Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 9

“Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”

“Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”

A malitere izi ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ozi ọma

O Si n’Ọrụ Ndịozi 10:1–11:30

1-3. Olee ọhụụ Pita hụrụ, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta ihe ọ pụtara?

 OTU ụbọchị n’afọ 36 O.N.K., ka anwụ ọkọchị na-acha, Pita nọ n’elu ụlọ dị larịị na-ekpe ekpere. Ụlọ a dị nso n’osimiri dị n’obodo Jọpa, bụ́ ebe e nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Pita bụ ọbịa n’ụlọ ahụ kemgbe ụbọchị ole na ole. Ọnụnọ ọ nọ ebe a gositụrụ na ọ kpọghị ndị obodo ọzọ asị. Aha onye nwe ụlọ ahụ bụ Saịmọn. Aka ọrụ ya bụ isiji akpụkpọ anụ. Ọ bụghị onye Juu ọ bụla ga-ekwe anọ n’ụlọ ya. a Ma, Pita na-aga ịmụta ihe dị ezigbo mkpa na-egosi na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu.

2 Mgbe Pita nọ na-ekpe ekpere, ọ hụrụ ọhụụ. Ihe ọ hụrụ n’ọhụụ ahụ ga-echu onye Juu ọ bụla hụrụ ya ụra. Ọ hụrụ ihe yiri ibé ákwà nke e si n’eluigwe na-ewedata n’ụwa. Ụdị anụ niile Iwu Mosis kwuru na ha adịghị ọcha dị n’ime ya. A gwaziri Pita ka o gbuo ma rie otu n’ime anụ ndị ahụ. Ma ọ sịrị: “Eritụbeghị m ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ọcha.” A gwara ya ugboro atọ, sị: “Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” (Ọrụ 10:14-16) Ọhụụ ahụ gbagwojuru Pita anya, ma obere oge, ọ matara ihe ọ pụtara.

3 Gịnị ka ọhụụ ahụ Pita hụrụ pụtara? Ọ dị mkpa ka anyị ghọta ihe ọ pụtara n’ihi na ọ ga-akụziri anyị eziokwu gbara ọkpụrụkpụ banyere otú Jehova si ele ndị mmadụ anya. Anyị bụ́ ezigbo Ndị Kraịst enweghị ike ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke ma ọ bụrụ na anyị anaghị ele ndị mmadụ anya otú Chineke si ele ha. Ka anyị leba anya n’ihe ndị mere tupu Pita ahụ ọhụụ ahụ nakwa ihe ndị mere mgbe ọ hụchara ya. Ha ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ọhụụ ahụ pụtara.

Ọ ‘Na-arịọ Chineke Arịrịọ Mgbe Niile’ (Ọrụ 10:1-8)

4, 5. Ònye bụ Kọniliọs, gịnịkwa mere mgbe ọ na-ekpe ekpere?

4 Pita amaghị na otu nwoke bi na Sizaria aha ya bụ Kọniliọs hụkwara ọhụụ ụnyaahụ ya. Sizaria dị ihe dị ka kilomita iri ise ma e si n’ebe Pita nọ gawa ya. Kọniliọs bụ onyeisi otu ìgwè ndị agha Rom. Ọ “na-efe Chineke.” b Ọ bụkwa ezigbo onyeisi n’ezinụlọ ya. ‘Ya na ndị ezinụlọ ya na-atụ egwu Chineke.’ Kọniliọs abụghị onye Juu, ọ naghịkwa ekpe okpukpe ndị Juu. Ọ bụ onye Jentaịl a na-ebighị úgwù. N’agbanyeghị ya, ọ na-emetere ndị Juu ụwa na-ara ahụ́ ebere, na-egbokwara ha mkpa ha. Nwoke a nwere ezi obi ‘na-arịọ Chineke arịrịọ mgbe niile.’​—Ọrụ 10:2.

5 Mgbe Kọniliọs nọ na-ekpe ekpere n’ihe dị ka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ otu mmụọ ozi n’ọhụụ. Mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Chineke anụla ekpere gị, hụkwa otú i si na-enyere ndị ogbenye aka.” (Ọrụ 10:4) Kọniliọs zipụrụ ụmụ nwoke abụọ ka ha gaa kpọọ Pita onyeozi otú mmụọ ozi ahụ gwara ya. N’oge na-adịghị anya, a ga-emere Kọniliọs ihe a na-emetụbereghị onye Jentaịl a na-ebighị úgwù. A ga-ezi ya ozi ga-eme ka a zọpụta ya.

6, 7. (a) Kọọ ihe mere eme gosiri na Chineke na-aza ekpere ndị ji obi ha niile na-achọ ka ha mụta eziokwu banyere ya na-ekpe. (b) Gịnị ka ụdị akụkọ a na-egosi?

6 Chineke ọ̀ na-aza ekpere ndị ji obi ha niile na-achọ ịmụta eziokwu banyere ya na-ekpe taa? Ka anyị hụ ihe mere otu nwaanyị. Nwaanyị a bi n’Albenia. Ọ natara Ụlọ Nche mgbe Onyeàmà Jehova bịara na nke ya. Otu n’ime isiokwu gbara na ya kwuru banyere ịzụ ụmụ. c Ọ gwara Onyeàmà Jehova ahụ, sị: “Ị̀ ma na m nọ na-arịọ Chineke n’ekpere ka m nweta ihe ga-enyere m aka ịzụ ụmụ m ndị nwaanyị? Ọ bụ ya zitere gị. Akwụkwọ a i nyere m bụ kpọmkwem ihe m chọrọ. O ruru m n’obi.” Nwaanyị ahụ na ụmụ ya ndị nwaanyị malitere ịmụ Baịbụl, di ya mechakwara soro ha.

7 Ọ̀ bụ naanị nwaanyị ahụ ka ụdị ihe a metụrụla? Mbanụ! Ụdị ihe a emeela ọtụtụ ugboro n’ụwa niile nke na e kwesịghị ikwu na ha mere ná ndaba. Gịnị ka ọ na-egosi? Nke mbụ bụ na Jehova na-aza ekpere ndị ji obi ha niile na-achọ ya na-ekpe. (1 Eze 8:41-43; Ọma 65:2) Nke abụọ bụ na ndị mmụọ ozi na-akwado anyị n’ozi ọma anyị na-ezisa.​—Mkpu. 14:6, 7.

Ọhụụ Ahụ “Gbara Pita Gharịị” (Ọrụ 10:9-23a)

8, 9. Gịnị ka mmụọ nsọ mere ka Pita mata, gịnịkwa ka Pita mere?

8 Pita ka nọ n’elu ụlọ ahụ. Ihe ọ hụrụ n’ọhụụ ahụ ka ‘gbara ya gharịị.’ N’oge ahụ, ndị Kọniliọs zipụrụ bịarutere n’ụlọ Saịmọn. (Ọrụ 10:17) Ebe ọ bụ na Pita ekwuola ugboro atọ na ya agaghị eri ihe Iwu Mosis kwuru na ha adịghị ọcha, ọ̀ ga-ekwenụ soro ndị ahụ gaa n’ụlọ onye Jentaịl? Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka Pita mata ihe bụ́ uche ya n’okwu a. A gwara Pita, sị: “E nwere ụmụ nwoke atọ na-achọ gị. Bilie, gbadaa n’ala ma soro ha gawa. Enwekwala obi abụọ ọ bụla, n’ihi na ọ bụ m zitere ha.” (Ọrụ 10:19, 20) O doro anya na ihe ahụ yiri ibé ákwà Pita hụrụ n’ọhụụ nyeere ya aka ime ihe mmụọ nsọ gwara ya mee.

9 Mgbe Pita matara na ọ bụ Chineke gwara Kọniliọs ka o zite ndị ozi ka ha bịa kpọọ ya, ọ kpọbatara ndị Jentaịl ahụ n’ụlọ ya, “ya na ha anọrọ chi abọọ.” (Ọrụ 10:23a) Onyeozi a na-erubere Chineke isi gbanwere otú o si ele ihe anya mgbe ọ matara ihe bụ́ uche Chineke.

10. Olee otú Jehova si eduzi ndị ya, oleekwa ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?

10 Jehova ka na-eji nwayọọ nwayọọ edu ndị ya n’oge a. (Ilu 4:18) Ọ na-eji mmụọ nsọ ya eduzi “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” (Mat. 24:45) Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịgbanwe otú anyị si ghọta ihe ụfọdụ n’Okwu Chineke ma ọ bụkwanụ a gbanwee otú anyị si eme ihe ụfọdụ ná nzukọ Jehova. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àna m anabata mgbanwe ndị a? Àna m eji obi ụtọ esoro ntụziaka mmụọ nsọ ma e mee mgbanwe ndị a?’

Pita “Wee Sị Ka E Mee Ha Baptizim” (Ọrụ 10:23b-48)

11, 12. Gịnị ka Pita mere mgbe ọ bịarutere Sizaria, gịnịkwa ka ọ mụtara?

11 Otu ụbọchị ahụ Pita hụchara ọhụụ, ọ gawara Sizaria, ya na mmadụ itoolu, ya bụ, mmadụ atọ ahụ Kọniliọs zitere na “ụmụnna isii” bụ́ ndị Juu, ndị si Jọpa. (Ọrụ 11:12) Ebe ọ bụ na Kọniliọs nọ na-atụ anya Pita, ọ kpọkọtara “ndị ikwu ya na ezigbo ndị enyi ya.” Ọ ga-abụ na ha niile bụ ndị Jentaịl. (Ọrụ 10:24) Mgbe Pita rutere, o mere ihe ọ na-echetụbeghị n’echiche ime: Ọ banyere n’ụlọ onye Jentaịl a na-ebighị úgwù. Pita kwuru, sị: “O doro unu anya na onye Juu dara iwu ndị Juu ma ọ bụrụ na ya na onye agbụrụ ọzọ na-akpakọrịta ma ọ bụkwanụ na ọ bịara onye ahụ nso. Ma, Chineke gosiri m na e nweghị onye m kwesịrị ịsị na ọ rụrụ arụ ma ọ bụ na ọ dịghị ọcha.” (Ọrụ 10:28) Ka ọ dị ugbu a, Pita aghọtala na ihe ọhụụ ahụ na-akụziri ya abụghị naanị gbasara ụdị nri o kwesịrị iri. E nweghị onye o “kwesịrị ịsị na ọ rụrụ arụ,” ọ bụrụgodị onye Jentaịl.

“Kọnịliọs nọ na-atụ anya ha, kpọkọọkwa ndị ikwu ya na ezigbo ndị enyi ya.”​—Ọrụ 10:24

12 Ndị niile zukọrọ n’ụlọ Kọniliọs chọrọ ịnụ ihe Pita ga-ekwu. Kọniliọs kwuru, sị: “Anyị niile agbakọtala n’ihu Chineke ịnụ ihe niile Jehova gwara gị ka i kwuo.” (Ọrụ 10:33) Chegodị otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na onye chọrọ ịmụta gbasara Jehova agwa gị ụdị ihe a. Ihe mbụ Pita kwuru na-eru n’obi. Ọ sịrị: “O doola m nnọọ anya na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.” (Ọrụ 10:34, 35) Pita amụtala na ọ bụghị agbụrụ ma ọ bụ mba mmadụ si ma ọ bụkwanụ ụcha akpụkpọ ahụ́ ya na-eme ka Chineke nabata ya. Pita gbaziiri ha àmà banyere ozi Jizọs jere, ọnwụ ya, na mbilite n’ọnwụ ya.

13, 14. (a) Olee ihe mere nchegharị Kọniliọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ chegharịrị n’afọ 36 O.N.K. ji pụọ iche? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịma ndị mmadụ ikpe n’ihi otú ha dị?

13 Ihe na-emetụbeghị mbụ meziri: “Ka Pita nọ na-ekwu ihe ndị a,” mmụọ nsọ dakwasịrị “ndị mba ọzọ” ahụ. (Ọrụ 10:44, 45) Ihe a bụ naanị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru na mmụọ nsọ dakwasịrị ndị mmadụ tupu e mee ha baptizim. Mgbe Pita ghọtara na mmụọ nsọ ahụ dakwasịrị ndị Jentaịl gosiri na Chineke anabatala ha, ọ sịrị “ka e mee ha baptizim.” (Ọrụ 10:48) Nchegharị ahụ ndị Jentaịl chegharịrị n’afọ 36 O.N.K. gosiri na oge Chineke nọ na-emere ndị Juu amara pụrụ iche agwụla. (Dan. 9:24-27) Pita ji ‘mkpịsị ugodi nke atọ nke alaeze,’ bụ́ nke ikpeazụ, rụọ ọrụ n’oge a. (Mat. 16:19) O ji mkpịsị ugodi a megheere ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ụzọ ka ha bụrụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ.

14 Anyị kwusawa ozi ọma Alaeze, anyị na-aghọta na “Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Rom 2:11) Uche ya bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile.” (1 Tim. 2:4) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịma ndị mmadụ ikpe n’ihi otú ha dị. Ọrụ anyị bụ ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke, ya bụ, izi mmadụ niile ozi ọma, n’agbanyeghị agbụrụ ha, mba ha, otú ha dị, ma ọ bụ okpukpe ha.

“Ha Kwụsịrị Ịkatọ Ya, Wee Nye Chineke Otuto” (Ọrụ 11:1-18)

15, 16. Gịnị mere ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ji na-akatọ Pita, gịnịkwa ka o kwuru mere o ji mee ndị na-abụghị ndị Juu baptizim?

15 Pita gawara Jeruselem. Ọ ga-abụ ka ọ gaa kọọrọ ụmụnna nọ ebe ahụ ihe merenụ. Ma o nwere ike ịbụ na tupu ya eruo, ụmụnna ahụ anụla na ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù “anabatala okwu Chineke.” Obere oge Pita ruru, “ndị chọrọ ka ndị mba ọzọ na-ebi úgwù malitere ịkatọ ya.” Ihe bụ́ iwe ha bụ na Pita “banyere n’ụlọ ndị a na-ebighị úgwù, sorokwa ha rie ihe.” (Ọrụ 11:1-3) Iwe ndị Juu ahụ na-eso ụzọ Kraịst abụghị na ndị Jentaịl ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Kama, ha na-ekwu na tupu Jehova anabata ofufe ndị Jentaịl, ha ga-edeberịrị Iwu Mosis, ma iwu nke kwuru na a ga-ebi ụmụ nwoke úgwù. O doro anya na o siiri ụfọdụ ndị Juu ahụ na-eso ụzọ Kraịst ike ikweta na ọ bụghịzi iwu na mmadụ ga-edebe iwu Mosis.

16 Gịnị ka Pita kwuru mere o ji mee ndị na-abụghị ndị Juu baptizim? N’Ọrụ Ndịozi 11:4-16, o kwuru ihe anọ gosiri na ihe o mere bụ uche Chineke: (1) ọhụụ Chineke mere ka ọ hụ (Amaokwu nke 4-10); (2) ihe mmụọ nsọ gwara ya mee (Amaokwu nke 11, 12); (3) ọbịbịa mmụọ ozi bịara n’ụlọ Kọniliọs (Amaokwu nke 13, 14); nakwa (4) mmụọ nsọ dakwasịrị ndị Jentaịl. (Amaokwu nke 15, 16) Pita jizi ajụjụ na-eru n’obi pịachie okwu ya. Ọ jụrụ, sị: “N’ihi ya, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ ọ na-enye n’efu otú o nyekwara anyịnwa bụ́ ndị kweere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ònye ka m bụ igbochi Chineke ime ihe ọ chọrọ ime?”​—Ọrụ 11:17.

17, 18. (a) Gịnị ka ihe Pita kwuru kwesịrị ime ka ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst kpebie? (b) Gịnị mere na ọ naghị adị mfe ime ka udo dịrị n’ọgbakọ, oleekwa ajụjụ onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya?

17 Ihe Pita gwara ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ime ka ha kpebie ebe ha kwụ. Hà ga-akwụsị ịkpọ ndị Jentaịl asị ma were ndị Jentaịl ahụ e mere baptizim ọhụrụ ka Ndị Kraịst ibe ha? Baịbụl gwara anyị, sị: “Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha kwụsịrị ịkatọ ya, wee nye Chineke otuto, sị: ‘Ọ bụrụ otú ahụ, Chineke chọkwara ka ndị mba ọzọ chegharịa, ka ha wee nweta ndụ.’” (Ọrụ 11:18) Àgwà ọma a ha kpara mere ka udo dịrị n’ọgbakọ na-aga.

18 Ime ka udo dịrị n’ọgbakọ n’oge a adịghị mfe n’ihi na ndị na-efe Jehova “si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile.” (Mkpu. 7:9) Ọ bụ ya mere e ji nwee ndị si n’agbụrụ dị iche iche, mba dị iche iche, na ndị na-eme omenala dị iche iche n’ọtụtụ ọgbakọ. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ kwụsịchaala ịkpọ ndị ọzọ asị n’obi m? Èkpebisiela m ike na agaghị m ekwe ka ihe ndị na-akpata nkewa n’ụwa a, ya bụ, ịhụ mba n’anya, ịkpa ókè agbụrụ, na mmadụ iji mba ya etu ọnụ, mee ka m na-akpaso Ndị Kraịst ibe m àgwà na-adịghị mma?’ Cheta ihe Pita (ya bụ, Sifas) mere afọ ole na ole ndị Jentaịl mbụ ghọchara Ndị Kraịst. Mgbe ọ hụrụ ndị kpọrọ ndị Jentaịl ghọrọ Ndị Kraịst asị, “ọ kwụsịrị iso” ndị Jentaịl ahụ. Ihe a mere ka Pọl baara ya mba. (Gal. 2:11-14) Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka a ghara inwe mgbe anyị ga-akpọ ndị ọzọ asị.

“Ọtụtụ Ndị Ghọrọ Ndị Kwere Ekwe” (Ọrụ 11:19-26a)

19. Olee ndị ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi n’Antiọk malitere izisara ozi ọma, oleekwa ihe si na ya pụta?

19 Ndị na-eso ụzọ Jizọs hà maliteziri izisara ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ozi ọma? Cheta ihe mechara mee n’Antiọk nke Siria. d E nwere ọtụtụ ndị Juu n’obodo a, ma ha na ndị Jentaịl bi n’obodo a dị ná mma. N’ihi ya, ọ dị mfe izi ndị Jentaịl nọ n’Antiọk ozi ọma. Ọ bụ n’obodo a ka ụfọdụ ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs malitere izisara “ndị na-asụ Grik” ozi ọma. (Ọrụ 11:20) Ọ bụghị naanị ndị Juu na-asụ Grik ka ha nọ na-ezisara ozi ọma a, ha nọkwa na-ezisara ya ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù. Jehova gọziri ọrụ ahụ. “Ọtụtụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe.”​—Ọrụ 11:21.

20, 21. Olee otú Banabas si gosi na ya dị umeala n’obi, oleekwa otú anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi mgbe anyị na-ezisa ozi ọma?

20 Ọgbakọ dị na Jeruselem zigara Banabas Antiọk ka o kwusaara ndị ahụ chọrọ ige ntị ozi ọma. Ma, o doro anya na naanị ya agaghị enwe ike izicha ndị niile nwere mmasị n’ebe ahụ ozi ọma. Ò nwere onye ọzọ kwesịrị ịga nye aka karịa Sọl bụ́ onye ga-aghọ onyeozi nke ndị mba ọzọ? (Ọrụ 9:15; Rom 1:5) Banabas ọ̀ ga-ewere Sọl ka onye na-ama ya aka? Mba. Banabas gosiri na ya dị umeala n’obi, ghọtakwa na e kwesịrị inyere ya ka. O ji aka ya gaa Tasọs chọọ Sọl, kpọrọ ya bịa n’Antiọk ka o nyere ya aka. Ha abụọ nọrọ otu afọ ebe ahụ, na-agba ụmụnna nọ n’ọgbakọ ume.​—Ọrụ 11:22-26a.

21 Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi n’ozi anyị na-eje? Ihe ịdị umeala n’obi pụtara bụ mmadụ ịma ebe ike ya ruru. Anyị niile nwere ebe anyị na-eme nke ọma karịa ibe anyị, ike anyị niile ahaghịkwa. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịbụ aka ochie n’izi ozi ọma ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ mgbe ha na-anọghị n’ozi ọma, mana ime nletaghachi ma ọ bụ ịmalite ọmụmụ Baịbụl ana-esiri ha ike. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-esiri gị ike n’ozi ọma, kwuo ka e nyere gị aka. I mee otú ahụ, ị ga na-emekwu nke ọma n’ozi gị ma na-enwetakwu ọṅụ na ya.​—1 Kọr. 9:26.

“Izigara Ụmụnna . . . Ihe Enyemaka” (Ọrụ 11:26b-30)

22, 23. Olee ihe ụmụnna nọ n’Antiọk mere iji gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, oleekwa otú ndị na-efe Chineke si eme ụdị ihe ahụ n’oge a?

22 Antiọk bụ “ebe mbụ a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Ndị Kraịst otú Chineke si chọọ.” (Ọrụ 11:26b) Aha ahụ Chineke kwadoro ka ha zawa dabara n’aha ndị chọrọ iso ụzọ Kraịst kwesịrị ịza. Mgbe ndị mba ọzọ ghọrọ Ndị Kraịst, ndị Juu na ndị Jentaịl kwere ekwe hà hụwara ibe ha n’anya? Ka anyị hụ ihe mere mgbe oké ụnwụ dara n’ihe dị ka afọ 46 O.N.K. e N’oge ochie, ụnwụ na-akpa ndị ogbenye aka ọjọọ n’ihi na e nweghị ego ma ọ bụ nri ha na-edosa maka oge ọjọọ. Mgbe ụnwụ a dara, ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi na Judia enweghị ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa maka na ọ ga-abụ na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ogbenye. Mgbe ụmụnna bi n’Antiọk, ma ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst, nụrụ otú ihe si kwụrụ, ha zigaara “ụmụnna ha bi na Judia ihe enyemaka.” (Ọrụ 11:29) Ihe a ha mere gosiri na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya n’eziokwu.

23 Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Chineke n’oge a. Ọ na-abụ anyị nụ na ụmụnna anyị ndị nọ ná mba ọzọ ma ọ bụ n’obodo anyị nọ ná nsogbu, anyị na-eji obi anyị niile achọta otú anyị ga-esi enyere ha aka. Ọ bụrụ na e nwee ọdachi ndị na-emere onwe ha, dị ka ajọ ifufe, ala ọma jijiji, nakwa mmiri isi n’oké osimiri nupụta n’ike, Kọmitii Alaka dị iche iche na-ahazi Kọmitii Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka ozugbo. Ha na-eme ihe a ka e nwee ike inyere ụmụnna anyị ihe ha mebiri aka. Mbọ niile anyị na-agba iji nyere ụmụnna anyị aka gosiri na anyị hụrụ ha n’anya n’eziokwu.​—Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 3:17.

24. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị mụtara ihe n’ọhụụ ahụ Pita hụrụ?

24 Ebe anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị ma na anyị kwesịkwara ịmụta ihe n’ọhụụ ahụ Pita hụrụ n’oge ndịozi mgbe ọ nọ n’elu ụlọ dị na Jọpa. Chineke anyị na-efe anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ bụ uche ya ka anyị na-agba àmà nke ọma banyere Alaeze ya. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga na-ezisara ndị ọzọ ozi ọma n’agbanyeghị agbụrụ na mba ha si, ma ndị ukwu ma ndị nta. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-ezisara ndị niile chọrọ ige ntị ozi ọma, ka ha nwee ohere ịmụta gbasara Jehova.​—Rom 10:11-13.

Ọ na-abụ ụmụnna anyị nọrọ ná nsogbu, anyị na-eji obi anyị niile enyere ha aka

a Ụfọdụ ndị Juu na-eleda onye na-esiji akpụkpọ anụ anya n’ihi na ọrụ ahụ na-eme ka ọ na-emetụ akpụkpọ anụ, ozu anụ, na ihe ndị na-asọ oyi o ji arụ ọrụ aka. A naghị ekwe ka ndị na-esiji akpụkpọ anụ bata n’ụlọ nsọ Chineke. Ebe ha na-anọ arụ ọrụ anaghị adị nso n’obodo. Ma é nweghị ihe ọzọ, ọ ga-adị kubit iri ise ma ọ bụ ihe karịrị amaụkwụ iri asaa ma e si n’obodo gawa ya. O nwere ike iso n’ihe mere ụlọ Saịmọn ji dịrị “n’akụkụ oké osimiri.”​—Ọrụ 10:6.

b Gụọ igbe bụ́ “ Kọniliọs na Ndị Agha Rom.”

d Gụọ igbe bụ́ “ Antiọk nke Siria.”

e Onye Juu na-ede akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs kwuru na “oké ụnwụ” ahụ dara n’oge Eze Ukwu bụ́ Klọdiọs na-achị (n’afọ 41-54 O.N.K.).