Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Foto Ndị Dị n’Akwụkwọ A

Foto Ndị Dị n’Akwụkwọ A

Foto ndị dị n’akwụkwọ a na peeji ha

  • Ihu na azụ ya: Pọl, Dọkas, Galio, Luk, ndịozi Jizọs na onye nche ụlọ nsọ, onye Sadusii, ebe e du Pọl na-aga Sizaria, na ebe e ji ụgbọala a rụnyere ígwè okwu na gramafon na-ezi ozi ọma.

  • Peeji nke 1 Ebe e kere Pọl agbụ ígwè, ya na Luk anọrọ n’ụgbọ mmiri na-aga Rom.

  • Peeji nke 2, na nke 3 Ebe Nwanna J. E. Barr na T. Jaracz, bụ́ ndị so n’Òtù Na-achị Isi, na-ele map ụwa.

  • Peeji nke 11 Ebe Jizọs na-enye ezigbo ndịozi ya iri na otu na ndị ọzọ na-eso ụzọ ya ọrụ n’ugwu dị na Galili.

  • Peeji nke 14 Ebe Jizọs na-agbago na mbara igwe, ndịozi ana-ele ya anya.

  • Peeji nke 20 Na Pentikọst, ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere ịgwa ndị bịara abịa okwu n’asụsụ ha.

  • Peeji nke 36 Ebe ndịozi guzo n’ihu Keyafas iwe ji. Ndị nche ụlọ nsọ nọ ebe ahụ na-eche ka ndị Sanhedrin gwa ha ndị ha ga-anwụchi.

  • Peeji nke 44 N’ala: Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, ụlọikpe dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Jamanị mara Ndịàmà Jehova ikpe na-ezighị ezi na ha bụ ndị nnyopụta si Amerịka.​—Magazin bụ́ Neue Berliner Illustrierte, October 3, 1950.

  • Peeji nke 46 Ebe a na-ebo Stivin ebubo n’ihu Sanhedrin. Ndị Sadusii bụ́ aka ji akụ̀ nọ ná mgbago, ndị Farisii na-esochi iwu anya nọ ná mgbada.

  • Peeji nke 54 Ebe Pita bikwasịrị onye ọhụrụ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs aka. Saịmọn ji akpa ego.

  • Peeji nke 75 Ebe Pita na ndị ya na ha so na-abanye n’ụlọ Kọniliọs. Kọniliọs wụkwasịrị ákwà pụrụ iche n’ubu aka ekpe ya, nke na-egosi na ọ bụ ọchịagha Rom.

  • Peeji nke 83 Ebe mmụọ ozi du Pita. Ọ ga-abụ n’Ụlọ Elu Antonia ka a tụrụ Pita mkpọrọ.

  • Peeji nke 84 N’ala: Ìgwè mmadụ ndị na-eme tigbuo zọgbuo n’ebe dị nso na Mọntriọl, Kwebek, n’afọ 1945.​—Akwụkwọ bụ́ Weekend Magazine, July 1956.

  • Peeji nke 91 A chụpụrụ Pọl na Banabas n’Antiọk dị na Pisidia. Ọwa mmiri ọhụrụ obodo ahụ dị n’azụ azụ, ọ ga-abụkwa na ọ dịbeghị oké anya a rụrụ ya.

  • Peeji nke 94 Pọl na Banabas ekweghị ka e fee ha na Listra. Ndị obodo ahụ chụwa àjà, ọ na-adị ka ebe a na-eme ememme, na-eme mkpọtụ, na-akụkwa ọtụtụ egwú.

  • Peeji nke 100 N’elu: Ebe Saịlas na Judas na-agba ọgbakọ Antiọk dị na Siria ume. (Ọrụ 15:30-32) N’ala: Ebe onye nlekọta sekit na-agwa otu ọgbakọ dị na Yuganda okwu.

  • Peeji nke 107 Ebe ọgbakọ Jeruselem zukọrọ n’ụlọ mmadụ.

  • Peeji nke 124 Ebe Pọl na Timoti nọ n’ụgbọ mmiri ndị Rom na-ebu ngwá ahịa. Ụlọ nwere nnukwu ọkụ e ji eduzi ndị na-akwọ ụgbọ mmiri dị n’ebe dị anya.

  • Peeji nke 139 Ebe Pọl na Saịlas nọ n’ebe a gbara ogige, na-agbanahụ ìgwè mmadụ iwe ji.

  • Peeji nke 155 Ebe Galio na-abara ndị na-ebo Pọl ebubo mba. Ejiji ya gosiri na ọkwá ya gbagotere. O yi uwe mwụda ọcha nwere akara na-acha pọpụl pọpụl nakwa akpụkpọ ụkwụ.

  • Peeji nke 158 Ebe Dimitriọs nọ n’ụlọ ọrụ na-eji ọlaọcha akpụ ihe n’Efesọs na-agwa ndị ọrụ okwu. A na-ere ụlọ nsọ Atemis e ji ọlaọcha kpụọ ere ka ihe e ji echeta ihe.

  • Peeji nke 171 Ebe Pọl na ndị ibe ya na-abanye n’ụgbọ mmiri. Nnukwu ụlọ a rụrụ tupu oge Ndị Kraịst, nke e ji echeta ọdụ ụgbọ mmiri, dị n’azụ azụ.

  • Peeji nke 180 N’ala: Ebe nwata nwoke bụ́ Onyeàmà Jehova na-ezobata akwụkwọ e ji amụ Baịbụl n’oge a machibidoro ọrụ anyị iwu na Kanada, n’agbata afọ 1940 ruo 1945. (E sere foto a n’oge a iji gosi ihe mere n’oge ahụ.)

  • Peeji nke 182 Pọl kwetara ime ihe ndị okenye gwara ya. Luk na Timoti nọ n’ebe ahụ na-enye aka n’ikesara ụmụnna onyinye e nyere ha.

  • Peeji nke 190 Ebe nwa nwanne Pọl na-agwa Klọdiọs Laịsias okwu n’Ụlọ Elu Antonia. O nwere ike ịbụ ebe e ji Pọl eji. Ụlọ nsọ Herọd dị n’ebe dịtụ anya.

  • Peeji nke 206 Ebe Pọl na-ekpere ndị njem ike gwụchara ekpere n’ala ụgbọ mmiri e ji ebu ngwá ahịa.

  • Peeji nke 222 Ebe Pọl na-elepụ anya n’obodo Rom. E ji agbụ ígwè e kere ya kekọta n’aka onye agha Rom.