịrị mba na obodo otu narị na iri ise (150) na-asụgharị akwụkwọ anyị. Ihe a ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na e nweghị nzukọ ọzọ n’ụwa nke mmụọ nsọ Chineke na-eme ka ha ‘na-agba àmà nke ọma’ n’ụwa niile banyere Jehova Chineke, Eze Bụ́ Mezaya, na Alaeze ya nke na-achị n’eluigwe.​—Ọrụ 28:23.

12. Olee ihe nyeere Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ aka ikwusa ozi ọma?

12 Mgbe Pọl kwusaara ndị Juu na ndị Jentaịl nọ n’Antiọk dị na Pisidia ozi ọma, “ndị niile na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 13:48) Mgbe Luk na-apịachi akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, o kwuru na Pọl ‘na-ekwusa gbasara Alaeze Chineke n’atụghị ụjọ,’ kwuokwa na “o nweghị onye ọ bụla na-egbochi ya.” (Ọrụ 28:31) Olee ebe onyeozi ahụ nọ na-ekwusa ozi ọma? Ọ bụ na Rom, bụ́ isi obodo alaeze na-achị ụwa n’oge ahụ. Ma ndị na-eso ụzọ Jizọs oge mbụ hà nọ na-agwa ndị mmadụ okwu n’ihu ọha ma hà si n’ụzọ ndị ọzọ kwusaa ozi ọma, ọ bụ mmụọ nsọ nọ na-enyere ha aka, na-eduzikwa ha.

Ịnọgidesi Ike n’Agbanyeghị Mkpagbu

13. Olee ihe mere anyị ji kwesị ikpe ekpere mgbe a na-akpagbu anyị?

13 Mgbe a na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs oge mbụ, ha rịọrọ Jehova ka o nye ha ike ikwu okwu n’atụghị egwu. Gịnị meziri? E mere ka ha jupụta na mmụọ nsọ, nke mere ka ha na-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu. (Ọrụ 4:18-31) Anyị na-ekpekwa ekpere ka Chineke nye anyị amamihe na ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị mkpagbu. (Jems 1:2-8) Ebe ọ bụ na Chineke na-agọzi anyị ma jiri mmụọ nsọ ya na-enyere anyị aka, anyị anaghị akwụsị ikwusa ozi ọma. O nweghị ihe ga-akwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa, ma mmegide ma mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Mgbe a na-akpagbu anyị, anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ, amamihe, na obi ike anyị ga-eji na-ekwusa ozi ọma.​—Luk 11:13.

14, 15. (a) Gịnị mere “mgbe e gbuchara Stivin, a malitekwara ịkpagbu” Ndị Kraịst? (b) N’oge anyị a, olee otú ọtụtụ ndị bi na Saịberịa si mụta eziokwu?

14 Stivin ji obi ike kwusaa ozi ọma tupu ndị iro ya egbuo ya. (Ọrụ 6:5; 7:54-60) Mgbe a malitere “ịkpagbu” Ndị Kraịst n’oge ahụ, a chụsasịrị ndị niile na-eso ụzọ Jizọs, ha agbaga Judia na Sameria, ma e wezụga ndịozi. Ma ihe a emeghị ka a kwụsị ikwusa ozi ọma. Filip gawara Sameria ‘ikwusa gbasara Kraịst,’ ọ rụpụtakwara ihe dị mma n’ebe ahụ. (Ọrụ 8:1-8, 14, 15, 25) A gwakwara anyị, sị: “Mgbe e gbuchara Stivin, a malitekwara ịkpagbu ndị kwere ekwe ndị ọzọ. N’ihi ya, ha gbagara Finishia, Saịprọs, na Antiọk. Ma, ọ bụ naanị ndị Juu ka ha nọ na-ezi ozi ọma. Ma, ụfọdụ n’ime ha ndị si Saịprọs na Saịrini gara Antiọk, malite izisara ndị na-asụ Grik ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (Ọrụ 11:19, 20) N’oge ahụ, mkpagbu mere ka ozi ọma Alaeze Chineke ruo n’ebe ndị ọzọ.

15 N’oge anyị a, ụdị ihe a mere n’ebe bụ́bu Sọviet Yuniọn. Karịchaa, n’agbata afọ 1951 na 1959, a chụgara ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova na Saịberịa. Ebe ọ bụ na ha bi n’ebe dị iche iche, ozi ọma nọ na-agbasa ná nnukwu mba ahụ. E nweghị otú ọtụtụ Ndịàmà Jehova ahụ gaara esi nweta ego ha ga-eji gbaa ụgbọ gaa ihe ruru puku kilomita iri (10,000) iji kwusaa ozi ọma. Ma, ọ bụzi ndị ọchịchị ji aka ha kpọga ha ná mba ahụ. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ ndị ọchịchị mere ka ọtụtụ puku ndị Saịberịa nwere ezi obi mụta eziokwu.”

Jehova Na-agọzi Anyị nke Ukwuu

16, 17. Olee ihe akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọọrọ anyị gosiri na Jehova gọziri ọrụ ikwusa ozi ọma?

16 O doro anya na Jehova gọziri Ndị Kraịst oge mbụ. Pọl na ndị ọzọ kụrụ mkpụrụ ma gbaa ya mmiri, ‘ma, ọ bụ Chineke mere ka o too.’ (1 Kọr. 3:5, 6) Ihe ndị a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi gosiri na ihe mere ọtụtụ ndị ji bịa fewe Jehova bụ maka na ọ gọziri ọrụ ikwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Okwu Chineke nọ na-agbasa, ndị na-eso ụzọ Jizọs nọkwa na-ehikwu nne n’ike n’ike na Jeruselem.” (Ọrụ 6:7) Ka a na-agbakwu àmà n’ebe ndị ọzọ, “obi malitere iru ọgbakọ niile dị na Judia na Galili na Sameria ala n’oge ahụ, okwukwe ha ana-esikwukwa ike. Ha nọkwa na-ehikwu nne maka na ha na-atụ egwu Jehova, mmụọ nsọ ana-akasikwa ha obi.”​—Ọrụ 9:31.

17 N’Antiọk nke Siria, ndịàmà obi siri ike kụziiri ma ndị Juu ma ndị na-asụ Grik eziokwu. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Jehova nọnyekwaara ha. Ọtụtụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe ma malite iso ụzọ Onyenwe anyị.” (Ọrụ 11:21) O kwukwara banyere otú ozi ọma si na-aga n’ihu n’obodo ahụ, sị: “Okwu Jehova nọ na-agbasa, ọtụtụ ndị ana-aghọkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 12:24) Ka Pọl na ndị ọzọ nọ na-agbara ndị Jentaịl àmà nke ọma, “okwu Jehova . . . si otú a na-agbasa ma na-akpa ike”​—Ọrụ 19:20.

18, 19. (a) Gịnị mere anyị ji mara na ‘Jehova na-anọnyere’ anyị? (b) Nye ihe atụ gosiri na Jehova na-akwado ndị ya.

18 O doro anya na ‘Jehova na-anọnyekwara’ anyị n’oge a. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji na-aghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, a na-eme ha baptizim iji gosi na ha enyefeela Chineke onwe ha. Ọ bụkwa enyemaka Chineke na ngọzi ya mere anyị ji na-edi mmegide na mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ a na-akpagbu anyị mgbe ụfọdụ ma nọgide na-ekwusa ozi ọma, otú Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ mere n’oge ndịozi. (Ọrụ 14:19-21) Jehova Chineke ga na-enyere anyị aka. O ji “ogwe aka ya na-adịru mgbe ebighị ebi” na-akwado anyị n’ọnwụnwa niile na-abịara anyị. (Diut. 33:27) Anyị kwesịkwara icheta na e nweghị mgbe Jehova ga-ahapụ ndị ya n’ihi aha ya dị ebube.​—1 Sam. 12:22; Ọma 94:14.

19 Dị ka ihe atụ: Ndị Nazi kpọgara Nwanna Harald Abt n’ogige ịta ahụhụ Saksenhaụsen maka na ọ nọ na-ekwusa ozi ọma n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Na Mee 1942, ndị uwe ojii Nazi gara n’ụlọ nwunye ya bụ́ Elsa, kpọrọ obere nwa ha nwaanyị ma nwụchie Elsa. A kpọgara Elsa n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. O kwuru, sị: “M mụtara ihe dị ezigbo mkpa n’afọ ndị m nọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Jamanị. Ihe ahụ bụ na mmụọ nsọ Jehova nwere ike ime ka okwukwe mmadụ sie ezigbo mgbe ọnwụnwa tara akpụ bịaara ya. Tupu e jide m, agụrụ m akwụkwọ ozi otu nwanna nwaanyị dere, bụ́ ebe o kwuru na mgbe ọnwụnwa tara akpụ bịaara mmadụ, mmụọ nsọ Jehova na-eme ka obi ruo onye ahụ ala. Echeburu m na ọ ga-abụrịrị na o tinyetụrụ ihe o dere nnu na ose. Ma mgbe ọnwụnwa bịaara m, amatara m na ihe o kwuru bụ eziokwu. Ọ bụ ihe na-eme eme. O siri ike ịghọta ya ma ọ bụrụ na o mebeghị mmadụ. Ma, o mere m.”

Nọgide Na-agba Àmà nke Ọma

20. Gịnị ka Pọl mere mgbe a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya, oleekwa otú ihe a si agba ụfọdụ ụmụnna anyị ume?

20 Ihe ikpeazụ a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi bụ na Pọl ji ịnụ ọkụ n’obi ‘na-ekwusa gbasara Alaeze Chineke.’ (Ọrụ 28:31) Ebe ọ bụ na a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya, o nweghị ike ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ na Rom. Ma, ọ nọgidere na-ekwusara ndị niile bịara ileta ya ozi ọma. Taa, ụfọdụ ụmụnna anyị anaghị apụ apụ n’ụlọ ha. O nwekwara ike ịbụ na ha anaghị ebili n’àkwà ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi n’ihi nká ma ọ bụ ọrịa. Ma, ha ka hụrụ Chineke n’anya, chọsiekwa ike ikwusa ozi ọma. Anyị na-echeta ha n’ekpere. Anyị nwekwara ike ịrịọ Nna anyị nke eluigwe ka o mee ka ha hụ ndị chọrọ ịmụta banyere ya na ihe ọma ndị o bu n’obi ime.

21. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agba àmà ngwa ngwa ugbu a?

21 Ọtụtụ n’ime anyị ga-agali ozi ọma ụlọ n’ụlọ, sikwa n’ụzọ ndị ọzọ mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ya, ka anyị niile mee ihe niile anyị nwere ike ime n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, soro na-agba àmà ‘ruo n’ebe kacha anya n’ụwa.’ Anyị ghọtara na e kwesịrị ịrụ ọrụ a ngwa ngwa ugbu a n’ihi na anyị ahụla “ihe àmà” na-egosi na anyị bi n’oge ọgwụgwụ. (Mat. 24:3-14) E kwesịghị igbu oge ọ bụla. Anyị nwere ‘ọtụtụ ihe anyị na-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị’ ugbu a.​—1 Kọr. 15:58.

22. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ka anyị na-echere ụbọchị Jehova?

22 Ka anyị na-echere “oké ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị dị egwu,” ka anyị kpebisie ike iji obi ike na-agba àmà nke ọma. (Joel 2:31) Anyị ka ga-ahụ ndị yiri ndị Beria ahụ “ji obi ha niile nabata okwu Chineke.” (Ọrụ 17:10, 11) N’ihi ya, ka anyị nọgide na-agba àmà ruo mgbe a rụchara ọrụ a. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ka à sịrị onye ọ bụla n’ime anyị: “I mere nke ọma, ezigbo ohu kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mat. 25:23) Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ n’oge a ma na-erubere Jehova isi, anyị ga-aṅụrị ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi na anyị so rụọ ọrụ ‘ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke.’