Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 26

“O Nweghị Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”

“O Nweghị Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”

Pọl nọ na ya kpuru. O gosiri na okwukwe ya siri ezigbo ike nakwa na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya

O Si n’Ọrụ Ndịozi 27:1–28:10

1, 2. Olee ụdị njem Pọl na-aga ime, oleekwa ụfọdụ ihe nwere ike ịna-echegbu ya?

 GỌVANỌ Festọs gwara Pọl, sị: “Ọ bụ Siza ga-ekpe ya.” Ọ ga-abụ na Pọl nọ na-eche ihe ga-eme ya mgbe ọ ga-aga ịhụ Siza. Pọl anọọla afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ. N’ihi ya, ma ó nweghị ihe ọzọ, njem ahụ dị anya ọ ga-eme iji ruo Rom ga-adịtụ ya iche n’ahụ́ karịa ịnọ otu ebe. (Ọrụ 25:12) Ma, Pọl esorola ụgbọ mmiri gaa njem ọtụtụ ugboro, ọ bụghịkwa ha niile gara nke ọma. Ọ ga-abụkwa na ọ na-echegbu onwe ya na nke ugbu a o ji ụgbọ mmiri na-aga ịhụ Siza.

2 Pọl ‘ahụsiela anya’ ọtụtụ ugboro n’osimiri. Ụgbọ ọ nọ na ya ekpuola ugboro atọ, ya anọọkwa n’ime oké osimiri otu ụbọchị, ehihie na abalị. (2 Kọr. 11:25, 26) Ihe ọzọ bụ na njem nke ugbu a agaghị adị ka ndị nke ahụ ọ gara n’oge o nweere onwe ya ọ gara kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ. Pọl bụ onye mkpọrọ ugbu a, ebe ọ na-aga dịkwa ezigbo anya. Ọ ga-aga ihe karịrị puku kilomita atọ (3,000), si na Sizaria ruo Rom. Njem a ọ̀ ga-aga siriri werere? Ọ bụrụgodị na ọ ga-aga siriri werere, à ga-ama ya ikpe ọnwụ ma o ruo Rom? Cheta na ọ bụ ọchịchị kacha ike n’ụwa Setan n’oge ahụ na-aga ikpe ya ikpe.

3. Gịnị ka Pọl kpebisiri ike ime, gịnịkwa ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Ugbu a ị gụrụla ọtụtụ ihe e kwuru banyere Pọl, ì chere na ike ụwa agwụla ya n’ihi ihe ndị nwere ike ime ya? Mbanụ! Ọ ma na nsogbu ga-abịara ya, ma ọ maghị kpọmkwem ụdị nsogbu ọ ga-abụ. Gịnị mere ọ ga-eji kwe ka nchegbu maka ihe ọ na-agaghị egbochili mee ka ọ gharazie inwe ọṅụ n’ozi ya? (Mat. 6:27, 34) Pọl ma na Jehova chọrọ ka o jiri ohere ọ bụla o nwere na-ezi ndị mmadụ, ma ndị ọchịchị, ozi ọma Alaeze Chineke. (Ọrụ 9:15) Pọl kpebisiri ike ịrụzu ọrụ a e nyere ya, ihe ọ sọkwara ya mee. Ọ́ bụghị ihe anyịnwa kpebisikwara ike ime? N’ihi ya, ka anyị leba anya na njem a pụrụ iche Pọl mere ma chọpụta otú anyị ga-esi rite uru n’àgwà ọma ọ kpara.

‘Ifufe Nọ Na-enye Anyị Nsogbu’ (Ọrụ 27:1-7a)

4. Olee ụdị ụgbọ mmiri Pọl ji malite njem ya, oleekwa ndị ya na ha so?

4 A kpọọrọ Pọl na ụfọdụ ndị mkpọrọ ndị ọzọ kpọnye otu ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Juliọs. Onyeisi ndị agha a kpebiri ịkpọrọ ha niile banye n’otu ụgbọ mmiri na-ebu ngwá ahịa nke kwụsịrị na Sizaria. Ụgbọ ahụ si n’ọdụ ụgbọ mmiri Adramitiọm, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ ụsọ oké osimiri Eshia Maịnọ, ná mpaghara obodo Mitilini nke dị n’agwaetiti Lesbos. Ụgbọ mmiri ahụ ga-agawa ebe ugwu, si ebe ahụ gawa ebe ọdịda anyanwụ. Ọ ga na-akwụsị n’ebe dị iche iche ibupụ ibu na iburu ibu. A naghị arụ ụdị ụgbọ mmiri a maka ibu ndị njem, ma ya fọdụzie ibu ndị mkpọrọ. (Gụọ igbe bụ́ “ Otú E Si Eji Ụgbọ Mmiri Eme Njem ma Na-aga Ahịa.”) Ọ dị mma na ọ bụghị naanị Pọl bụ Onye Kraịst ha na ndị omempụ nọ n’ụgbọ mmiri ahụ. Ọ́ dịkarịa ala, ụmụnna ya abụọ so ya. Ha bụ Arịstakọs na Luk. Ọ bụkwa Luk dere akụkọ a n’Ọrụ Ndịozi. Anyị amaghị ma ọ̀ bụ ezigbo ndị enyi Pọl a kwụụrụ onwe ha ụgwọ njem ahụ, ka à hapụrụ ha ka ha ghara ịkwụ ụgwọ maka na ha mere ka hà bụ ndị na-ejere Pọl ozi.​—Ọrụ 27:1, 2.

5. Olee ndị ha na Pọl nọrọ na Saịdọn, oleekwa ihe anyị ga-amụta na ya?

5 Mgbe ụgbọ mmiri ahụ gbachara ihe dị ka otu narị kilomita na iri (110) n’ebe ugwu n’otu ụbọchị, ọ kwụsịrị na Saịdọn, n’ụsọ oké osimiri dị na Siria. O doro anya na Juliọs emesoghị Pọl ka onye omekome. O nwere ike ịbụ maka na Pọl bụ nwa amaala Rom, a mabeghịkwa ya ikpe. (Ọrụ 22:27, 28; 26:31, 32) Juliọs hapụrụ Pọl ka ọ banye n’obodo hụ Ndị Kraịst ibe ya. Ọ ga-abụrịrị na obi dị ụmụnna ndị ahụ ụtọ ilekọta onyeozi ahụ ugbu a ọ nọcharala ogologo oge n’ụlọ mkpọrọ. Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka i chee banyere oge i nwere ike iji lee ndị ọzọ ọbịa otú a, nke ga-eme ka a gbaa gị ezigbo ume?​—Ọrụ 27:3.

6-8. Olee otú njem Pọl si gaa malite na Saịdọn ruo Kinaịdọs, oleekwa ohere ndị ọ ga-abụ na Pọl ji zie ndị mmadụ ozi ọma?

6 Ụgbọ mmiri ahụ hapụrụ Saịdọn gbagowe n’oké osimiri ahụ ma gafee Silishia, nke dị nso n’obodo Pọl, bụ́ Tasọs. Luk ekwughị ebe ndị ọzọ ha kwụsịtụrụ, ma o kwuru nsogbu ha mechara nwee, nke bụ́ na ‘ifufe nọ na-enye ha nsogbu.’ (Ọrụ 27:4, 5) N’agbanyeghị ya, anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ ka Pọl ji ohere ọ bụla o nwere na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’eziokwu, o ziri ndị mkpọrọ ibe ya na ndị ọzọ nọ n’ụgbọ mmiri ahụ ozi ọma, ma ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ ma ndị agha ma ndị ọ hụrụ n’ebe ọ bụla ụgbọ ahụ kwụsịtụrụ. Taa, ànyị na-eji ohere ndị anyị nwere ezi ndị ọzọ ozi ọma ka Pọl?

7 Ụgbọ mmiri ahụ mechara ruo Maịra, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri dị n’ụsọ oké osimiri dị n’ebe ndịda Eshia Maịnọ. N’ebe ahụ, Pọl na ndị ọzọ banyere n’ụgbọ ọzọ ga-ebu ha ruo Rom, bụ́ ebe ha na-aga. (Ọrụ 27:6) N’oge ahụ, ọ bụ n’Ijipt ka a na-esikarị ebubata ọka na Rom. Ụgbọ mmiri ndị si Ijipt, bụ́ ndị bu ọka, na-akwụsịkwa na Maịra. Juliọs chọtara otu n’ime ụgbọ mmiri ahụ ma gwa ndị agha na ndị mkpọrọ ahụ ka ha banye na ya. Ọ ga-abụrịrị na ụgbọ mmiri a buru ezigbo ibu karịa nke mbụ ahụ. O bu ọka wit buru ezigbo ibu nakwa narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii (276), ya bụ, ndị na-akwọ ya, ndị agha, na ndị mkpọrọ. Ọ ga-abụkwa na ndị ọzọ na-aga Rom so ha. O doro anya na ụgbọ mmiri a ha banyere mere ka Pọl hụ ọtụtụ ndị ọzọ ọ ga-ezi ozi ọma. Anyị makwa na o ji ohere ahụ zie ha ozi ọma.

8 Ebe ọzọ ha kwụsịrị bụ Kinaịdọs, nke dị n’ebe ndịda Eshia Maịnọ. Ọ bụrụ na ifufe enyeghị nsogbu, ụgbọ mmiri nwere ike isi Maịra rute ebe a n’ihe dị ka otu ụbọchị. Ma, Luk kọrọ, sị: “Ụgbọ mmiri ahụ bu anyị nọ na-aga nwayọọ nwayọọ, ma, anyị mechara ruo Kinaịdọs ka ọtụtụ ụbọchị gachara.” (Ọrụ 27:7a) Ịkwọ ụgbọ mmiri ahụ nyere ha ezigbo nsogbu. (Gụọ igbe bụ́ “ Ifufe Na-enye Ụgbọ Mmiri Nsogbu n’Oké Osimiri Mediterenian.”) Chegodị otú imi na anya dị ndị nọ n’ụgbọ ahụ ka ha na oké ifufe na ebili mmiri na-alụ.

“Oké Ifufe Ahụ Nọ Na-aṅagharịsi Ụgbọ Anyị Ike” (Ọrụ 27:7b-26)

9, 10. Olee nsogbu ha nwere gburugburu agwaetiti Krit?

9 Onyeisi ụgbọ mmiri ahụ bu n’obi isi Kinaịdọs kwọrọ ụgbọ ahụ gawa n’ebe ọdịda anyanwụ. Ma Luk, onye nọ mgbe ihe ahụ mere, sịrị: “Ifufe ekweghị anyị na-aga ebe anyị chọrọ ịga.” (Ọrụ 27:7b) Mgbe ụgbọ mmiri ahụ si n’akụkụ osimiri ahụ kwọpụ, oké ifufe ọjọọ nke si n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ eburuzie ya gawa ebe ndịda. Ọ ga-abụkwa na o bu ya na-efe oké ọsọ. Otú ahụ agwaetiti Saịprọs si mee ka ifufe kwụsị inye ha nsogbu n’oge mbụ, ka agwaetiti Krit sikwa mee ka ifufe kwụsị inye ha nsogbu na nke ugbu a. Ozugbo ụgbọ ahụ gafere ugwu Salmoni, nke dị ná ngwụcha ebe ọwụwa anyanwụ Krit, nsogbu ha kwụsịtụrụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ụgbọ ahụ rutere n’akụkụ ebe ndịda agwaetiti ahụ, bụ́ ebe ifufe ahụ na-anaghị efesi ike. Chegodị otú obi si ruo ndị nọ n’ụgbọ ahụ ala ozugbo. Ma ebe ụgbọ ahụ ka nọ n’oké osimiri, ndị na-akwọ ya ma na agwọ ka nọ n’akịrịka n’ihi na oge oyi eruwela. Obi eruchabeghị ha ala.

10 Luk kwuru ihe merenụ, sị: “Ka anyị jisikwara ike kwọrọ ụgbọ na-aga, anyị bịaruru ebe a na-akpọ Ọdụ Ụgbọ Mmiri Ọma.” N’agbanyeghị na ala dị ha nso, o siiri ha ike ịkwọ ụgbọ ahụ. N’ikpeazụ, ha ruru ebe ha ga-enwe ike iji nko e ji ejide ụgbọ mmiri kwụsị ụgbọ ahụ. Ha chere na ebe ahụ dị nso n’ebe oké osimiri ahụ si gawa n’ebe ugwu. Abalị ole ka ha nọrọ ebe ahụ? Luk kwuru na ‘ọtụtụ ụbọchị gara,’ ma oge fọọrọ ha ebughịzi ibu. N’ọnwa Septemba na Ọktoba, njem ụgbọ mmiri na-aka adị ize ndụ.​—Ọrụ 27:8, 9.

11. Olee ihe Pọl gwara ndị ha na ya nọ n’ụgbọ mmiri, ma gịnị ka ha kpebiri ime?

11 O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị nọ n’ụgbọ ahụ jụrụ Pọl ihe ha ga-eme ebe ọ bụ na o meela njem ọtụtụ ugboro n’oké osimiri Mediterenian ahụ. Ọ gwara ha ka ha ghara ịkwọrọ ụgbọ ahụ gawa. Ọ sịrị na ọ bụrụ na ha akwọrọ ya gawa, ‘ụgbọ ha ga-ekpu, ihe niile ha ji ga-ala n’iyi,’ ha nwekwara ike ịnwụ. Ma, ọkwọ ụgbọ ahụ na onye nwe ụgbọ ahụ chọrọ ka ha gawa agawa. Ọ ga-abụ na ha chere na ha mee ngwa ngwa, ha ga-enweta ebe ga-akatụrụ ha mma. Ha mere ka Juliọs kweta ka ha gawa, ọtụtụ n’ime ha chekwara na ha kwesịrị ịgbalị ruo Finiks, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri ka dị anya n’ụsọ oké osimiri ahụ. Ọ ga-abụ na ha chere na ọ ga-akara ha mma ịnọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ maka na ọ ka buo ibu, kakwa mma. N’ihi ya, mgbe ifufe si n’ebe ndịda fewere nwayọọ nwayọọ ka à ga-asị na ọ bụ ifufe na-agaghị enye ụgbọ mmiri nsogbu, ha kwọọrọ ụgbọ mmiri ahụ gawa.​—Ọrụ 27:10-13.

12. Olee nsogbu ụgbọ mmiri ahụ nwere mgbe ọ hapụchara Krit, oleekwa otú ndị na-akwọ ya si gbalịa ka ụgbọ mmiri ha ghara ịkpọka?

12 Ma, nsogbu ha kara njọ. “Oké ifufe” nke si n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ malitere ife. Obere oge o bidoro ife, ha ruru “n’otu obere agwaetiti a na-akpọ Kọda” bụ́ ebe ifufe ahụ kwụsịtụrụ inye ha nsogbu. Isi n’Ọdụ Ụgbọ Mmiri Ọma rute Kọda dị ihe dị ka kilomita iri isii na ise. Ma, ifufe ahụ ka nwere ike iburu ụgbọ ahụ gawa n’ebe ndịda ruo mgbe ọ ga-akpọka ná mkputamkpu ájá dị n’ụsọ oké osimiri Afrika. Ka ihe a ghara ime ha, ndị na-akwọ ụgbọ ahụ mewere ngwa ngwa ka ha bubata ụgbọ epeepe ụgbọ mmiri ahụ na-adọkpụ. Ma, ibubata ya siiri ha ezigbo ike n’ihi na ọ dị ka mmiri ò jula ụgbọ epeepe ahụ. Ha jisiri ike jiri eriri ma ọ bụ ụdọ ígwè kee nnukwu ụgbọ ahụ iji jidesie osisi ndị e ji rụọ ya ike. Ha tọturu ihe e ji eduzi ụgbọ mmiri ahụ, ákwà ya ma ọ bụ eriri e ji kegide ya, ma gbalịsie ike na-akwọ ụgbọ ahụ ka ha gafere oké ifufe ahụ. Chegodị ụdị ụjọ ga na-atụ ha mgbe ahụ. Ma, mbọ niile a ha gbara kụrụ afọ n’ala n’ihi na ‘oké ifufe ahụ nọ na-aṅagharịsi ụgbọ ha ike.’ N’ụbọchị nke atọ, ha tụfusịrị ihe e ji arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ahụ. Ọ ga-abụ na ha mere ihe a ka ụgbọ ha dị fere fere.​—Ọrụ 27:14-19.

13. Olee otú imi na anya dị ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ Pọl nọ na ya n’oge ahụ oké ifufe na-enye ha nsogbu?

13 Ọ ga-abụrịrị na ezigbo ụjọ ji ndị niile nọ n’ụgbọ ahụ. Ma, obi siri Pọl na ndị enyi ya ike. Onyenwe anyị ebula zụọ gwa Pọl na ọ ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma na Rom. Otu mmụọ ozi mechakwara mee ka obi sikwuo ya ike na nkwa e kwere ya ga-emezu. (Ọrụ 19:21; 23:11) Ma, oké ifufe ahụ ka nọ na-enye ha nsogbu ehihie na abalị ruo izu abụọ. Mmiri ahụ na-ezonụ n’akwụsịghị akwụsị na ígwé ojii gbachiri ebe niile mere ka ha ghara ịhụ anyanwụ na kpakpando. Ihe a mere ka onye na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ ghara ịmata ebe ụgbọ mmiri ahụ nọ ma ọ bụ ebe ọ na-aga. Ha enwedịghị ike iri nri. Oleekwanụ otú mmadụ ga-esi chewe echiche iri ihe oriri ebe ọ bụ na oyi na-atụ, mmiri ana-ezo, ahụ́ aghasaala ha niile, ụjọ ana-atụkwa ha?

14, 15. (a) Mgbe Pọl na-agwa ndị ha na ya nọ n’ụgbọ mmiri okwu, gịnị mere o ji kwute banyere aka ná ntị ọ dọburu ha? (b) Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ozi Pọl ziri ha nke mere ka ha nwee olileanya?

14 Pọl guzoro ọtọ. O chetaara ha ihe ọ gwaburu ha. Ma, o kwughị ya ka à ga-asị na ọ na-asị ha, ‘Ọ̀ kwa m gwara unu agwa?’ Kama, ihe niile merenụ egosila na ha kwesịrị ige ya ntị. Ọ gwaziri ha, sị: “Obi sie unu ike, n’ihi na o nweghị onye ọ bụla n’ime unu ga-ala n’iyi, naanị ụgbọ a ga-ala n’iyi.” (Ọrụ 27:21, 22) Ọ ga-abụrịrị na ihe a o kwuru kasiri ndị ọ gwara ya obi. Ọ ga-abụ na obi tọrọ Pọl ezigbo ụtọ na Jehova ziri ya ozi a mere ka ya na ndị nọ n’ụgbọ ahụ nwee olileanya. Anyị kwesịrị ịna-echeta na ihe gbasara mmadụ ọ bụla dị ndụ na-emetụ Jehova n’obi. O ji onye nke ọ bụla kpọrọ ihe. Pita onyeozi dere, sị: “O nweghị onye [Jehova] chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ngwa ngwa ugbu a hụ na anyị ziri ọtụtụ ndị ozi si n’aka Jehova nke na-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya. Ndụ ndị mmadụ nke Jehova ji kpọrọ ihe nọ n’ihe ize ndụ.

15 Ọ ga-abụ na Pọl nọ na-ezi ọtụtụ ndị nọ n’ụgbọ ahụ ozi ọma banyere “olileanya na nkwa Chineke kwere.” (Ọrụ 26:6; Kọl. 1:5) Ugbu a ọ dị ka ụgbọ ahụ ọ̀ ga-ekpu, Pọl gwara ha ezigbo ihe mere ha ga-eji nwee olileanya n’agbanyeghị nsogbu. Ọ sịrị ha: “N’abalị ụnyaahụ, Chineke, onye m bụ nke ya . . . guzoro m nso, sị: ‘Pọl, ụjọ atụla gị. Gị na Siza ga-ahụ. Chineke ga-azọpụta gị na ndị niile gị na ha nọ n’ụgbọ mmiri a.’” Pọl gbara ha ume, sị: “N’ihi ya, obi sie unu ike maka na ekwere m na Chineke ga-eme ihe a mmụọ ozi gwara m. Ma, ụgbọ anyị ga-akpọkasị, anyịnwa apụta n’ikpere mmiri n’otu agwaetiti.”​—Ọrụ 27:23-26.

‘Mmadụ Niile Pụtara n’Elu Ala n’Enweghị Ihe Mere Ha’ (Ọrụ 27:27-44)

‘O kelere Chineke n’ihu ha niile.’​—Ọrụ 27:35

16, 17. (a) Olee mgbe Pọl kpere ekpere, oleekwa uru ekpere ya bara? (b) Olee otú ihe Pọl dọrọ ha aka ná ntị ya si mezuo?

16 Mgbe ha tachara ahụhụ izu abụọ, ifufe eburukwa ụgbọ ha gaa ihe dị ka narị kilomita asatọ na iri asaa (870), ndị na-akwọ ụgbọ ahụ chọpụtara na ihe agbanwetụla. Ọ ga-abụ na ha nụrụ ụda mmiri na-asọrute n’ikpere mmiri. Ha si n’azụ ụgbọ ahụ tụda nko ndị e ji ejide ụgbọ mmiri, ka mmiri ghara iburu ụgbọ ahụ gawa nakwa ka ha nwee ike iche ụgbọ ahụ ihu n’elu ala, ka ha mara ma hà ga-eru n’ụsọ osimiri ahụ. N’oge ahụ, ha chọrọ isi n’ụgbọ ahụ pụọ, ma ndị agha ahụ ekweghị ha. Pọl gwara onyeisi ndị agha ahụ na ndị agha ya, sị: “Ọ bụrụ na ndị a esi n’ụgbọ a pụọ, a gaghị azọpụta unu.” Mgbe ụgbọ ahụ kwụsịtụrụ ịṅagharị aṅagharị, Pọl gbara ha niile ume ka ha ritụ nri, mee ka obi sie ha ike ọzọ na o nweghị onye ga-anwụ. O ‘kelere Chineke n’ihu ha niile.’ (Ọrụ 27:31, 35) N’ekpere ahụ o kpere iji kelee Chineke, o gosiri Luk, Arịstakọs, na Ndị Kraịst taa ihe ha kwesịrị ịna-eme. Ekpere ị na-ekpe n’ihu ọha ọ̀ na-agba ndị ọzọ ume ma na-akasi ha obi?

17 Ekpere ahụ Pọl kpere “mesiri ha obi ike, ha amalitekwa iri ihe.” (Ọrụ 27:36) Ha tụbara ọka wit ụgbọ ahụ bu na mmiri ahụ ka ụgbọ ha dịtụkwuo fere fere, ka o nwee ike ise n’elu mmiri ka ha na-erute n’ụsọ osimiri ahụ. Mgbe chi bọrọ, ndị na-akwọ ụgbọ ahụ gbubiri nko ndị e ji ejide ụgbọ mmiri ahụ, tọpụ ụdọ e ji kegide ụmara ndị dị n’azụ ụgbọ ahụ, dọlitekwa obere ákwà dị n’ihu ụgbọ ka ha nwee ike ịkwọrọ ụgbọ ahụ gaa n’ebe ọ ga-akwụsị n’ikpere osimiri ahụ. Ma, ihu ụgbọ ahụ tọrọ. O nwere ike ịbụ n’ájá ma ọ bụ n’apịtị dị n’ụsọ osimiri ahụ ka ọ tọrọ. Ebili mmiri malitekwara ịkụrisị azụ ụgbọ ahụ. Ụfọdụ n’ime ndị agha chọziri igbu ndị mkpọrọ ahụ ka a ghara inwe onye ga-agba ọsọ n’ime ha, ma Juliọs gbochiri ha ime otú ahụ. Ọ gwara ha niile ka ha gwuru mmiri ma ọ bụ jide ibé osisi aka ruo n’ikpere mmiri ahụ. Ihe Pọl kwuru mezuru. Ọkọ akọghị otu n’ime narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii (276) ahụ. N’eziokwu, ‘mmadụ niile pụtara n’elu ala n’enweghị ihe mere ha.’ Ma, olee ebe ha nọzi?​—Ọrụ 27:44.

“Ihe Ọma Pụrụ Iche” (Ọrụ 28:1-10)

18-20. Olee otú ndị Mọlta si meere ndị ahụ “ihe ọma pụrụ iche,” oleekwa ọrụ ebube Chineke si n’aka Pọl rụọ?

18 Ọ dabara na ọ bụ n’agwaetiti Mọlta, nke dị n’ebe ndịda Sisili, ka ndị ahụ si n’ụgbọ ahụ nọ. (Gụọ igbe dị na peeji nke 209 bụ́ “ Olee Ebe Mọlta Dị?”) Ndị bi n’agwaetiti a, bụ́ ndị na-asụ asụsụ ọzọ, meere ha “ihe ọma pụrụ iche.” (Ọrụ 28:2) Ha kwanyeere ndị ahụ ha na-amaghị ndị ha bụ ọkụ n’ihi na uwe ha edechaala mmiri, oyi na-atụkwa ha. Ọkụ ahụ mere ka ahụ́ kporo ha ọkụ n’agbanyeghị na oyi na-atụ, mmiri ana-ezokwa. Pọl rụkwara ọrụ ebube.

19 Pọl chọrọ inyere ndị ibe ya aka. N’ihi ya, ọ kpatara nkụ tinye n’ọkụ ahụ. Ozugbo ahụ, otu ajụala si ná nkụ ahụ pụta ma taa Pọl, gbakụọkwa ya n’aka. Ndị Mọlta chere na ihe ahụ bụ otú chi ha si na-ata Pọl ahụhụ. a

20 Mgbe ndị bi n’ebe ahụ hụrụ na agwọ ahụ ataala Pọl, ha chere na “aka ya ga-aza.” Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “aka ya ga-aza” bụ “otú ndị na-agwọ ọrịa si ekwu ya.” O jughị anyị anya na “Luk, onye anyị hụrụ n’anya, onye na-agwọ ọrịa,” chetara okwu ahụ. (Ọrụ 28:6; Kọl. 4:14) Ma, Pọl febara agwọ ahụ n’ọkụ, e nweghịkwa ihe mere ya.

21. (a) Olee ihe ụfọdụ gosiri na Luk kpọrọ okwu aha ma ọ bụ kọwaa ihe nke ọma n’ihe o dere? (b) Olee ọrụ ebube ndị Pọl rụrụ, oleekwa ihe ndị Mọlta mere?

21 E nwere otu aka ji akụ̀ nwere ala n’ebe ahụ. Aha ya bụ Pọbliọs, o bikwa n’ebe ahụ. O nwere ike ịbụ ya ka ndị Rom mere onyeisi na Mọlta. Luk kpọrọ ya nwoke na-achị agwaetiti ahụ,” bụ́ utu aha e dere n’ihe mgbe ochie abụọ a chọtara na Mọlta. O lere Pọl na ndị ibe ya ọbịa ụbọchị atọ. Ma, ahụ́ adịghị nna Pọbliọs. Luk kọwakwara ihe na-eme nwoke a nke ọma na otú o si eme ya. O dere na o “dina ala maka na ahụ́ ọkụ ji ya, afọ na-asakwa ya, ya ana-anyụ ọbara.” Pọl kpere ekpere, bikwasị ya aka n’isi, ya agbakee. Ọrụ ebube ahụ mere ndị obodo ahụ obi ụtọ, ha akpọta ndị ọzọ na-arịa ọrịa ka Pọl gwọọ ha. Ha nyekwara Pọl na ndị ibe ya onyinye iji gboo mkpa ha.​—Ọrụ 28:7-10.

22. (a) Olee otú otu prọfesọ si jaa Luk mma maka ihe ndị ọ kọrọ gbasara otú ha si jiri ụgbọ mmiri gaa Rom? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu ọzọ?

22 Ihe ndị anyị lebarala anya Luk kọrọ banyere otú Pọl si jiri ụgbọ mmiri gaa njem bụ eziokwu doro anya. Otu prọfesọ sịrị: “N’ime ihe niile e dere na Baịbụl, ihe Luk dere . . . bụ otu n’ime ndị a kacha kọwaa nke ọma. Ihe dị iche iche ọ kpọrọ aha gbasara otú e si eji ụgbọ mmiri aga njem n’oge ahụ dabara adaba, otú o sikwa kọwaa ihe ndị na-eme n’ebe ọwụwa anyanwụ Oké Osimiri Mediterenian bụ nnọọ eziokwu” nke na ọ ga-abụrịrị na e nwere akwụkwọ o si nweta ihe ndị o dere. O nwere ike ịbụ na Luk nọ na-ede ihe ndị ahụ mgbe ya na Pọl so na-aga njem ahụ. Ya bụrụ otú ahụ, a ga-enwekwa ọtụtụ ihe ọ ga-ede ka ha na-amalitekwa njem ha. Gịnị ga-eme Pọl mgbe ha ga-emecha ruo Rom? Ka anyị chọpụta.

a Ebe ọ bụ na ndị bi n’agwaetiti ahụ ma agwọ ahụ, ọ pụtara na e nwere ajụala n’ebe ahụ n’oge ochie. N’oge anyị a, ajụala adịghị na Mọlta. Ọ ga-abụ na ihe kpatara ya bụ otú ihe sirila gbanwee n’ebe ahụ kemgbe ọtụtụ narị afọ. O nwekwara ike ịbụ maka na ọtụtụ ndị bizi n’agwaetiti a mere ka a ghara inwekwa ajụala na ya.