ISI NKE 20
‘Okwu Jehova Na-agbasa ma Na-akpa Ike’ n’Agbanyeghị Mmegide
Otú Apọlọs na Pọl si nyere ndị ọzọ aka ka ha nụ ozi ọma
1, 2. (a) Olee nsogbu bịaara Pọl na ndị ibe ya n’Efesọs? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?
NDỊ mmadụ nọ na-eti mkpu ma na-agba ọsọ n’okporo ụzọ ndị dị n’Efesọs. Ebe niile na-azụ wuruwuru. Ìgwè mmadụ iwe ji emewela ngagharị iwe. Ha jidere mmadụ abụọ n’ime ndị ha na Pọl onyeozi so ma dọkpụrụ ha. Ka ìgwè mmadụ ahụ na-eme ara ara na-ebukwu ibu, e nweghịzi ndị nọ n’ụlọ ahịa ndị dị n’akụkụ okporo ụzọ sara mbara n’obodo ahụ. Ha nukọọrọ banye ná nnukwu ámá egwuregwu dị n’obodo ahụ, nke nwere ike ịba puku mmadụ iri abụọ na puku ise (25,000). Ọtụtụ n’ime ha amaghịdị ihe kpatara ọgba aghara ahụ, mana ha chere na a chọrọ imerụ ụlọ nsọ ha na chi ha bụ́ Atemis ha hụrụ n’anya. N’ihi ya, ha malitere iti mkpu, na-asị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!”—Ọrụ 19:34.
2 Setan emewela otú ọ na-emebu. O ji ìgwè mmadụ na-eme tigbuo zọgbuo na-agbalị ime ka a kwụsị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ọ bụghị naanị tigbuo zọgbuo ka Setan ji eme ka a kwụsị ikwusa ozi ọma. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ dị iche iche Setan si gbalịa ka ọ kwụsị ọrụ ikwusa ozi ọma ma mee ka Ndị Kraịst oge mbụ ghara ịdị n’otu. Nke ka nke bụ na anyị ga-amụta na ihe niile o mere kụrụ afọ n’ala, n’ihi na ‘okwu Jehova nọ na-agbasa ma na-akpa ike.’ (Ọrụ 19:20) Gịnị mere Ndị Kraịst ahụ ji nwee ike imeri Setan? Ọ bụ n’ihi otu ihe ahụ mere anyị ji emeri ya n’oge a. N’eziokwu, ọ bụ Jehova nwe mmeri, ọ bụghị anyịnwa. Ma, anyị kwesịrị ime òkè nke anyị otú Ndị Kraịst oge mbụ mere. Mmụọ Jehova ga-enyeliri anyị aka ịmụta àgwà ndị ga-eme ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma. Ka anyị buru ụzọ leba anya n’àgwà ọma Apọlọs kpara.
‘Ọ Ma Akwụkwọ Nsọ nke Ọma’ (Ọrụ 18:24-28)
3, 4. Gịnị ka Akwịla na Prisila chọpụtara gbasara Apọlọs, oleekwa otú ha si nyere ya aka?
3 Mgbe Pọl na-aga Efesọs na nke ugboro atọ ọ gara mba ọzọ ikwusa ozi ọma, otu onye Juu aha ya bụ Apọlọs bịara Efesọs. O si Alegzandria, bụ́ obodo a ma ama dị n’Ijipt. Apọlọs nwere ụfọdụ àgwà ndị magburu onwe ha. Ọ ma ekwu okwu. Ihe ọzọ bụ na ‘ọ ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma.’ ‘Mmụọ nsọ mekwara ka Apọlọs na-anụ ọkụ n’obi.’ N’ihi ya, o ji ịnụ ọkụ n’obi gwa ndị Juu nọ n’ụlọ nzukọ ha okwu n’atụghị egwu.—Ọrụ 18:24, 25.
4 Akwịla na Prisila nụrụ ihe Apọlọs nọ na-ekwu. O doro anya na obi tọrọ ha ụtọ mgbe ha nụrụ ka ọ “na-akụzi ihe ma na-agwa ndị mmadụ eziokwu gbasara Jizọs.” Ihe o kwuru gbasara Jizọs bụ eziokwu. Ma obere oge, di na nwunye ahụ bụ́ Ndị Kraịst chọpụtara na e nwere ihe dị ezigbo mkpa Apọlọs na-amaghị. “Ihe ọ ma bụ naanị gbasara baptizim Jọn.” Di na nwunye a dị umeala n’obi, ndị aka ọrụ ha bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu, atụghị Apọlọs ụjọ maka na ọ bụ ọkà okwu, gụọkwa akwụkwọ. Kama ịtụ ya ụjọ, “ha kpọpụrụ ya iche kọwakwuoro ya eziokwu gbasara ụzọ Chineke.” (Ọrụ 18:25, 26) Gịnịzi ka nwoke a ma akwụkwọ, na-ekwukwa okwu nke ọma mere? O doro anya na o gosiri na o nwere otu n’ime àgwà ndị dị oké mkpa Onye Kraịst kwesịrị inwe, ya bụ, ịdị umeala n’obi.
5, 6. Gịnị nyeere Apọlọs aka ịbakwuru Jehova uru, gịnịkwa ka àgwà ọma Apọlọs kpara na-akụziri anyị?
5 Apọlọs mekwuru nke ọma n’ozi Jehova maka na o kwere ka Akwịla na Prisila nyere ya aka. O mechara gawa Akeya, bụ́ ebe ọ nọ nyere Ndị Kraịst “ezigbo aka.” O kwusakwaara ndị Juu nọ n’ebe ahụ ozi ọma nke ọma, bụ́ ndị nọ na-esi ọnwụ na Jizọs abụghị Mezaya ahụ e buru n’amụma. Luk kwuru, sị: ‘O ji ịnụ ọkụ n’obi na-egosi na ihe ndị Juu na-ekwu abụghị eziokwu. Ọ na-ejikwa Akwụkwọ Nsọ egosi na Jizọs bụ Kraịst.’ (Ọrụ 18:27, 28) N’eziokwu, Apọlọs baara ọgbakọ ezigbo uru. E nwere ike ikwu na mbọ ọ gbara so mee ka “okwu Jehova” na-akpa ike. Gịnị ka àgwà ọma Apọlọs kpara na-akụziri anyị?
6 Ndị Kraịst niile kwesịrị ịdị umeala n’obi. Chineke nyere onye ọ bụla n’ime anyị onyinye dị iche iche. O nwere ike ịbụ nkà anyị nwere, amamihe anyị nwere, ma ọ bụ ihe anyị mụtara. Ma, anyị ga-adịrịrị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka onyinye ndị ahụ baara Jehova uru. Ma ọ́ bụghị ya, onyinye ndị ahụ nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Ha nwere ike ime ka àgwà ọjọọ bụ́ mpako puo ka ero n’obi anyị. (1 Kọr. 4:7; Jems 4:6) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi n’eziokwu, anyị ga-agbalị na-ewere na ndị ọzọ ka anyị. (Fil. 2:3) Anyị agaghị ajụ ndụmọdụ ndị ọzọ na-enye anyị ma ọ bụ ghara ikwe ka ha kụziere anyị ihe. Anyị agaghị ekwe ka mpako mee ka anyị na-esi ọnwụ ka e mee ihe anyị chọrọ mgbe anyị ma na ọ dabaghị n’ihe mmụọ nsọ mere ka nzukọ Jehova ghọta ugbu a. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, anyị ga-abara Jehova na Ọkpara ya uru.—Luk 1:51, 52.
7. Olee otú Pọl na Apọlọs si gosi na ha dị umeala n’obi?
7 Ịdị umeala n’obi na-emekwa ka Ndị Kraịst ghara ịna-amarịta aka. Ọ̀ bụ na ihe Setan chọsiri ike abụghị ka ọ kpata nkewa n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ? Ọ gaara atọ ya ezigbo ụtọ ma a sị na Apọlọs na Pọl onyeozi, bụ́ mmadụ abụọ na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ, nọ na-amarịta aka, na-azọ onye ọkwá ya ka nke ibe ya n’ọgbakọ. Ọ gaara adịrị ha mfe ime otú ahụ. Na Kọrịnt, ụfọdụ Ndị Kraịst malitere ịsị, “Ana m eso ụzọ Pọl,” ndị ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Apọlọs.” Pọl na Apọlọs hà kwadoro ka ụmụnna ndị ahụ kwuwe ụdị ihe a ga-akpata nkewa? Mbanụ! Pọl dị umeala n’obi. Ọ bụ ya mere o ji jaa Apọlọs mma maka mbọ ọ gbara n’ọrụ ikwusa ozi ọma ma nyekwuo ya ọrụ. Apọlọs mekwara ihe Pọl gwara ya. (1 Kọr. 1:10-12; 3:6, 9; Taị. 3:12, 13) Ha abụọ dị umeala n’obi, nweekwa otu obi. Anyị kwesịrị ịna-eme ka ha taa.
‘Ịgwa Ndị Mmadụ Okwu Banyere Alaeze Chineke Otú Ọ Na-eru Ha n’Obi’ (Ọrụ 18:23; 19:1-10)
8. Olee ụzọ Pọl si gaghachi Efesọs, oleekwa ihe mere o ji si ụzọ ahụ?
8 Pọl kweburu nkwa na ọ ga-agaghachi Efesọs, o mekwara ihe o kwuru. a (Ọrụ 18:20, 21) Ma, ka anyị leba anya n’ụzọ o si mgbe ọ na-agaghachi. Pọl malitere njem ya n’Antiọk dị na Siria. Iji ruo Efesọs, ọ gaara esi ụzọ dị nso gaa Seliushia, banyezie ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Antiọk. Kama ime otú ahụ, o “si n’ime ime obodo ndị dị n’Eshia gbadata Efesọs.” Otu akwụkwọ kwuru na Pọl gara ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii (1,600) iji mee njem ahụ a kọwara n’Ọrụ Ndịozi 18:23 na 19:1. Gịnị mere Pọl ji họrọ isi ụzọ ahụ na-adịghị mfe ọgịga, nke dịkwa ezigbo anya? Ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ‘ime ka okwukwe ndị niile na-eso ụzọ Jizọs sie ike.’ (Ọrụ 18:23) Njem nke atọ a ga-ata akpụ otú nke mbụ na nke abụọ takwara. Ma, ọ ma na mgbalị ya agaghị efu ọhịa. Ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha na-emekwa ụdị ihe ahụ taa. Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ maka ezigbo ịhụnanya ha na-egosi anyị?
9. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka e mee ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim ọzọ, gịnịkwa ka ihe ha mere na-akụziri anyị?
9 Mgbe Pọl rutere Efesọs, ọ hụrụ ihe dị ka mmadụ iri na abụọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Baptizim e mere ha bụ baptizim Jọn, nke na-abaghịzi uru. Ọ ga-abụkwa na ha amachaghị gbasara mmụọ nsọ ma ọ bụkwanụ na ha amatụdịghị gbasara ya. Pọl kọwaara ha na e kwesịrị ime ha baptizim n’aha Jizọs, ha egosi na ha dị umeala n’obi, chọọkwa ịmụta ihe otú Apọlọs mere. Mgbe e mechara ha baptizim n’aha Jizọs, mmụọ nsọ dakwasịrị ha, ha enwetakwa onyinye ịrụ ọrụ ebube ụfọdụ. Ihe a gosiri na Jehova na-agọzi ndị na-eso ntụziaka nzukọ ya na-enye.—Ọrụ 19:1-7.
10. Gịnị mere Pọl ji hapụ ụlọ nzukọ ndị Juu gaa n’ụlọ ezumezu, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ya mgbe anyị na-ezisa ozi ọma?
10 E nwere ihe ọzọ mere n’oge na-adịghị anya. Pọl zisara ozi ọma n’ụlọ nzukọ ndị Juu ruo ọnwa atọ n’atụghị egwu. Ọ bụ eziokwu na ‘ọ nọ na-agwa ndị mmadụ okwu banyere Alaeze Chineke otú ọ na-eru ha n’obi,’ ụfọdụ ndị kpọchiri obi ha ma bido imegide Pọl. Kama ikwe ka ndị “na-ekwu okwu ọjọọ banyere Ụzọ Onyenwe anyị” gbuwe ya oge, Pọl malitere ikwu okwu kwa ụbọchị n’ụlọ ezumezu dị n’otu ụlọ akwụkwọ. (Ọrụ 19:8, 9) Ndị chọrọ ịmụtakwu banyere Alaeze Chineke kwesịrị ịhapụ ụlọ nzukọ ndị Juu ahụ ma gafeta n’ụlọ ezumezu ahụ. Dị ka Pọl mere, anyị nwere ike ịkwụsị ụka anyị na onye nwe ụlọ na-akparịta ma anyị chọpụta na ọ chọghị ige ntị ma ọ bụkwanụ na ọ chọrọ naanị ka anyị na ya rụwa ụka. A ka nwere ọtụtụ ndị yiri atụrụ kwesịrị ịnụ ozi na-agba ume anyị na-ezisa.
11, 12. (a) Olee otú Pọl si gosi na ọ na-arụsi ọrụ ike ma na-agbanwe ihe mgbe o kwesịrị ime otú ahụ? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova si na-agbalị ịrụsi ọrụ ike ma na-agbanwe ihe n’otú ha si ekwusa ozi ọma?
11 O nwere ike ịbụ na Pọl na-ekwu okwu n’ụlọ ezumezu ahụ dị n’ụlọ akwụkwọ kwa ụbọchị, malite n’ihe dị ka elekere iri na otu nke ụtụtụ ruo n’ihe dị ka elekere anọ nke mgbede. (Ọrụ 19:9) Ọ ga-abụ na oge ahụ bụ oge kacha ekpo ọkụ n’ụbọchị nakwa oge ebe niile kacha ada jii, ọ bụkwa mgbe ọtụtụ ndị na-akwụsịtụ ọrụ ha ka ha rie nri ma zurutụ ike. Chegodị nnukwu ọrụ Pọl nọ na-arụ ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe a ruo afọ abụọ zuru ezu. Ọ pụtara na o ji ihe karịrị puku awa atọ (3,000) kụzie Okwu Chineke. b N’ihi ya, ihe ọzọ mere okwu Jehova ji na-agbasa ma na-akpa ike bụ na Pọl rụsiri ọrụ ike ma na-agbanwe ihe mgbe o kwesịrị ime otú ahụ. Ọ hazigharịrị oge o ji ekwusa ozi ọma ka ọ daba n’oge ndị obodo ahụ na-enwe ohere. Gịnị meziri? “Ndị niile bi ná mpaghara Eshia nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma ndị Juu ma ndị Grik.” (Ọrụ 19:10) N’eziokwu, ọ gbara àmà nke ọma.
12 Ndịàmà Jehova n’oge anyị a egosikwala na ha na-arụsi ọrụ ike ma na-agbanwe ihe mgbe ha kwesịrị ime otú ahụ. Anyị na-agbalị ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe ọ bụla ha nọ nakwa n’oge ọ bụla anyị ga-enweta ha. Anyị na-ekwusa ozi ọma n’okporo ámá, n’ahịa, nakwa n’ebe a na-adọsa ụgbọala. Anyị nwere ike iji ekwentị ma ọ bụ akwụkwọ ozi zie ndị mmadụ ozi ọma. N’ozi ụlọ n’ụlọ, anyị na-agbalị ịchọ ndị mmadụ mgbe anyị ma na anyị ga-akacha enweta ha n’ụlọ.
‘Okwu Jehova Na-agbasa ma Na-akpa Ike’ n’Agbanyeghị Ndị Mmụọ Ọjọọ (Ọrụ 19:11-22)
13, 14. (a) Gịnị ka Jehova nyeere Pọl aka ime? (b) Olee ihe na-adịghị mma ụmụ Siva mere, oleekwa otú ọtụtụ ndị chọọchị si eme ụdị ihe ahụ taa?
13 Ihe ọzọ Luk gwara anyị bụ na Jehova nyeere Pọl aka ịrụ “ọrụ ebube dị iche iche.” A na-achịrịdị ákwà na eprọn Pọl yiri metụ ndị ọrịa, a gwọọ ha. E sikwa otú a chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. c (Ọrụ 19:11, 12) Mmeri a e meriri ndị na-arụrụ Setan ọrụ masịrị ọtụtụ ndị. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka obi dị ụtọ.
14 “Ụfọdụ ndị Juu ndị na-agagharị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ” gbalịrị ịrụ ọrụ ebube ndị ahụ Pọl rụrụ. Ụfọdụ n’ime ha gbalịrị iji aha Jizọs na aha Pọl chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Luk kwuru na ụmụ nwoke asaa Siva, bụ́ onyeisi nchụàjà ndị Juu, so ná ndị gbalịrị ime ihe a. Mmụọ ọjọọ ahụ gwara ha, sị: “Ama m Jizọs, marakwa Pọl. Ununwa, ùnu bụ ole ndị?” Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji lụsoro ndị aghụghọ ahụ ọgụ, makwasị ha ka anụ ọhịa, merụchaa ha ahụ́, ha agbara ọtọ gbapụsịa. (Ọrụ 19:13-16) N’eziokwu, “okwu Jehova” nwere ezigbo mmeri n’ihi na ọ bịara doo anya na ọ bụ Jehova nyere Pọl ike o ji rụọ ọrụ ndị ahụ, ma e nweghị ihe jikọrọ ya na ndị okpukpe ụgha ahụ na-enweghị ike ọ bụla. Taa, e nwere ọtụtụ nde mmadụ ndị chere na naanị ịkpọku aha Jizọs ma ọ bụ ịza “Onye Kraịst” ezuola. Ma, Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ naanị ndị na-eme uche Nna ya ka ihe ga-adịrị mma n’ọdịnihu.—Mat. 7:21-23.
15. A bịa n’ihe gbasara ime mgbaasị nakwa ihe ndị e ji eme ya, olee otú anyị ga-esi eme ka ndị Efesọs?
15 Ihu e mechuru ụmụ Siva mere ka ọtụtụ ndị tụwa egwu Chineke, kwụsịzie ime mgbaasị ma ghọọ Ndị Kraịst. N’Efesọs, ọtụtụ ndị na-eme anwansi. Ha na-akọ ndị mmadụ ọgwụ, na-agọ mmụọ, na-eji ọtụmọkpọ, nakwa akwụkwọ ndị na-ekwu gbasara anwansi. Ihe ahụ merenụ mere ka ọtụtụ ndị Efesọs kpopụta akwụkwọ ha ji eme anwansi ma kpọọ ha ọkụ n’ihu ọha, n’agbanyeghị na a ga-ereta ha ọtụtụ narị puku naịra ma ọ bụrụ ugbu a. d Luk kọrọ, sị: “Okwu Jehova wee si otú a na-agbasa ma na-akpa ike.” (Ọrụ 19:17-20) Ọ bụ ezigbo mmeri ka eziokwu meriri ụgha nakwa ofufe ndị mmụọ ọjọọ. E nwere ọtụtụ ihe anyịnwa ga-amụta n’aka ndị ahụ rubeere Chineke isi. Ọtụtụ ndị na-emekwa mgbaasị n’oge anyị a. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere ihe anyị nwere gbasara ime mgbaasị, anyị kwesịrị ime ka ndị Efesọs, ya bụ, ibibi ihe ahụ ozugbo. Anyị kwesịrị ịgbara ihe ndị ahụ jọgburu onwe ha ọsọ, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu anyị.
“E Nwere Ezigbo Ọgba Aghara” (Ọrụ 19:23-41)
16, 17. (a) Kọwaa otú Dimitriọs si mee ka a malite ngagharị iwe n’Efesọs. (b) Olee otú ndị Efesọs si gosi na okpukpe ha na-agba ha ara?
16 Ihe ọzọ Luk kọọrọ anyị bụ ụzọ aghụghọ Setan ji bịa ọgụ. Ọ sịrị na “e nwere ezigbo ọgba aghara n’ihi Ụzọ Onyenwe anyị.” Ọ bụghị égbè ọnụ ka ọ na-agba. e (Ọrụ 19:23) Ọ bụ nwoke a na-akpọ Dimitriọs, onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe, malitere nsogbu ahụ. O bu ụzọ chetara ndị omenkà ibe ya na ọ bụ ire arụsị a kpụrụ akpụ ka ha ji akpata ego. O si otú ahụ nweta obi ha. Ọ gwaziri ha na ozi Pọl na-ezisa ga-emebiri ha ahịa ebe ọ bụ na Ndị Kraịst anaghị efe arụsị. O kwuru ihe tọrọ ndị ọ na-agwa okwu ụtọ ebe ha bụ ụmụ amaala Efesọs ndị hụrụ obodo ha n’anya. Ọ dọrọ ha aka ná ntị na ọ bụrụ na ndị obodo ahụ egewe Pọl ntị, a ga-ewere chi ha bụ́ Atemis na ụlọ nsọ ha na-ewu ewu n’ụwa niile “ka ihe efu.”—Ọrụ 19:24-27.
17 Ihe ahụ Dimitriọs kwuru ruru ndị ọ gwara ya n’obi. Ndị ahụ na-eji ọlaọcha akpụ ihe maliteziri iti mkpu, na-asị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!” Obodo ahụ gbawaziri aghara, nke mere ka ìgwè mmadụ ahụ anyị kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a mewe ngagharị iwe. f Ebe ọ bụ na Pọl nwere obi ike, ọ chọrọ ịbanye n’ámá egwuregwu ahụ gwa ìgwè mmadụ ahụ okwu. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs siri ọnwụ na ọ gaghị aga ebe ahụ ka a ghara imerụ ya ahụ́. Otu nwoke aha ya bụ Alegzanda guzoro n’ihu ìgwè mmadụ ahụ ma gbalịa ịgwa ha okwu. Ebe ọ bụ onye Juu, ọ ga-abụ na ọ na-enu ya enu n’obi ịkọwa ihe dị iche ná ndị Juu na Ndị Kraịst ndị ahụ. Ma, ìgwè mmadụ ahụ achọghị ịnụ ihe ọ chọrọ ịgwa ha. Mgbe ha matara na ọ bụ onye Juu, ha tisiwere mkpu ike ruo ihe dị ka awa abụọ, na-asị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!” Kemgbe oge ahụ, okpukpe ndị mmadụ akwụsịbeghị ịgba ha ara. Ọ ka na-eme ka ọtụtụ ndị na-akpa àgwà ka ndị na-anaghị eche echiche.—Ọrụ 19:28-34.
18, 19. (a) Olee otú onyeisi obodo Efesọs si mee ka ìgwè mmadụ gbakọtara n’obodo ahụ nọrọ jụụ? (b) Olee otú ndị ọchịchị sirila chebe ndị Jehova mgbe ụfọdụ, oleekwa otú àgwà anyị nwere ike isi mee ka ha chebe anyị?
18 N’ikpeazụ, onyeisi obodo ahụ mere ka ìgwè mmadụ ahụ nọrọ jụụ. Ọ bụ nwoke ma ihe. O bu ụzọ gwa ìgwè mmadụ ahụ iwe ji na Ndị Kraịst ahụ abịaghị imerụ ụlọ nsọ ha na chi ha. Ọ gwakwara ha na o nweghị ihe ọjọọ Pọl na ndị ibe ya mere ụlọ nsọ Atemis, nakwa na e nwere ebe e kwesịrị ịnọ leba ụdị okwu ahụ anya. Ọ ga-abụ na ihe kacha mkpa o chetaara ha bụ na ịkpọkọta ìgwè mmadụ a na-akpa aghara bụ ịda iwu ndị Rom nakwa na e nwere ike ịta ha ahụhụ maka ya. Mgbe ọ gwachara ha okwu, ọ sịrị ha lawa. Eziokwu a doro anya ọ gwara ìgwè mmadụ a mere ka iwe ha dajụọ, ha agbasaakwa ozugbo.—Ọrụ 19:35-41.
19 Ihe a abụghị nke mbụ onye ọchịchị isi jụrụ oyi gbachiteere ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọ gaghịkwanụ abụ nke ikpeazụ. N’eziokwu, Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ na n’oge ikpeazụ a, ala nke nọchiri anya ụwa anyị a ga-elo nnukwu mmiri a ga-agbọpụta. Mmiri ahụ a ga-agbọpụta nọchiri anya mkpagbu Setan ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mkpu. 12:15, 16) Ihe a emeela. Ọtụtụ mgbe, ndị ọkàikpe na-eche echiche nke ọma emeela ka Ndịàmà Jehova nweta ikike ịna-ezukọta efe Chineke nakwa ikike izisa ozi ọma. Omume anyị nwekwara ike iso eme ka ndị ọkàikpe kpelaara anyị ikpe. O doro anya na omume Pọl so mee ka ụfọdụ ndị ọchịchị bi n’Efesọs na-akwanyere ya ùgwù ma dị njikere ichebe ya. (Ọrụ 19:31) Ka anyị gbalịa ka àgwà ọma anyị na otú anyị si akwụwa aka ọtọ mee ka ndị ọzọ na-akwanyekwara anyị ùgwù. Ọtụtụ ihe ọma ga-abịara anyị n’ihi àgwà ọma anyị na-akpa.
20. (a) Olee otú obi dị gị maka otú okwu Jehova si kpaa ike n’oge ndịozi ma ka na-akpa ike n’oge anyị a? (b) Gịnị ka i kpebiri ime banyere iso eme ka ndị Jehova na-emeri n’oge anyị a?
20 Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ ileba anya n’otú ‘okwu Jehova si gbasaa ma kpaa ike’ n’oge ndịozi? Obi tọkwara anyị ezigbo ụtọ ịhụ ụzọ dị iche iche Jehova si mee ka ndị ya merie n’oge anyị a. Ị̀ ga-achọ iso na-eme ka ndị Jehova na-emeri n’oge a, ọ bụrụgodị na ihe ị ga-eme ebughị ibu? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, gbalịa mụta ihe n’aka ndị anyị kwuru okwu ha n’isiokwu a. Dịrị umeala n’obi, soro nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ, na-arụsi ọrụ ike, zere mgbaasị, na-agbalịsikwa ike ka àgwà ọma ị na-akpa na otú i si akwụwa aka ọtọ na-agbara ndị ọzọ àmà.
a Gụọ igbe bụ́ “ Efesọs Bụ Isi Obodo Eshia.”
b Pọl nọkwa n’Efesọs dee Ndị Kọrịnt nke Mbụ.
c Ákwà ahụ nwere ike ịbụ ihe dị ka hankachiif Pọl na-eke n’egedege ihu ya ka ọsụsọ ghara ịsọba ya n’anya. Ọ ga-abụkwa na eprọn ahụ Pọl yiri n’oge ahụ gosiri na ọ na-arụ ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu n’oge ọ na-anaghị ekwusa ozi ọma. O nwere ike ịbụ n’ụtụtụ.—Ọrụ 20:34, 35.
d Luk kwuru na akwụkwọ ndị ahụ ruru puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise (50,000). Ọ bụrụ mkpụrụ ego dinarịọs ka o bu n’obi, onye ọrụ n’oge ahụ ga-arụ ọrụ puku ụbọchị iri ise (50,000), ya bụ, ihe dị ka otu narị afọ na iri atọ na asaa (137) tupu ya akpata ego ahụ, ma ọ bụrụ na ọ na-arụ ọrụ ụbọchị asaa n’izu.
e Ụfọdụ ndị kwuru na ọ bụ ihe a merenụ ka Pọl bu n’obi mgbe ọ gwara ndị Kọrịnt, sị: “Anyị ejighịzi ndụ anyị n’aka.” (2 Kọr. 1:8) Ma, o nwere ike ịbụ na o bu ihe ka nke ahụ njọ n’obi. Mgbe Pọl dere na ‘ya na anụ ọhịa lụrụ ọgụ n’Efesọs,’ ọ ga-abụ na ọ na-ekwu banyere ọgụ nkịtị ya na anụmanụ ọjọọ lụrụ n’ámá egwuregwu, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ mkpagbu ndị mmadụ kpagburu ya ka ọ na-ekwu. (1 Kọr. 15:32) Nkọwa abụọ a dabachara adaba.
f Òtù dị iche iche, dị ka òtù ndị omenkà, na-akpa ezigbo ike. Dị ka ihe atụ, otu narị (100) afọ ihe a mechara, òtù ndị na-eme achịcha mere ụdị ngagharị iwe a n’Efesọs.