Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 10

“Okwu Jehova Nọ Na-agbasa”

“Okwu Jehova Nọ Na-agbasa”

A napụtara Pita, mkpagbu emeghịkwa ka a kwụsị ikwusa ozi ọma

O Si n’Ọrụ Ndịozi 12:1-25

1-4. Olee nsogbu bịaara Pita, oleekwa otú obi ga-adị gị ma a sị na ọ bụ gị?

 WERE ya na ị na-ahụ ka a kpụ Pita banye n’ogige ụlọ mkpọrọ ma mechie nnukwu ọnụ ụzọ ya e ji ígwè rụọ, ya adaa oké ụda. Ọ nọ n’etiti ndị agha Rom abụọ, ha akpụrụ ya banye n’ime ụlọ mkpọrọ. Ọ nọ ebe ahụ ruo ọtụtụ awa ma ọ bụdị ọtụtụ ụbọchị, na-eche ka ọ mara ihe a ga-eme ya. Ya legharịa anya, naanị ihe ọ na-ahụ bụ ahụ́ ụlọ mkpọrọ ahụ, ihe e ji kpọchie ya, agbụ ígwè e kere ya, nakwa ndị na-eche ya nche.

2 A maziri Pita ikpe. Eze Herọd Agrịpa nke Mbụ kpebisiri ike na ọ ga-egbu ya. a Ọ chọrọ ịkpọrọ Pita kpọnye ndị Juu mgbe e mechara Ememme Ngabiga. Ogbugbu a ọ ga-egbu ya ga-amasị ha. Ihe ahụ abụghị égbè ọnụ. Ọ dịbeghị anya eze a gburu Jems, onye bụkwa onyeozi ka Pita.

3 N’abalị ga-abọta ụbọchị e kwuru na a ga-egbu Pita, gịnị ka Pita nọ na-eche n’obi ya n’ụlọ mkpọrọ ahụ gbara ọchịchịrị? Ò chetara na Jizọs gwara ya ọtụtụ afọ gara aga na a ga-eke ya agbụ otu ụbọchị, duru ya gaa n’ebe ọ na-achọghị ma gbuo ya? (Jọn 21:18, 19) O nwere ike ịbụ na Pita nọ na-eche ma oge ahụ ò ruola.

4 A sị na ị bụ Pita, olee otú obi gaara adị gị? Ike ụwa ga-agwụ ọtụtụ ndị, ha echee na olileanya adịghịzi. Ma, è nwere ihe kwesịrị ime ka ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst chee na olilieanya adịghịzi? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Pita na Ndị Kraịst ibe ya mere mgbe a nọ na-akpagbu ha? Ka anyị chọpụta.

“Ọgbakọ Nọ Na-ekpesi Ekpere Ike” (Ọrụ 12:1-5)

5, 6. (a) Gịnị mere Eze Herọd Agrịpa nke Mbụ ji mesie ọgbakọ Ndị Kraịst ike, oleekwa otú o si mee ya? (b) Gịnị mere ọnwụ Jems ji bụụrụ ọgbakọ Ndị Kraịst ọnwụnwa?

5 Anyị mụtara n’Isi nke 9 n’akwụkwọ a na nchegharị onye Jentaịl bụ́ Kọniliọs na ezinụlọ ya chegharịrị tọrọ ọgbakọ Ndị Kraịst ezigbo ụtọ. Ma, ọ ga-abụrịrị na iwe were ndị Juu na-abụghị Ndị Kraịst mgbe ha matara na ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu na-efekọ Chineke ọnụ.

6 Herọd bụ onye ọchịchị dị akọ. Ọ chọpụtara na ya nwere ike iji ohere a zụrụ ụtọ ndị Juu. N’ihi ya, ọ malitere imesi Ndị Kraịst ike. Ọ ga-abụ na ọ nụla na Jems onyeozi bụ ezigbo enyi Jizọs Kraịst mgbe Jizọs nọ n’ụwa. N’ihi ya, Herọd “ji mma agha gbuo Jems nwanne Jọn.” (Ọrụ 12:2) Ihe a bụụrụ ọgbakọ Ndị Kraịst ezigbo ọnwụnwa. Jems bụ otu n’ime mmadụ atọ ahụ hụrụ mgbe Jizọs nwoghara, hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ndịozi Jizọs ndị ọzọ na-ahụghị. (Mat. 17:1, 2; Mak 5:37-42) E nwere mgbe Jizọs kpọrọ Jems na nwanne ya Jọn “Ụmụ Égbè Eluigwe” n’ihi otú ha si anụ ọkụ n’obi. (Mak 3:17) N’ihi ya, mgbe e gburu Jems, nnukwu ihe funahụrụ ọgbakọ Ndị Kraịst n’ihi na ọ bụ onye àmà a tụkwasịrị obi na onyeozi a hụrụ n’anya nke nwere obi ike.

7, 8. Gịnị ka ọgbakọ Ndị Kraịst mere mgbe a tụrụ Pita mkpọrọ?

7 Ogbugbu e gburu Jems masịrị ndị Juu otú Agrịpa tụrụ anya ya. Ọ bụ ihe mere o ji kata obi chọwa ihe ọ ga-eme Pita. Dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, Agrịpa mere ka e jide ya. Ma, dị ka anyị mụrụ n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a, e nweela mgbe ihe ịtụnanya mere, ndịozi Jizọs e ji eji esi n’ụlọ mkpọrọ pụta. Ọ ga-abụ na Agrịpa chetara ihe a, ya asaa anya ná mmiri na nke ugbu a. N’ihi ya, o mere ka a tụọ Pita mkpọrọ n’agbata ndị nche abụọ, meekwa ka e nwee mmadụ iri na isii na-eche ya nche ehihie na abalị, ndị nke a chechaa, ndị ọzọ anọchie ha, iji hụ na onyeozi a agbaghị ọsọ. Ọ gbaa ọsọ, a ga-eme ndị nche ahụ ihe a gaara eme ya. Ebe ọ bụ na ihe esierela Pita ike otú a, oleezi ihe Ndị Kraịst ibe ya ga-eme?

8 Ọgbakọ ahụ ma nnọọ ihe ha kwesịrị ime. Ọrụ Ndịozi 12:5 kwuru, sị: “Ka Pita nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọgbakọ nọ na-ekpesi ekpere ike maka ya.” N’eziokwu, ha ji obi ha niile kpesie ekpere ike maka nwanna ha ha hụrụ n’anya. Ọnwụ Jems emeghị ka ha daa mbà, o meghịkwa ka ha chee na ekpere abaghị uru. Jehova ji ekpere ndị ya na-ekpe kpọrọ ihe. Ọ na-aza ekpere ọ bụla dabara n’uche ya. (Hib. 13:18, 19; Jems 5:16) Ihe a bụ ihe dị mkpa Ndị Kraịst n’oge a kwesịrị ịmụta.

9. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Ndị Kraịst oge mbụ ndị kpere ekpere maka Pita?

9 È nwere ụmụnna ị ma ha na ọnwụnwa dị iche iche na-alụ? O nwere ike ịbụ na a na-akpagbu ha ma ọ bụ na ndị ọchịchị machibidoro ọrụ anyị iwu n’obodo ha ma ọ bụkwanụ na ọdachi ndị na-emere onwe ha mere n’ebe ha bi. Ọ ga-adị mma ka i jiri obi gị niile na-ekpe ekpere maka ha. O nwekwara ike ịbụ na ị ma ụmụnna ụfọdụ na-enwe nsogbu ndị ọzọ a na-anaghị achọpụta ngwa ngwa, dị ka nsogbu ezinụlọ, obi ịda mbà, ma ọ bụ ọnwụnwa ọ bụla ọzọ nwere ike ịkpa okwukwe ha aka ọjọọ. Ọ bụrụ na i chee echiche tupu gị ekpee ekpere, i nwere ike icheta ọtụtụ ndị ị ga-akpọ aha mgbe ị na-agwa Jehova, “Onye na-anụ ekpere,” okwu. (Ọma 65:2) A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na ihe esiere gịnwa ike, ị ga-achọkwa ka ụmụnna gị na-echeta gị n’ekpere.

Anyị na-ekpe ekpere maka ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha

“Sowe M” (Ọrụ 12:6-11)

10, 11. Kọwaa otú mmụọ ozi Jehova si kpọpụta Pita n’ụlọ mkpọrọ.

10 Pita ọ̀ nọ na-echegbu onwe ya maka ihe na-aga ime ya? Anyị amaghị. Ma n’abalị ikpeazụ ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ọ nọ na-ehi ụra n’agbata mmadụ abụọ mụ anya na-eche ya nche. Nwoke a okwukwe ya siri ike ma na n’agbanyeghị ihe chi ga-abọta, Jehova agaghị echefu ya. (Rom 14:7, 8) Ma, ọ ga-abụ na Pita atụghị anya ihe dị ebube na-aga ime. Na mberede, ìhè nwusiri ike n’ebe ahụ a tụrụ ya mkpọrọ. Otu mmụọ ozi bịara guzo n’ebe ahụ. Ọ ga-abụ na ndị nche ahụ ahụghị ya. Ọ kpọtere Pita ngwa ngwa. Agbụ ígwè e kere ya n’aka, nke yiri ihe na-enweghị ike ịdọbi adọbi, dapụsịkwara.

“Ha ruru n’ọnụ ụzọ ámá e ji ígwè mee, nke e si abanye n’obodo, ụzọ ahụ emeghee n’onwe ya, ha agafere”​—Ọrụ 12:10

11 Mmụọ ozi ahụ gwaziri Pita ihe ole na ole ọ ga-eme. Ọ sịrị ya: “Bilie ọsọ ọsọ! . . . Yiri ákwà gị, yirikwa akpụkpọ ụkwụ gị. . . . Yiri uwe elu gị.” Pita mere ihe o kwuru ozugbo. Mmụọ ozi ahụ sịziri ya: “Sowe m,” Pita esoro ya. Ha si n’ụlọ mkpọrọ ahụ pụọ, sikwa n’akụkụ ndị nche guzo n’èzí gafere n’ekwughị ihe ọ bụla, gawazie ná nnukwu ọnụ ụzọ ogige ụlọ mkpọrọ ahụ nke e ji ígwè rụọ. Oleekwanụ otú ha ga-esi agafe nnukwu ọnụ ụzọ ahụ? Ọ bụrụgodị na Pita nọ na-eche ihe a n’obi ya, o cheghị ya ruo ogologo oge. Mgbe ha rutewere n’ọnụ ụzọ ogige ahụ, ‘ụzọ ahụ meghere n’onwe ya.’ Tupu Pita amara ihe na-eme, ha agafeela ọnụ ụzọ ahụ ma banye n’okporo ámá, ọ hụghịzi mmụọ ozi ahụ. Pita nọzi naanị ya n’ebe ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka o doro ya anya na ihe ahụ niile mere eme n’eziokwu, na ọ bụghị ọhụụ. A kpọpụtala ya n’ụlọ mkpọrọ.​—Ọrụ 12:7-11.

12. Gịnị mere obi ga-eji esi anyị ike ma anyị chee banyere otú Jehova si napụta Pita?

12 N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị echee banyere ụdị ike na-enweghị atụ Jehova nwere ịnapụta ndị ohu ya, obi ga-esi anyị ike. Onye tụrụ Pita mkpọrọ bụ eze ọchịchị kacha ike n’ụwa n’oge ahụ na-akwado. N’agbanyeghị ya, Pita ji ụkwụ ya si n’ụlọ mkpọrọ pụta. N’eziokwu, Jehova anaghị arụrụ ndị ohu ya niile ụdị ọrụ ebube ahụ. Ọ rụghịrị ya Jems, o mechakwanụghị rụọrọ ya Pita mgbe ihe Jizọs kwuru banyere ya mezuru n’isi ya. Ndị Kraịst taa anaghị atụ anya ka Chineke rụọ ọrụ ebube napụta ha. Ma, anyị ma na Jehova anaghị agbanwe agbanwe. (Mal. 3:6) N’oge na-adịghị anya, ọ ga-esi n’aka Ọkpara ya napụta ọtụtụ nde mmadụ n’ihe yiri ụlọ mkpọrọ mmadụ na-enweghị ike isi na ya pụta, ya bụ, ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị taa, nkwa a na ndị ọzọ yiri ya ga-emeli ka obi sie anyị ezigbo ike.

“Ha Hụrụ Ya, Ya Eju Ha Anya” (Ọrụ 12:12-17)

13-15. (a) Gịnị ka ndị nọ n’ọgbakọ na-ezukọ n’ụlọ Meri mere mgbe Pita rutere? (b) Olee ihe akwụkwọ Ọrụ Ndịozi maliteziri ịkọ, oleekwa ihe Pita nọ na-emere ụmụnna ya?

13 Pita guzo n’okporo ámá ahụ gbara ọchịchịrị na-eche ebe ọ ga-aga. O chetara ozugbo na e nwere otu nwanna nwaanyị bi nso. Aha ya bụ Meri. Ọ ga-abụ na Meri bụ nwaanyị di ya nwụrụ nke nwetụrụ ego. O nwere ụlọ buru ibu nke na-aba otu ọgbakọ. Ọ bụ nne Jọn Mak. Ihe a bụ nke mbụ a kpọrọ Jọn Mak aha n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, Pita mechakwara jiri ya mere nwa. (1 Pita 5:13) N’abalị ahụ, ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ nọ n’ụlọ Meri na-ekpesi ekpere ike n’agbanyeghị na chi ejiela. O doro anya na ha nọ na-ekpe ekpere ka a tọhapụ Pita. Ma, otú Jehova si za ha ekpere tụrụ ha n’anya.

14 Pita kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ámá e si abanye n’ogige dị n’ihu ụlọ ahụ. Otu nwa agbọghọ na-eje ozi aha ya bụ Roda bịara ịmara onye na-akụ aka. “Roda” bụ aha Grik nke pụtara “Roz,” ya bụ, okooko osisi Roz. Ihe ọ nụrụ dị ya ka ọ̀ bụ ná nrọ. Ọ bụ olu Pita. Obi ụtọ ekweghị ya mepee ọnụ ụzọ ámá ahụ, kama ọ hapụrụ Pita n’okporo ámá ahụ o guzo gbaghachi n’ụlọ ma gbalịwa ime ka ụmụnna zukọrọ n’ebe ahụ kweta na ọ bụ Pita guzo n’èzí. Ha sịrị na ọ maghị ihe ọ na-ekwu. Ma, ọnụ kara nwa agbọghọ ahụ. Ọ nọ na-ekwusi ike na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ụfọdụ n’ime ha kwetaziri na ọ ga-abụ na ọ dị ihe Roda nụrụ, mana na ọ ga-abụ olu mmụọ ozi nke nọchiri anya Pita. (Ọrụ 12:12-15) Ma ka ihe a niile na-eme, Pita ka nọ na-akụ aka ruo mgbe ha mechara gaa n’ọnụ ụzọ ámá ahụ mepeere ya ụzọ.

15 Mgbe ha ruru n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, “ha hụrụ ya, ya eju ha anya.” (Ọrụ 12:16) Pita mere ka ha kwụsịtụ mkpu ọṅụ ha na-eti ka ọ kọọrọ ha ihe merenụ. Ọ gwakwara ha ka ha kọọrọ ya Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs nakwa ụmụnna ndị ọzọ. Ọ pụwaziri ka ndị agha Herọd ghara ịhụ ya. Pita gawara ebe ọzọ ọ ga-anọ na-ejere Jehova ozi ahụ́ erutụ ya ala. Naanị otu ebe ọzọ a kpọrọ ya aha n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi bụ n’Isi nke 15, bụ́ ebe kwuru otú o si nye aka mee ka e dozie okwu gbasara ibi úgwù. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi maliteziri ịkọ banyere ozi Pọl onyeozi jere na ebe dị iche iche ọ gara. Ma, obi siri anyị ike na Pita mere ka okwukwe ụmụnna ya sie ike n’ebe ọ bụla ọ gara. O doro anya na mgbe ọ hapụrụ ụmụnna ahụ nọ n’ụlọ Meri, obi dị ha niile ezigbo ụtọ.

16. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi n’ọdịnihu?

16 Mgbe ụfọdụ, Jehova na-emere ndị ohu ya ihe karịrị ihe ha tụrụ anya ya, nke na ọnụ ọchị anaghị ekwe ha fụnwuo ọkụ. Ọ bụ otú ọ dị ụmụnna Pita n’abalị ahụ. Ọ bụkwa otú o nwere ike ịdị anyị mgbe ụfọdụ n’oge a ma Jehova gọzie anyị nke ukwuu. (Ilu 10:22) N’ọdịnihu, anyị ga-ahụ mgbe Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere n’ebe niile n’ụwa. Ihe ọma ọ ga-emere anyị mgbe ahụ ga-akarị ihe ọ bụla anyị na-atụ anya ya n’oge a. Ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-erubere Jehova isi, obi kwesịrị isi anyị ike na anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi n’ọdịnihu.

“Mmụọ Ozi Jehova Mere Ka Ikpuru Gbaa Ya” (Ọrụ 12:18-25)

17, 18. Gịnị mere ìgwè mmadụ ji too Herọd gafee ókè?

17 Otú Pita si pụta n’ụlọ mkpọrọ jukwara Herọd anya, ma o meghị ya obi ụtọ. Herọd nyere iwu ozugbo ka a chọsie Pita ike, ọ gbakwara ndị nche ahụ ajụjụ. ‘A kpụụrụ ha gaa taa ha ahụhụ.’ O nwere ike ịbụ na e gburu ha egbu. (Ọrụ 12:19) Herọd Agrịpa anaghị eme ebere. È mechara taa nwoke obi ọjọọ a ahụhụ?

18 Ọ ga-abụ na Agrịpa chere na ya kpụrụ úgwù ya n’ala maka na ya egbughị Pita. Ma n’oge na-adịghị anya, o nwetara ohere ọ ga-eji mee ka a kwanyewakwara ya úgwù. Ụfọdụ ndị iro ya bịara ịhụ ya ka ha na ya mee udo. N’ihi ya, ọ chọsiri ike ịgwa ìgwè mmadụ zukọtaranụ okwu. Luk kọrọ na mgbe Herọd na-ejikere, o “yiiri uwe onye eze.” Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josifọs dere na e ji ọlaọcha mee uwe Herọd otú ọ ga-abụ mgbe ọ bụla ìhè chara na ya, Herọd adị ebube n’anya. Onye ọchịchị a dị mpako maliteziri okwu ya. Ìgwè mmadụ ahụ, ndị chọrọ ito Herọd ka ha zụrụ ụtọ ya, tiri mkpu, sị: “Olu ya bụ olu chi. Ọ bụghị olu mmadụ!”​—Ọrụ 12:20-22.

19, 20. (a) Gịnị mere Jehova ji taa Herọd ahụhụ? (b) Gịnị mere akụkọ ọnwụ mberede Herọd Agrịpa nwụrụ ji akasi anyị obi?

19 Ọ bụ naanị Chineke ka e kwesịrị inye ụdị otuto ahụ. Chineke nọkwa na-ahụ ihe na-emenụ. A sị na Herọd chọrọ, ọ gaara agbara nsogbu ọsọ. Ọ gaara abara ìgwè mmadụ ahụ mba ma ọ bụkwanụ ma é nweghị ihe ọzọ jụ ịnara otuto ahụ. Kama ime otú ahụ, otu ilu a tụrụ na Baịbụl mezuru n’isi ya. Ilu ahụ sịrị: “Nganga na-ala mmadụ n’iyi.” (Ilu 16:18) “Ozugbo ahụ, mmụọ ozi Jehova mere ka ikpuru gbaa ya.” Ihe a mere ka nwoke ahụ mpako na-egbu ka mmanya nwụọ ọnwụ ihere. ‘Ikpuru gbara ya, ya anwụọ.’ (Ọrụ 12:23) Josifọs kwukwara na ikpuru gbara Agrịpa na mberede nakwa na eze ahụ kwetara na ihe mere ya ji anwụ bụ maka na ọ nabatara otuto ahụ ìgwè mmadụ ahụ toro ya. Josifọs dere na Agrịpa rịara ọrịa ahụ abalị ise tupu ya anwụọ. b

20 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị ka ndị ajọ omume anaghị anata ntaramahụhụ arụrụala ha na-arụ. Ihe a ekwesịghị iju anyị anya ebe ọ bụ na “ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ma mgbe ụfọdụ, ọ na-ewute ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ma ọ dị ka e nweghị ihe e mere ndị ajọ omume. O so n’ihe mere ụdị akụkọ a ji akasi anyị obi. Ọ na-egosi na Jehova na-ekpe ndị ajọ omume ikpe, na-echetakwara ndị niile na-efe ya na ikpe ziri ezi na-amasị ya. (Ọma 33:5) Mee elu mee ala, ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi.

21. Olee isi ihe Ọrụ Ndịozi Isi 12 na-akụziri anyị, gịnịkwa mere o ji bụụrụ anyị ihe na-akasi obi n’oge a?

21 Okwu na-agba ezigbo ume e ji pịachie akụkọ a bụ na “okwu Jehova nọ na-agbasa, ọtụtụ ndị ana-aghọkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 12:24) Ihe a a kọrọ banyere otú ọrụ ikwusa ozi ọma si na-aga n’ihu n’oge ahụ na-echetara anyị otú Jehova sirila gọzie otu ọrụ a n’oge anyị a. O doro anya na isi ihe e dere n’Ọrụ Ndịozi Isi 12 abụghị otú e si gbuo otu n’ime ndịozi Jizọs nakwa otú e si napụta onye nke ọzọ. Kama, ọ na-akụziri anyị banyere Jehova na ihe o mere iji kụghasịa mbọ Setan gbara ibibi ọgbakọ Ndị Kraịst na ime ka ha kwụsị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Mbọ niile ọ gbara kụrụ afọ n’ala otú atụmatụ ya niile ga-emechakwa kụọ afọ n’ala. (Aịza. 54:17) Ma, ndị na-akwado Jehova na Jizọs Kraịst na-arụ ọrụ na-agaghị akụ afọ n’ala. Ọ̀ bụ na ihe a anaghị agba anyị ume? N’eziokwu, ọ bụụrụ anyị ezigbo ihe ùgwù iso na-ekwusa “okwu Jehova” n’oge a.

a Gụọ igbe bụ́ “ Eze Herọd Agrịpa nke Mbụ.”

b Otu dọkịta bụ́kwa onye na-ede akwụkwọ dere na ọ ga-abụ na ihe kpatara ọrịa ahụ Josifọs na Luk kọwara bụ òkpò ndị na-akpọchi mmadụ eriri afọ ma gbuo ya. Mgbe ụfọdụ, onye ụdị òkpò ahụ dị n’ahụ́ na-agbọpụta ya ma ọ bụkwanụ ya esi n’ahụ́ ya rịpụta ma onye ahụ nwụọ. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru, sị: “Otú Luk, onye na-agwọ ọrịa, si kpọọ okwu aha mgbe ọ na-akọwa ihe mere Herọd na-eme ka o doo anya na ọnwu [Herọd] wụrụ ndị mmadụ akpata oyi n’ahụ́.”