Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 2

‘Unu Ga-abụ Ndị Àmà M’

‘Unu Ga-abụ Ndị Àmà M’

Otú Jizọs si kwadebe ndịozi ya ka ha bute ụzọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma

O Si n’Ọrụ Ndịozi 1:1-26

1-3. Olee otú Jizọs si hapụ ndịozi ya, oleekwa ajụjụ ndị e kwesịrị ịza?

 OBI dị ndịozi Jizọs ezigbo ụtọ kemgbe izu ole na ole ugbu a. Ha chọrọ ka ihe dịrị otú a gawa. Mkpọlite a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ mere ka obi kwụsị ịda ha mbà, ha aṅụrịwazie ọṅụ. Kemgbe ụbọchị iri anọ ugbu a, Jizọs apụtala n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro, na-akụzikwuru ha ihe ma na-agba ha ume. Ma, taa ga-abụ ụbọchị ikpeazụ ọ ga-apụta n’ihu ha.

2 Mgbe Jizọs na ndịozi ya guzo n’Ugwu Oliv, ha gere ntị nke ọma n’ihe niile Jizọs na-agwa ha. Mgbe ha na-ama ihe na-emenụ, Jizọs ekwuchaala. Ọ chịliri aka elu ma gọzie ha. Ọ maliteziri ịgbago elu. Ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ele ya anya ka ọ na-agbago na mbara igwe. Ígwé ojii kpuchiri ya, ha ahụghịzi ya. N’agbanyeghị na ọ laala, ha ka nọ na-ele anya n’eluigwe.​—Luk 24:50; Ọrụ 1:9, 10.

3 Ihe a merenụ gbanwere ndụ ndịozi Jizọs. Gịnị ka ha ga-eme ugbu a Nna ha ukwu bụ́ Jizọs Kraịst lara n’eluigwe? Obi kwesịrị isi anyị ike na Nna ha ukwu kwadebere ha akwadebe ka ha rụrụ ọrụ ahụ o bidoro gawa n’ihu. Olee otú o si kwadebe ha ịrụ ọrụ ahụ dị mkpa? Gịnị ka ha mere? Oleekwa otú ọrụ ahụ si gbasa Ndị Kraịst taa? Ọrụ Ndịozi isi 1 zara ajụjụ ndị a otú ga-agba anyị ume.

“Ọ Pụtara n’Ihu Ha Ọtụtụ Ugboro Ka O Doo Ha Anya” (Ọrụ 1:1-5)

4. Olee ihe mbụ Luk dere n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi?

4 Ọ bụ Tiofilọs, onye Luk degaara Oziọma ya, ka ọ gwara ihe mbụ o dere n’Ọrụ Ndịozi. a Akụkọ Luk ji malite Ọrụ Ndịozi bụ ihe ikpeazụ o dere n’akwụkwọ Luk. Naanị ihe dị iche bụ na o kwuru ha ná nkenke, mkpụrụ okwu ha dịtụkwa iche. E nwekwara ihe ọhụrụ ndị ọ gbakwụnyere. Ihe a mere ka o doo anya na o ji akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọtọpụ ihe ọ malitere ịkọ n’Oziọma Luk.

5, 6. (a) Olee ihe ga-eme ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs sie ike? (b) Olee otú o si bụrụ na e nwere ọtụtụ ihe mere ka ihe ezigbo Ndị Kraịst kweere “doo ha anya”?

5 Olee ihe ga-eme ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs sie ike? Ọrụ Ndịozi 1:3 kwuru gbasara Jizọs, sị: “Ọ pụtara n’ihu ha ọtụtụ ugboro ka o doo ha anya na ya dị ndụ.” Na Baịbụl, ọ bụ naanị Luk, bụ́ ‘onye a hụrụ n’anya, onye na-agwọ ọrịa,’ dere okwu a sụgharịrị “ka o doo ha anya.” (Kọl. 4:14) Okwu ahụ bụ okwu a na-ede n’akwụkwọ ahụ́ ike n’oge ochie. Ọ na-egosi na ihe a na-ekwu bụ eziokwu nakwa na e ji ya n’aka. Ọ bụ ụdị ihe a ka Jizọs mere. Ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ugboro. Mgbe ụfọdụ, ọ pụtara n’ihu otu onye ma ọ bụ abụọ, mgbe ụfọdụ, ya apụta n’ihu ndịozi ya niile. Ọ pụtakwara otu ugboro n’ihu ihe karịrị narị mmadụ ise (500) bụ́ ndị na-eso ụzọ ya. (1 Kọr. 15:3-6) N’eziokwu, o mere ka o doo ha anya na ya dị ndụ.

6 Taa, e nwere ọtụtụ ihe mere ka ihe ezigbo Ndị Kraịst kweere “doo ha anya.” È nwere ihe gosiri na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, nwụọ maka mmehie anyị, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ? À na-ajụkwa ajụ? N’Okwu Chineke e si n’ike mmụọ nsọ dee, ndị ji anya ha hụ mgbe ihe ndị a mere kọrọ ihe ha hụrụ. Ihe ndị ha kọrọ mere ka ihe ndị ahụ dokwuo anyị anya. Ịmụ ihe ndị ahụ ha kọrọ na ikpe ekpere rịọ Chineke ka o nyere anyị aka ka anyị ghọta ha ga-eme ka okwukwe anyị sie ezigbo ike. Cheta na ọ bụ ihe àmà e ji n’aka ga-eme ka anyị nwee ezigbo okwukwe, ọ bụghị ịnụ na ọ dị iri anyị achịrị wụnye n’akpa. Ọ bụ ezigbo okwukwe ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi.​—Jọn 3:16.

7. Gịnị ka Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-akụzi ma na-ekwusa otú yanwa mere?

7 Jizọs “nọkwa na-ekwu gbasara Alaeze Chineke.” Dị ka ihe atụ, ọ kọwara amụma ndị gosiri na Mezaya ga-ata ahụhụ ma nwụọ. (Luk 24:13-32, 46, 47) Mgbe Jizọs nọ na-eme ka o doo anya na ọ bụ ya bụ Mezaya, o kwusiri okwu ike gbasara Alaeze Chineke n’ihi na ọ bụ ya ka a họpụtara ịbụ Eze Alaeze ahụ. Ọ bụ Alaeze Chineke ka Jizọs kwusara mgbe niile. Ndị na-eso ụzọ ya taa na-ekwusakwa otu ihe ahụ.​—Mat. 24:14; Luk 4:43.

‘Ruo n’Ebe Kacha Anya n’Ụwa’ (Ọrụ 1:6-12)

8, 9. (a) Olee ihe abụọ na-adịghị mma ndịozi Jizọs nọ na-eche n’echiche? (b) Olee otú Jizọs si mee ka ndịozi ya ghọta ihe ha ghọtahiere, oleekwa ihe Ndị Kraịst n’oge a ga-amụta na ya?

8 Mgbe ndịozi Jizọs zukọrọ n’Ugwu Oliv, ha na ya nwere nnọkọ ikpeazụ ha n’ụwa. Ha ji obi ha niile jụọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ ga-eme ka Izrel nwetaghachi alaeze ha n’oge a?” (Ọrụ 1:6) N’otu ajụjụ a ha jụrụ, ha gosiri na e nwere ihe abụọ na-adịghị mma ha na-eche n’echiche. Nke mbụ bụ na ha chere na a ga-eme ka mba Izrel nwetaghachi Alaeze Chineke. Nke abụọ abụrụ na ha nọ na-atụ anya na Alaeze ahụ e kwere ná nkwa ga-amalite ịchị ozugbo, ya bụ, ‘n’oge ahụ.’ Olee otú Jizọs si nyere ha aka ka ha ghọta ihe ha ghọtahiere?

9 Ọ ga-abụ na Jizọs ma na ọ gaghị adị anya, Chineke emee ka ha ghọta ihe mbụ ahụ na-adịghị mma ha chere. N’eziokwu, ọ fọrọ naanị abalị iri ka ndị na-eso ụzọ Jizọs hụ mgbe a ga-amụ mba ọhụrụ, ya bụ, Izrel nke Chineke. Ọ fọrọ obere ka Chineke na mba Izrel kwụsị imekọrịta ihe. A bịa n’ihe nke abụọ ahụ ha na-atụ anya ya, Jizọs ji obiọma chetara ha, sị: “Ọ bụ naanị Nna m nwere ikike ikpebi oge na mgbe ihe ga-emenụ ga-eme. Unu ekwesịghị ịma oge ọ ga-abụ.” (Ọrụ 1:7) Jehova bụ Onye Ukwu Na-edebe Oge. Tupu Jizọs anwụọ, o kwuru na n’oge ahụ, Ọkpara ahụ amaghịdị “ụbọchị na awa” ọgwụgwụ ga-abịa, kama na ọ bụ ‘naanị Nna ya’ ma. (Mat. 24:36) Ma n’oge ahụ ma n’oge anyị a, ọ bụrụ na Ndị Kraịst ana-echegbu onwe ha banyere mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ a, ọ pụtara na ha na-echegbu onwe ha banyere ihe ha na-ekwesịghị ịma.

10. Olee àgwà ndịozi Jizọs nwere anyị kwesịrị inwe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

10 N’agbanyeghị na e nwere ihe ụfọdụ ndịozi Jizọs ghọtahiere, anyị ekwesịghị ịma ha ikpe ebe ọ bụ na ha nwere ezigbo okwukwe. Ha ji obi umeala kwe ka a gbazie ha. Ihe ọzọ bụ na ajụjụ ha jụrụ gosiri na ha nwere àgwà ọma, ọ bụ eziokwu na ajụjụ ahụ ezighị ezi. Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ọtụtụ ugboro, sị: “Na-echenụ nche.” (Mat. 24:42; 25:13; 26:41) Ha mụ anya n’ofufe ha na-efe Chineke, na-atụsi anya ike ka ha hụ ihe na-egosi na oge Jehova ga-eme ihe eruwela. Ọ bụ àgwà anyị kwesịrị inwe n’oge a. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-eche nche karịa n’ihi na anyị bi ‘n’oge ikpeazụ.’​—2 Tim. 3:1-5.

11, 12. (a) Olee ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? (b) Gịnị mere o ji daba adaba na Jizọs kwuru na ya ga-ezitere ndị na-eso ụzọ ya mmụọ nsọ mgbe ọ na-enye ha ọrụ ikwusa ozi ọma?

11 Jizọs chetaara ndịozi ya ihe kwesịrị ịkacha ha mkpa. O kwuru, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu. Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ebe mbụ ha ga-ekwusa na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ bụ na Jeruselem, bụ́ ebe ndị mmadụ nọ gbuo ya. Ha ga-esi ebe ahụ kwusara ya gaa Judia niile nakwa Sameria, ruokwa n’ebe ndị ọzọ dị anya.

12 Ọ dabara adaba na Jizọs bu ụzọ kweghachi ha nkwa na ya ga-ezitere ha mmụọ nsọ ga-enyere ha aka tupu ya agwawa ha na ha ga-ekwusa ozi ọma. Ihe a bụ otu n’ime ihe karịrị ugboro iri anọ e dere “mmụọ nsọ” n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi. Akwụkwọ Baịbụl a mere ka o doo anya ọtụtụ ugboro na anyị enweghị ike ime uche Jehova ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ enyereghị anyị aka. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-arịọ Chineke mgbe niile ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Mmụọ nsọ dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

13. Olee ebe a ga-arụru ọrụ ikwusa ozi ọma Chineke nyere ndị na-efe ya taa, gịnịkwa mere anyị ga-eji na-arụsi ọrụ a ike?

13 Kemgbe ahụ, ihe okwu bụ́ ‘ebe kacha anya n’ụwa’ pụtara agbanweela. Ma dị ka anyị kwuru n’isi nke mbụ n’akwụkwọ a, Ndịàmà Jehova ji obi ha niile nabata ọrụ ịgba àmà a n’ihi na ha ma na Chineke chọrọ ka ụdị mmadụ niile nụ ozi ọma Alaeze ya. (1 Tim. 2:3, 4) Ì ji ọrụ a na-azọ ndụ kpọrọ ihe? E nweghị ọrụ ọzọ ga-eme gị obi ụtọ ma baara gị uru karịa ọrụ a. Jehova ga-enye gị ike ị ga-eji na-arụ ya. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ga-akụziri gị ụzọ dị iche iche dị mma ị ga-esi na-arụ ọrụ a nakwa òtù i kwesịrị isi na-ele ọrụ a anya ka i nwee ike na-arụ ya nke ọma.

14, 15. (a) Gịnị ka ndị mmụọ ozi ahụ kwuru banyere otú Kraịst ga-esi alọghachi, gịnịkwa ka ihe ha kwuru pụtara? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.) (b) Gịnị mere anyị ga-eji ekwu na Kraịst lọghachiri “otú” o si laa eluigwe?

14 Dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, Jizọs si n’ụwa gbagowe elu, e mechaa, a hụghịzi ya. Ma, ndịozi ya iri na otu ka guzo ebe ahụ, na-ele anya na mbara igwe. Ndị mmụọ ozi abụọ pụtara n’ihu ha ma jiri nwayọọ gwa ha, sị: “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzoro na-ele anya na mbara igwe? Jizọs a, onye si ebe unu nọ gbagoo na mbara igwe, ga-esi otú a bịa, ya bụ, otú a unu hụrụ ya ka ọ na-abanye na mbara igwe.” (Ọrụ 1:11) Ndị mmụọ ozi ahụ hà na-ekwu na Jizọs ga-eji ahụ́ mbụ ya lọghachi dị ka ụfọdụ okpukpe na-akụzi? Mbanụ, ọ bụghị ihe ha na-ekwu. Olee otú anyị si mara?

15 Ndị mmụọ ozi ahụ ekwughị na Jizọs ga-eji otu ahụ́ ahụ lọghachi, kama ha sịrị na ọ “ga-esi otú a” bịa. b Olee otú o si hapụ ụwa? Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ kwuru ihe a, ndịozi Jizọs anaghịzi ahụ Jizọs anya. Ọ bụ naanị ụmụ nwoke ole na ole, ya bụ, ndịozi Jizọs, ma na Jizọs ahapụla ụwa lakwuruwe Nna ya n’eluigwe. Otú ahụ Kraịst si laa n’eluigwe ka ọ ga-esikwa alọghachi. Ọ bụkwa ihe merenụ. Taa, ọ bụ naanị ndị na-aghọta Akwụkwọ Nsọ ma na Jizọs nọ ugbu a na-achị n’Alaeze Chineke. (Luk 17:20) Anyị kwesịrị ịghọta ihe ndị na-egosi na Jizọs nọ ugbu a na-achị achị ma na-akọrọ ya ndị ọzọ ka ha mata na oge agwụla agwụ.

“Gosi Anyị Onye Ị Họọrọ” (Ọrụ 1:13-26)

16-18. (a) Malite n’Ọrụ Ndịozi 1:13, 14, gịnị ka anyị mụtara banyere Ndị Kraịst izukọta maka ife Chineke? (b) Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe Meri nne Jizọs mere? (ch) Olee ihe mere nnọkọ Ndị Kraịst ji dị mkpa taa?

16 Ndịozi Jizọs ‘ṅụụrụ ezigbo ọṅụ laghachi Jeruselem.’ (Luk 24:52) Ma, hà ga-erube isi ná ntụziaka Kraịst nakwa n’otú ọ ga na-esi edu ha? Ọrụ Ndịozi isi 1 amaokwu nke 13 na nke 14 kwuru na ha zukọrọ “n’ọnụ ụlọ dị n’elu.” E nwere ụmụ irighiri ihe Baịbụl gwara anyị banyere ụdị nnọkọ ahụ. Ụlọ ndị a rụrụ na Palestaịn n’oge ahụ na-enwekarị ọnụ ụlọ dị n’elu a na-esi na steepụ dị n’èzí arịgo. Ọ̀ ga-abụ n’ụlọ e kwuru okwu ya n’Ọrụ 12:12, ya bụ, n’ụlọ nne Mak, ka ‘ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu’ dị? Ma ọ̀ bụ ya ma ọ bụ na ọ bụghị ya, ụlọ ahụ ga-abụ ebe a na-achọghị oké mma na-adịrị ndị na-eso ụzọ Kraịst mfe izukọta. Ma olee ndị zukọrọ ebe ahụ, oleekwa ihe ha mere?

17 Ị̀ hụrụ na ọ bụghị naanị ndịozi ma ọ bụ naanị ụmụ nwoke zukọrọ n’ebe ahụ? “Ụmụ nwaanyị ụfọdụ” sokwa, ma Meri nne Jizọs. Ihe a bụ nke ikpeazụ a kpọrọ Meri nne Jizọs aha na Baịbụl. Ọ bụ ihe na-eme obi ụtọ ịmata na ọ bịaghị nnọkọ ahụ ka a kwanyere ya ùgwù, kama o ji obi umeala bịa ka ya na ụmụnna ya fee Chineke. Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ ya ụtọ na ụmụ ya ndị nwoke anọ na-abụghị ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe Jizọs nọ n’ụwa sozi ya ugbu a. (Mat. 13:55; Jọn 7:5) Ha agbanweela kemgbe nwanne ha nwoke nwụrụ ma si n’ọnwụ bilie.​—1 Kọr. 15:7.

18 Gịnị mere ndị a na-eso ụzọ Jizọs ji zukọta n’ụbọchị ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ha niile ji otu obi na-ekpe ekpere mgbe niile.” (Ọrụ 1:14) Ihe e ji mara Ndị Kraịst kemgbe bụ na ha na-ezukọta ọnụ. Ihe mere anyị ji ezukọta bụ ka anyị gbarịta ibe anyị ume, ka a dụọ anyị ọdụ ma nye anyị ntụziaka. Ma, nke kachanụ bụ ka anyị fee Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, ofufe. Ekpere anyị na-ekpe na abụ otuto anyị na-abụ ma anyị zukọta na-atọ ya ụtọ, anyị ejighịkwa ihe ndị a egwu egwu. Anyị ekwesịghị ịhapụ nnọkọ ndị a dị nsọ, ndị na-agba anyị ume.​—Hib. 10:24, 25.

19-21. (a) Olee ihe anyị mụtara n’otú Pita si hụ na e lebara anya n’okwu dị mkpa n’ọgbakọ? (b) Gịnị mere e ji kwesị ịhọpụta onye ga-anọchi Judas, gịnịkwa ka anyị na-amụta n’otú e si họpụta ya?

19 E nwere otu ihe dị mkpa ndị ahụ na-eso ụzọ Kraịst kwesịrị ilebara anya. Pita onyeozi butere ụzọ n’ịhụ na e lebara ya anya. (Amaokwu nke 15-26) Ọ̀ bụ na ọ naghị eme obi ụtọ na Jehova amalitekwala iji Pita arụ ọrụ n’agbanyeghị na ọ gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ izu ole na ole gara aga? (Mak 14:72) Anyị niile bụ ndị mmehie. Ọ dị mkpa ka a na-echetara anyị na “Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara” ndị ji obi ha chegharịa.​—Ọma 86:5.

20 Pita ghọtara na e kwesịrị ịhọpụta onye ga-anọchi Judas, bụ́ onyeozi raara Jizọs nye. Ònye ga-anọchikwanụ ya? Pita kwuru na onyeozi ọhụrụ a ga-abụ onye soro Jizọs n’oge niile ọ nọ na-eje ozi ma hụkwa ya mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ. (Ọrụ 1:21, 22) Ọ bụkwa ihe Jizọs kwere ná nkwa mgbe ọ sịrị: “Ununwa ndị na-eso m ga-anọdụkwa n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.” (Mat. 19:28) Ọ ga-abụ na Jehova chọrọ ka ọ bụrụ ndịozi iri na abụọ ahụ so Jizọs n’oge ọ na-eje ozi n’ụwa ga-abụ “nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọala” Jeruselem Ọhụrụ. (Mkpu. 21:2, 14) N’ihi ya, Chineke mere ka Pita ghọta na amụma e buru, nke bụ́ “ka onye ọzọ rụwa ọrụ ọ na-arụbu,” mezuru n’isi Judas.​—Ọma 109:8.

21 Olee otú e si họrọ onye nọchiri Judas? E fere nza. A na-efekarị nza n’oge ochie. (Ilu 16:33) Ma, ihe a bụ nke ikpeazụ Baịbụl kwuru na e fere nza. Ọ ga-abụ na mmụọ nsọ a wụsara ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ka ife nza gharazie ịdị mkpa. Ma, gịnị mere ndịozi Jizọs ji fee nza? Ha kpere ekpere, sị: “Jehova, onye ma obi mmadụ niile, biko, gosi anyị onye ị họọrọ n’ime ụmụ nwoke abụọ a.” (Ọrụ 1:23, 24) Ha chọrọ ka ọ bụrụ Jehova ga-ekpebi onye ọ ga-abụ. Jehova họọrọ Matayas. Ọ ga-abụ na Matayas so ná ndị na-eso ụzọ Jizọs dị mmadụ iri asaa Jizọs zipụrụ ka ha gaa zie ozi ọma. Otú a ka Matayas si soro ná “ndịozi iri na abụọ Jizọs.” c​—Ọrụ 6:2.

22, 23. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-edo onwe anyị n’okpuru ndị na-eduzi ọgbakọ taa ma na-erubere ha isi?

22 Akụkọ a na-echetara anyị na e kwesịrị ịhazi ndị Chineke ahazi. N’oge a, a ka na-ahọpụtakwa ụmụ nwoke ruru eru ka ha bụrụ ndị nlekọta n’ọgbakọ. Ndị okenye na-asa anya na mmiri leba anya n’àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru mmadụ ga na-akpa tupu a họpụta ya ka ọ bụrụ onye nlekọta. Ha na-ekpekwa ekpere ka mmụọ nsọ duzie ha. N’ihi ya, ndị nọ n’ọgbakọ na-ewere ndị ahụ ka ndị mmụọ nsọ họpụtara. Ọ bụrụ na anyị ana-edo onwe anyị n’okpuru ha, na-erubekwara ha isi, anyị na-eme ka ndị niile nọ n’ọgbakọ nwee otu obi.​—Hib. 13:17.

Anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ndị a họpụtara ka ha na-elekọta anyị, anyị na-erubekwara ha isi

23 Ebe ọ bụ na okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs esikwuola ike maka na Jizọs pụtara n’ihu ha ugboro ugboro mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ebe ọ bụkwa na a haziela ihe nke ọma n’ọgbakọ, a kwadebela ha maka ihe ga-eme n’ọdịnihu. N’Isi nke 3, anyị ga-eleba anya n’ihe dị egwu merenụ.

a Luk kpọrọ nwoke ahụ “Tiofilọs onye ukwu” n’Oziọma Luk. N’ihi ya, ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ ga-abụ na Tiofilọs bụ onye a ma ama, ma ọ bụbeghị Onye Kraịst mgbe ahụ. (Luk 1:3) Ma n’Ọrụ Ndịozi, naanị ihe Luk kpọrọ ya bụ “Tiofilọs.” Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na Tiofilọs ghọrọ Onye Kraịst mgbe ọ gụchara Oziọma Luk. Ha na-ekwu na ọ bụ ya mere Luk ji hapụ itu ya aha e ji akwanyere ya ùgwù ma degara ya akwụkwọ ka nwanna.

b Okwu Grik e dere n’amaokwu a bụ troʹpos, nke pụtara “otú” ọ bụghị mor·pheʹ, nke pụtara “ọdịdị.”

c E mechara họpụta Pọl ka ọ bụrụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” Mana, a naghị agụnye ya ná ndịozi iri na abụọ Jizọs. (Rom 11:13; 1 Kọr. 15:4-8) O rughị eru inweta ihe ùgwù a pụrụ iche n’ihi na ọ bụghị onye na-eso ụzọ Jizọs mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa.