Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 23

“Geenụ M Ntị Ka M Gwa Unu Ihe Merenụ”

“Geenụ M Ntị Ka M Gwa Unu Ihe Merenụ”

Pọl gbachiteere eziokwu n’ihu ìgwè mmadụ iwe ji nakwa n’ihu ndị Sanhedrin

O Si n’Ọrụ Ndịozi 21:18–23:10

1, 2. Gịnị mere Pọl ji gaa Jeruselem, oleekwa nsogbu ndị ọ ga-enwe n’ebe ahụ?

 PỌL abịala ọzọ na Jeruselem. Ọ na-aga n’okporo ámá ya dị warara ma na-ekwo ekwo. A bịa n’ihe gbasara ife Jehova, e nweghị obodo wuru ewu n’ụwa ka Jeruselem. Ọtụtụ n’ime ndị bi n’obodo a n’oge ahụ ji ya anya isi n’ihi ihe ndị merela na ya. Pọl ma na uche ọtụtụ Ndị Kraịst bi na Jeruselem ka dị n’otú ha si fee Jehova n’oge ndị gara aga. Ha anabatabeghị otú ọ chọziri ka e si na-efe ya. N’ihi ya, Pọl ghọtara na ihe dị Ndị Kraịst a mkpa abụghị naanị onyinye ndị ahụ o ji maka ha kpebie ịga Jeruselem mgbe ọ nọ n’Efesọs, kama na o kwesịkwara inyere ha aka ịgbanwe echiche ha. (Ọrụ 19:21) Ọ gara n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara ya.

2 Olee nsogbu ga-abịara Pọl na Jeruselem? Otu nsogbu ọ ga-enwe ga-esi n’aka ndị na-eso ụzọ Kraịst, ndị nke kwetara asịrị a kọọrọ ha banyere Pọl. Ma, nsogbu ndị nke ka njọ ga-esi n’aka ndị iro Kraịst. Ha ga-ebo Pọl ebubo ụgha, tie ya ihe, chọọkwa igbu ya. Nsogbu ndị ahụ ga-eme ka Pọl jiri oge ndị ahụ gbachitere ihe o kweere. Ndị Kraịst n’oge a ga-amụta ezigbo ihe n’otú Pọl si dị umeala n’obi ma nwee obi ike na okwukwe mgbe nsogbu ndị ahụ bịaara ya. Ka anyị leba ya anya.

“Ha Malitere Ito Chineke” (Ọrụ 21:18-20a)

3-5. (a) Olee nnọkọ Pọl gara na Jeruselem, oleekwa ihe e kwuru na ya? (b) Gịnị na gịnị ka anyị na-amụta ná nnọkọ Pọl na ndị okenye nọ na Jeruselem nwere?

3 Ụbọchị sotere ụbọchị Pọl na ndị ibe ya rutere Jeruselem, ha gawara ịhụ ndị okenye ọgbakọ ahụ. E nweghị onyeozi ọ bụla ka dị ndụ e kwutere okwu ya n’akụkọ a. Ọ ga-abụ na mgbe ahụ, ha nọzi na-eje ozi n’ọgbakọ ndị dị n’ebe ndị ọzọ. Ma, Jems nwanne Jizọs ka nọ ebe ahụ. (Gal. 2:9) Ọ ga-abụ Jems bụ onyeisi oche mgbe ahụ Pọl na “ndị okenye niile” nọ ebe ahụ nwere nnọkọ.​—Ọrụ 21:18.

4 Pọl kelere ndị okenye ahụ “ma kọọrọ ha ihe niile Chineke si n’ozi ọma o zisara meere ndị mba ọzọ.” (Ọrụ 21:19) O doro anya na ihe ahụ ọ kọọrọ ha gbara ha ume. N’oge a, anyị na-enwekwa obi ụtọ ma anyị nụ otú ozi ọma si aga n’ihu n’ihu n’obodo ndị ọzọ.​—Ilu 25:25.

5 Mgbe Pọl na-ekwu okwu, ọ ga-abụ na o kwuru banyere onyinye ndị ahụ ụmụnna nọ na Yurop bunyere ya. Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ ụmụnna a Pọl na-agwa okwu ezigbo ụtọ na ihe banyere ha na-emetụ ụmụnna ha ndị bi n’obodo ndị dị anya n’obi. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na mgbe ndị okenye ahụ nụchara ihe Pọl kwuru, “ha malitere ito Chineke.” (Ọrụ 21:20a) N’oge a, obi na-atọkwa ọtụtụ ndị ọdachi dakwasịrị ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa ezigbo ụtọ ma ụmụnna ha gbatara ha ọsọ enyemaka, gbaakwa ha ume.

Ọtụtụ Ka ‘Ji Iwu Mosis Kpọrọ Ihe’ (Ọrụ 21:20b, 21)

6. Olee nsogbu a kọọrọ Pọl?

6 Ndị okenye ahụ gwaziri Pọl na e nwere nsogbu na Judia n’ihi asịrị a nụrụ banyere ya. Ha gwara ya, sị: “Nwanna anyị, ị manụ na e nwere ọtụtụ puku ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs, nakwa na ha ji Iwu Mosis kpọrọ ihe. Ma ha nụrụ ka ndị mmadụ na-asị: ‘Pọl na-akụziri ndị Juu niile nọ ná mba ọzọ ka ha ghara ime ihe Iwu Mosis kwuru. Ọ na-agwakwa ha ka ha ghara ibi ụmụ ha úgwù, gharakwa ime omenala anyị dị iche iche.’” a​—Ọrụ 21:20b, 21.

7, 8. (a) Olee otú na-adịghị mma ọtụtụ Ndị Kraịst nọ na Judia si na-ele ihe anya? (b) Gịnị mere o ji bụrụ na otú ahụ na-adịghị mma ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu si ele ihe anya apụtaghị na ha abụghị ezigbo Ndị Kraịst?

7 Gịnị mere ọtụtụ Ndị Kraịst ka ji buru Iwu Mosis n’isi n’agbanyeghị na ihe karịrị afọ iri abụọ agafeela kemgbe a kagburu ya? (Kọl. 2:14) N’afọ 49 O.N.K., ndịozi na ndị okenye ndị zukọtara na Jeruselem degaara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi ma kọwaara ha na ọ dịzighị mkpa ka e bie ndị mba ọzọ ghọrọ Ndị Kraịst úgwù ma ọ bụ ka ha debe Iwu Mosis. (Ọrụ 15:23-29) Ma, akwụkwọ ozi ahụ ekwughị banyere ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ndị ọtụtụ n’ime ha na-aghọtaghị na a kagbuola Iwu Mosis.

8 Otú ahụ na-adịghị mma ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst si ele ihe anya ọ̀ pụtara ha abụghị ezigbo Ndị Kraịst? Mba. Tupu ha aghọọ Ndị Kraịst, ọ bụghị arụsị ka ha na-ekpere nke a ga-asị na ha ka nọ na-eme omenala ndị ha na-emebu n’okpukpe mbụ ha. Ọ bụ Jehova nyere Iwu ahụ ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst ji kpọrọ ihe. E nweghịkwa ihe ọ bụla dị njọ ma ọ bụ ihe gbasara ife ndị mmụọ ọjọọ na ya. Ma, e nyere ndị Izrel Iwu ahụ mgbe ha nọ n’ọgbụgba ndụ ochie, mana Ndị Kraịst nọzi n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ. Idebe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ adịghịzi mkpa iji fee Jehova ezigbo ofufe. Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru, ndị ji Iwu Mosis kpọrọ ihe, aghọtaghị ihe bụ́ ọgbakọ Ndị Kraịst, ihe a na-eme na ya akabeghịkwa ha obi. Ha kwesịrị ịgbanwe echiche ha ka ọ daba n’eziokwu Chineke mere ka ndị ya mata mgbe ahụ. b​—Jere. 31:31-34; Luk 22:20.

“Ihe Ahụ Ndị Mmadụ Na-akọ Banyere Gị Abụghị Eziokwu” (Ọrụ 21:22-26)

9. Gịnị ka Pọl kụziri banyere Iwu Mosis?

9 Oleekwanụ banyere asịrị ahụ a nọ na-akọ na Pọl na-akụziri ndị Juu bi ná mba ọzọ “ka ha ghara ibi ụmụ ha úgwù, gharakwa ime omenala [ha] dị iche iche”? Pọl bụ onyeozi ndị mba ọzọ, ndị mba ọzọ makwa na ọ kwadoro mkpebi ahụ e mere, nke bụ́ na ọ dịghị mkpa ka ha debe Iwu Mosis. O kwukwara na ọ dịghị mma ka onye ọ bụla gwa ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst ka ha bie úgwù ma debe Iwu Mosis. (Gal. 5:1-7) Pọl zikwara ndị Juu bi n’obodo ndị ọ gara ozi ọma. O doro anya na ọ kọwaara ndị gere ya ntị na ọnwụ Jizọs kagburu Iwu Mosis nakwa na ọ bụ okwukwe na-eme ka mmadụ bụrụ onye ezi omume, ọ bụghị idebe Iwu Mosis.​—Rom 2:28, 29; 3:21-26.

10. Olee otú Pọl si gosi na o lere Iwu Mosis na ibi úgwù anya otú kwesịrị ekwesị?

10 Ma, Pọl akatọghị ndị akọnuche ha nabatara ime omenala ụfọdụ ndị Juu na-eme, dị ka ịhapụ ịrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike ma ọ bụ ịjụ iri ihe ụfọdụ. (Rom 14:1-6) O nyeghịkwanụ ha iwu banyere ibi úgwù. Pọl bidịrị Timoti úgwù ka ndị Juu ghara ile Timoti anya ọjọọ, ebe ọ bụ na nna ya bụ onye Grik. (Ọrụ 16:3) Ọ bụ mmadụ ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-ebi úgwù ma ọ̀ bụ na ọ gaghị ebi. Pọl gwara ndị Galeshia, sị: “E nweghị uru ibi úgwù ma ọ bụ ebighị úgwù baara ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu, kama ihe ka mkpa bụ okwukwe ha nwere nke ha na-egosi n’ịhụ ndị ọzọ n’anya.” (Gal. 5:6) Ma, ọ bụrụ na mmadụ ebie úgwù maka na ọ chọrọ idebe Iwu Mosis ma ọ bụkwanụ na-ekwu na ibi úgwù ga-eme ka mmadụ bụrụ onye ezi omume n’anya Jehova, onye ahụ na-egosi na o nweghị okwukwe.

11. Olee ihe ndị okenye gwara Pọl ka o mee, oleekwa ihe ọ ga-abụ na o meghị? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

11 Ọ bụ eziokwu na asịrị a na-akọ banyere Pọl ekwesịghị ekwesị, ma o nyere ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nsogbu n’obi. N’ihi ya, ndị okenye ahụ gwara Pọl, sị: “Anyị nwere ụmụ nwoke anọ ndị chọrọ imezu nkwa ha kwere Chineke. Kpọrọ ụmụ nwoke ndị a gaa ka gị na ha sachaa onwe unu otú iwu kwuru, kwụọkwa ụgwọ ihe niile ọ ga-efu ha, ka e wee kpụọ ha isi. Onye ọ bụla ga-esikwa otú a mara na ihe ahụ ndị mmadụ na-akọ banyere gị abụghị eziokwu, kama na ị na-eme ihe kwesịrị ekwesị, na-edebekwa Iwu Mosis.” c​—Ọrụ 21:23, 24.

12. Olee otú Pọl si gosi na ya dị njikere ime ihe ndị okenye nọ na Jeruselem gwara ya?

12 Pọl gaara agwa ha na ihe bụ́ nsogbu bụ na ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst na-anụrụ Iwu Mosis ọkụ n’obi, ọ bụghị asịrị a na-akọ banyere ya. Kama ime otú ahụ, ọ dị njikere ime ihe ndị okenye ahụ gwara ya ebe ọ bụ na e nweghị iwu Chineke ọ ga-emebi. Tupu mgbe ahụ, o dere, sị: “M gakwuru ndị na-edebe Iwu Mosis, mụ emewe ka onye na-edebe Iwu Mosis iji nyere ha aka iso ụzọ Jizọs, ọ bụ eziokwu na iwu ejighị m idebe Iwu Mosis.” (1 Kọr. 9:20) N’okwu a, Pọl kwetara ime ihe ndị okenye nọ na Jeruselem gwara ya mee. O mere ka “onye na-edebe Iwu Mosis.” Taa, anyị kwesịrị ịna-eme ka Pọl, na-eme ihe ndị okenye gwara anyị, ọ bụghị isi ọnwụ na-eme ihe otú masịrị anyị.​—Hib. 13:17.

Mgbe a gwara Pọl mee ihe na-emebighị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, o kwetara mee ya. Ị̀ na-eme ka ya?

“Gbuonụ Ya!” (Ọrụ 21:27–22:30)

13. (a) Gịnị mere ụfọdụ ndị Juu ji kpata ọgba aghara n’ụlọ nsọ? (b) Olee otú e si napụta Pọl?

13 Ihe agaghị nke ọma n’ụlọ nsọ. Mgbe ọ fọrọ abalị ole na ole ka ụbọchị ụmụ nwoke ahụ ga-emezu nkwa ha ruo, ndị Juu si Eshia hụrụ Pọl ma bo ya ebubo na ọ kpọbatara ndị Jentaịl n’ụlọ nsọ. Ha kpatakwara ọgba aghara. Á sị na ọchịagha ndị Rom gbara nkịtị, ha gaara akụgbu Pọl. Ma, ọchịagha ahụ tụbara Pọl n’ụlọ mkpọrọ. Malite n’ụbọchị ahụ, Pọl ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ ihe karịrị afọ anọ tupu a tọhapụ ya. Ma, ndị Juu ka nọkwa na-achọ otú ha ga-esi egbu ya. Mgbe ọchịagha ahụ jụrụ ndị Juu ihe mere ha ji chọọ igbu Pọl, ha malitere iti mkpu ma na-ebo Pọl ebubo dị iche iche. Ụzụ ha na-eme ekweghịdị ọchịagha ahụ ghọta ihe ọ bụla. N’ikpeazụ, ndị agha bu Pọl ebu pụọ n’ebe ahụ. Mgbe Pọl na ndị agha Rom chọrọ ịbanye n’ogige ndị agha, ọ gwara ọchịagha ahụ, sị: “Biko, kwe m ka m gwa ndị a okwu.” (Ọrụ 21:39) Ọchịagha ahụ kwetara, Pọl ejirizie obi ike gbachitere ihe o kweere.

14, 15. (a) Olee ihe Pọl kọọrọ ndị Juu? (b) Gịnị ka ọchịagha ndị Rom mere iji mata ihe mere ndị Juu ji na-ewesa Pọl iwe?

14 Pọl malitere okwu ya, sị: “Geenụ m ntị ka m gwa unu ihe merenụ.” (Ọrụ 22:1) Pọl ji asụsụ Hibru gwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, nke mere ka ha nọrọ nwayọọ. Ọ gwara ha hoo haa ihe mere o ji bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst. Mgbe Pọl na-agwa ha okwu, o kwuru ihe dị iche iche ndị Juu ahụ ga-achọpụtali ma hà bụ eziokwu ma ha chọọ. Ọ ga-abụ na ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ ma na ọ bụ Gameliel bụ́ onye nkụzi a ma ama kụziiri Pọl ihe nakwa na Pọl kpagburu ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ma, mgbe ọ na-aga Damaskọs, Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ si n’ọhụụ gwa ya okwu. Ndị ha na Pọl so hụrụ ìhè nwurunụ, nụkwa olu, ma ha aghọtaghị ihe olu ahụ kwuru. (Ọrụ 9:7; 22:9) Ha mechara duru Pọl banye Damaskọs maka na ọhụụ ahụ mere ka o kpuo ìsì. N’ebe ahụ, otu nwoke ndị Juu ma ama, onye aha ya bụ Ananayas, rụrụ ọrụ ebube mee ka Pọl hụwa ụzọ.

15 Pọl kọziiri ha na mgbe ya laghachiri Jeruselem, na ya hụrụ Jizọs n’ọhụụ n’ụlọ nsọ. Mgbe o kwuru ihe a, iwe were ndị Juu, ha etie mkpu, sị: “Nwoke a kwesịrị ọnwụ. Gbuonụ ya!” (Ọrụ 22:22) Iji chebe Pọl, ọchịagha ahụ kpọbara ya n’ogige ndị agha. Ọ chọrọ ịmata ihe mere ndị Juu ji na-ewesa Pọl iwe. N’ihi ya, ọ gwara ndị agha ka ha pịa ya ihe ka o nwee ike ikwu ihe o mere. Ma, Pọl gwara ha na ya bụ nwa amaala Rom, si otú ahụ jiri ikike iwu ndị Rom nyere ya napụta onwe ya. Taa, ndị na-efe Jehova na-ejikwa ikike iwu obodo nyere ha agbachitere ihe ha kweere. (Gụọ igbe bụ́ “ Iwu Ndị Rom na Ụmụ Amaala Rom,” nakwa nke bụ́ “ Ịgbachitere Ozi Ọma n’Ụlọikpe n’Oge Anyị A.”) Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na Pọl bụ nwa amaala Rom, ọ ghọtara na ya kwesịrị isi ụzọ ọzọ mata ihe ahụ ọ chọrọ ịmata. N’echi ya, ọ gwara ndị so na Sanhedrin, bụ́ ụlọikpe ndị Juu kacha elu, ka ha zukọta maka okwu ahụ, ma kpọpụtara ha Pọl.

“Abụ M Onye Farisii” (Ọrụ 23:1-10)

16, 17. (a) Kọwaa ihe mere mgbe Pọl gwara ndị Sanhedrin okwu. (b) Mgbe e tiri Pọl ihe, olee otú o si gosi na ọ dị umeala n’obi?

16 Pọl malitere ịzara ọnụ ya n’ihu ndị Sanhedrin, sị: “Ụmụnna m, Chineke ma na akọnuche m na-agwa m na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere ruo taa.” (Ọrụ 23:1) O kwughị ihe ọzọ. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Ananayas bụ́ nnukwu onye nchụàjà wee gwa ndị guzo Pọl nso ka ha tie ya ihe n’ọnụ.” (Ọrụ 23:2) Ihe a bụ ezigbo mkparị. O gosiri na ha buuru Pọl iwe n’obi n’ihi na ha kpọrọ ya onye ụgha n’ebughị ụzọ nweta ihe akaebe ọ bụla. Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji gwa ya, sị: “Mgbidi e tere nzu, Chineke ga-eti gị ihe. Ị nọ ọdụ ka i kpee m ikpe otú Iwu kwuru, ma ị na-emebi Iwu, ebe i kwuru ka e tie m ihe. Ihe a ị na-eme ọ̀ dị mma?”​—Ọrụ 23:3.

17 Ihe a juru ụfọdụ ndị guzo ebe ahụ anya. Ma, ihe juru ha anya abụghị ihe a kụrụ Pọl, kama ọ bụ ihe Pọl kwuru. Ha sịrị ya: “Ị̀ na-akparị nnukwu onye nchụàjà Chineke?” Pọl gwaziri ha ihe gosiri na ọ dị umeala n’obi ma na-akwanyere Iwu Mosis ùgwù. Ọ sịrị: “Ụmụnna m, amaghị m na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà. N’ihi na e dere, sị, ‘Agwala onye na-achị ndị gị okwu ọjọọ.’” d (Ọrụ 23:4, 5; Ọpụ. 22:28) Pọl chepụtara otú ọzọ ọ ga-esi agwa ha okwu. Ebe ọ ma na ndị so na Sanhedrin bụ ndị Farisii na ndị Sadusii, ọ sịrị: “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii, nna nna m hà bụkwa ndị Farisii. Ihe mere e ji na-ekpe m ikpe bụ maka na m kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.”​—Ọrụ 23:6.

Anyị na-eme ka Pọl mgbe anyị na-agwa ndị na-ekpe okpukpe ọzọ okwu. Anyị na-agwa ha okwu n’ihe anyị na ha kweere otu ihe na ya

18. Gịnị mere Pọl ji sị na ya bụ onye Farisii, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ka ya mgbe ụfọdụ?

18 Gịnị mere Pọl ji sị na ya bụ onye Farisii? Ọ bụ n’ihi na ‘nna nna ya hà bụ ndị Farisii,’ ya bụ, na ha nọ n’òtù ndị Farisii. N’ihi ya, ọtụtụ ndị ka ga-ewere ya ka onye Farisii. e Ma, gịnị mere Pọl ji kwuo na ya kweere ná mbilite n’ọnwụ otú ndị Farisii kweere? E kwuru na ndị Farisii kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ ma mmadụ nwụọ, nakwa na mkpụrụ obi ndị ezi omume ga-emecha lọghachi n’anụ ahụ́, ha adịrịkwa ndụ. Pọl ekweghị n’ihe ndị ahụ ha kweere. O kweere ná mbilite n’ọnwụ Jizọs kụziri. (Jọn 5:25-29) N’agbanyeghị ya, Pọl kwetara ihe ndị Farisii kwuru, nke bụ́ na e nwere olileanya na mmadụ ga-adị ndụ ọzọ ma ọ nwụọ. Ma ndị Sadusii achọghị iji ntị anụ na onye nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Anyị nwere ike ime ka Pọl mgbe anyị na-agwa ndị Katọlik ma ọ bụ ndị chọọchị ndị ọzọ okwu. Anyị nwere ike ịgwa ha na anyị kweere na Chineke otú ha kweere. N’eziokwu, ha nwere ike ikwere n’Atọ n’Ime Otu, ma anyị kweere na Chineke e kwuru okwu ya na Baịbụl. N’agbanyeghị ya, anyị na ha kweere na e nwere Chineke.

19. Gịnị mere e ji nwee ọgba aghara ná nnọkọ ahụ ndị Sanhedrin nwere?

19 Ihe Pọl kwuru mere ka ndị Sanhedrin kewaa. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Ebe ahụ niile malitere ịgba ghara ghara, ụfọdụ ndị odeakwụkwọ ndị dụnyeere ndị Farisii úkwù malitere ịrụ ezigbo ụka, sị: ‘Anyị ahụghị ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere. O nwere ike ịbụ na mmụọ ma ọ bụ mmụọ ozi gwara ya okwu​—.’” (Ọrụ 23:9) Ndị Sadusii achọghị iji ntị anụ na mmụọ ozi gwara Pọl okwu n’ihi na ha ekweghị na e nwere ndị mmụọ ozi. (Gụọ igbe bụ́ “ Ndị Sadusii na Ndị Farisii.”) Ọgba aghara ahụ kara njọ nke na ọchịagha ndị Rom ahụ kpọpụtara Pọl n’aka ha ọzọ. (Ọrụ 23:10) Ma, Pọl onyeozi ka nọkwa ná nsogbu. Gịnịzi ga-eme ya? Anyị ga-amụtakwu banyere ya n’isiokwu ọzọ.

a Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ndị Juu ghọrọla Ndị Kraịst, ọ ga-abụ na e nwere ọtụtụ ọgbakọ na-anọ n’ụlọ ụmụnna amụ ihe.

b Mgbe afọ ole na ole gachara, Pọl onyeozi degaara Ndị Hibru akwụkwọ ozi o ji gosi ha na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ka nke ochie mma. N’akwụkwọ ozi ahụ, o mere ka o doo anya na ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ kagburu ọgbụgba ndụ ochie. Ọ bụghị naanị na Pọl gwara ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst ihe doro anya ha ga-aza ndị Juu ibe ha na-emegide ha, kama ọ ga-abụrịrị na ihe o kwuru mere ka ụfọdụ Ndị Kraịst bú Iwu Mosis n’isi nabata ihe ọhụrụ ahụ a kụziiri ha.​—Hib. 8:7-13.

c Ndị ọkà mmụta kwuru na ụmụ nwoke ahụ kwere nkwa ịbụ ndị Naziraịt. (Ọnụ Ọgụ. 6:1-21) Ma, a kagbuola Iwu Mosis nke mere mmadụ ga-eji kwe nkwa ịbụ onye Naziraịt. N’agbanyeghị ya, ọ ga-abụ na Pọl chere na ọ bụghị ihe ọjọọ ma ụmụ nwoke ahụ mezuo nkwa ha kwere Jehova. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ọjọọ ma o soro ha gaa ma kwụọrọ ha ụgwọ ihe ha mefuru. Anyị amaghị kpọmkwem ụdị nkwa ha kwere, ma nke ọ bụla ọ bụ, o doro anya na Pọl agaghị akwado ka ụmụ nwoke ahụ jiri anụmanụ chụọ àjà (otú ndị Naziraịt na-eme), chee na ọ ga-asachapụ mmehie ha. Àjà ụmụ anụmanụ enweghịzi ike ikpuchi mmehie ebe ọ bụ na Kraịst ejirila ndụ ya zuru okè chụọ àjà. Anyị amaghị ihe niile Pọl mere n’okwu a, ma anyị ji n’aka na ọ gaghị ekweta ime ihe ọ bụla ga-emebi akọnuche ya.

d Ụfọdụ ndị ekwuola na Pọl anaghị ahụcha ụzọ, na ọ bụ ya mere na ọ mataghị nnukwu onye nchụàjà ahụ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ dịla anya ọ hapụrụ Jeruselem, nke mere na ọ maghị onye bụ́ nnukwu onye nchụàjà mgbe ahụ. O nwekwara ike ịbụ na Pọl ahụghị onye nyere iwu ka a kụọ ya ihe maka na ìgwè mmadụ ahụ nọchiiri ya ụzọ.

e N’afọ 49 O.N.K., mgbe ndịozi na ndị okenye nọ na-ekwurịta ma ndị Jentaịl hà kwesịrị idebe Iwu Mosis, e kwuru na ụfọdụ Ndị Kraịst nọ ebe ahụ bụ “ndị nọbu n’òtù ndị Farisii, ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 15:5) Ọ ga-abụ na a ka na-echeta na ha bụbu ndị Farisii.