Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 3

‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’

‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’

Ihe mmụọ nsọ a wụkwasịrị ha na Pentikọst mere ka ha mee

O Si n’Ọrụ Ndịozi 2:1-47

1. Kọwaa otú ihe na-adị n’ụbọchị Ememme Pentikọst.

 MKPỌTỤ nọ na-eme n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. Obi dị mmadụ niile ụtọ. a Anwụrụ ọkụ si n’ebe ịchụàjà dị n’ụlọ nsọ na-akwụgo elu ka ndị Livaị na-abụ abụ Halel (ya bụ, Abụ Ọma 113 ruo 118), nke ndị Izrel ji eto Jaa n’oge ememme. Ọ ga-abụ na otú ha si na-abụ ya bụ ụfọdụ ndị bụọ, ndị ọzọ ekweere ha. Ndị si ebe dị iche iche dị ezigbo anya juru okporo ámá niile. Ha si ebe ndị dị ka Ịlam, Mesopotemia, Kapadoshia, Pọntọs, Ijipt, na Rom. b Gịnị ka ha bịara ime? Ọ bụ Ememme Pentikọst. A na-akpọkwa ya ‘ụbọchị ememme mkpụrụ mbụ kara aka.’ (Ọnụ Ọgụ. 28:26) A na-eme ememme a kwa afọ iji gosi na oge ịghọ ọka bali agwụla nakwa na a malitela ịghọ ọka wit. Ọ na-abụ ụbọchị ọṅụ.

2. Olee ihe dị egwu mere na Pentikọst afọ 33 O.N.K.?

2 N’ihe dị ka elekere itoolu n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, n’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 O.N.K., e nwere ihe merenụ nke a ga na-echeta ruo ọtụtụ narị afọ na-abịanụ. Na mberede, a nụrụ “ụzụ si n’eluigwe nke dị ka ụzụ oké ifufe.” (Ọrụ 2:2) A nụrụ ụzụ a n’ebe niile n’ụlọ ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ (120) zukọtara. Ihe dị egwu meziri. A hụrụ ihe ndị dị ka ire ọkụ, otu dịkwa n’isi onye nke ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs. c ‘Ha wee jupụta na mmụọ nsọ.’ Ha malitekwara ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche ndị mba ọzọ na-asụ. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs si n’ụlọ ahụ pụta, o juru ndị ahụ si esi bịa nọ n’okporo ámá Jeruselem anya, n’ihi na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-agwa ha okwu. N’eziokwu, onye ọ bụla n’ime ha na-anụ ka ha “na-ekwu okwu n’asụsụ nke ya.”​—Ọrụ 2:1-6.

3. (a) Gịnị mere Pentikọst nke afọ 33 O.N.K. ji bụrụ ụbọchị dị ezigbo mkpa n’ezigbo ofufe? (b) Olee otú Pita si jiri otu n’ime “mkpịsị ugodi Alaeze” rụọ ọrụ n’okwu o kwuru na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K.?

3 Akụkọ a na-emetụ n’ahụ́ gosiri na e nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ mere n’ezigbo ofufe, ya bụ, na e nweela “Izrel nke Chineke,” bụ́ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ. (Gal. 6:16) Ma e nwekwara ihe ndị ọzọ dị mkpa merenụ. Mgbe Pita na-agwa ìgwè mmadụ okwu n’ụbọchị ahụ, o ji otu n’ime ‘mkpịsị ugodi atọ nke alaeze’ rụọ ọrụ. E nwere ndị mkpịsị ugodi nke ọ bụla ga-eme ka ha nweta ngọzi pụrụ iche. (Mat. 16:18, 19) Mkpịsị ugodi nke mbụ a mere ka ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu nabata ozi ọma, e jirikwa mmụọ nsọ Chineke tee ha mmanụ. d N’ihi ya, ha ga-eso n’Izrel nke Chineke, nweekwa olileanya ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà ga-achị n’Alaeze Mezaya. (Mkpu. 5:9, 10) Ka oge na-aga, ndị Sameria na ndị Jentaịl ga-enwetakwa ihe ùgwù a. Gịnị ka Ndị Kraịst taa ga-amụta n’ihe ndị ahụ dị mkpa mere na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K.?

“Ndị Niile Na-eso Ụzọ Jizọs Zukọrọ Otu Ebe” (Ọrụ 2:1-4)

4. Olee otú ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge a si na-arụ ọrụ ọgbakọ Ndị Kraịst nke malitere n’afọ 33 O.N.K. rụrụ?

4 Mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst malitere, ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ (120). Ha ‘niile zukọrọ otu ebe,’ n’ọnụ ụlọ dị n’elu. E jikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ. (Ọrụ 2:1) Tupu chi ejie n’ụbọchị ahụ, e mere ọtụtụ puku mmadụ baptizim n’ọgbakọ ahụ. Ọ bụ otú a ka nzukọ a si malite ịmụba n’ike n’ike ruo taa. N’eziokwu, ọ bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke, ya bụ, ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge a, na-ekwusa “ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà” tupu ọgwụgwụ abịa.​—Mat. 24:14.

5. Ọ bụrụ na mmadụ nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi ma ọ bụkwanụ n’oge a, olee ngọzi ọ ga-enweta?

5 Ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-enyekwara ndị nọ na ya aka ma na-eme ka okwukwe ha sie ike, ma ndị e tere mmanụ ma ndị ga-emecha bụrụ “atụrụ ọzọ.” (Jọn 10:16) Mgbe Pọl na-edegara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ozi, o gosiri na obi dị ya ụtọ maka otú ha si enyere ibe ha aka. O dere, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, ka m nye unu onyinye si n’aka Chineke ka unu wee guzosie ike, ma ọ bụ, e kwuo ya otú ọzọ, ka unu jiri okwukwe unu gbaa m ume, mụnwa ejirikwa okwukwe nke m gbaa unu ume.”​—Rom 1:11, 12.

6, 7. Olee otú ọgbakọ Ndị Kraịst taa si na-arụ ọrụ Jizọs nyere ka e kwusaara ndị mba niile ozi ọma?

6 Ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge a na-arụ otu ọrụ ahụ e nyere ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi. Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ tara akpụ ha ga-arụ. Ma, ọrụ a na-eme obi ụtọ. Ọ gwara ha, sị: ‘Meenụ ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.’​—Mat. 28:19, 20.

7 Chineke ji ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ a taa. N’eziokwu, ikwusara ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ozi ọma adịghị mfe. Ma, Ndịàmà Jehova ebipụtala akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị otu puku (1,000) asụsụ. Ọ bụrụ na ị na-agachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya, na-ekwusa ozi ọma Alaeze ma na-eme ndị na-eso ụzọ, obi kwesịrị ịna-atọ gị ụtọ. I so na mmadụ ole na ole nọ n’ụwa taa ndị nwere ihe ùgwù ịgbara aha Jehova àmà nke ọma.

8. Olee otú e si gọzie onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ?

8 Jehova Chineke nyere gị ụmụnna ndị nọ n’ebe niile n’ụwa iji nyere gị aka iji ọṅụ na-atachi obi n’oge a dị oké egwu. Pọl degaara Ndị Kraịst bụ́ Ndị Hibru akwụkwọ ozi, sị: ‘Ka anyị na-echebara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ. Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị otú ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume ma na-emekwu ihe ndị a ebe anyị na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.’ (Hib. 10:24, 25) Ọgbakọ Ndị Kraịst bụ onyinye Jehova nyere gị ka i nwee ike ịna-agba ndị ọzọ ume, ha ana-agbakwa gị ume. Nọrọ ụmụnna gị nso. Ahapụkwala ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.

‘Onye Ọ Bụla Nụrụ Ka A Na-ekwu Okwu n’Asụsụ nke Ya’ (Ọrụ 2:5-13)

“Anyị na-anụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ anyị banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.”—Ọrụ 2:11

9, 10. Olee otú ụfọdụ ndị sirila wepụta onwe ha ikwusara ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma?

9 Chegodị otú obi si tọọ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu ụtọ na Pentikọst nke afọ 33 O.N.K. Ọ ga-abụ na e nwere otu asụsụ ọtụtụ n’ime ndị ahụ bịara ememme ahụ na-asụ. O nwere ike ịbụ Grik ma ọ bụ Hibru. Ma ugbu a, “onye ọ bụla nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ nke ya.” (Ọrụ 2:6) Ọ ga-abụrịrị na ozi ọma ahụ ha nụrụ n’asụsụ obodo ha ruru ha n’obi. Ọ bụ eziokwu na e nyeghị Ndị Kraịst nke oge a onyinye isi n’ụzọ ọrụ ebube na-asụ asụsụ ndị obodo ọzọ, ma ọtụtụ n’ime ha ewepụtala onwe ha ikwusara ndị mba niile ozi ọma Alaeze Chineke. Olee otú ha si eme ya? Ụfọdụ amụọla asụsụ ọzọ ka ha nwee ike ije ozi n’ọgbakọ dị nso nke na-amụ ihe n’asụsụ obodo ọzọ. Ụfọdụ akwagadịla ná mba ọzọ. Ọtụtụ n’ime ha achọpụtala na mbọ ha na-agba na-amasị ndị ha na-ezi ozi ọma.

10 Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Christine na ụmụnna asaa ndị ọzọ malitere ịmụ asụsụ Gujerati. Mgbe ọ hụrụ otu nwa agbọghọ ya na ya na-arụkọ ọrụ, onye na-asụ asụsụ Gujerati, o kelere ya n’asụsụ ha. Obi tọrọ nwa agbọghọ ahụ ụtọ, ya achọọkwa ịma ihe mere Christine ji na-agbalị ịmụta asụsụ Gujerati. Christine ziri ya ozi ọma nke ọma. Ọ gwara Christine, sị: “O nweghị okpukpe ọzọ ga-agwali ndị òtù ya ka ha mụọ asụsụ a tara akpụ. A ga-enwerịrị ihe dị mkpa ị chọrọ ikwu.”

11. Olee otú anyị ga-esi jikere ejikere izisara ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke?

11 N’eziokwu, ọ bụghị anyị niile ga-amụli asụsụ ọzọ. Ma, anyị nwere ike jikere ejikere izisara ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke. Olee otú anyị ga-esi ejikere? Otu ụzọ bụ iji ihe a na-akpọ JW Language® app mụta otú e si ekele ekele n’asụsụ a na-asụkarị n’ebe anyị bi. I nwere ike ịmụta okwu ole na ole n’asụsụ ahụ bụ́ ndị nwere ike ime ka ndị mmadụ nwee mmasị ịmụ banyere Chineke. Gwa ha banyere jw.org. I nwekwara ike igosi ha vidio na akwụkwọ dị iche iche e nwere n’asụsụ ha. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị a na-enyere ndị mmadụ aka n’ozi ọma, anyị nwere ike inwe ụdị ọṅụ ahụ ụmụnna anyị dịrị ndụ n’oge ndịozi nwere mgbe o juru ndị si mba ndị ọzọ anya ka a na-ezi “onye ọ bụla” n’ime ha ozi ọma “n’asụsụ nke ya.”

‘Pita Biliri Ọtọ’ (Ọrụ 2:14-37)

12. (a) Olee amụma Joel buru nke ihe ebube ahụ mere na Pentikọst afọ 33 O.N.K. mezuru? (b) Gịnị mere ndị na-ezo ụzọ Jizọs ji tụọ anya na amụma Joel buru ga-emezu n’oge ndịozi?

12 ‘Pita biliri ọtọ’ ịgwa ìgwè mmadụ ahụ si mba dị iche iche okwu. (Ọrụ 2:14) Ọ kọwaara ndị niile chọrọ ige ntị na ọ bụ Chineke rụrụ ọrụ ebube mere ka ha sụọ asụsụ dị iche iche iji mezuo amụma Joel buru, sị: “M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị mmadụ ọ bụla.” (Joel 2:28) Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “M ga-arịọkwa Nna m, ọ ga-enye unu ihe inyeaka ọzọ.” Jizọs kwuru na ihe inyeaka ahụ bụ ‘mmụọ nsọ.’​—Jọn 14:16, 17.

13, 14. Olee otú Pita si mee ka okwu ya ruo ndị ọ gwara okwu n’obi, oleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya?

13 Pita gwaziri ìgwè mmadụ ahụ hoo haa, sị: “Ka ndị Izrel niile mara n’eziokwu na Chineke mere ka Jizọs a unu kpọgidere n’osisi bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.” (Ọrụ 2:36) N’eziokwu, ọtụtụ n’ime ndị ahụ Pita gwara okwu anọghị mgbe a kpọgburu Jizọs n’osisi ịta ahụhụ. Mana, ebe ọ bụ na ha so ná mba Izrel, mmehie ahụ dị ha n’isi. Ị̀ hụrụ na Pita kwanyeere ndị Juu ibe ya ùgwù mgbe ọ na-agwa ha okwu, kwuokwa okwu ahụ otú ruru ha n’obi? Ihe Pita bu n’obi bụ ime ka ndị na-ege ya ntị chegharịa, ọ bụghị ịma ha ikpe. Ihe ahụ Pita kwuru ò were ìgwè mmadụ ahụ iwe? Mbanụ! Kama, “o wutere ha nnọọ.” Ha ajụọ, sị: “Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” O nwere ike ịbụ na otú ahụ Pita si kwanyere ha ùgwù mgbe ọ na-agwa ha okwu mere ka ihe ọ na-ekwu ruo ọtụtụ n’ime ha n’obi, ha echegharịa.​—Ọrụ 2:37.

14 Anyị nwere ike ịna-ekwu okwu na-eru ndị mmadụ n’obi ka Pita. Mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, anyị ekwesịghị ikwu okwu n’ihe niile na-abụghị eziokwu onyenwe ụlọ kwuru. Kama, ọ ka mma ikwu okwu n’ihe anyị na ya nwere otu olu na ya. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị nweziri ike iji akọ mee ka ha ghọta Okwu Chineke. Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na anyị esi otú ahụ na-akọwa eziokwu ndị dị na Baịbụl, ọ ga-aka adịrị ndị nwere ezi obi mfe ikwere ihe anyị kwuru.

“Ka Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Meekwa Baptizim” (Ọrụ 2:38-47)

15. (a) Olee ihe Pita kwuru, oleekwa ihe mere mgbe o kwuchara ihe ahụ? (b) Gịnị mere ọtụtụ puku mmadụ e ziri ozi ọma na Pentikọst ji ruo eruo ka e mee ha baptizim n’otu ụbọchị ahụ?

15 N’ụbọchị ahụ pụrụ iche bụ́ Pentikọst nke afọ 33 O.N.K., Pita gwara ndị ahụ gere ya ntị, ya bụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu, sị: “Chegharịanụ, ka onye ọ bụla n’ime unu meekwa baptizim.” (Ọrụ 2:38) N’ihi ya, e mere ihe dị ka puku mmadụ atọ (3,000) baptizim. e Ọ ga-abụ n’ọdọ mmiri ndị dị na Jeruselem ma ọ bụ n’ebe dị nso na Jeruselem ka e mere ha baptizim. È mere ha baptizim ahụ oké ngwa ngwa? Akụkọ a ò kwesịrị ime ka ndị a na-amụrụ Baịbụl na ụmụaka nne na nna ha bụ Ndị Kraịst chọwa ka e mee ha baptizim mgbe ha na-erubeghị eru? Mba. Cheta na ndị Juu ahụ na ndị mba ọzọ ahụ na-ekpe okpukpe ndị Juu e mere baptizim n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 O.N.K. na-amụchi Okwu Chineke anya, ha sokwa ná mba nyefere Jehova onwe ha. Ihe ọzọ bụ na ihe gbasara ofufe Chineke na-anụ ha ọkụ n’obi. Ụfọdụ n’ime ha na-aga njem dị ezigbo anya ka ha nwee ike iso mee ememme a a na-eme kwa afọ. Mgbe ha nabatachara eziokwu ndị dị mkpa banyere ọrụ Jizọs Kraịst na-arụ n’imezu uche Chineke, ha dị njikere ịnọgide na-efe Chineke. Ugbu a, ha bụzi ndị na-eso ụzọ Kraịst e mere baptizim.

16. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si jiri ihe ha nwere nyere ibe ha aka?

16 O doro anya na Jehova gọziri ìgwè mmadụ ahụ. Baịbụl sịrị: “Ndị niile ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-anọkọ, na-ekerịtakwa ihe niile ha nwere. Ha na-erekwa ala na ihe ndị ha nwere ma na-ekere mmadụ niile ego ha retere, onye ọ bụla enweta ego ọ ga-eji gboo mkpa ya.” f (Ọrụ 2:44, 45) N’eziokwu, ezigbo Ndị Kraịst niile kwesịrị iṅomi ụdị ịhụnanya ahụ na otú ahụ ha si jiri ihe ha nwere nyere ibe ha aka.

17. Gịnị na gịnị ka mmadụ kwesịrị ime tupu e mee ya baptizim?

17 Akwụkwọ Nsọ gosiri na e nwere ọtụtụ ihe mmadụ ga-eme tupu ya enyefee Chineke onwe ya, e meekwa ya baptizim. Onye ahụ ga-amụrịrị Okwu Chineke. (Jọn 17:3) O kwesịrị igosi na o nwere okwukwe, chegharịa n’ihe ọjọọ ọ na-emebu, gosikwa na ihe ahụ wutere ya. (Ọrụ 3:19) Ọ ga-agbanwezi ma ọ bụ tụgharịa, malitezie ime ihe Chineke chọrọ ka ọ na-eme. (Rom 12:2; Efe. 4:23, 24) Ihe ọzọ ọ ga-eme bụ ikpe ekpere nyefee Chineke onwe ya, e mezie ya baptizim.​—Mat. 16:24; 1 Pita 3:21.

18. Olee ihe ùgwù ndị na-eso ụzọ Kraịst e mere baptizim nwere?

18 Ị̀ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst nyeferela Chineke onwe ya, meekwa baptizim? Ya bụrụ otú ahụ, ka obi dị gị ụtọ maka ihe ùgwù i nwere. Jehova nwere ike iji gị gbaara ndị mmadụ àmà nke ọma, meekwa ka ị na-eme uche ya, otú ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị jupụtara ná mmụọ nsọ mere.

c ‘Ihe ndị ahụ dị ka ire ọkụ’ abụghị ọkụ nkịtị, kama ha dị ka ire ọkụ.” Ọ ga-abụ na ihe a na-egosi na ihe a hụrụ n’isi onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs yiri ọkụ, na-egbukekwa egbuke ka ọkụ.

e Ihe a abụghị mmadụ ole kachanụ e metụrụla baptizim. N’Ọgọst 7, 1993, ná mgbakọ mba niile Ndịàmà Jehova mere na Kiev, Yukren, e mere puku mmadụ asaa na narị anọ na abụọ (7,402) baptizim. O were awa abụọ na nkeji iri na ise iji mechaa ha niile baptizim.

f Ihe a bụ ndokwa na-adịteghị aka e mere iji gbooro ndị ahụ si ebe ndị dị anya bịa Jeruselem mkpa ha maka na ha nọtụkwuru ka ha mụtakwuo banyere otú ọhụrụ a e si efe Chineke. Ụmụnna ndị ahụ ji obi ha nye ndị ọzọ ihe ha nwere. E kwesịghị iche na ihe onye nke ọ bụla nwere bụzi nke mmadụ niile otú a na-eme n’ọchịchị ndị Kọmunist.​—Ọrụ 5:1-4.