Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 24

“Obi Sie Gị Ike”

“Obi Sie Gị Ike”

A napụtara Pọl mgbe ndị Juu kpara nkata igbu ya, ọ zakwaara ọnụ ya n’ihu Feliks

O Si n’Ọrụ Ndịozi 23:11–24:27

1, 2. Gịnị mere mkpagbu a na-akpagbu Pọl na Jeruselem ejughị ya anya?

 A NAPỤTARA Pọl n’aka ìgwè mmadụ iwe ji na Jeruselem, ma a kpọchiekwala ya ọzọ. O jughị onyeozi a na-anụ ọkụ n’obi anya na a na-akpagbu ya na Jeruselem. A gwara ya agwa na ‘a ga-atụ ya mkpọrọ, kpagbuokwa ya’ n’obodo a. (Ọrụ 20:22, 23) Ọ bụ eziokwu na Pọl amachaghị ihe na-aga ime ya, ma ọ ma na ọ ka ga na-ata ahụhụ n’ihi aha Jizọs.​—Ọrụ 9:16.

2 Ndị amụma bụ́ Ndị Kraịst gwadịrị Pọl na a ga-eke ya agbụ ma “nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.” (Ọrụ 21:4, 10, 11) Ọ dịbeghị anya ìgwè ndị Juu nwara igbu Pọl. Ọ dịchabeghịkwa anya, o yiri ka ndị Sanhedrin hà “ga-adọrisị Pọl” mgbe ha na-arụrịta ụka n’ihi ihe o kwuru. Ugbu a, ndị agha Rom ji onyeozi a eji, ikpe a ga-ekpe ya na ebubo ndị a ga-ebo ya agwụbeghị. (Ọrụ 21:31; 23:10) N’eziokwu, agbamume dị Pọl onyeozi mkpa.

3. Olee ebe ndị anyị si enweta agbamume iji nọgide na-ekwusa ozi ọma?

3 N’oge ọgwụgwụ a, anyị ma na “a ga-akpagbukwa ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.” (2 Tim. 3:12) Ọ na-amasịkwa anyị ka a na-agba anyị ume ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-esi n’akwụkwọ ndị ha na-ewepụta nakwa n’ọmụmụ ihe ndị anyị na-aga agba anyị ume. (Mat. 24:45) Jehova mere ka obi sie anyị ike na ihe agaghị agaziri ndị chọrọ ịkwụsị ọrụ ikwusa ozi ọma. Ha agaghị ekpochapụli ndị ohu Jehova niile ma ọ bụ kwụsị ọrụ ikwusa ozi ọma. (Aịza. 54:17; Jere. 1:19) Oleekwanụ maka Pọl onyeozi? Ò nwetara agbamume ga-enyere ya aka ịnọgide na-agba àmà nke ọma n’agbanyeghị mmegide? Ọ bụrụ na o nwetara, olee otú e si gbaa ya ume, oleekwa ihe o mere?

Otú ‘Nkata A Kpara, Ṅụọkwa Iyi’ Si Kụọ Afọ n’Ala (Ọrụ 23:11-34)

4, 5. Olee ume a gbara Pọl, gịnịkwa mere o ji bụrụ na a gbara ya ume a n’oge kwesịrị ekwesị?

4 A gbara Pọl onyeozi ezigbo ume n’abalị ụbọchị a napụtachara ya n’aka ndị Sanhedrin. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Onyenwe anyị guzoro n’akụkụ ya, sị ya: ‘Obi sie gị ike. N’ihi na otú ahụ ị nọ na-agba àmà nke ọma banyere m na Jeruselem, ka ị ga-agbakwa àmà banyere m na Rom.’” (Ọrụ 23:11) Okwu agbamume a Jizọs gwara Pọl mere ka obi sie ya ike na a ga-anapụta ya. Ọ ma na ya ga-eru Rom ma gbaa àmà banyere Jizọs n’ebe ahụ.

“Ihe karịrị ụmụ nwoke iri anọ n’ime ha bu n’obi ichechi ya n’ụzọ.”​—Ọrụ 23:21

5 A gbara Pọl ume a n’oge kwesịrị ekwesị. N’echi ya, ihe karịrị ụmụ nwoke iri anọ bụ́ ndị Juu kpara nkata na ha “agaghị eri ihe ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla ruo mgbe [ha] gburu Pọl. Ọ bụrụkwa na [ha] emeghị ihe a, ka a bụọ [ha] ọnụ.” Nkata a ha kpara nakwa iyi ha ṅụrụ gosiri na ndị Juu ahụ kpebisiri ike igbu onyeozi a. Ha chere na ihe ọjọọ ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha emezughị ihe ha kpara nkata ime. (Ọrụ 23:12-15) Ndị isi nchụàjà na ndị okenye kwadoro nkata ha kpara, nke bụ́ na ha ga-akpọrọ Pọl kpọghachiri ndị Sanhedrin ka ha jụkwuo ya ajụjụ, ka à ga-asị na ha chọrọ ilebakwu okwu ya anya nke ọma. Ma, ndị ahụ kpara nkata ahụ bu n’obi ichechi ya n’ụzọ ka ha gbuo ya.

6. Olee otú e si mata nkata a kpara igbu Pọl, oleekwa ihe ndị na-eto eto n’oge a ga-amụta n’ihe nwa nwanne Pọl mere?

6 Ma, nwa nwanne Pọl nụrụ banyere nkata a a kpara ma kọọrọ ya Pọl. Pọl gwaziri nwa okorobịa ahụ ka ọ gaa kọọrọ ya ọchịagha ndị Rom bụ́ Klọdiọs Laịsias. (Ọrụ 23:16-22) N’eziokwu, Jehova hụrụ ụmụ okorobịa na-eme ka nwa nwanne Pọl ahụ a na-akpọghị aha n’anya, bụ́ ndị na-eji obi ike eme ihe ga-abara ndị na-efe Chineke uru kama ime ihe ga-abara naanị ha uru, ndị na-emekwa ihe niile ha nwere ike ime iji na-akwado ọrụ Alaeze Chineke.

7, 8. Olee ihe Klọdiọs Laịsias mere iji hụ na ọ dịghị ihe mere Pọl?

7 Ozugbo a gwara Klọdiọs Laịsias, bụ́ ọchịagha otu puku (1,000) ndị agha, na a kpara nkata igbu Pọl, o nyere iwu ka ndị agha dị narị mmadụ anọ na iri asaa (470), ma ndị ji ube ma ndị na-agba ịnyịnya, duru Pọl n’abalị ahụ si Jeruselem gaa Sizaria ka ihe ọ bụla ghara ime ya. Ozugbo o ruru ebe ahụ, ha ga-enyefe ya n’aka Gọvanọ Feliks. a N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị Juu bi na Sizaria, bụ́ ebe ndị Rom si na-achị Judia, ọ bụ ndị Jentaịl kacha biri na ya. Ebe ahụ dị jụụ. Ọ dịghị ka Jeruselem, bụ́ ebe ọtụtụ ndị kpọrọ ndị na-ekpe okpukpe ọzọ asị nakwa ebe a na-enwekarị ọgba aghara. Ọ bụkwa na Sizaria ka e nwere isi ogige ndị agha Rom.

8 Laịsias mere ihe iwu Rom kwuru, ya bụ, o degaara Feliks akwụkwọ ozi ma kọọrọ ya banyere ikpe a na-ekpe Pọl. Laịsias kwuru na mgbe ya nụrụ na Pọl bụ nwa amaala Rom, na ya chebere ya mgbe ‘ọ fọrọ obere ka ha gbuo ya.’ O kwuru na o nweghị ihe ọ chọpụtara “e kwesịrị iji maka ya gbuo ya ma ọ bụ tụọ ya mkpọrọ,” ma n’ihi nkata a kpara igbu Pọl, na ya na-ezitere ya Gọvanọ Feliks ka ọ nụrụ ihe ndị na-ebo ya ebubo na-ekwu ma kpebie ikpe ya.​—Ọrụ 23:25-30.

9. (a) Olee otú e si mee Pọl ihe a na-ekwesịghị ime nwa amaala Rom? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị iji ikike iwu obodo nyere anyị dị ka ụmụ amaala chebe onwe anyị?

9 Ihe Laịsias dere ọ̀ bụ eziokwu? Ọ bụghị ha niile bụ eziokwu. Ọ ga-abụ na ọ chọrọ ka gọvanọ kpọọ ya ezigbo mmadụ. N’eziokwu, ihe mere o ji napụta Pọl abụghị maka na ọ chọpụtara na onyeozi a bụ nwa amaala Rom. Ihe ọzọ bụ na Laịsias ekwughị na ya nyere iwu ka e kee Pọl “agbụ ígwè abụọ,” mechaakwa nye iwu na “a ga na-apịa ya ihe ma a na-agba ya ajụjụ.” (Ọrụ 21:30-34; 22:24-29) Laịsias si otú a mee Pọl ihe a na-ekwesịghị ime nwa amaala Rom. Taa, Setan na-eji ndị okpukpe ha na-agba ara eme ka a na-akpagbu anyị, ha nwekwara ike ime anyị ihe a na-ekwesịghị ime ụmụ amaala. Ma dị ka Pọl mere, ndị Chineke na-ejikarị ikike iwu obodo nyere ha dị ka ụmụ amaala ewepụ ụdị okwu ahụ n’ụlọikpe ka e chebe ha.

‘Obi Dị M Ụtọ Ugbu A Ịzara Ọnụ M n’Ihu Gị’ (Ọrụ 23:35–24:21)

10. Olee ebubo ndị dị oké njo e boro Pọl?

10 Na Sizaria, ‘a na-eche Pọl nche n’obí Herọd’ ruo mgbe ndị na-ebo ya ebubo ga-esi Jeruselem bịa. (Ọrụ 23:35) Mgbe ụbọchị ise gachara, ha bịarutere. Ha bụ Ananayas Nnukwu Onye Nchụàjà, ọkà okwu bụ́ Tetọlọs, nakwa ụfọdụ ndị okenye. Tetọlọs bu ụzọ too Feliks maka ihe ọ na-emere ndị Juu. Ọ ga-abụ na o kwuru ya ka isi buwe ya nakwa ka o nweta obi ya. b O kwuweziri banyere Pọl, sị na Pọl “bụ onye ọjọọ.” O kwukwara, sị: “Ọ na-eme ka ndị Juu niile nọ n’ụwa na-emegide ndị ọchịchị. Ọ bụkwa onye ndú òtù a na-akpọ ‘ndị Nazaret.’ Ọ nwakwara imerụ ụlọ nsọ, anyị ejide ya.” Ndị Juu ndị ọzọ “sokwa na-ekwusi ike na ihe ndị a bụ eziokwu.” (Ọrụ 24:5, 6, 9) Ebubo ndị a e boro ya, ya bụ, na ọ na-emegide ndị ọchịchị, na ọ bụ onye ndú òtù ọjọọ, nakwa na o merụrụ ụlọ nsọ, dị oké njọ nke na e nwere ike iji maka ha maa ya ikpe ọnwụ.

11, 12. Olee otú Pọl si gosi na ebubo niile e boro ya abụghị eziokwu?

11 E nyeziri Pọl ohere ka o kwuo okwu. Ihe o kwuru mgbe ọ na-amalite okwu ya bụ: ‘Obi dị m ụtọ ugbu a ịzara ọnụ m n’ihu gị.’ O kwuru na ebubo niile e boro ya abụghị eziokwu. Onyeozi a emerụghị ụlọ nsọ, o nweghịkwanụ mgbe o mere ka ndị mmadụ megidewe ọchịchị. O kwuru na ya anọghị na Jeruselem kemgbe “ọtụtụ afọ” nakwa na ya bu ‘onyinye a ga-eji nyere ndị obodo ya aka’ bịa, ya bụ, onyinye ndị a tụkọtaara Ndị Kraịst ndị ọ ga-abụ na ụnwụ nri na mkpagbu mere ka ha daa ogbenye. Pọl kwuru na tupu ya abanye n’ụlọ nsọ, na ya ‘asachaala onwe ya otú iwu kwuru’ nakwa na ya ‘na-agbasi mbọ ike mgbe niile ka akọnuche ya ghara ịma ya ikpe, ka ọ ghara imebi iwu Chineke ma ọ bụ iwu mmadụ.’​—Ọrụ 24:10-13, 16-18.

12 Ma, Pọl kwetara na ya “na-eso ụzọ ahụ ha na-akpọ òtù” nakwa na ọ bụ otú o si na-efe Chineke nna nna ya hà. Mana, o kwusiri okwu ike na ya kweere “ihe niile Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma kwuru,” kwerekwa na Chineke “ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ” otú ndị na-ebo ya ebubo kweere. Pọl gwaziri ndị ahụ na-ebo ya ebubo ka ha kwuo ihe mere ha ji na-ebo ya ebubo. Ọ sịrị: “Ka ndị nọ ebe a kwuo ihe ọjọọ ndị Sanhedrin chọpụtara m mere mgbe ha na-ekpe m ikpe. Naanị ihe ha ga-asị na m mere bụ na m kwuru, sị: ‘A na-ekpe m ikpe taa maka na m kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.’”​—Ọrụ 24:14, 15, 20, 21.

13-15. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ka Pọl ma a bịa n’iji obi ike agba àmà n’ihu ndị ọchịchị?

13 Anyị kwesịrị ime ka Pọl ma ọ bụrụ na a kpọpụrụ anyị n’ihu ndị ọchịchị n’ihi ofufe anyị ma bo anyị ebubo na anyị na-akpata ọgba aghara, na-eme ka ndị mmadụ na-emegide ọchịchị ma ọ bụ sị na anyị nọ ‘n’òtù ọjọọ.’ Pọl etoweghị gọvanọ iji zụrụ ụtọ otú Tetọlọs mere. Pọl nọ nwayọọ nakwa otú gosiri na ọ na-akwanyere gọvanọ ùgwù. O ji akọ kwuo ihe bụ́ eziokwu otú doro anya. Pọl sịrị na “ndị Juu si ná mpaghara Eshia,” ndị boro ya ebubo na o merụrụ ụlọ nsọ, anọghị ebe a a na-ekpe ya ikpe, nakwa na iwu kwuru na ha kwesịrị ịnọ n’ihu ya kwuo ihe o mere.​—Ọrụ 24:18, 19.

14 Nke kachanụ bụ na e nweghị mgbe Pọl kwụsịrị ikwu ihe ndị o kweere. Onyeozi a ji obi ike kwughachi na ya kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’agbanyeghị na ihe a o kwuru kpataburu ọgba aghara mgbe ọ nọ n’ihu Sanhedrin. (Ọrụ 23:6-10) Mgbe Pọl na-azara ọnụ ya, o kwusiri okwu ike banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Pọl na-ekwusa banyere Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya. Ndị na-emegide ya achọghịkwanụ iji ntị anụ ihe a. (Ọrụ 26:6-8, 22, 23) N’eziokwu, ọ bụ mbilite n’ọnwụ bụ isi ihe na-ese okwu, karịchaa, ikwere na Jizọs nakwa ikwere na a kpọlitere ya n’ọnwụ.

15 Anyị ga-ejilikwa obi ike na-ekwusa ozi ọma ka Pọl. Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya nwekwara ike ịgba anyị ume. Ọ sịrị ha: “Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m. Ma, ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” Ànyị kwesịrị ichegbu onwe anyị maka ihe anyị ga-ekwu? Mba, n’ihi na Jizọs kwere anyị nkwa, sị: “Mgbe ha kpụ unu na-aga n’ụlọikpe, unu ebula ụzọ na-echegbu onwe unu maka ihe unu ga-ekwu. Kama kwuonụ ihe ọ bụla a ga-agwa unu kwuo n’oge ahụ, n’ihi na ọ bụghị unu na-ekwu, kama ọ bụ mmụọ nsọ na-ekwu.”​—Mak 13:9-13.

“Feliks Tụwara Ụjọ” (Ọrụ 24:22-27)

16, 17. (a) Olee otú Feliks si kpee ikpe Pọl? (b) Ọ̀ ga-abụ gịnị mere Feliks ji tụwa ụjọ, ma gịnị mere o ji hụ Pọl ugboro ugboro?

16 Ihe a abụghị nke mbụ Gọvanọ Feliks na-anụ banyere ihe Ndị Kraịst kweere. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi sịrị: “Ebe Feliks ma nke bụ́ eziokwu gbasara Ụzọ Onyenwe anyị [ya bụ, Ndị Kraịst oge mbụ], o yigharịrị ikpe ha wee sị: ‘M ga-ekpebi okwu a mgbe ọ bụla ọchịagha Laịsias bịara.’ Ọ gwakwara onyeisi ndị agha ahụ ka ọ kpọchie Pọl, ma, ka ọ hapụ ya ka ọ na-eme ihe ụfọdụ ọ chọrọ ime, nakwa ka o kwe ka ndị enyi ya na-abịa enyere ya aka.”​—Ọrụ 24:22, 23.

17 Mgbe abalị ole na ole gara, Feliks na Drusila nwunye ya, bụ́ onye Juu, ziri ozi ka a kpọọ Pọl. “O gere ya ntị ka ọ na-agwa ya gbasara mmadụ ikwere na Kraịst Jizọs.” (Ọrụ 24:24) Ma, mgbe Pọl kwuru gbasara “mmadụ ime ezi omume na ijide onwe ya nakwa ikpe a ga-ekpe ndị mmadụ n’ọdịnihu, Feliks tụwara ụjọ.” Ọ ga-abụ na ihe ndị a Pọl kwuru mere ka obi mawa ya ikpe n’ihi ihe ọjọọ ndị o merela. N’ihi ya, ọ sịrị Pọl: “Ka gawagodị. M ga-ezi ozi ka a kpọọ gị ọzọ ma m nweta ohere.” Feliks na Pọl mechara hụ ọtụtụ ugboro, ma ọ bụghị maka na ọ chọrọ ịmụta eziokwu, kama ọ na-atụ anya ka Pọl nye ya aka azụ.​—Ọrụ 24:25, 26.

18. Gịnị mere Pọl ji gwa Feliks na nwunye ya gbasara “mmadụ ime ezi omume na ijide onwe ya nakwa ikpe a ga-ekpe ndị mmadụ n’ọdịnihu”?

18 Gịnị mere Pọl ji gwa Feliks na nwunye ya gbasara “mmadụ ime ezi omume na ijide onwe ya nakwa ikpe a ga-ekpe ndị mmadụ n’ọdịnihu”? Cheta na ha chọrọ ịma ihe “mmadụ ikwere na Kraịst Jizọs” pụtara. Pọl makwanụ na ha na-eme omume rụrụ arụ, na-emekpọ ndị mmadụ ọnụ ma na-ekpe ikpe mkpegbu. N’ihi ya, ọ nọ na-agwa ha ihe ndị niile chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ime. Ihe Pọl kwuru gosiri ezigbo ọdịiche dị n’iwu Chineke na ụdị ndụ Feliks na nwunye ya nọ na-ebi. Ihe a o kwuru kwesịrị ime ka ha ghọta na mmadụ niile ga-aza Chineke ajụjụ banyere ihe ha na-eche, ihe ha na-ekwu, na ihe ha na-eme, nakwa na ikpe Chineke ga-ekpe ha dị mkpa karịa ikpe Feliks na-ekpe Pọl. Ka a sịkwa ihe mere Feliks ji ‘tụwa ụjọ.’

19, 20. (a) N’ozi ọma, olee otú anyị kwesịrị isi mesoo ndị o nwere ike ịdị ka hà nwere mmasị mana ya abụrụ na ha na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru? (b) Olee otú anyị si mara na Feliks abụghị enyi Pọl?

19 N’ozi ọma, anyị nwere ike ịhụ ndị dị ka Feliks. Ná mmalite, o nwere ike ịdị ka hà nwere mmasị n’eziokwu dị na Baịbụl, mana, ihe ha na-achọ bụ ihe ga-abara naanị ha uru. Anyị kwesịrị ịkpachara anya mgbe anyị na-enyere ndị dị otú ahụ aka. Ma, anyị nwekwara ike ime ka Pọl, jiri akọ gwa ha ihe Chineke chọrọ ka ha mee. Eziokwu si na Baịbụl nwere ike iru ha n’obi. Ma, ọ bụrụ na o doo anyị anya na ha achọghị ịhapụ ihe ọjọọ ha na-eme, anyị ga-ahapụ ha chọwa ndị chọrọ ịmụta eziokwu.

20 Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi mere ka a mata ihe dị Feliks n’obi. Ọ sịrị: “Mgbe afọ abụọ gachara, Pọshiọs Festọs nọchiri Feliks. Ma, Feliks hapụrụ Pọl n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ọ chọrọ ịzụrụ ụtọ ndị Juu.” (Ọrụ 24:27) N’eziokwu, Feliks abụghị enyi Pọl. Feliks ma na ndị na-eso “Ụzọ Onyenwe anyị” anaghị emegide ọchịchị ma ọ bụ na-agba ya mgba okpuru. (Ọrụ 19:23) Ọ makwa na e nweghị iwu ndị Rom Pọl mebiri. N’agbanyeghị ya, Feliks hapụrụ Pọl n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ọ chọrọ “ịzụrụ ụtọ ndị Juu.”

21. Gịnị mere Pọl mgbe Pọshiọs Festọs ghọrọ gọvanọ, ọ̀ ga-abụkwa gịnị gbara Pọl ume?

21 Ọrụ Ndịozi 24:27 gosiri na Pọl ka nọ n’ụlọ mkpọrọ mgbe Pọshiọs Festọs ghọrọ gọvanọ nọchie Feliks. Ọ bụ otú a ka e si malite ịkpọpụta Pọl n’ihu ndị ọchịchị dị iche iche ka ọ zara ọnụ ya. N’eziokwu, a kpụgara onyeozi a nwere obi ike “n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ.” (Luk 21:12) Anyị ga-achọpụta na ọ ga-emecha zie onye ọchịchị kacha ike e nwere n’oge ahụ ozi ọma. N’oge niile ahụ, okwukwe Pọl siri ezigbo ike. O doro anya na ihe Jizọs kwuru gbara ya ume, ya bụ, “obi sie gị ike.”

a Gụọ igbe bụ́ “ Feliks Bụ Gọvanọ Judia.”

b Tetọlọs kelere Feliks maka na o “meela ka udo dịrị n’obodo” ha. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na e wepụ n’oge ndị Juu nupụụrụ Rom isi, udo adịchaghị na Judia n’oge Feliks bụ gọvanọ otú ọ dị n’oge gọvanọ ndị ọzọ chịrị Judia. Ihe ọzọ na-abụghị eziokwu o kwuru bụ na ndị Juu “na-ekele” Feliks maka na otú dị mma o si achị emeela ka ha na-enwe ọganihu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị Juu kpọrọ Feliks asị n’ihi na o mekpọrọ ha ọnụ, jirikwa obi ọjọọ taa ha ahụhụ mgbe ha nupụrụ isi.​—Ọrụ 24:2, 3.