Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 22

“Ka Uche Jehova Mee”

“Ka Uche Jehova Mee”

Pọl gara Jeruselem maka na o kpebisiri ike ime uche Chineke

O Si n’Ọrụ Ndịozi 21:1-17

1-4. Gịnị mere Pọl ji aga Jeruselem, gịnịkwa ga-eme ya n’ebe ahụ?

 O WUTERE ụmụnna niile mgbe Pọl na Luk na-ahapụ Maịlitọs, wutekwa Pọl na Luk. O siiri ha ezigbo ike ịhapụ ndị okenye ahụ si Efesọs, bụ́ ndị ha hụrụ n’anya. Ha abụọ banyeziri n’ụgbọ mmiri. Ha bu nri na ihe ndị ọzọ ga-adị ha mkpa maka njem ahụ, burukwa onyinye e nyere maka ụmụnna ndị dara ogbenye na Judia. Ha chọsiri ike ịhụ na onyinye ahụ ruru ụmụnna ndị ahụ aka.

2 Ikuku ji nwayọọ nwayọọ malite ibu ákwà ụgbọ mmiri ha, ụgbọ mmiri ahụ esi n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ na-ekwo ekwo kwọpụ. Pọl na Luk na mmadụ asaa ndị ọzọ ha na ha so nọ na-ele ụmụnna ha ihu ha gbarụchara agbarụ nọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. (Ọrụ 20:4, 14, 15) Pọl na ndị ibe ya nọ na-efere ha aka ruo mgbe ha na-anaghịzi ahụ ha anya.

3 Pọl na ndị okenye Efesọs ahụ arụkọọla ọrụ ọnụ ruo ihe dị ka afọ atọ. Ma ugbu a, ọ na-aga Jeruselem mmụọ nsọ gwara ya gaa. Ọ matụ ihe ga-eme ya n’ebe ahụ. Ọ gwaburu ndị okenye ahụ, sị: “Mmụọ nsọ du m na-aga Jeruselem, n’agbanyeghị na amaghị m ihe ga-eme m ebe ahụ, naanị na si n’obodo ruo n’obodo, mmụọ nsọ na-agbara m àmà ugboro ugboro na a ga-atụ m mkpọrọ, kpagbuokwa m.” (Ọrụ 20:22, 23) N’agbanyeghị na ihe nwere ike ime Pọl, o kwetara ka ‘mmụọ nsọ duo ya,’ ya bụ, o ji obi ya niile kpebie ịga Jeruselem dị ka mmụọ nsọ gwara ya. Ndụ dị ya ụtọ, ma ime uche Chineke bụ ihe kacha ya mkpa.

4 Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, anyị ji obi anyị niile kwe ya nkwa na ime uche ya ga-abụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Ileba anya n’ihe Pọl onyeozi mere ga-abara anyị uru.

Ha Gafere “Agwaetiti Saịprọs” (Ọrụ 21:1-3)

5. Olee ebe Pọl na ndị ibe ya si gaa Taya?

5 Ụgbọ mmiri ahụ Pọl na ndị ibe ya banyere ‘gawara n’akwụsịghị akwụsị.’ Ihe ọ pụtara bụ na ifufe bu ya na-aga ngwa ngwa ruo mgbe ha ruru n’obodo Kọs n’otu ụbọchị ahụ. (Ọrụ 21:1) Ọ ga-abụ na ụgbọ mmiri ahụ kwụsịtụrụ ebe ahụ ruo echi ya tupu ya agawa Rods na Patara. Na Patara, nke dị n’akụkụ oké osimiri ndịda Eshia Maịnọ, ụmụnna ndị ahụ banyere n’otu nnukwu ụgbọ mmiri na-ebu ibu, ya eburuo ha Taya, nke dị na Finishia. Ka ha na-aga, ha gafere “agwaetiti Saịprọs n’aka ekpe.” (Ọrụ 21:3) Gịnị mere Luk bụ́ onye dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ji kwuo na ha gafere Saịprọs?

6. (a) Olee ihe mere ịhụ Saịprọs nwere ike iji gbaa Pọl ume? (b) Mgbe ị tụgharịrị uche n’otú Jehova sirila gọzie gị ma nyere gị aka, gịnị ka ị chọpụtara?

6 Ọ ga-abụ na Pọl tụrụ agwaetiti ahụ aka ma kọọ ihe mere ya n’ebe ahụ. N’oge mbụ ọ gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ, n’ihe dị ka afọ itoolu tupu mgbe ahụ, ya na Banabas na Jọn Mak hụrụ otu dibịa afa aha ya bụ Elimas n’ebe ahụ, bụ́ onye nọ na-enye ha nsogbu. (Ọrụ 13:4-12) O nwere ike ịbụ na ịhụ agwaetiti ahụ na icheta ihe mere n’ebe ahụ gbara Pọl ume ma mee ka obi sie ya ike n’agbanyeghị ihe ga-eme ya na Jeruselem. Anyị nwekwara ike irite uru ma ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’otú Chineke sirila gọzie anyị ma nyere anyị aka idi ọnwụnwa. Ịtụgharị uche otú a nwere ike ime ka obi dị anyị otú ahụ ọ dị Devid mgbe o dere, sị: “Ọtụtụ nsogbu na-abịara onye ezi omume, ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.”​—Ọma 34:19.

“Anyị Chọwara Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Nọ Ebe Ahụ Wee Chọta Ha” (Ọrụ 21:4-9)

7. Gịnị ka Pọl na ndị ibe ya mere mgbe ha ruru Taya?

7 Pọl ghọtara na ọ na-abara Ndị Kraịst uru ma ha na Ndị Kraịst ibe ha na-anọkọ, ọ chọsikwara ike ka ya na ha nọkọọ. Luk dere na mgbe ha ruru Taya, ha “chọwara ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ wee chọta ha.” (Ọrụ 21:4) Ebe Pọl na ndị ibe ya ma na Ndị Kraịst ibe ha bi na Taya, ha chọrọ ha ma chọta ha. Ọ ga-abụkwa na ha nọrọ na nke ha. Otu n’ime ezigbo ngọzi anyị nwere maka na anyị na-efe Jehova bụ na n’ebe ọ bụla anyị gara, anyị ga-ahụ ụmụnna anyị ndị ga-anabata anyị. Ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-efe ya ezigbo ofufe na-enwe ndị enyi n’ụwa niile.

8. Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta Ọrụ Ndịozi 21:4?

8 Mgbe Luk na-akọ banyere ụbọchị asaa ha nọrọ na Taya, o dere ihe nwere ike iju mmadụ anya. O dere, sị: “N’ihi ihe mmụọ nsọ mere ka ụfọdụ ụmụnna [ndị bi na Taya] mara, ha gwara Pọl ugboro ugboro ka ọ ghara ịkpa ụkwụ na Jeruselem.” (Ọrụ 21:4) Ọ̀ pụtara na Jehova agbanweela obi ya? Ọ̀ na-agwa Pọl ugbu a ka ọ hapụ ịga Jeruselem? Mba. Mmụọ nsọ ebula ụzọ mee ka Pọl mata na a ga-emesi ya ike na Jeruselem, ọ bụghị na o kwesịghị ịga obodo ahụ. Ọ ga-abụ na mmụọ nsọ mere ka ụmụnna ndị nọ na Taya kwuo n’eziokwu na Pọl ga-enwe nsogbu na Jeruselem. N’ihi ya, ebe ọ bụ na ha na-echere Pọl echiche ọma, ha rịọrọ ya ka ọ ghara ịga n’obodo ahụ. O doro anya na ha achọghị ka ihe na-aga ime Pọl mee ya. Ma Pọl gawara Jeruselem n’ihi na o kpebisiri ike ime uche Jehova.​—Ọrụ 21:12.

9, 10. (a) Mgbe ụmụnna nọ na Taya nọ na-arịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem, olee ihe ọ ga-abụ na o chetara? (b) Olee ihe ndị mmadụ na-achọkarị n’ụwa taa, oleekwa otú o si dị iche n’ihe Jizọs kwuru?

9 Mgbe ụmụnna nọ na-arịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem, ọ ga-abụ na o chetara na ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara Jizọs ụdị ihe a mgbe ọ gwara ha na ya ga-aga Jeruselem, na a ga-ata ya ezigbo ahụhụ ma gbuo ya. N’oge ahụ, Pita meteere Jizọs ebere ma sị ya: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị. Ihe a agaghị eme gị.” Ma, Jizọs gwara ya, sị: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị na-achọ imegharị m anya, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama ọ bụ nke mmadụ.” (Mat. 16:21-23) Jizọs kpebisiri ike ime uche Chineke nakwa iji ndụ ya chụọ àjà. Otú ahụ ka ọ dịkwa Pọl. O doro anya na ụmụnna nọ na Taya cheere Pọl echiche ọma otú ahụ Pita onyeozi cheere Jizọs. Ma, ha aghọtaghị na ọ bụ uche Chineke ka Pọl gaa Jeruselem.

Onye chọrọ iso ụzọ Jizọs ga-adị njikere iji ndụ ya niile jeere Chineke ozi

10 Taa, ọtụtụ ndị na-achọ ime ihe na-agaghị esiri ha ike, ọ bụrụgodị na ihe ahụ adịghị mma. Ndị mmadụ na-achọkarị ịnọ n’okpukpe ga-enye ha ohere ịna-eme otú masịrị ha. Ma, ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya dị nnọọ iche. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya ma buru osisi ịta ahụhụ ya na-eso m mgbe niile.” (Mat. 16:24) Iso Jizọs bụ ihe kacha mma onye ma ihe kwesịrị ime, ma ime ya adịghị mfe.

11. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Taya si gosi na ha hụrụ Pọl n’anya ma na-akwado ya?

11 N’oge na-adịghị anya, oge ruru ka Pọl, Luk, na ndị ọzọ ha na ha so gawa ebe ha na-aga. Ihe mere mgbe ha chọrọ ịgawa na-emetụ n’ahụ́. O gosiri otú ụmụnna nọ na Taya si hụ Pọl n’anya nakwa otú ha si na-akwadosi ozi ya ike. Ha so Pọl na ndị ibe ya rute n’akụkụ osimiri, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka. Ha niile gburu ikpere n’ala, kpee ekpere ma sị ya gaa nke ọma. Mgbe e mechara, Pọl, Luk, na ndị ha na ha so banyere n’ụgbọ mmiri ọzọ gawa Tọlemeis. Ha gakwuuru ụmụnna n’ebe ahụ, ha na ha anọọ otu ụbọchị.​—Ọrụ 21:5-7.

12, 13. (a) Olee otú Filip si jiri obi ya niile jee ozi ọtụtụ afọ? (b) Olee otú Filip si bụrụ onye Ndị Kraịst bụ́ nna kwesịrị iṅomi taa?

12 Ihe ọzọ Luk kọrọ bụ na Pọl na ndị ibe ya gawara Sizaria. Ozugbo ha ruru ebe ahụ, ha “banyere n’ụlọ Filip onye na-ezisa ozi ọma.” a (Ọrụ 21:8) Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ ha ụtọ ịhụ Filip. N’ihe dị ka afọ iri abụọ gara aga na Jeruselem, ndịozi họpụtara ya ka o nye aka na-ekesa ihe oriri n’ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ malitere ọhụrụ. Filip ejirila ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ọtụtụ afọ. Cheta na mgbe mkpagbu chụsasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs, Filip gara Sameria malite ikwusa ozi ọma. O mechara zie onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ ozi ọma, meekwa ya baptizim. (Ọrụ 6:2-6; 8:4-13, 26-38) N’eziokwu, o ji obi ya niile jee ozi ọtụtụ afọ.

13 Izisa ozi ọma ka na-anụ Filip ọkụ n’obi. Luk kpọrọ ya “onye na-ezisa ozi ọma.” O gosiri na ọ ka na-ekwusasi ozi ọma ike na Sizaria, bụ́ ebe o bizi. Anyị mụtakwara na o nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-ebu amụma, nke gosiri na ha so nzọụkwụ nna ha. b (Ọrụ 21:9) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na Filip rụsiri ọrụ ike iji mee ka ndị ezinụlọ ya na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Taa, Ndị Kraịst bụ́ nna kwesịrị ịna-eme ka ya, na-ebute ụzọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma, na-enyekwara ụmụ ha aka iji ọrụ a kpọrọ ihe.

14. Olee uru nleta Pọl letara ụmụnna ya bara, oleekwa ohere ndị yiri ya anyị na-enwe taa?

14 N’ebe ọ bụla Pọl gara, ọ chọtara ụmụnna ya, ya na ha anọtụ. N’eziokwu, obi dị ụmụnna ndị bi n’obodo ndị ahụ ụtọ ile Pọl na ndị ibe ya ọbịa. O doro anya na nleta ahụ o letara ha mere ka ha ‘gbaa Pọl ume, ya agbaakwa ha.’ (Rom 1:11, 12) Anyị na-enwekwa ụdị ohere a taa. Ọ bụrụ na ị nabata ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha n’ụlọ gị, ọ bụrụgodị na ụlọ gị abụghị ụlọ ndị ukwu, ị ga-erite ọtụtụ uru.​—Rom 12:13.

“Adị M Njikere . . . Ịnwụ” (Ọrụ 21:10-14)

15, 16. Olee ozi Agabọs ji bịa, oleekwa otú o mere ka obi dị ndị nụrụ ya?

15 N’oge Pọl nọ n’ụlọ Filip, onye ọbịa ọzọ a na-akwanyere ùgwù aha ya bụ Agabọs bịara. Ndị zukọtara n’ụlọ Filip ma na Agabọs bụ onye amụma. Ọ bụ ya buru amụma na a ga-enwe oké ụnwụ n’oge Klọdiọs na-achị. (Ọrụ 11:27, 28) O nwere ike ịbụ na ha na-eche ugbu a, sị: ‘Gịnị mere Agabọs ji bịa? Olee ozi ọ bịara izi?’ Ka ha nọ na-ele ya anya, ọ chịịrị ájị̀ Pọl, ya bụ, ákwà dị ogologo a na-eke n’úkwù, nke e nwere ike itinye ego na ihe ndị ọzọ. Agabọs ji ya kee aka ya na ụkwụ ya. O kwuziri ihe na-emetụ n’ahụ́, sị: “Chineke ji mmụọ nsọ kwuo, sị: ‘Otú a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ájị̀ a agbụ na Jeruselem ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.’”​—Ọrụ 21:11.

16 Amụma ahụ o buru gosiri na Pọl ga-aga Jeruselem. O gosikwara na ndị Juu nọ n’ebe ahụ ‘ga-enyefe ya n’aka ndị mba ọzọ.’ Amụma ahụ metụrụ ndị nọ ebe ahụ n’ahụ́. Luk dere, sị: “Mgbe anyị nụrụ ihe a, ma anyịnwa ma ndị ebe ahụ malitere ịrịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem. Ma ọ sịrị: ‛Gịnị mere unu ji na-ebe ákwá? Gịnịkwa mere unu ji na-eme ka obi ghara isi m ike? Ka o doo unu anya na adị m njikere ka e kee m agbụ, dịkwa njikere ịnwụ na Jeruselem n’ihi aha Onyenwe anyị Jizọs.’”​—Ọrụ 21:12, 13.

17, 18. Olee otú Pọl si gosi na o kpebisiri ike ime uche Chineke, oleekwa ihe ụmụnna mere?

17 Weregodị ya na ị nọ ebe ahụ. Ụmụnna ndị ahụ, ma Luk, nọ na-arịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem. Ụfọdụ nọkwa na-ebe ákwá. Pọl hụrụ na ha na-echebara ya echiche. N’ihi ya, o medara obi gwa ha na ha na-eme ka ‘obi ghara isi ya ike’ ma ọ bụkwanụ na ‘ha na-eme ka obi gbawaa ya’ dị ka e si sụgharịa ya na Baịbụl ụfọdụ. N’agbanyeghị ya, o kpebisiri ike ịga. O mekwara ihe o meburu mgbe ya na ụmụnna nọ na Taya zukọrọ, o kweghị ka arịrịọ ma ọ bụ ákwá ụmụnna ahụ na-ebe mee ka obi daa ya mbà. Kama ikwe ka obi daa ya mbà, ọ kọwaara ha ihe mere ọ ga-eji gaa. O gosiri na o nwere ezigbo obi ike. Pọl kpebisiri ike ịga Jeruselem otú Jizọs meburu. (Hib. 12:2) Pọl achọghị ka e gbuo ya n’ihi okwukwe ya. Ma, ọ bụrụ na e gbuo ya, ọ ga-ewere ya ka ihe ùgwù ịnwụ maka na ọ bụ onye na-eso ụzọ Kraịst Jizọs.

18 Oleezi ihe ụmụnna ahụ mere? E kwuo ya ná nkenke, ha kwanyeere Pọl ùgwù. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe anyị hụrụ na anyị agaghị agbanweli obi ya, anyị kwụsịrị ịgwa ya ka ọ ghara ịga. Anyị sịkwara: ‛Ka uche Jehova mee.’” (Ọrụ 21:14) Ndị ahụ gbalịrị ime ka Pọl ghara ịga Jeruselem esighị ọnwụ na Pọl ga-emerịrị ihe ha kwuru. Ha gere Pọl ntị ma kweta ihe o kwuru. Ha nabatara ihe o kwuru ma ghọta na ọ bụ uche Jehova n’agbanyeghị na o siiri ha ike ime otú ahụ. Pọl amalitela njem nke ga-emecha kpatara ya ọnwụ. Ihe ga-akara ya mfe ma ọ bụrụ na ndị ahụ hụrụ ya n’anya akụdaghị ya obi.

19. Olee ihe bara uru anyị na-amụta n’ihe mere Pọl?

19 Anyị mụtara ezigbo ihe n’ihe Pọl mere. Ọ na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ime ka ndị ji ndụ ha niile na-ejere Chineke ozi daa mbà. Ma, ọ bụghị naanị n’okwu ọnwụ na ndụ ka anyị ga-amụta ihe n’ihe Pọl mere, kama e nwere ọtụtụ ihe ọ na-akụziri anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na ọ na-esiri ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ nne na nna ike ịhụ ka ụmụ ha hapụrụ ụlọ ma gaa n’ebe dị anya ijere Jehova ozi, ma ha kpebisiri ike na ha agaghị akụda ha obi. E nwere otu nwanna nwaanyị bi n’Ịngland aha ya bụ Phyllis. O chetara otú obi dị ya mgbe naanị otu nwa nwaanyị ọ mụtara gara ikwusa ozi ọma n’Afrịka. Phyllis kwuru, sị: “Amaghị m otú obi dị m adị mgbe ahụ. Ọ dịrịghị m mfe na ọ ga-aga ije ozi n’ebe dị ezigbo anya. O wutere m, ma eji m ya eme ọnụ. M kpere ekpere banyere ya ọtụtụ mgbe. Ma, ọ bụ mkpebi ya, o nweghịkwa mgbe m gbalịrị ịgwa ya lọta. A sị ka e kwuwe, m na-akụziri ya mgbe niile ka ihe gbasara Alaeze Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ ya. O jeela ozi ná mba dị iche iche kemgbe afọ iri atọ ugbu a. Ana m ekelekwa Jehova kwa ụbọchị na ọ na-erubere Jehova isi.” Anyị na-eme ihe dị mma ma ọ bụrụ na anyị na-agba ụmụnna anyị ume ka ha jiri ndụ ha niile na-ejere Chineke ozi.

Ọ dị mma ịgba ụmụnna anyị ndị ji ndụ ha niile na-ejere Chineke ozi ume

“Ụmụnna Ji Ọṅụ Nabata Anyị” (Ọrụ 21:15-17)

20, 21. Olee ihe gosiri na Pọl chọrọ ka ya na ụmụnna ya na-anọ, oleekwa ihe mere o ji chọọ ka ya na ha na-anọ?

20 Mgbe Pọl na ndị ibe ya kwadebechara, ha gawara. Ụmụnna ha ndị si Sizaria sokwa ha iji gosi na ha ji obi ha niile kwado ha. N’ebe ọ bụla Pọl na ndị ibe ya rutere ka ha na-aga Jeruselem, ha na-achọta ụmụnna ha, ha na ha anọọ. Mgbe ha rutere Taya, ha hụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha na ha anọọ ụbọchị asaa. Na Tọlemeis, ha gara kelee ụmụnna ha, ha na ha anọọ otu ụbọchị. Na Sizaria, ha nọrọ abalị ole na ole n’ụlọ Filip. Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị si Sizaria, sokwa Pọl na ndị ibe ya ruo Jeruselem. Na Jeruselem, a kpọgara ha n’ụlọ Minesin, bụ́ otu n’ime ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Luk kwuziri na mgbe ha ruru Jeruselem, “ụmụnna ji ọṅụ nabata” ha.​—Ọrụ 21:17.

21 N’eziokwu, Pọl chọrọ ka ya na ụmụnna ya nọrọ. Ụmụnna ya gbara ya ume, ụmụnna anyị na-emekwa otú ahụ taa. O doro anya na ume ahụ a gbara Pọl mere ka obi kaa ya mgbe ìgwè mmadụ iwe ji chọrọ igbu ya.