Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 1

“Gaanụ Mee . . . Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”

“Gaanụ Mee . . . Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”

Isi ihe akwụkwọ Ọrụ Ndịozi na-ekwu na otú ha si gbasa oge anyị a

1-6. Kọọ otu n’ime akụkọ ndị gosiri ụzọ dị iche iche Ndịàmà Jehova si ezi ozi ọma.

 E NWERE otu nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà Jehova bi na Gana. Aha ya bụ Rebecca. O ji ụlọ akwụkwọ ha mere ebe ọ na-ekwusa ozi ọma. Ọ na-etinye akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’akpa akwụkwọ ya mgbe niile. N’oge ụmụ akwụkwọ ji ezurutụ ike, ọ na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ ezi ụmụ akwụkwọ ibe ya ozi ọma. Rebecca malitere ịmụrụ ọtụtụ ụmụ klas ha Baịbụl.

2 E nwere di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ bi n’obodo mmiri gbara gburugburu a na-akpọ Madagaska, nke dị nso n’ụsọ oké osimiri ebe ọwụwa anyanwụ Afrịka. N’agbanyeghị okpomọkụ a na-enwe ebe ahụ, ha na-eji ụkwụ aga ihe dị ka kilomita iri abụọ na ise iji ruo otu ime ime obodo. Ha na-amụrụ ndị nwere mmasị Baịbụl n’ebe ahụ.

3 Ndịàmà Jehova bi na Paragụwaị na ndị ọzọ si mba iri na ise ọzọ rụrụ otu ụgbọ mmiri ha ga na-eji aga ekwusara ndị bi n’akụkụ osimiri Paragụwaị na osimiri Parana ozi ọma. Mmadụ iri na abụọ nwere ike ibi ná nnukwu ụgbọ mmiri ahụ. Ụmụnna anyị ndị a na-anụ ọkụ n’obi na-eji ụgbọ mmiri a aga ekwusa ozi ọma n’ebe dị iche iche na-esi ike ịgaru.

4 N’oge okpomọkụ, ọtụtụ ndị na-esi n’obodo ndị ọzọ abịa ilegharị anya n’Alaska. Ndịàmà Jehova na-eji ohere ahụ pụrụ iche aga ekwusara ha ozi ọma. N’oge ahụ oyi na-anaghị atụ, ọ na-abụ ụgbọ mmiri buru ndị a si n’ọtụtụ mba bịa, Ndịàmà Jehova bi n’obodo ahụ na-aga chere ha n’ebe ụgbọ mmiri na-akwụsị ma nye ha ọmarịcha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ndị e dere n’asụsụ dị iche iche. N’obodo ahụ, a na-ejikwa ụgbọelu aga ekwusa ozi ọma n’ime ime obodo. Nke a emeela ka e zie ndị Aleut, Atabaskan, Chimshian, na Klinket ozi ọma.

5 E nwere Onyeàmà Jehova bi n’ebe a na-elekọta ndị ọrịa na Teksas dị n’Amerịka. Aha ya bụ Larry. O ji ebe ahụ o bi mere ebe ọ na-ezi ozi ọma. Larry anaghị emechi ọnụ n’agbanyeghị na ihe mberede mere ka ọ na-anọ n’ígwè ndị ngwọrọ. Ọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke, na-akọrọ ha olileanya Baịbụl mere ka o nwee, ya bụ, na otu ụbọchị, na ya ga-aga ije ma Alaeze Chineke bịa.​—Aịza. 35:5, 6.

6 N’obodo Mianmaa, ìgwè Ndịàmà Jehova ji ụgbọ mmiri si Mandale gaa mgbakọ n’ebe ugwu obodo ahụ. Njem ahụ were ha abalị atọ. Ebe ọ bụ na ha chọrọ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma, ha weere akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl mgbe ha na-aga, nye ha ndị ha na ha nọ n’ụgbọ ahụ. N’obodo ọ bụla ụgbọ mmiri ahụ kwụsịtụrụ, ndị ahụ ikwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi na-apụta ngwa ngwa gaa kesaara ndị bi gburugburu ebe ahụ akwụkwọ. Ka ha na-ekwusa ozi ọma, ndị ọzọ na-abata n’ụgbọ ahụ, ha ahụzie ndị ọhụrụ ha ga-ezi ozi ọma.

7. Olee ụzọ dị iche iche ndị na-efe Jehova si akọrọ ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke, gịnịkwa ka ha bu n’obi?

7 Ụmụnna ole na ole a a kọrọ akụkọ ha na-egosi na ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova n’ụwa niile ‘na-akọwa okwu gbasara Alaeze Chineke nke ọma.’ (Ọrụ 28:23) Ha na-agakwuru ndị mmadụ n’ụlọ n’ụlọ, n’okporo ámá, na-edegara ha akwụkwọ ozi, na-akpọkwa ha n’ekwentị. Ma hà nọ n’ụgbọala, n’ebe a na-atụrụ ndụ, ma ọ bụ mgbe ha na-ezurutụ ike n’ebe ha na-arụ ọrụ, ha na-eji ohere ọ bụla ha nwere akọrọ ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. N’agbanyeghị na e nwere ụzọ dị iche iche ha si ezisa ozi a, ha niile bu otu ihe n’obi, ya bụ, izi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ha hụrụ ha.​—Mat. 10:11.

8, 9. (a) Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na otú ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke si aga n’ihu n’ihu dị ka ọrụ ebube? (b) Olee ajụjụ dị mkpa a jụrụ, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime ka anyị mata azịza ya?

8 Gịnwa, onye na-agụ akwụkwọ a, ì so n’ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova ndị na-ekwusa banyere Alaeze Chineke ugbu a n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ na ise (235)? Ọ bụrụ otú ahụ, obi kwesịrị ịdị gị ụtọ na i so na-eme ka ọtụtụ ndị ọzọ nụ ozi ọma Alaeze. Ihe Ndịàmà Jehova na-arụzu n’ụwa niile dị ka ọrụ ebube. N’agbanyeghị ihe isi ike na nsogbu na-abịara ha, ma iwu ndị ọchịchị na-amachibido ọrụ ha ma mkpagbu a na-akpagbu ha, ha na-akọwara ndị mba niile okwu gbasara Alaeze Chineke nke ọma.

9 Ajụjụ dị mkpa e kwesịrị ịjụ bụ: Gịnị mere ihe isi ike na mmegide Setan na-emegide ha emebeghị ka ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze a kwụsị ịga n’ihu n’ihu? Iji zaa ajụjụ a, anyị kwesịrị ileba anya n’ihe ndị mere n’oge ndịozi. A sị ka e kwuwe, ọrụ a anyị bụ́ Ndịàmà Jehova n’oge a na-arụ malitere n’oge ahụ.

Ọrụ Dị Ezigbo Mkpa A Ga-arụ

10. Olee ọrụ Jizọs ji kpọrọ ihe, gịnịkwa ka ọ ma banyere ọrụ a?

10 Ọ bụ Jizọs Kraịst malitere ọgbakọ Ndị Kraịst. O ji ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụ ọrụ kacha mkpa ọ rụrụ n’ụwa. E nwere mgbe o kwuru, sị: “M ga-ekwusarịrị ozi ọma Alaeze Chineke n’obodo ndị ọzọ, n’ihi na ọ bụ ya mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Jizọs ma na ya na-amalite ọrụ naanị ya na-agaghị arụchali. Obere oge tupu ya anwụọ, o buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke “ná mba niile.” (Mak 13:10) Ma olee otú a ga-esi ekwusa ya, oleekwa ndị ga-ekwusa ya?

“Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Matiu 28:19

11. Olee ọrụ dị ezigbo mkpa Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa ihe ndị ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ a?

11 Mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ma nye ha ọrụ dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị ha: “N’ihi ya, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu. M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.” (Mat. 28:19, 20) Okwu ahụ bụ́ “m nọnyekwaara unu” na-egosi na Jizọs kwụ ndị na-eso ụzọ ya n’azụ n’ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Enyemaka a dị ha mkpa, n’ihi na Jizọs ebula ụzọ kwuo na ‘mba niile ga-akpọ ha asị.’ (Mat. 24:9) E nwekwara ihe ọzọ ga-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka. Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ha na mmụọ nsọ ga-eme ka ha nweta ike ha ga-eji bụrụ ndị àmà ya ruo “n’ebe kacha anya n’ụwa.”​—Ọrụ 1:8.

12. Olee ajụjụ ndị dị mkpa a jụrụ, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị mata azịza ha?

12 Ugbu a, ajụjụ ụfọdụ dị mkpa bụ: Ndịozi Jizọs na ndị ọzọ soro ụzọ Jizọs n’oge ndịozi hà ji ọrụ a e nyere ha kpọrọ ihe? Ndị Kraịst ahụ dị ole na ole hà kọwaara ndị mmadụ okwu gbasara Alaeze Chineke nke ọma, ma mgbe e ji obi ọjọọ na-akpagbu ha? È si n’eluigwe nyere ha aka n’eziokwu? È ji mmụọ nsọ Jehova nyere ha aka n’ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ? A zara ajụjụ ndị a na ndị yiri ha n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ọrụ Ndịozi. Ọ dị mkpa ka anyị mata azịza ha. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jizọs kwuru na a ga na-arụ ọrụ ahụ o kwuru ka a rụọ “ruo ọgwụgwụ oge a.” N’ihi ya, ọrụ a bụ ọrụ ezigbo Ndị Kraịst niile ga-arụ, ma anyịnwa ndị bi n’oge ikpeazụ a. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịmụ akụkọ ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi.

Ihe Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi Na-ekwu

13, 14. (a) Ònye dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, oleekwa otú onye dere ya si mata ihe ndị o dere? (b) Olee ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi?

13 Ònye dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi? Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ekwughị onye dere ya. Ma, ihe mbụ e kwuru na ya mere ka o doo anya na ọ bụ onye dere akwụkwọ Luk dere ya. (Luk 1:1-4; Ọrụ 1:1, 2) N’ihi ya, ọ dịla ezigbo anya ndị mmadụ kwetara na ọ bụ Luk dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. Luk bụ ‘onye a hụrụ n’anya, onye na-agwọ ọrịa,’ nakwa onye sara anya na mmiri dee akụkọ ihe mere eme. (Kọl. 4:14) Ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ a mere n’ime ihe dị ka afọ iri abụọ na asatọ, malite n’oge Jizọs laghachiri n’eluigwe n’afọ 33 O.N.K. ruo n’oge a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ na Rom n’ihe dị ka afọ 61 O.N.K. Ebe ọ bụ na Luk kwukatara “ha” n’akụkọ ya, kwuwezie “anyị,” o gosiri na ọ nọ mgbe ọtụtụ n’ime ihe ndị ọ kọrọ mere. (Ọrụ 16:8-10; 20:5; 27:1) Ebe ọ bụ na Luk chọrọ ide kpọmkwem ihe merenụ, ọ ga-abụ na o sikwa n’aka ndị nọ mgbe ihe ndị ọzọ o dere mere mata ihe ndị o dere. Ndị ahụ bụ Pọl, Banabas, Filip, na ndị ọzọ ọ kpọrọ aha n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi.

14 Olee ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi? N’Oziọma Luk bu ụzọ dee, o dere ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere. Ma, n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, Luk kọrọ ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs kwuru na ihe ha mere. N’ihi ya, ọ bụ ndị mere ihe mmadụ na-agaghị ejili ike nkịtị mee ka a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. Ha mere ihe ndị ahụ n’agbanyeghị na e weere ọtụtụ n’ime ha ka “ndị nkịtị na-agụghị akwụkwọ.” (Ọrụ 4:13) E kwuo ya ná nkenke, akwụkwọ a e si n’ike mmụọ nsọ dee kwuru otú ọgbakọ Ndị Kraịst si malite na otú o si mụbaa. O gosiri ụzọ dị iche iche Ndị Kraịst oge mbụ si kwusaa ozi ọma na otú ha si were ọrụ izisa ozi ọma. (Ọrụ 4:31; 5:42) Ọ kọrọ otú mmụọ nsọ si nyere ha aka n’ime ka ozi ọma ruo ebe dị iche iche. (Ọrụ 8:29, 39, 40; 13:1-3; 16:6; 18:24, 25) Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi mekwara ka isi ihe Baịbụl kwuru doo anya, ya bụ, otú Alaeze Chineke nke Kraịst bụ eze ya ga-esi eme ka e doo aha Chineke nsọ. O gosikwara otú e si kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ.​—Ọrụ 8:12; 19:8; 28:30, 31.

15. Olee uru ndị anyị ga-erite ma anyị mụọ akwụkwọ Ọrụ Ndịozi?

15 N’eziokwu, ịgụ akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ, meekwa ka okwukwe anyị sie ike. Ọ bụrụ na anyị echee gbasara obi ike na ịnụ ọkụ n’obi ndị mbụ soro ụzọ Kraịst nwere, mbọ ha gbara ga-emetụ anyị n’obi. Ọ ga-eme ka anyị ṅomie okwukwe ụmụnna anyị ndị oge mbụ ahụ. N’ihi ya, ọ ga-enyekwuru anyị aka ịrụ ọrụ e nyere anyị, ya bụ, ‘ịga mee ka ndị mmadụ bụrụ na-eso ụzọ Jizọs.’ E bipụtara akwụkwọ a ị na-agụ ugbu a ka o nyere gị aka ịsa anya na mmiri mụọ akwụkwọ Ọrụ Ndịozi.

Akwụkwọ A Ga-enyere Anyị Aka Ịmụ Baịbụl

16. Olee ihe atọ mere e ji bipụta akwụkwọ a?

16 Olee isi ihe mere e ji bipụta akwụkwọ a? Ọ dị ụzọ ihe atọ, (1) ime ka obi sikwuo anyị ike na Jehova ji mmụọ nsọ ya na-akwado ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, (2) ime ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi n’ozi ọma n’ihi ihe ndị anyị ga-amụta n’aka ndị mbụ soro ụzọ Kraịst, na (3) ime ka anyị na-akwanyekwuru nzukọ Jehova ùgwù, na-akwanyekwara ndị na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma nakwa ọgbakọ dị iche iche ùgwù.

17, 18. Olee otú e si hazie akwụkwọ a, oleekwa ihe ụfọdụ dị na ya ga-enyere gị aka mgbe ị na-amụ Baịbụl?

17 Olee otú e si hazie akwụkwọ a? Ị ga-achọpụta na o nwere nkebi asatọ. Nke ọ bụla n’ime ha nwere amaokwu ndị dị n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ọ kọwara. Isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a akọwaghị amaokwu ndị dị n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi otu otu, kama ha kọwara ihe ndị anyị ga-amụta n’akụkọ ndị a kọrọ na ha nakwa otú anyị ga-esi eme ihe anyị mụtara eme. Ná mmalite isiokwu ọ bụla, e dere isi ihe a ga-eleba anya na ya nakwa amaokwu ndị a ga-atụle n’Ọrụ Ndịozi.

18 E nwere ihe ndị ọzọ dị n’akwụkwọ a ga-enyere gị aka mgbe ị na-amụ Baịbụl. Ọmarịcha foto ndị e sere na ya, ndị na-egosi ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, ga-enyere gị aka iji uche gị na-ahụ ihe ndị ahụ mgbe ị na-echebara ha echiche. N’ọtụtụ isiokwu dị n’akwụkwọ a, e nwere igbe ndị e dere ihe ndị ọzọ ga-enyekwuru mmadụ aka. Igbe ụfọdụ kwuru gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị anyị kwesịrị iṅomi okwukwe ha. E nwekwara igbe ndị kọwakwuru ebe dị iche iche, ihe ndị mere eme, omenala, ma ọ bụ ndị ọzọ e kwuru banyere ha n’Ọrụ Ndịozi.

Na-ekwusa ozi ọma n’ebe e kenyere gị ka onye ma na oge agwụla agwụ

19. Olee otú anyị kwesịrị isi na-eleru onwe anyị anya?

19 Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ileru onwe gị anya nke ọma. N’agbanyeghị afọ ole ị bụrụla onye nkwusa Alaeze, ọ dị mma ị nọtụ gị echebara ihe ndị kacha gị mkpa ná ndụ echiche nakwa otú i si ele ọrụ Ndị Kraịst na-arụ anya. (2 Kọr. 13:5) Jụọ onwe gị, sị: ‘Otú m si ekwusa ozi ọma ọ̀ na-egosi na m ghọtara na oge agwụla agwụ? (1 Kọr. 7:29-31) Àna m eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma, na-ekwusa ya ka onye kwetasiri ike n’ihe ọ na-ekwusa? (1 Tesa. 1:5, 6) Èji m ike m niile na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs?’​—Kọl. 3:23.

20, 21. Gịnị mere ọrụ e nyere anyị ji dị ngwa ngwa, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 Ka anyị na-echeta mgbe niile na e nyere anyị ọrụ dị mkpa, ya bụ, ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụbọchị ọ bụla gaferenụ na-eme ka o dokwuo anya na anyị kwesịrị ịrụ ọrụ ahụ ngwa ngwa. Ọgwụgwụ ụwa Setan a na-abịa n’ike n’ike. Ndụ ọtụtụ ndị nọ n’ihe ize ndụ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Anyị amaghị mmadụ ole ọzọ na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ka ga-aghọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 13:48) Ma, ọ bụ anyị ka ọ dịịrị inyere ndị ahụ aka tupu oge agwụ.​—1 Tim. 4:16.

21 N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ka ndị ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’oge ndịozi. Ka ọmụmụ ị ga-asa anya na mmiri mụọ akwụkwọ a mee ka ị na-anụkwu ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma n’atụghị egwu. Ka o meekwa ka i kpebisie ike na ị ga ‘na-akọwara ndị mmadụ okwu gbasara Alaeze Chineke nke ọma.’​—Ọrụ 28:23.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a O.N.K. pụtara Oge Ndị Kraịst; dk. pụtara “n’ihe dị ka,” t. pụtara “tupu.”