ISI NKE 21
“Ọbara Onye Ọ Bụla A Na-azọpụtaghị Adịghị M n’Isi”
Otú Pọl si nụọ ọkụ n’obi n’ozi ọma, nakwa ndụmọdụ o nyere ndị okenye
O Si n’Ọrụ Ndịozi 20:1-38
1-3. (a) Kọọ ihe ndị mere n’abalị Yutikọs nwụrụ. (b) Gịnị ka Pọl mere, gịnịkwa ka ihe ahụ na-akụziri anyị banyere Pọl?
PỌL nọ n’otu ụlọ elu ndị mmadụ juru na Troas. Ọ gwara ụmụnna nọ ebe ahụ okwu ọtụtụ awa maka na ihe a bụ abalị ikpeazụ ya na ha ga-anọ. Ọ bụzi etiti abalị. E nwere ọtụtụ mpanaka na-enwu ọkụ n’ụlọ ahụ, nke mere ka ebe ahụ na-ekpokwu ọkụ. O nwekwara ike ịbụ na o mere ka anwụrụ ọkụ ju ebe ahụ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Yutikọs nọ ọdụ na windo. Ka Pọl nọ na-ekwu okwu, ụra buuru Yutikọs, ya esi na windo dị n’okpukpu nke atọ n’ụlọ ahụ dapụ.
2 O nwere ike ịbụ na Luk so ná ndị mbụ gbapụrụ n’èzí ma leruo nwa okorobịa ahụ anya n’ihi na ọ bụ onye na-agwọ ọrịa. A naghị ajụkwa ajụ ma Yutikọs ò kubiela ume. “Ọ nwụọla.” (Ọrụ 20:9) Ma Pọl rụziri ọrụ ebube. O hulatara makụọ nwa okorobịa ahụ ma gwa ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Unu esogbuzila onwe unu, n’ihi na ọ dị ndụ.” Pọl akpọlitela Yutikọs n’ọnwụ.—Ọrụ 20:10.
3 Ihe ahụ merenụ gosiri na mmụọ nsọ Chineke na-akpa ike. E kwesịghị ịta Pọl ụta maka ọnwụ Yutikọs. Ma, ọ chọghị ka ọnwụ nwa okorobịa a mebie oge ahụ dị mkpa ma ọ bụkwanụ mee ka ụfọdụ ndị kwụsị inwe okwukwe. Mkpọlite Pọl kpọlitere Yutikọs n’ọnwụ kasiri ọgbakọ ahụ obi ma gbakwuo ha ume ịnọgide na-eje ozi ha. O doro anya na Pọl ejighị ndụ ndị ọzọ gwuo egwu. Baịbụl chetaara anyị na o kwuru, sị: “Ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi.” (Ọrụ 20:26) Ka anyị leba anya n’otú ihe Pọl mere ga-esi enyere anyị aka iji ndụ kpọrọ ihe.
“Ọ Gawara Masedonia” (Ọrụ 20:1, 2)
4. Olee nsogbu bịaara Pọl n’Efesọs?
4 Dị ka anyị kwuru n’Isi nke 20, ezigbo nsogbu bịaara Pọl n’Efesọs. Ozi ọma o kwusara n’ebe ahụ mere ka e nwee ọgba aghara. N’eziokwu, ndị ji ọlaọcha akpụ ihe so ná ndị mere ngagharị iwe n’ihi na ha ji ofufe a na-efe chi Atemis akpa ego. Ọrụ Ndịozi 20:1 kwuru, sị: “Mgbe ndị mmadụ kwụsịrị ịkpa aghara, Pọl ziri ozi ka a kpọọ ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe ọ gbachara ha ume ma sị ha ka e mesịa, ọ gawara Masedonia.”
5, 6. (a) Afọ ole ka o nwere ike ịbụ na Pọl nọrọ na Masedonia, gịnịkwa ka o meere ụmụnna nọ n’ebe ahụ? (b) Olee otú Pọl si were ụmụnna ya?
5 Mgbe Pọl na-aga Masedonia, ọ kwụsịtụrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Troas. Pọl tụrụ anya na Taịtọs ga-esi na Kọrịnt, bụ́ ebe e zigara ya, bịakwute ya n’ebe ahụ. (2 Kọr. 2:12, 13) Ma mgbe Pọl matara na Taịtọs agaghị abịa, ọ gawara Masedonia. Ọ ga-abụ na ọ nọrọ ihe dị ka otu afọ n’ebe ahụ “gbaa ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ume.” a (Ọrụ 20:2) Taịtọs mechara bịakwute Pọl na Masedonia, kọọrọ ya akụkọ ọma banyere otú Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt si nabata akwụkwọ ozi mbụ o degaara ha. (2 Kọr. 7:5-7) Ihe a mere ka Pọl degara ha akwụkwọ ozi ọzọ, nke anyị na-akpọ Ndị Kọrịnt nke Abụọ ugbu a.
6 Ị̀ hụrụ na mgbe Luk na-akọwa nleta Pọl letara ụmụnna nọ n’Efesọs nakwa na Masedonia, o kwuru na ọ gbara ha ume? Ọ bụ kpọmkwem ihe Pọl meere ụmụnna ya ọ hụrụ n’anya. Ọ kpaghị àgwà ka ndị Farisii, bụ́ ndị na-eleda ndị ọzọ anya, kama, o weere atụrụ Chineke ka ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ. (Jọn 7:47-49; 1 Kọr. 3:9) O medịrị otú ahụ mgbe ọ dụsiri ha ọdụ ike.—2 Kọr. 2:4.
7. Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-eme ka Pọl n’oge anyị a?
7 Taa, ndị okenye ọgbakọ na ndị nlekọta sekit na-agbalị ịna-eme ka Pọl. Ọ bụrụgodị mgbe ha na-adọ ụmụnna aka ná ntị, ihe ha chọrọ bụ ime ka okwukwe ndị e kwesịrị inyere aka sie ike. Ọmịiko na-eme ka ndị okenye na-agbalị ịgba ụmụnna ha ume kama ịma ha ikpe. Otu nwanna bụrụla onye nlekọta sekit ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụnna anyị chọrọ ime ihe ziri ezi. Ma ọtụtụ mgbe, nsogbu ha na-enwe bụ na ụjọ na-atụ ha, ha anaghị amacha ihe ha ga-eme eme, ihe anaghịkwa agacha otú ha tụrụ anya ya.” Ndị okenye kwesịrị ịgba ụmụnna ha ndị ọ dị otú a ume.—Hib. 12:12, 13.
“Ndị Juu Akpaala Nkata Igbu Ya” (Ọrụ 20:3, 4)
8, 9. (a) Gịnị mere Pọl ji hapụzie ịga ebe ọ ga-abanye ụgbọ mmiri gawa Siria? (b) Ọ̀ ga-abụ gịnị mere ndị Juu ji na-eburu Pọl iwe n’obi?
8 Pọl si na Masedonia gaa Kọrịnt. b Mgbe ọ nọrọ ebe ahụ ọnwa atọ, ọ chọrọ ịgawa Senkrea, bụ́ ebe o bu n’obi ịbanye ụgbọ mmiri gawa Siria. Ya ruo ebe ahụ, ọ ga-enwe ike ịga Jeruselem bunye ụmụnna bụ́ ndị ogbenye nọ n’ebe ahụ onyinye e nyere ha. c (Ọrụ 24:17; Rom 15:25, 26) Ma, e nweziri ihe dapụtaranụ mere ka Pọl gbanwee njem ya. Ọrụ Ndịozi 20:3 kọrọ, sị: “Ndị Juu akpaala nkata igbu ya.”
9 O jughị anyị anya na ndị Juu buuru Pọl iwe n’obi ebe ọ bụ na ha weere ya ka onye kwụsịrị ife Chineke. Ozi ọma o kwusaburu mere ka Krispọs, onye bụ́bu onyeisi n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Kọrịnt, ghọọ Onye Kraịst. (Ọrụ 18:7, 8; 1 Kọr. 1:14) N’oge ọzọ, ndị Juu nọ na Kọrịnt boro Pọl ebubo n’ihu Galio, onye na-achị ógbè Akeya. Ma Galio kagburu ebubo ndị ahụ, kwuo na ha erijughị afọ. Ihe a Galio mere were ndị iro Pọl ezigbo iwe. (Ọrụ 18:12-17) Ọ ga-abụ na ndị Juu nọ na Kọrịnt matara ma ọ bụ chee na n’oge na-adịghị anya, Pọl ga-aga Senkrea, bụ́ obodo dị nso, banye ụgbọ mmiri. N’ihi ya, ha kpara nkata ichechi ya n’ụzọ. Olee ihe Pọl ga-eme?
10. Nhapụ Pọl hapụrụ ịga Senkrea ò gosiri na ọ bụ onye ụjọ? Kọwaa.
10 Pọl kpebiri ịhapụ ịga Senkrea ma si Masedonia laghachi ebe o si bịa, ka ihe ọ bụla ghara ime ya na onyinye ahụ e bunyere ya. Ma, isi n’okporo ụzọ eme njem nwekwara nsogbu nke ya. N’oge ochie, ndị ohi na-echechikarị ndị mmadụ n’okporo ụzọ. Ihe nwedịrị ike ime mmadụ n’ụlọ ndị njem. N’agbanyeghị ihe ndị a, Pọl kpebiri na nsogbu dị na njem okporo ụzọ kaara ya mma karịa isi ebe ahụ e chechiri ya n’ụzọ na Senkrea. Ihe ọzọ dị mma bụ na ọ bụghị naanị ya so aga. Ndị ha na Pọl so aga njem ahụ bụ Arịstakọs, Geyọs, Sekọndọs, Sọpata, Timoti, Trọfimọs, na Tikikọs.—Ọrụ 20:3, 4.
11. Olee otú Ndị Kraịst taa si agbalị ka ha ghara ịdaba ná nsogbu, oleekwa ihe anyị na-amụta n’ihe Jizọs mere?
11 Ndị Kraịst taa na-emekwa ka Pọl. Ha na-agbalị ka ha ghara ịdaba ná nsogbu mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. N’ebe ụfọdụ, ha na-aga n’ìgwè n’ìgwè ma ọ bụkwanụ abụọ abụọ kama ịga otu otu. Oleekwanụ ihe ha na-eme ma a kpagbuwe ha? Ndị Kraịst ma na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ịkpagbu ha. (Jọn 15:20; 2 Tim. 3:12) Ma, ọ naghị abụ ha hụ nsogbu, ha etinye isi. Chebagodịrị ihe Jizọs mere echiche. E nwere mgbe ndị mmegide nọ na Jeruselem buuru nkume ka ha tụọ ya, “ma Jizọs zoro wee si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ.” (Jọn 8:59) N’oge ọzọ, mgbe ndị Juu nọ na-agba izu igbu ya, ọ “kwụsịrị ijegharị n’ebe ọtụtụ ndị ga-ahụ ya. Ọ hapụkwara ebe ahụ gaa n’ebe dị nso n’ala ịkpa.” (Jọn 11:54) Jizọs gbara mbọ ichebe onwe ya mgbe ime otú ahụ na-emebighị ihe Chineke chọrọ ka o mee. Ndị Kraịst na-emekwa otú ahụ taa.—Mat. 10:16.
Ha “Na-enwe Sọ Aṅụrị” (Ọrụ 20:5-12)
12, 13. (a) Olee otú obi dị ọgbakọ ahụ mgbe a kpọlitere Yutikọs n’ọnwụ? (b) Olee olileanya Baịbụl mere ka ndị mmadụ nwụnahụrụ n’oge a nwee nke na-eme ka ha na-enwe aṅụrị?
12 Pọl na ndị ibe ya sokọta ọnụ gafere Masedonia. Ma, ọ ga-abụ na e nwere mgbe ha gawara iche iche, mechazie sokọta ọnụ na Troas. d Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ụbọchị ise gachara, anyị ruru Troas ebe ha nọ.” e (Ọrụ 20:6) Ọ bụ n’ebe ahụ ka a kpọlitere nwa okorobịa ahụ bụ́ Yutikọs n’ọnwụ dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a. Chegodị otú obi dị ụmụnna ahụ mgbe ha hụrụ ka a kpọlitere nwanna ha bụ́ Yutikọs n’ọnwụ. Ọrụ Ndịozi kwuru na ha nọ “na-enwe sọ aṅụrị.”—Ọrụ 20:12.
13 Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị arụ ụdị ọrụ ebube ahụ n’oge a, ma ndị mmadụ nwụnahụrụ “na-enwe sọ aṅụrị” n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ Baịbụl mere ka ha nwee. (Jọn 5:28, 29) Ebe ọ bụ na Yutikọs ezughị okè, o mechara nwụọ ọzọ. (Rom 6:23) Ma, ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ Chineke ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ndị a na-akpọlite n’ọnwụ ka ha soro Jizọs chịa n’eluigwe ga-enwezi ahụ́ nke na-enweghị ike ịnwụ anwụ. (1 Kọr. 15:51-53) Ndị Kraịst n’oge a, ma ndị e tere mmanụ ma ndị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ kwesịrị ‘ịna-enwe sọ aṅụrị.’—Jọn 10:16.
“N’Ihu Ọha Nakwa n’Ụlọ n’Ụlọ” (Ọrụ 20:13-24)
14. Gịnị ka Pọl gwara ndị okenye si Efesọs mgbe ya na ha hụrụ na Maịlitọs?
14 Pọl na ndị ibe ya si Troas gaa Asọs, sizie ebe ahụ gaa Mitilini, Kiọs, Semọs, na Maịlitọs. Pọl chọrọ iru Jeruselem tupu Ememme Pentikọst amalite. Ọ dịzi ya ngwa ngwa ugbu a. Ọ bụ ya mere o ji soro ụgbọ mmiri nke na-agaghị abanye Efesọs. Ma, ebe ọ bụ na Pọl chọrọ ịgwa ndị okenye si n’Efesọs okwu, ọ gwara ha ka ya na ha hụ na Maịlitọs. (Ọrụ 20:13-17) Mgbe ha rutere, Pọl gwara ha, sị: “Unu ma nnọọ otú m si na-akpa àgwà mgbe mụ na unu nọ, malite n’ụbọchị mbụ ụkwụ m kpara ná mpaghara Eshia. Eweturu m onwe m ala na-agbara Onyenwe anyị ohu. Ebere m ákwá, taakwa ahụhụ mgbe ndị Juu kpara nkata igbu m. Unu makwa na ahapụghị m ịgwa unu ihe niile ga-abara unu uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha nakwa n’ụlọ n’ụlọ. Kama, eziri m ma ndị Juu ma ndị Grik ozi ọma nke ọma ka ha chegharịa, fewe Chineke ma nwee okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.”—Ọrụ 20:18-21.
15. Olee ụfọdụ uru ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ bara?
15 E nwere ọtụtụ ụzọ anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma taa. Dị ka Pọl mere, anyị na-agbalị ịga ebe anyị ga-ahụ ndị mmadụ, dị ka n’ebe ụgbọala na-akwụsị, n’okporo ámá na-ekwo ekwo, ma ọ bụkwanụ n’ahịa. Ma, ụzọ bụ́ isi Ndịàmà Jehova si ekwusa ozi ọma ka bụkwa ịga n’ụlọ n’ụlọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ na-eme ka mmadụ niile nwee ohere ịnụ ozi Alaeze ugboro ugboro. Ọ na-egosi na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ na-emekwa ka a na-enyere ndị nwere ezi obi aka nke ọma. Ihe ọzọ bụ na ozi ụlọ n’ụlọ na-eme ka okwukwe ndị na-ezisa ya sikwuo ike, meekwa ka ha na-atachi obi. N’eziokwu, otu n’ime ihe e ji mara ezigbo Ndị Kraịst taa bụ na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma “n’ihu ọha nakwa n’ụlọ n’ụlọ.”
16, 17. Olee otú Pọl si gosi na ọ naghị atụ egwu, oleekwa otú Ndị Kraịst n’oge a si eme ka ya?
16 Pọl kọwaara ndị okenye ahụ si Efesọs na ya amaghị ihe ga-eme ya ma ọ gaghachi Jeruselem. Ọ gwara ha, sị: “Ka o sina dị, o nweghị ihe m ji ndụ m kpọrọ. Ihe bụ́ mkpa m bụ ime ihe niile m kwesịrị ime na ịrụcha ọrụ Onyenwe anyị Jizọs nyere m. Ọrụ ahụ bụ izi ndị mmadụ ozi ọma nke ọma gbasara amara Chineke meere anyị.” (Ọrụ 20:24) Pọl atụghị egwu. O kweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ ghara ijezu ozi ya, ma ọ̀ bụ ọrịa ma ọ̀ bụ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ.
17 Ndị Kraịst taa na-edikwa nsogbu dị iche iche. N’ebe ụfọdụ, ndị ọchịchị machiri ọrụ ụmụnna anyị, na-akpagbukwa ha. E nwere ndị na-arịa ọrịa, nweekwa ndị obi na-anaghị ezu ike. Ma, ha na-edi ya. Ụmụ klas ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst na-enye ha nsogbu ka ha mee ihe na-adịghị mma. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị Ndịàmà Jehova, ha na-akwụsi ike ka Pọl, kpebisiekwa ike “izi ndị mmadụ ozi ọma nke ọma.”
“Na-elezinụ Onwe Unu na Ìgwè Atụrụ Chineke Niile Anya” (Ọrụ 20:25-38)
18. Olee otú Pọl si mee ka ọbara onye ọ bụla ghara ịdị ya n’isi, oleekwa otú ndị okenye si Efesọs ga-esi mee otú ahụ?
18 Pọl nyeziri ndị okenye ahụ si Efesọs ndụmọdụ doro anya ma chetara ha otú yanwa si lekọta ọgbakọ dị iche iche. O bu ụzọ gwa ha na ihe a nwere ike ịbụ nke ikpeazụ ha ga-ahụ ya. Ọ gwaziri ha, sị: “Ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi, n’ihi na ahapụghị m ịgwa unu ihe niile Chineke zubere ime.” Olee otú ndị okenye ahụ si Efesọs ga-esi na-eme ka Pọl, ka ọbara onye ọ bụla ghara ịdị ha n’isi? Ọ sịrị ha: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ Chineke niile anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke, nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:26-28) Pọl dọrọ ha aka ná ntị na “anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri” ga-abata n’etiti ìgwè atụrụ ahụ ma ‘na-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.’ Gịnị ka ndị okenye ahụ kwesịrị ime? Pọl dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Mụrụnụ anya, chetakwanụ na kemgbe afọ atọ, akwụsịghị m iji anya mmiri na-adụ onye ọ bụla n’ime unu ọdụ, ehihie na abalị.”—Ọrụ 20:29-31.
19. Gịnị mere n’ihe dị ka afọ iri isii Jizọs nwụchara, gịnịkwa mere mgbe ọtụtụ iri afọ gachara?
19 “Anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri” batara n’ọgbakọ n’ihe dị ka afọ iri isii Jizọs nwụchara. N’ihe dị ka afọ 98 O.N.K., Jọn onyeozi dere, sị: “E nweedịla ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst ugbu a. . . . Ha si n’ebe anyị nọ pụọ, ma anyị na ha abụghị otu; n’ihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara eso anyị nọrọ.” (1 Jọn 2:18, 19) Ihe dị ka narị afọ abụọ (200) Jizọs nwụchara, e nwere ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ. Ihe a mere ka e nwee Ndị Kraịst adịgboroja nakwa ndị ụkọchukwu ha. N’ihe dị ka narị afọ atọ (300) Jizọs nwụchara, eze ukwu bụ́ Kọnstantin kwadoro Ndị Kraịst adịgboroja ahụ. Ndị isi okpukpe ‘kwuru ihe ndị na-abụghị eziokwu’ mgbe ha nabatara ememme ndị ọgọ mmụọ, sịzie na ha bụ ememme Ndị Kraịst. Chọọchị dị iche iche e nwere taa ka na-eso nkụzi na omenala ụgha ndị ahụ.
20, 21. Olee otú Pọl si gosi na ya ji obi ya niile jeere ọgbakọ ozi, oleekwa otú ndị okenye ọgbakọ n’oge a ga-esi na-eme ka ya?
20 Ihe Pọl mere dị ezigbo iche n’ihe ndị ahụ ga-emecha rigbuo ìgwè atụrụ Chineke ga-eme. Ọ rụrụ ọrụ ego iji na-egboro onwe ya mkpa ya, ka ọ ghara ibo ọgbakọ ibu arọ. Ihe mere o ji jeere Ndị Kraịst ibe ya ozi abụghị maka na ọ chọrọ irite ihe n’aka ha. Pọl gbara ndị okenye si Efesọs ume ka ha jiri obi ha niile na-emere ụmụnna ha ihe ọma. Ọ gwara ha, sị: “Unu kwesịrị inyere ndị na-adịghị ike aka. Unu kwesịkwara ịna-echeta ihe Onyenwe anyị Jizọs kwuru. Ọ sịrị: ‘A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.’”—Ọrụ 20:35.
21 N’oge anyị a, ndị okenye ọgbakọ na-eme ka Pọl. Ha ji obi ha niile na-arụrụ ụmụnna ha ọrụ. Ha anaghị eme ka ndị ụkọchukwu, bụ́ ndị na-erigbu ìgwè atụrụ ha. Ndị e nyere ọrụ ‘ịzụ ọgbakọ Chineke’ na-eji obi ha niile arụ ọrụ. Nganga na oké ọchịchọ ekwesịghị ịdị n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’ihi na ndị ‘na-achọ ka a na-eto ha’ ga-emecha kụọ afọ n’ala. (Ilu 25:27) Naanị ihe mpako na-ebute bụ mmechuihu.—Ilu 11:2.
22. Gịnị mere ndị okenye si Efesọs ji hụ Pọl n’anya?
22 Otú Pọl si jiri obi ya niile hụ ụmụnna ya n’anya mere ka ha hụ ya n’anya. N’eziokwu, mgbe oge ruru ka ọ laa, “ha niile malitere ibe ezigbo ákwá, ha makụkwara” ya “ma susuo ya ọnụ.” (Ọrụ 20:37, 38) Ndị Kraịst anaghị eji ndị na-ebu mkpa atụrụ Chineke n’isi ka Pọl egwuri egwu, ha na-ahụkwa ha n’anya. Ugbu a anyị lebachara anya n’ihe Pọl mere, ọ̀ bụ na i kwetaghị na o kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi”?—Ọrụ 20:26.
a Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Akwụkwọ Ozi Ndị Pọl Nọ na Masedonia Dee.”
b O nwere ike ịbụ n’oge a Pọl gara Kọrịnt ka o dere akwụkwọ ozi o zigaara Ndị Rom.
c Gụọ igbe bụ́ “ Pọl Bugaara Ụmụnna Onyinye E Ji Enyere Ha Aka.”
d Ọ ga-abụ na ihe mere Luk ji kwuo “anyị” n’Ọrụ Ndịozi 20:5, 6 bụ na o sooro Pọl na Filipaị mgbe Pọl hapụchara ya ebe ahụ n’oge gara aga.—Ọrụ 16:10-17, 40.