Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 3 • ỌRỤ 10:1–12:25

‘Ndị Mba Ọzọ Nabatara Okwu Chineke’

‘Ndị Mba Ọzọ Nabatara Okwu Chineke’

ỌRỤ 11:1

Ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs hà ga-ekwe ekwusara ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ozi ọma? Ná nkebi a, anyị ga-ahụ otú mmụọ Jehova si nyere Ndị Kraịst aka ịhụ ụdị mmadụ ọ bụla n’anya ma kwụsị ịkpọ ndị ọ bụla asị. Anyị ga-ahụkwa otú ihe a si mee ka a gbapụ ọrụ ikwusara mba niile ozi ọma ọsọ.