Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 8

‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’

‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’

Sọl, onye obi tara mmiri na-akpagbu ọgbakọ, ghọrọ onye ozi na-anụ ọkụ n’obi

O Si n’Ọrụ Ndịozi 9:1-43

1, 2. Gịnị ka Sọl chọrọ ịga mee na Damaskọs?

 E NWERE ụmụ nwoke ihu atọ ọchị nọ n’okporo ụzọ na-eme njem. Ọ fọrọ obere ka ha rute Damaskọs, bụ́ ebe ha chọrọ ịga rụọ arụrụala. Ha ga-aga n’ụlọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị ha kpọrọ asị, kee ha agbụ, menye ha ihere, kpụrụkwa ha gaa Jeruselem ka ụlọikpe Sanhedrin taa ha ahụhụ.

2 Aha onyeisi ha bụ Sọl. E nweela mgbe o so gbuo mmadụ. a N’oge na-adịbeghị anya, obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ nọ na-ekiri ndị ibe ya okpukpe ha na-agba ara ka ha ji nkume tụgbuo Stivin, ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 7:57–8:1) Mana, imesi ndị na-eso ụzọ Jizọs bi na Jeruselem ike ezurughị Sọl. Ọ malitekwara ịkpagbu Ndị Kraịst nọ n’obodo ndị ọzọ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọ chọrọ ikpochapụ ndị okpukpe ahụ a na-akpọ “Ụzọ Onyenwe anyị.”—Ọrụ 9:1, 2; gụọ igbe bụ́ “ Ikike Sọl Nwere na Damaskọs.”

3, 4. (a) Gịnị mere Sọl? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Na mberede, ìhè na-achachi anya nwuru gburugburu Sọl. Ndị ha na ya so hụrụ ìhè ahụ, o nyeghịkwa ha ọnụ okwu. Ìhè ahụ mere ka ìsì kpuo Sọl, ya adaa n’ala. Ọ naghịzi ahụ ụzọ. Ọ nụziri olu si n’eluigwe nke sịrị ya: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Ihe a juru Sọl anya, ya ajụọ, sị: “Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?” Ọ ga-abụrịrị na ihe a zara Sọl enyeghị ya ọnụ okwu. Olu ahụ zara ya, sị: “Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu.”—Ọrụ 9:3-5; 22:9.

4 Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe mbụ a Jizọs gwara Sọl? Olee uru anyị ga-erite ma anyị mụọ ihe ndị mere mgbe Sọl ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs? Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’ihe ọgbakọ Ndị Kraịst ji oge obi ruru ha ala mee mgbe Sọl chegharịrị?

“Gịnị Mere I Ji Na-akpagbu M?” (Ọrụ 9:1-5)

5, 6. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Jizọs gwara Sọl?

5 Mgbe Jizọs kwụsịrị Sọl n’ụzọ Damaskọs, ọ jụghị ya: “Gịnị mere i ji na-akpagbu ndị na-eso ụzọ m?” Dị ka anyị kwuburu, ọ sịrị ya: “Gịnị mere i ji na-akpagbu m?” (Ọrụ 9:4) N’eziokwu, ọ na-adị Jizọs ka ọ̀ bụ ya ka a na-akpagbu ma a kpagbuwe ndị na-eso ụzọ ya.—Mat. 25:34-40, 45.

6 Ọ bụrụ na a na-emesi gị ike maka na i nwere okwukwe na Kraịst, obi sie gị ike na Jehova na Jizọs ma ihe na-eme gị. (Mat. 10:22, 28-31) E nwere ike Jehova agaghị ewepụ ọnwụnwa ahụ ugbu a. Cheta na Jizọs hụrụ mgbe Sọl nọ na-akwado ka e gbuo Stivin, hụkwa mgbe Sọl na-aga n’ụlọ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs na Jeruselem na-akpụrụ ha. (Ọrụ 8:3) N’agbanyeghị na Jizọs hụrụ ihe niile ahụ, ọ kwụsịghị mkpagbu ahụ mgbe ahụ. Ma, Jehova si n’aka Kraịst nye Stivin na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ume ha ji rubere ya isi.

7. Gịnị ka ị ga na-eme ka i nwee ike idi mkpagbu?

7 I nwekwara ike idi mkpagbu a na-akpagbu gị ma i mee ihe ndị a: (1) Kpebisie ike na ị ga na-erubere Jehova isi, ihe ọ sọkwara ya mee. (2) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. (Fil. 4:6, 7) (3) Hapụrụ Jehova ọbọ. (Rom 12:17-21) (4) Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye gị ike ị ga-eji na-atachi obi ruo mgbe ọ ga-ewepụ ọnwụnwa ahụ.—Fil. 4:12, 13.

“Sọl, Nwanna M, Onyenwe Anyị . . . Zitere M” (Ọrụ 9:6-17)

8, 9. Olee otú ọ ga-abụ na obi dị Ananayas maka ọrụ e nyere ya?

8 Mgbe Jizọs zachara Sọl ajụjụ ọ jụrụ ya nke bụ́, “Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?,” Jizọs sịrị ya: “Bilie banye n’obodo, a ga-agwakwa gị ihe ị ga-eme.” (Ọrụ 9:6) Ebe Sọl na-anaghịzi ahụ ụzọ, e du ya edu gaa n’ebe ọ ga-anọ na Damaskọs. Ọ nọ ebe ahụ buo ọnụ ma kpee ekpere ruo ụbọchị atọ. Ka ihe a na-eme, Jizọs gwara otu onye na-eso ụzọ ya nọ n’obodo ahụ banyere Sọl. Aha onye ahụ bụ Ananayas, ‘onye ndị Juu niile bi na Damaskọs na-ekwu okwu ọma banyere ya.’—Ọrụ 22:12.

9 Chegodị otú obi dị Ananayas. Ọ ga-abụ na obi akachaghị ya. Ọ bụ Jizọs Kraịst, onye a kpọlitere n’ọnwụ, Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst, na-agwa ya okwu ma họrọ ya ka ọ gaa rụọ ọrụ pụrụ iche. Ọ bụ nnukwu ùgwù ka a kwanyeere ya nye ya ọrụ ahụ. Mana, ọrụ ahụ adịghị mfe. Mgbe Jizọs gwara Ananayas ka ọ gaa gwa Sọl okwu, Ananayas sịrị: “Onyenwe anyị, anụla m ihe ọtụtụ ndị na-ekwu gbasara nwoke a. Ha na-ekwu gbasara ihe ọjọọ niile o mere ndị nsọ gị na Jeruselem. Ndị isi nchụàjà nyekwara ya ikike ka ọ kpụta ndị niile na-eso ụzọ gị.”—Ọrụ 9:13, 14.

10. Gịnị ka otú Jizọs si meso Ananayas ihe na-akụziri anyị gbasara Jizọs?

10 Jizọs abaraghị Ananayas mba maka na o kwuru ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Ma, Jizọs gwara ya hoo haa ihe ọ ga-eme. Jizọs kwanyekwaara ya ùgwù gwa ya ihe mere o ji chọọ ka ọ rụọ ọrụ ahụ pụrụ iche. Jizọs kwuru banyere Sọl, sị: “Ahọrọla m nwoke a ka ọ gbaara ndị mba ọzọ, ndị eze nakwa ndị Izrel àmà gbasara m. M ga-eme ka ọ mara ahụhụ niile ọ ga-ata n’ihi aha m.” (Ọrụ 9:15, 16) Ananayas rubeere Jizọs isi ozugbo. Ọ gara chọta Sọl onye na-akpagbu Ndị Kraịst ma sị ya: “Sọl, nwanna m, Onyenwe anyị Jizọs, onye pụtara n’ihu gị mgbe ị nọ n’ụzọ na-abịa, zitere m, ka i wee hụwa ụzọ ma jupụta na mmụọ nsọ.”—Ọrụ 9:17.

11, 12. Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ a kọrọ banyere Jizọs, Ananayas, na Sọl?

11 E nwere ọtụtụ ihe anyị na-amụta n’akụkọ a a kọrọ banyere Jizọs, Ananayas, na Sọl. Dị ka ihe atụ, anyị mụtara na Jizọs na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma otú o kwere nkwa na ọ ga-eme. (Mat. 28:20) Ọ bụ eziokwu na Jizọs anaghị esi n’eluigwe agwa ndị mmadụ okwu taa, ọ na-esi n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye ọ họpụtara ilekọta ezinụlọ ya, na-eduzi ọrụ a. (Mat. 24:45-47) Òtù Na-achị Isi na-ezipụ ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ ka ha gaa chọta ndị chọrọ ịmatakwu banyere Kraịst. N’isi nke 7, anyị kwuru na e nweela ọtụtụ ndị dị otú ahụ kpere ekpere ka Chineke zi ha ụzọ, obere oge, Ndịàmà Jehova abịa n’ụlọ ha.—Ọrụ 9:11.

12 Ananayas rubere isi, gaa rụọ ọrụ ahụ e nyere ya, Chineke gọzikwara ya. Ị̀ na-erube isi n’iwu e nyere anyị ka anyị na-agba àmà nke ọma, ọ bụrụgodị na obi akachaghị gị? Ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, na-aga agwa ndị anyị na-amaghị okwu, na-eme ka obi wụba ụfọdụ n’ime anyị n’afọ. Ọ na-esiri ndị ọzọ ike izi ndị mmadụ ozi ọma n’ahịa ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ ha, n’okporo ámá, ma ọ bụkwanụ iji telefon ma ọ bụ akwụkwọ ozi ezi ha ozi ọma. Ananayas kwụsịrị ịtụ ụjọ. Ọ bụ ya mere o ji nwee ihe ùgwù ime ka mmụọ nsọ dakwasị Sọl. b Ananayas meliri ihe a maka na ọ tụkwasịrị Jizọs obi, werekwa Sọl ka onye ga-abụ nwanna ya. Anyị nwere ike ịkwụsị ịtụ ụjọ ma anyị mee ka Ananayas, tụkwasị Jizọs obi na ọ bụ ya na-eduzi ozi ọma anyị na-ezisa, na-enwekwara ndị mmadụ ọmịiko, ma weredị ndị ọtụtụ ndị kacha atụ ụjọ ka ndị nwere ike ịbụ ụmụnna anyị.—Mat. 9:36.

“Ọ Malitere Kwusawa . . . na Jizọs Bụ Ọkpara Chineke” (Ọrụ 9:18-30)

13, 14. Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma e mebeghị gị baptizim, gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe Sọl mere?

13 Sọl mere ihe ọ mụtara ozugbo. Mgbe a gwọchara ya, e mere ya baptizim, ya na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Damaskọs amalite ịkpachi anya. Ma e nwere ihe ọzọ o mere. “N’egbughị oge, ọ malitere kwusawa n’ụlọ nzukọ na Jizọs bụ Ọkpara Chineke.”—Ọrụ 9:20.

14 Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma e mebeghị gị baptizim, ị̀ ga-eme ka Sọl, mee ihe ị mụtara n’egbughị oge? N’eziokwu, Sọl ji anya ya hụ ọrụ ebube Kraịst rụrụ. O dokwara anya na ihe a so mee ka o kpebie ime baptizim. Ma e nwere ndị ọzọ hụrụ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị Farisii hụrụ mgbe Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. E nwekwara ọtụtụ ndị Juu ma na Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. N’agbanyeghị ya, ọtụtụ n’ime ha enweghị mmasị iso Jizọs, ụfọdụ nọdị na-emegide ya. (Mak 3:1-6; Jọn 12:9, 10) Ma Sọl gbanwere obi ya. Gịnị mere Sọl ji gbanwee n’agbanyeghị na ndị ọzọ kpọrọ ekwo nkụ? Ọ bụ n’ihi na ọ tụrụ Chineke egwu karịa mmadụ. Obi dịkwa ya ezigbo ụtọ maka ebere Kraịst meere ya. (Fil. 3:8) Ọ bụrụ na i mee ka ya, ị gaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie gị iso na-ekwusa ozi ọma na ịgbalịsi ike ka i ruo eruo ime baptizim.

15, 16. Gịnị ka Sọl mere n’ụlọ nzukọ ndị Juu, gịnịkwa ka ndị Juu nọ na Damaskọs mere?

15 Chegodị otú obi dị ndị mmadụ mgbe ha hụrụ ka Sọl malitere ikwusa banyere Jizọs n’ụlọ nzukọ ndị Juu. O juru ụfọdụ ndị anya, wụọ ụfọdụ ndị akpata oyi n’ahụ́, weekwa ụfọdụ ndị iwe. Ha jụrụ, sị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ na-emesi ndị na-eso ụzọ Jizọs ike na Jeruselem?” (Ọrụ 9:21) Mgbe Sọl na-akọwara ndị Juu ihe mere o ji kweta na Jizọs bụ Kraịst, ihe ọ kọwaara ha “doro nnọọ anya, ha enweghịkwa ike ịgbagha ihe o kwuru.” (Ọrụ 9:22) Ma, ọ bụrụgodị na a kọwara ihe nke ọma, ọ bụghị mmadụ niile na-ekweta ya. Ịkọwa ihe nke ọma enweghị ike ime ka ndị niile omenala ma ọ bụ mpako mere ka obi ha kpọchie gbanwee. Ma, Sọl adaghị mbà.

16 Mgbe afọ atọ gachara, ndị Juu nọ na Damaskọs ka nọ na-emegide Sọl. Ha mechara chọwa igbu ya. (Ọrụ 9:23; 2 Kọr. 11:32, 33; Gal. 1:13-18) Mgbe Sọl matara gbasara nkata ha na-akpa, o kwetara ka e si n’oghere dị ná mgbidi jiri nkata butuo ya, ya esizie n’obodo ahụ pụọ. Luk kpọrọ ndị nyeere Sọl aka ịgbapụ n’abalị ahụ “ndị ọ kụziiri ihe.” (Ọrụ 9:25) Ihe a Luk kpọrọ ha gosiri na e nwere ụfọdụ ndị nabatara ozi ọma Sọl kwusara na Damaskọs ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst.

17. (a) Olee ihe dị iche iche ndị mmadụ na-eme ma a kụziere ha eziokwu dị na Baịbụl? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme? Maka gịnị?

17 Mgbe ị malitere ịgwa ndị ezinụlọ unu, ndị enyi gị, na ndị ọzọ ihe ọma ndị ị na-amụta na Baịbụl, i nwere ike ịna-atụ anya na ha niile ga-anabata eziokwu dị na Baịbụl maka na ha esighị ike nghọta. Ọ ga-abụ na ụfọdụ ndị nabatara ya, ma ọtụtụ ndị emeghị otú ahụ. O nwedịrị ike ịbụ na ndị ezinụlọ unu mesoro gị omume ka ị̀ bụ onye iro ha. (Mat. 10:32-38) Ma, ọ bụrụ na ị na-amụtakwu otú ị ga na-esi enyere ha aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ, ọ bụrụkwa na ị na-akpa àgwà ka Onye Kraịst, ndị na-emegide gị nwedịrị ike imecha chegharịa.—Ọrụ 17:2; 1 Pita 2:12; 3:1, 2, 7.

18, 19. (a) Mgbe Banabas gbachiteere Sọl, gịnị mere? (b) Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Banabas na Sọl?

18 Mgbe Sọl bịara Jeruselem, obi esichaghị ndị na-eso ụzọ Jizọs ike na ọ bụzi onye na-eso ụzọ Jizọs otú o kwuru na ya bụ. Anyị ghọtakwara ihe kpatara ya. Ma mgbe Banabas gbachiteere Sọl, ndịozi Jizọs nabatara ya, ya na ha anọtụ. (Ọrụ 9:26-28) Sọl kpachapụrụ anya, ma ihere ozi ọma emeghị ya. (Rom 1:16) O ji obi ike kwusaa ozi ọma na Jeruselem, bụ́ ebe ọ nọ malite imesi ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ike. O wutere ndị Juu nọ na Jeruselem na onye ha chere ga-enyere ha aka kpochapụ Ndị Kraịst bụzi onye na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ya, ha chọwara otú ha ga-esi egbu ya. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ụmụnna matara gbasara ihe a, ha kpọgara ya Sizaria ma ziga ya Tasọs.” (Ọrụ 9:30) Sọl mere ihe Jizọs si n’aka ọgbakọ Ndị Kraịst gwa ya. Ihe a baara ma Sọl ma ọgbakọ ahụ uru.

19 Ị̀ hụrụ na Banabas nyeere Sọl aka n’echeghị ka a gwa ya agwa? O doro anya na ihe a o meere ya mere ka ha abụọ, bụ́ ndị na-anụrụ ofufe Jehova ọkụ n’obi, bụrụ ezigbo enyi. Ị̀ na-eme ka Banabas, jiri obi gị niile na-akwado ndị ọhụrụ nọ n’ọgbakọ unu, soro ha na-aga ozi ọma, na-enyekwara ha aka ịna-emekwu nke ọma? Chineke ga-agọzi gị nke ukwuu ma ị na-eme otú ahụ. Ọ bụrụ na ị ka malitere ikwusa ozi ọma amalite, ị̀ na-ekwe ka e nyere gị aka otú Sọl mere? Ọ bụrụ na gị na ndị bụ́ aka ochie n’ikwusa ozi ọma ana-eso aga ozi ọma, ị ga-amụtakwu otú e si ezi ozi ọma, na-enwekwu ọṅụ, nwetakwa ndị gị na ha nwere ike ịbụ ezigbo enyi ná ndụ gị niile.

‘Ọtụtụ Ndị Kweere n’Onyenwe Anyị’ (Ọrụ 9:31-43)

20, 21. Olee otú ndị ohu Chineke si jiri oge ‘obi ruru ha ala’ mee ihe bara uru, ma n’oge ochie ma n’oge anyị a?

20 Mgbe Sọl ghọrọ Onye Kraịst ma mechaa si na Jeruselem gbapụ, “obi malitere iru ọgbakọ niile dị na Judia na Galili na Sameria ala.” (Ọrụ 9:31) Olee ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs ji ‘oge ahụ dị mma’ mee? (2 Tim. 4:2) Baịbụl kwuru na ‘okwukwe ha nọ na-esikwu ike.’ Ndịozi Jizọs na ụmụnna ndị ọzọ e nyere ọrụ mere ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs sie ike, ha nyekwaara ọgbakọ ahụ aka ka “ha na-atụ egwu Jehova, mmụọ nsọ ana-akasikwa ha obi.” Dị ka ihe atụ, Pita ji oge ahụ mee ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs bi n’obodo Lida na Sharọn sie ike. Mbọ ọ gbara mere ka ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ ‘kwere n’Onyenwe anyị.’ (Ọrụ 9:32-35) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ekweghị ka oké ọchịchọ megharịa ha anya, kama ha gbalịsiri ike na-enyere ibe ha aka ma na-ekwusa ozi ọma. Ihe a mere ka ọgbakọ ahụ “na-ehikwu nne.”

21 N’ihe dị ka afọ 1990, “obi malitere iru” Ndịàmà Jehova nọ n’ọtụtụ mba ala otú o ruru Ndị Kraịst oge mbụ. Ọchịchị ndị nọ na-emesi ndị Chineke ike ruo ọtụtụ iri afọ kwụsịrị ịchị na mberede. N’ihi ya, a kagburu ihe ụfọdụ a machiboro anyị iwu ime. Ná mba ụfọdụ, a kagbuchara ha kpamkpam. Ọtụtụ iri puku Ndịàmà Jehova ji ohere ahụ na-ekwusa ozi ọma n’ihu ọha. Ọtụtụ ndị gekwara ntị.

22. Ọ bụrụ na a machighị ikwusa ozi ọma n’obodo unu, olee otú ị ga-esi jiri oge a na-eme ihe bara uru?

22 Ọ bụrụ na a machighị ikwusa ozi ọma n’obodo unu, ì ji oge a na-eme ihe bara uru? Ọ bụrụ na i bi n’obodo ebe ndị mmadụ nweere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha, Setan ga-achọ ime ka i jiri oge gị niile na-achụ akụnụba, kama ife Jehova. (Mat. 13:22) Ekwela ka o megharịa gị anya. Jiri oge ọ bụla obi ruru Ndị Kraịst ala n’obodo unu mee ihe bara uru. Were ya ka ohere i nwere iji gbaa àmà nke ọma na ime ka okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ sie ike. Cheta na ihe nwere ike ịgbanwe na mberede.

23, 24. (a) Olee ihe ndị anyị na-amụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Tabita? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

23 Chegodị banyere ihe mere otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Tabita, ma ọ bụ Dọkas. O biri na Jọpa, bụ́ obodo dị nso na Lida. Nwanna nwaanyị ahụ hụrụ Jehova n’anya ji oge ya na ihe o nwere mee ihe bara uru. “Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma, na-enyekwara ndị ogbenye aka.” Ma ọrịa bịara ya na mberede, ya anwụọ. c Ọnwụ ya mere ka ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Jọpa ruo uju nke ukwuu, karịchaa, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ndị o meere ihe ọma. Mgbe Pita rutere n’ụlọ ebe a nọ na-akwadebe ozu ya maka olili, ọ rụrụ ọrụ ebube ndịozi Jizọs Kraịst na-arụtụbeghị. Pita kpere ekpere ma mee ka Tabita si n’ọnwụ bilie. Chegodị otú obi si tọọ ụmụ nwaanyị ahụ na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ụtọ mgbe Pita kpọbatara ha n’ime ụlọ ahụ ma kpọnye ha Tabita. Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ merenụ mere ka obi sie ha ike maka ọnwụnwa ndị ga-abịara ha. O doro anya na akụkọ ọrụ ebube a “gbasara na Jọpa niile, ọtụtụ ndị kwekwaara n’Onyenwe anyị.”—Ọrụ 9:36-42.

Olee otú ị ga-esi na-eme ka Tabita?

24 E nwere ihe abụọ dị mkpa anyị na-amụta n’akụkọ ọma a a kọrọ banyere Tabita. Nke mbụ bụ na anyị ejighị ndụ anyị n’aka. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị meere onwe anyị ezigbo aha n’ebe Chineke nọ ugbu a anyị dị ndụ. (Ekli. 7:1) Nke abụọ abụrụ na olileanya anyị nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ga-emezu. Jehova hụrụ ọtụtụ ihe ọma Tabita mere ma kwụọ ya ụgwọ. Ọ ga-echeta ọrụ anyị rụsiri ike ma kpọlite anyị n’ọnwụ ma ọ bụrụ na anyị anwụọ tupu Amagedọn. (Hib. 6:10) N’ihi ya, ma ànyị nọ “n’oge nsogbu” ugbu a ma ọ̀ bụ n’oge ‘obi ruru anyị ala,’ ka anyị nọgidesie ike na-agba àmà nke ọma banyere Kraịst.—2 Tim. 4:2.

a Gụọ igbe bụ́ “ Sọl, Onye Farisii.”

b Ọ na-abụkarị naanị ndịozi Jizọs na-eme ka mmụọ nsọ dakwasị ndị mmadụ. Ma nke Sọl pụrụ iche. Ọ ga-abụ na Jizọs nyere Ananayas ikike ime ka mmụọ nsọ dakwasị Sọl. Mgbe Sọl ghọrọ Onye Kraịst, ya na ndịozi iri na abụọ Jizọs emekọghị ihe ruo ogologo oge. Ma, o nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eje ozi n’oge niile ahụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Jizọs chọrọ ịhụ na Sọl nwetara ikike ọ ga-eji rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere ya.