ISI NKE 7
Izisa “Ozi Ọma Banyere Jizọs”
Filip gosiri na ọ bụ onye e ji ama atụ n’ikwusa ozi ọma
O Si n’Ọrụ Ndịozi 8:4-40
1, 2. Olee otú mbọ a gbara ịkwụsị ozi ọma n’oge ndịozi si kụọ afọ n’ala?
A MALITERE ịkpagbu Ndị Kraịst mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Sọl malitekwara “imesi ọgbakọ Chineke ike.” Okwu Grik a sụgharịrị ‘imesi ike’ gosiri na mkpagbu ahụ jọgburu onwe ya. (Ọrụ 8:3) Ndị na-eso ụzọ Jizọs gbara ọsọ. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na Sọl ga-emezu ihe o bu n’obi, nke bụ́ ime ka Ndị Kraịst kwụsị ikwusa ozi ọma. Ma, Ndị Kraịst ahụ gbara ọsọ mere ihe a na-atụghị anya ya n’ebe ha gbagara. Gịnị ka ha mere?
2 Ndị ahụ a chụsasịrị malitere ‘ikwusa okwu Chineke’ n’obodo dị iche iche ha gbagara. (Ọrụ 8:4) Chebagodịrị ihe a echiche. Mkpagbu ahụ emeghị ka ndị Chineke kwụsị ikwusa ozi ọma, kama o medịrị ka ozi ọma ruo ebe ndị ọzọ. Mgbe ndị na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs chụsasịrị ha, ha amaghị na ihe a ha mere ga-eme ka ozi ọma Alaeze Chineke ruo ebe dị iche iche dị anya. Anyị ga-emecha chọpụta na ụdị ihe a emeekwala n’oge anyị a.
“Ndị Ahụ A Chụsasịrị” (Ọrụ 8:4-8)
3. (a) Ònye bụ Filip? (b) Gịnị mere na ọtụtụ ndị bi na Sameria anụbeghị ozi ọma, ma gịnị ka Jizọs buru n’amụma ga-eme na ya?
3 Otu n’ime “ndị ahụ a chụsasịrị” bụ Filip. a (Ọrụ 8:4; gụọ igbe bụ́ “ Filip ‘Onye Na-ezisa Ozi Ọma.’”) Ọ gara Sameria. Ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ anụbeghị ozi ọma n’ihi na Jizọs gwaburu ndịozi ya, sị: “Unu abanyela n’okporo ụzọ ndị mba ọzọ, unu abanyekwala n’obodo ndị Sameria. Kama, na-agakwurunụ atụrụ furu efu bụ́ mba Izrel.” (Mat. 10:5, 6) Ma, Jizọs ma na ka oge na-aga, a ga-ezisa ozi ọma nke ọma na Sameria, n’ihi na tupu ya alaa eluigwe, o kwuru, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.”—Ọrụ 1:8.
4. Olee ihe ndị Sameria mere mgbe Filip ziri ha ozi ọma, oleekwa ihe ndị nwere ike iso mee ka ha gee ya ntị?
4 Filip chọpụtara na Sameria “achaala maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35) Ozi ọma o ziri ndị bi ebe ahụ mere ka obi ruo ha ala. Anyị ghọtara ihe kpatara ya. Ndị Juu anaghị ekwe ka ha na ndị Sameria mekọọ ihe, ọtụtụ ndị Juu kpọdịrị ha asị. Ma, ndị Sameria ghọtaziri na Ndị Kraịst anaghị akpa ókè n’ozi ọma ha na-ekwusa. Ha chọpụtara na ozi ọma ahụ dị ezigbo iche n’ihe ndị Farisii, bụ́ ndị na-akpa ókè, na-akụzi. Filip ji ịnụ ọkụ n’obi zie ndị Sameria ozi ọma n’akpaghị ókè ọ bụla. O si otú a gosi na ọ kpọghị ha asị otú ndị ọzọ kpọrọ ha. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị Sameria ji jiri “otu obi na-aṅa ntị n’ihe Filip na-ekwu.”—Ọrụ 8:6.
5-7. Nye ihe atụ ndị gosiri otú nchụsa a chụsara Ndị Kraịst si mee ka e kwusaa ozi ọma n’ebe dị iche iche.
5 Taa, mkpagbu a na-akpagbu ndị Chineke emebeghị ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma otú ahụ ọ na-emeghị ka Ndị Kraịst oge mbụ kwụsị. Ọtụtụ mgbe, ịtụ Ndị Kraịst mkpọrọ ma ọ bụ ịchụga ha ebe ọzọ na-eme ka e kwusaara ndị nọ ebe ahụ ozi ọma Alaeze. Dị ka ihe atụ, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, Ndịàmà Jehova kwusaara ndị ọzọ ozi ọma mgbe a tụdịrị ha mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi. Otu onye Juu ya na Ndịàmà Jehova nọrọ n’ebe ahụ kwuru, sị: “Obi ike Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ nwere mere ka o doo m anya na okpukpe ha si n’Akwụkwọ Nsọ, o mekwara ka m bụrụ Onyeàmà Jehova.”
6 Mgbe ụfọdụ, Ndịàmà Jehova na-ezidị ndị na-akpagbu ha ozi ọma, ha echegharịa. Dị ka ihe atụ, mgbe a kpọfere otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Franz Desch n’ogige ịta ahụhụ Gusen nke dị n’Ọstria, ọ mụụrụ otu onye so ná ndị uwe ojii a na-akpọ SS Baịbụl. Chegodị otú obi si tọọ ha ụtọ mgbe ha hụrụ ibe ha ọzọ n’otu mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere mgbe ọtụtụ afọ gachara. Ha abụọ bụzi ndị na-ekwusa ozi ọma.
7 Ụdị ihe a mekwara mgbe mkpagbu mere ka Ndị Kraịst si n’otu mba gbaga ná mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, n’agbata afọ 1970 na 1980, mgbe Ndịàmà Jehova nọ na Malawi gbara ọsọ ndụ gbaga Mozambik, ha ziri ndị obodo ahụ ozi ọma nke ọma. Mgbe ndị Mozambik mechadịrị kpagbuwe Ndịàmà Jehova, ha akwụsịghị izisa ozi ọma. Otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Francisco Coana kwuru, sị: “N’eziokwu, e jidere ụfọdụ n’ime anyị ọtụtụ ugboro n’ihi ozi ọma anyị na-ekwusa. Ma, mgbe ọtụtụ ndị ghọrọ Ndịàmà Jehova n’ihi ozi ọma anyị ziri ha, o mere ka obi sie anyị ike na Chineke na-enyere anyị aka otú ahụ o nyeere Ndị Kraịst n’oge ndịozi.”
8. Olee otú mgbanwe ọchịchị na ihe isi ike si eme ka ndị mmadụ na-anụkwu ozi ọma?
8 N’eziokwu, ọ bụghị naanị mkpagbu na-eme ka ndị nọ n’ebe dị iche iche na-anabata ozi ọma. N’ime ọtụtụ afọ gara aga, mgbanwe ọchịchị na ihe isi ike emeela ka e kwusaara ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na ndị si mba dị iche iche ozi ọma Alaeze. Ụfọdụ ndị a na-alụ agha n’obodo ha na ndị ihe siri ike n’obodo ha akwagala mba ebe ihe katụ mma ma malite ịmụ Baịbụl n’ebe ahụ. Ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ emeela ka e nwee ókèala ndị a na-asụ asụsụ mba ọzọ ná mba dị iche iche. Ị̀ na-agbalị izi ndị “si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile ozi ọma” n’ókèala unu?—Mkpu. 7:9.
“Nyenụ M Ikike A” (Ọrụ 8:9-25)
9. Ònye bụ Saịmọn, ọ̀ ga-abụkwa gịnị mere o ji nwee mmasị n’ọrụ Filip nọ na-arụ?
9 Filip rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na Sameria. Dị ka ihe atụ, ọ gwọrọ ndị nwere nkwarụ, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ. (Ọrụ 8:6-8) E nwere otu nwoke ọrụ ebube ndị ahụ Filip rụrụ kacha masị. Aha ya bụ Saịmọn. Ọ na-eme anwansi, ndị mmadụ na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù ma na-ekwu banyere ya, sị: “Chineke nyere nwoke a ike dị egwu.” Ma ugbu a, Saịmọn ahụla nke bụ́ ike Chineke n’ọrụ ebube ndị Filip rụrụ, ya aghọzie onye na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 8:9-13) Ma mgbe e mechara, Saịmọn gosiri ihe mere o ji ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Gịnị ka o mere?
10. (a) Olee ihe Pita na Jọn mere na Sameria? (b) Olee ihe Saịmọn mere mgbe ọ hụrụ ka ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ọhụrụ nwetara mmụọ nsọ mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka n’isi?
10 Mgbe ndịozi Jizọs nụrụ na ọtụtụ ndị bi na Sameria aghọwala Ndị Kraịst, ha zigaara ha Pita na Jọn. (Gụọ igbe bụ́ “ Otú Pita Si Jiri ‘Mkpịsị Ugodi nke Alaeze’ Rụọ Ọrụ.”) Mgbe ndịozi abụọ ahụ rutere Sameria, ha bikwasịrị ndị ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ọhụrụ aka n’isi, mmụọ nsọ adakwasị onye ọ bụla n’ime ha. b Mgbe Saịmọn hụrụ ihe merenụ, ọ masịrị ya. Ọ gwara ndịozi Jizọs, sị: “Nyenụ m ikike a, ka ọ ga-abụ, onye ọ bụla m bikwasịrị aka n’isi, mmụọ nsọ adakwasị ya.” Saịmọn nyedịrị ha ego, chee na ya nwere ike iji ego zụta ike a Chineke na-enye ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Ọrụ 8:14-19.
11. Olee ndụmọdụ Pita nyere Saịmọn, oleekwa ihe Saịmọn mere?
11 Pita amaghị ọnụ jijiji mgbe ọ na-agwa Saịmọn okwu. Ọ sịrị ya: “Ka gị na ọlaọcha gị laa n’iyi, n’ihi na i chere na ị ga-ejili ego nweta onyinye Chineke na-enye n’efu. O nweghị ihe ọ bụla gbasara gị n’ihe a, n’ihi na obi gị adịghị ọcha n’anya Chineke.” Pita gwaziri Saịmọn ka o chegharịa ma kpee ekpere ka Chineke gbaghara ya. Pita sịrị ya: “Rịọsiekwa Jehova arịrịọ ike ma gbanwee echiche ọjọọ gị, ka ọ gbaghara gị.” Ọ ga-abụ na Saịmọn abụghị onye ọjọọ. Ọ chọrọ ime ihe ziri ezi, ma o mere nke na-adịghị mma mgbe ahụ. N’ihi ya, ọ rịọrọ ndịozi ahụ, sị: “Rịọsierenụ m Jehova arịrịọ ike ka nke ọ bụla n’ime ihe unu kwuru ghara ime m.”—Ọrụ 8:20-24.
12. Gịnị bụ “ịzụ ọkwá,” oleekwa otú ọnyà a sirila mata Ndị Kraịst adịgboroja?
12 Ndị Kraịst taa kwesịrị ịmụta ihe na mba Pita baara Saịmọn. N’eziokwu, e si n’ihe ahụ merenụ nweta okwu Bekee a sụgharịrị “ịzụ ọkwá.” Ọ pụtara iji ego zụta ọkwá ma ọ bụ iresị onye ọzọ ọkwá, karịchaa, n’okpukpe. E ji ịzụ ọkwá mara Ndị Kraịst adịgboroja. Akwụkwọ aha ya bụ Encyclopædia Britannica (1878), mbipụta nke itoolu, sịrị: “Ọ bụrụ na nwa akwụkwọ amụọ gbasara ihe na-eme ná nzukọ ndị a na-enwe ma a họpụtawa poopu, ọ ga-edo ya anya na e nwetụbeghị ntụliaka e mere ná nzukọ ndị ahụ nke a na-azụghị ọkwá na ya. Ọtụtụ mgbe, otú e si zụọ ọkwá ndị ahụ n’ezoghị ihe ọ bụla ezo jọgburu onwe ha, na-emekwa ihere.”
13. Olee otú Ndị Kraịst ga-esi kpachara anya ka ha ghara ịzụ ọkwá n’ọgbakọ?
13 Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịzụrụ ọkwá n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ha ekwesịghị ịna-enye ndị e chere na ha nwere ike inye mmadụ ọrụ ma ọ bụ ihe ùgwù n’ọgbakọ nnukwu onyinye ma ọ bụ na-eto ha gafee ókè. Ndị e chere na ha nwere ike inye mmadụ ọrụ ma ọ bụ ihe ùgwù n’ọgbakọ kwesịkwara ịkpachara anya ka ha ghara imenyere ndị ọgaranya. Nke ọ bụla n’ime ha bụ ịzụrụ ọkwá. N’eziokwu, ndị niile na-efe Chineke kwesịrị iwere onwe ha ka ‘ndị ka nta’ ma chere ka mmụọ Jehova họpụta ha ka ha jewe ozi n’ọgbakọ. (Luk 9:48) E kwesịghị inwe ndị ‘na-achọ ka a na-eto’ ha ná nzukọ Chineke.—Ilu 25:27.
“Ị̀ Na-aghọta Ihe Ị Na-agụ?” (Ọrụ 8:26-40)
14, 15. (a) Ònye bụ onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ ma ọ bụ ọnaozi, oleekwa otú Filip si hụ ya? (b) Gịnị ka nwoke Etiopia ahụ mere mgbe Filip ziri ya ozi ọma, gịnịkwa mere a ga-eji ekwu na e meghị ya baptizim ọkụ ọkụ? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)
14 Mmụọ ozi Jehova gwaziri Filip ka ọ gaa n’ụzọ si Jeruselem gaa Gaza. Ọ bụrụ na Filip amaghị ihe mere e ji sị ya gawa ebe ahụ, ọ matara ozugbo ọ hụrụ onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ ma ọ bụ ọnaozi ka “ọ na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma.” (Gụọ igbe bụ́ “ Gịnị Mere E Ji Kpọọ Onye Etiopia Ahụ ‘Ọnaozi’ Ma Ọ Bụ ‘Nnukwu Mmadụ’?”) Mmụọ nsọ Jehova mere ka Filip garuo ụgbọ ịnyịnya nwoke ahụ nso. Ka ụgbọ ịnyịnya onye Etiopia ahụ na-aga, Filip ji ọsọ na-aga n’akụkụ ya ma jụọ nwoke ahụ, sị: “Ị̀ na-aghọta ihe ị na-agụ?” Onye Etiopia ahụ zara ya, sị: “Olee otú m ga-esi ghọta ihe m na-agụ ma ọ bụrụ na o nweghị onye kọwaara m ya?”—Ọrụ 8:26-31.
15 Onye Etiopia ahụ rịọrọ Filip ka ọ rịgota n’ụgbọ ịnyịnya ya. Chegodị ụdị ụka ha kparịtara. Onye Etiopia ahụ amaghị onye bụ́ “atụrụ” ma ọ bụ “ohu” e dere n’amụma Aịzaya ahụ ọ na-agụ, otú ọtụtụ ndị na-amaghị kemgbe. (Aịza. 53:1-12) Ma ka ha abụọ na-aga, Filip kọwaara ya na amụma ahụ mezuru n’isi Jizọs Kraịst. Dị ka ndị ahụ e mere baptizim na Pentikọst afọ 33 O.N.K., onye Etiopia ahụ, onye na-ekpe okpukpe ndị Juu, ma ihe o kwesịrị ime ozugbo. Ọ gwara Filip, sị: “Lee mmiri, gịnị ga-egbochi ime m baptizim?” Filip mere onye Etiopia ahụ baptizim ozugbo. c (Gụọ igbe bụ́ “ Ime Baptizim ‘n’Ime Mmiri.’”) Mgbe e mechara, mmụọ Jehova duuru Filip gaa Ashdọd, bụ́ ebe ọ nọzi na-ekwusa ozi ọma.—Ọrụ 8:32-40.
16, 17. Olee otú ndị mmụọ ozi si eso ekwusa ozi ọma taa?
16 Chineke meere Ndị Kraịst nke oge a amara kwe ka ha na-arụ ụdị ọrụ ahụ Filip rụrụ. Ha na-ezikarị ndị ha hụrụ mgbe ha na-anọghị n’ozi ọma ozi gbasara Alaeze Chineke, dị ka mgbe ha na-eme njem. Ọtụtụ mgbe, ọ na-edo ha anya na ọ bụghị ná ndaba ka ha ji nweta onye nwere mmasị. Ihe a ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na Baịbụl mere ka o doo anya na ndị mmụọ ozi na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma ka e nwee ike izisara ya “mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile na agbụrụ niile.” (Mkpu. 14:6) Jizọs buru amụma na ndị mmụọ ozi ga na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma. N’ihe atụ ọka wit na ata Jizọs mere, o kwuru na n’oge owuwe ihe ubi, ya bụ, n’ọgwụgwụ oge a, ndị “na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọ ozi.” O kwukwara na ndị mmụọ ozi ga-esi “n’Alaeze ya chịkọta ndị niile na-eme ka ndị ọzọ mee mmehie nakwa ụmụ mmadụ ndị na-emebi iwu.” (Mat. 13:37-41) Ndị mmụọ ozi ga-achịkọtakwa ndị ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze eluigwe. Ka oge na-aga, ha ga-achịkọta “oké ìgwè mmadụ,” ndị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ ndị Jehova ga-akpọbata ná nzukọ ya.—Mkpu. 7:9; Jọn 6:44, 65; 10:16.
17 Ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu bụ na ụfọdụ ndị anyị na-ezi ozi ọma na-ekwu na ha nọ na-ekpe ekpere ka Chineke nyere ha aka tupu anyị abịa na nke ha. Dị ka ihe atụ, otu nwatakịrị so ụmụnna abụọ gaa ozi ọma. Mgbe ụmụnna abụọ ahụ zichara ozi ọma n’ụtụtụ ahụ chọwa ịla, nwatakịrị ahụ chọsiri ike ka ha gaa n’ụlọ nke ọzọ. Ọ gadịrị kụọ aka n’ọnụ ụzọ ahụ n’onwe ya. Mgbe otu nwa agbọghọ mepere ụzọ, ụmụnna abụọ ahụ gawara izi ya ozi ọma. O juru ha anya mgbe nwaanyị ahụ gwara ha na ya nọ na-ekpe ekpere ka Chineke zitere ya onye ga-akụziri ya Baịbụl. Ha malitere ịmụrụ ya Baịbụl.
18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji ozi ọma anyị na-ekwusa egwu egwu?
18 Ebe ọ bụ na ị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, i nwere ihe ùgwù iso ndị mmụọ ozi na-ekwusa ozi ọma n’oge anyị a otú a na-ekwusatụbeghị ya. Anyị ekwesịghị iji ihe ùgwù a gwuo egwu. Ọ bụrụ na ị nọgide na-agbasi mbọ ike n’ọrụ a, obi ga na-atọ gị ezigbo ụtọ na ị na-ekwusa “ozi ọma banyere Jizọs.”—Ọrụ 8:35.
a Filip a abụghị Filip onyeozi. Kama, dị ka e kwuru n’Isi nke 5 n’akwụkwọ a, o so ‘n’ụmụ nwoke asaa ndị nwere aha ọma,’ ndị a họpụtara ka ha na-ahụ maka ikesara Ndị Kraịst bụ́ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ nọ na Jeruselem nri kwa ụbọchị, ma ndị nke na-asụ Grik ma ndị nke na-asụ Hibru.—Ọrụ 6:1-6.
b O doro anya na n’oge ahụ, ọ na-abụkarị mgbe e mere ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Jizọs baptizim ka a na-eji mmụọ nsọ ete ha mmanụ ma ọ bụ ka mmụọ nsọ na-adakwasị ha. Ihe a na-eme ka ha nwee olileanya iso Jizọs bụrụ eze na ndị nchụàjà n’eluigwe n’ọdịnihu. (2 Kọr. 1:21, 22; Mkpu. 5:9, 10; 20:6) Ma e jighị mmụọ nsọ tee ndị ọhụrụ a na-eso ụzọ Jizọs mmanụ mgbe e mere ha baptizim. Ọ bụ mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ha aka n’isi ka mmụọ nsọ dakwasịrị ha, ha enweekwa ike ịrụ ọrụ ebube.
c E meghị onye Etiopia ahụ baptizim ọkụ ọkụ. Ebe ọ bụ na ọ na-ekpe okpukpe ndị Juu, ọ ma Akwụkwọ Nsọ, marakwa amụma ndị e buru gbasara Mezaya. Ebe ọ bụkwa na ọ matala ọrụ Jizọs na-arụ ná nzube Chineke, e kwesịrị ime ya baptizim ozugbo.