Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 6

“Chineke Meere Stivin Amara, Nyekwa Ya Ike”

“Chineke Meere Stivin Amara, Nyekwa Ya Ike”

Ihe anyị ga-amụta n’otú Stivin si jiri obi ike gbaa àmà n’ụlọikpe Sanhedrin

O Si n’Ọrụ Ndịozi 6:8–8:3

1-3. (a) Olee nsogbu tara akpụ bịaara Stivin, oleekwa ihe o mere? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya?

 STIVIN guzo n’ụlọikpe Sanhedrin. Ụlọikpe a na-eyi egwu. Ọ ga-abụ na ọ dị nso n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ọ bụ ụmụ nwoke iri asaa na otu na-ekpe ikpe na ya. Ha niile zukọtara taa ka ha kpee Stivin ikpe. Ha nọcha ọdụ n’oche ndị a haziri ka ọ fọ obere ka ha gbaa okirikiri. Ndị ikpe a bụ ndị a ma ama na ndị ọnụ na-eru n’okwu. O nweghịdị ihe ọtụtụ n’ime ha ji Stivin kpọrọ. N’eziokwu, ọ bụ Keyafas, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, kpọkọtara ndị ikpe Sanhedrin a. Ọ bụkwa ya bụ onyeisi oche n’ụlọikpe a mgbe ha mara Jizọs Kraịst ikpe ọnwụ n’ọnwa ole na ole gara aga. Ụjọ ò ji Stivin?

2 Ihu Stivin pụrụ iche n’oge a. Ndị ikpe ahụ legidere ya anya hụ na ihu ya “dị ka ihu mmụọ ozi.” (Ọrụ 6:15) Ozi ndị mmụọ ozi na-ezi si n’aka Jehova Chineke. N’ihi ya, ha anaghị atụ ụjọ, ahụ́ na-erukwa ha ala. Otú ahụ ka ọ dị Stivin. Ndị ikpe ahụ kpọrọ ya asị chọpụtadịrị ihe a. Gịnị mere ahụ́ ji ruo ya ala otú a?

3 E nwere ọtụtụ ihe Ndị Kraịst taa ga-amụta n’azịza ajụjụ a. Anyị kwesịkwara ịmata ihe kpataara Stivin nsogbu a. Olee otú o sirila gbachitere ihe o kweere? Oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ya?

‘Ihe Ha Kwuru Kpasuru Ìgwè Mmadụ Iwe’ (Ọrụ 6:8-15)

4, 5. (a) Gịnị mere Stivin ji baara ọgbakọ Ndị Kraịst ezigbo uru? (b) Olee otú o si bụrụ na “Chineke meere Stivin amara, nyekwa ya ike”?

4 Anyị amụtala na Stivin baara ọgbakọ Ndị Kraịst ọhụrụ ezigbo uru. N’Isi nke 5 n’akwụkwọ a, anyị chọpụtara na o so n’ụmụ nwoke asaa ahụ dị umeala n’obi, ndị ji obi ha niile kweta inyere ndịozi Jizọs aka mgbe a gwara ha ka ha nye aka. Ịdị umeala n’obi Stivin ga-amasịkwu anyị ma anyị cheta na e nwere ọtụtụ onyinye Chineke nyere ya. Ọrụ Ndịozi 6:8 gwara anyị na e nyere ya ike ịrụrụ “ọtụtụ ndị ọrụ ebube” otú ụfọdụ ndịozi Jizọs rụrụ. A gwakwara anyị na “Chineke meere Stivin amara, nyekwa ya ike.” Gịnị ka ọ pụtara?

5 Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu Grik a sụgharịrị ‘Chineke meere Stivin amara’ bụ na ‘Chineke nweere Stivin obiọma.’ O doro anya na Stivin dị obiọma, dịkwa nwayọọ, nke mere ndị mmadụ ji nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Otú o si kwuo okwu mere ka ihe ọ na-ekwu ruo ndị gere ya ntị n’obi, mee ka ha ghọta na ihe ọ na-ekwu si ya n’obi nakwa na ihe ọ na-akụziri ha ga-abara ha uru. Ebe ọ bụ na ọ dị umeala n’obi ma kwe ka mmụọ nsọ Jehova na-edu ya, Jehova nyere ya ike. Kama ikwe ka onyinye na ikike Chineke nyere ya mee ka ọ dị mpako, o nyere Jehova otuto niile, gosikwa na ọ hụrụ ndị ọ na-agwa okwu n’anya. Ka a sịkwa ihe mere ndị na-emegide ya ji were ya ka onye iro ha.

6-8. (a) Olee ebubo abụọ ndị na-emegide Stivin boro ya, gịnịkwa mere ha ji bo ya ebubo ndị ahụ? (b) Gịnị mere akụkọ Stivin ga-eji baara Ndị Kraịst uru taa?

6 Ụfọdụ ụmụ nwoke gbalịrị ka ha rụọ Stivin ụka. “Ma, ha agbaghalighị ihe ọ na-ekwu n’ihi na ọ nọ na-ekwu okwu otú gosiri na ọ ma nnọọ ihe, mmụọ nsọ nọkwa na-enyere ya aka.” a Ebe ọ bụ na ha achịtaghị ájá, ha gwara ụfọdụ ụmụ nwoke “na nzuzo” ka ha bo onye a na-eso ụzọ Kraịst aka ya dị ọcha ebubo. Ha ‘kpasukwara ìgwè mmadụ,’ ndị okenye, na ndị odeakwụkwọ iwe, nke mere ka ha kpụrụ Stivin kpụgara ndị Sanhedrin. (Ọrụ 6:9-12) Ndị mmegide ahụ boro ya ebubo abụọ: Ha sịrị na ọ na-ekwulu Chineke, sịkwa na ọ na-ekwulu Mosis. Olee otú o si kwuluo Chineke na Mosis?

7 Ndị ahụ boro Stivin ebubo ụgha kwuru na otú Stivin si kwuluo Chineke bụ na o kwuru okwu ọjọọ gbasara “ebe nsọ a,” ya bụ, ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (Ọrụ 6:13) Ha boro ya ebubo na o kwuluru Mosis, ya bụ, na o kwuru okwu ọjọọ gbasara Iwu Mosis, gbanweekwa omenala ndị si n’aka Mosis. Ihe ahụ abụghị obere ebubo n’ihi na n’oge ahụ, ndị Juu ejighị ụlọ nsọ ahụ, ihe ndị e kwuru n’Iwu Mosis, nakwa ọtụtụ omenala ndị a na-edeghị ede ha gbakwụnyere n’Iwu ahụ, egwu egwu. N’ihi ya, ebubo ha na-ebo ya pụtara na ha na-asị na Stivin bụ onye ọjọọ, nakwa na o kwesịrị ọnwụ.

8 Ọ dị mwute na ọtụtụ mgbe, ndị okpukpe na-eji ụdị aghụghọ a akpatara ndị na-efe Chineke nsogbu. N’oge anyị a kwa, ndị okpukpe na-achọghị iji anya ahụ Ndịàmà Jehova ka na-eme ka ndị ọchịchị kpagbuwe ha mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na e bo anyị ebubo ụgha, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’ihe Stivin mere.

O Ji Obi Ike Gbaa Àmà Banyere “Chineke Onye Dị Ebube” (Ọrụ 7:1-53)

9, 10. Gịnị ka ndị na-akatọ ihe e dere na Baịbụl kwuru banyere ihe Stivin zara ndị Sanhedrin, ma gịnị ka anyị kwesịrị icheta?

9 Dị ka e kwurula ná mbido isiokwu a, mgbe Stivin nụrụ ebubo e boro ya, ihu ya dị ka ihu mmụọ ozi, nke gosiri na obi ruru ya ala. Ugbu a, Keyafas jụrụ ya, sị: “Ihe a ndị a kwuru ọ̀ bụ eziokwu?” (Ọrụ 7:1) Oge eruola ka Stivin kwuo okwu. O kwukwara okwu.

10 Ụfọdụ ndị akatọọla ihe Stivin kwuru. Ha sịrị na n’agbanyeghị na okwu o kwuru dị ogologo, o nweghị ihe o kwuru banyere ebubo e boro ya. Ma n’eziokwu, Stivin gosiri anyị otú magburu onwe ya anyị ga-esi ‘aza mmadụ ajụjụ gbasara’ ozi ọma. (1 Pita 3:15) Cheta na e boro Stivin ebubo na o kwuluru Chineke, ya bụ, na o kwuru ihe na-adịghị mma gbasara ụlọ nsọ. E bokwara ya ebubo na o kwuluru Mosis, ya bụ, na o kwuru ihe na-adịghị mma gbasara Iwu Mosis. Mgbe Stivin na-azaghachi ha, ọ kọrọ akụkọ ihe mere ụmụ Izrel n’oge atọ dị iche iche. Ọ kpachapụrụ anya kwusie okwu ike n’ihe ụfọdụ ọ kọrọ. Ka anyị leba anya n’oge atọ ndị ahụ n’otu n’otu.

11, 12. (a) Olee otú Stivin si jiri akụkọ Ebreham kwuo okwu nke ọma? (b) Gịnị mere Stivin ji kpọtụ Josef aha n’okwu ya?

11 Oge ndị nna ochie. (Ọrụ 7:1-16) Stivin bu ụzọ kwuo banyere Ebreham, onye ndị Juu na-akwanyere ùgwù n’ihi okwukwe o nwere. Mgbe Stivin malitere ịkọ akụkọ a dị mkpa ndị Juu ma nke ọma, o kwuru na Jehova, bụ́ “Chineke onye dị ebube,” pụtara n’ihu Ebreham nke mbụ ya mgbe ọ nọ na Mesopotemia. (Ọrụ 7:2) N’eziokwu, Ebreham bụ onye mbịarambịa n’Ala Nkwa ahụ. O nweghị ụlọ nsọ, o nweghịkwa Iwu Mosis. Gịnịzi mere mmadụ ga-eji siwe ọnwụ na ọ bụ ụlọ nsọ ma ọ bụ iwu e dere ede ga-eme ka mmadụ na-erubere Chineke isi?

12 Ndị Stivin na-agwa okwu na-akwanyekwara Josef, onye si n’agbụrụ Ebreham, ezigbo ùgwù. Ma Stivin chetaara ha na ọ bụ ụmụnne Josef, ndị mụtara ebo dị iche iche e nwere n’Izrel, kpagburu onye ezi omume ahụ ma ree ya ka ọ bụrụ ohu. N’agbanyeghị ya, Chineke ji ya zọpụta ndị Izrel mgbe ụnwụ dara. Stivin ma na e nwere ụzọ dị iche iche ihe Jizọs Kraịst mere si yie ihe Josef mere, ma o kwughị ya mgbe ahụ n’ihi na ọ chọrọ ka ndị ọ na-agwa okwu ka gewegodị ya ntị.

13. Mgbe Stivin na-ekwu banyere Mosis, olee otú o si zara ọnụ ya n’ebubo ndị e boro ya, oleekwa isi ihe o mere ka o doo anya?

13 Oge Mosis. (Ọrụ 7:17-43) Stivin kwuru ọtụtụ ihe banyere Mosis. Ọ dị mma na o mere otú ahụ ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ndị Sanhedrin bụ ndị Sadusii, ndị na-anaghị anabata akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ ma ọ́ bụghị ndị nke Mosis dere. Chetakwa na ha boro Stivin ebubo na o kwuluru Mosis. Stivin ji ihe a o kwuru zara ọnụ ya, n’ihi na o gosiri na ọ na-akwanyere Mosis na Iwu Mosis ezigbo ùgwù. (Ọrụ 7:38) Stivin kwuru na ụmụnne Mosis jụrụ ya n’agbanyeghị na ọ nọ na-agbalị ịzọpụta ha. Ha jụrụ ya mgbe ọ dị afọ iri anọ. Mgbe ihe karịrị afọ iri anọ gachara, ha nupụụrụ ya isi ọtụtụ ugboro. b Stivin si otú ahụ jiri nwayọọ nwayọọ mee ka isi ihe ọ na-ekwu doo anya, ya bụ, na ọtụtụ ugboro, ndị Izrel jụrụ ndị Jehova họpụtara ka ha duo ha.

14. Olee otú Stivin si jiri akụkọ Mosis kwado isi ihe o kwuru n’okwu ya?

14 Stivin chetaara ha na Mosis buru amụma na a ga-enwe onye amụma dị ka ya n’Izrel. Ònye ka ọ ga-abụ, oleekwa otú a ga-esi ele ya anya? Stivin azaghị ajụjụ ndị a ruo mgbe o kwuchawara okwu ya. O kwuziri ihe ọzọ dị mkpa. Ọ sịrị na Mosis mụtara na e nwere ike ime ka ala ọ bụla dịrị nsọ, dị ka ala ebe ahụ ọkụ nọ na-enwu n’osisi ogwu, bụ́ ebe Jehova nọ gwa ya okwu. N’ihi ya, è kwesịrị ikwu na ọ bụ naanị n’otu ụlọ, dị ka ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, ka a ga na-anọ efe Jehova? Ka anyị chọpụta.

15, 16. (a) Gịnị mere Stivin ji kwuo gbasara ụlọikwuu? (b) Olee otú Stivin si jiri ụlọ nsọ Solomọn rụrụ mee ka ihe ọ na-ekwu doo anya?

15 Ụlọikwuu na ụlọ nsọ. (Ọrụ 7:44-50) Stivin chetaara ndị ikpe ahụ na tupu e nwee ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, Chineke gwara Mosis ka ọ rụọ ụlọikwuu a na-ebugharị ebugharị, bụ́ ebe a ga-anọ na-efe Chineke ofufe. È nwere onye ga-anwa anwa kwuo na ụlọ nsọ ahụ ka ụlọikwuu ahụ mma, ebe ọ bụ na Mosis nọ n’ụlọikwuu ahụ fee Chineke?

16 Mgbe Solomọn mechara rụọ ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, o si n’ike mmụọ nsọ kwuo otu ihe dị ezigbo mkpa n’ekpere o kpere. Stivin kwuru ihe ahụ Solomọn kwuru. Ọ sịrị: “Onye Kacha Elu anaghị ebi n’ụlọ e ji aka rụọ.” (Ọrụ 7:48; 2 Ihe 6:18) Jehova nwere ike iji ụlọ nsọ mezuo ihe o bu n’obi ime, ma o nwekwara ike imezu ya ma ọ bụrụ na ụlọ nsọ adịghị. Gịnịzi mere ndị na-efe ya ga-eji na-eche na ọ bụ naanị mgbe ha nọ n’ụlọ mmadụ rụrụ ka ha ga-efe Chineke ezigbo ofufe? Mgbe Stivin pịachiwere okwu ya, o ji ihe e kwuru n’Aịzaya mee ka ihe ọ na-ekwu doo anya. Ọ sịrị: “Jehova kwuru, sị, ‘Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ihe m ji gbakwasị ụkwụ m. Olee ụdị ụlọ unu ga-arụrụ m? Ma ọ bụ, olee ebe unu ga-arụrụ m ụlọ m ga-ebi? Ọ̀ bụ na ọ bụghị m ji aka m mee ihe a niile?’”—Ọrụ 7:49, 50; Aịza. 66:1, 2.

17. Olee otú ihe Stivin kwuru si (a) mee ka a ghọta na otú ndị ọ na-agwa okwu si eche echiche adịghị mma (b) gosi na e nweghị ihe ọjọọ o mere?

17 Ọ bụrụ na anyị echebara ihe niile Stivin gwarala ndị Sanhedrin echiche, anyị ga-achọpụta na o mere ka o doo anya na otú ndị na-ebo ya ebubo si eche echiche adịghị mma. Ihe o kwuru gosiri na Jehova na-agbanwe ihe ụfọdụ mgbe ọ dị mkpa iji mezuo nzube ya, gosikwa na omenala ma ọ bụ otú ihe si kwụrụ enweghị ike igbochi ya imezu ya. Ma, otú ndị Stivin na-agwa okwu si jiri ọmarịcha ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem na omenala niile a gbakwụnyere n’Iwu Mosis kpọrọ ihe mere ka ha ghara ịghọta ihe mere e ji nwee Iwu ahụ na ụlọ nsọ ahụ. E nwere ike ikwu na ajụjụ dị mkpa Stivin na-ajụ bụ: Ụzọ kacha mma unu ga-esi akwanyere Iwu ahụ na ụlọ nsọ ahụ ùgwù ọ́ bụghị irubere Jehova isi? N’eziokwu, ihe Stivin kwuru gosiri na e nweghị ihe ọjọọ o mere n’ihi na o ji obi ya niile rubere Jehova isi.

18. Olee ụzọ ndị anyị kwesịrị isi na-eme ka Stivin?

18 Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe Stivin kwuru? Ọ ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Anyị kwesịkwara ịna-amụchi Okwu Chineke anya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ‘ịna-akụzi eziokwu, na-akọwakwa ya nke ọma.’ (2 Tim. 2:15) Ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Stivin bụ iji olu ọma na-agwa ndị mmadụ okwu nakwa ịdị akọ. Obi tara ndị ọ na-agwa okwu mmiri. N’agbanyeghị ya, o kwuru okwu n’ihe ndị ya na ha nwere otu olu na ha, ya bụ, n’ihe ndị ha ji kpọrọ ihe. Ọ kwanyekwaara ha ùgwù mgbe ọ na-agwa ha okwu, kpọọ ndị agadi n’ime ha “ndị nna m.” (Ọrụ 7:2) Mgbe anyị na-akụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl, anyị kwesịkwara ‘imeda obi kwanyere ha ezigbo ùgwù.’—1 Pita 3:15.

19. Olee otú Stivin si jiri obi ike gwa ndị Sanhedrin banyere ikpe Jehova?

19 Ma, anyị anaghị ekwe ka ụjọ ịkpasu ndị mmadụ iwe mee ka anyị hapụ ịgwa ha eziokwu dị n’Okwu Chineke. Anyị anaghịkwa agbanwe ozi ikpe Jehova iji meta ndị mmadụ mma. Anyị na-amụta ezigbo ihe n’aka Stivin. O doro anya na ọ ghọtara na ihe niile o kwuru n’ihu ndị Sanhedrin agbanweghị obi ndị ọkàikpe ahụ obi kpọrọ nkụ. N’ihi ya, mgbe ọ na-apịachi okwu ya, o si n’ike mmụọ nsọ gwa ha n’asọghị anya na ha dị ka ndị nna nna ha, bụ́ ndị jụrụ Josef, Mosis, na ndị amụma niile. (Ọrụ 7:51-53) N’eziokwu, ọ bụ ndị ọkàikpe Sanhedrin a gburu Mezaya ahụ Mosis na ndị amụma niile buru amụma na ọ ga-abịa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ha kacha mebie Iwu Mosis.

“Onyenwe M Jizọs, Ndụ M Dị Gị n’Aka” (Ọrụ 7:54–8:3)

“Ihe a o kwuru were ha ezigbo iwe, ha ana-ele ya na-ata ikikere ezé.”—Ọrụ 7:54

20, 21. Gịnị ka ndị Sanhedrin mere mgbe Stivin gwachara ha okwu, oleekwa otú Jehova si mee ka obi sie ya ike?

20 Eziokwu doro anya Stivin gwara ndị ọkàikpe ahụ mere ka iwe ju ha obi. Ha ejidelighịzi onwe ha, ha ana-ele Stivin anya, na-ata ikikere ezé. Ọ ga-abụ na nwoke a na-erubere Chineke isi chọpụtara na ha agaghị emere ya ebere otú ha na-emereghị Jizọs bụ́ Nna ya ukwu.

21 Stivin kwesịrị ịkata obi ka o nwee ike idi ihe na-aga ime ya. O doro anya na ọhụụ Jehova mere ebere gosi ya gbara ya ezigbo ume. Stivin hụrụ ebube Chineke, hụkwa Jizọs ka o guzo n’aka nri Jehova. Mgbe Stivin na-akọ ihe ọ hụrụ, ndị na-ekpe ya ikpe kpuchiri aka ná ntị ha. Maka gịnị? Jizọs gwaburu ndị ikpe a na ya bụ Mezaya, nakwa na ya ga-anọ ọdụ n’aka nri Nna ya n’oge na-adịghị anya. (Mak 14:62) Ọhụụ ahụ Stivin hụrụ gosiri na ihe Jizọs kwuru bụ eziokwu. N’eziokwu, ọ bụ ndị Sanhedrin ahụ raara Mezaya ahụ nye ma gbuo ya. Ha niile ji otu obi gakwuru Stivin ma jiri nkume tụgbuo ya. c

22, 23. Olee otú ọnwụ Stivin si yie nke Nna ya ukwu, oleekwa otú Ndị Kraịst taa ga-esi nwee obi ike ka Stivin?

22 Stivin nwụrụ otú Nna ya ukwu si nwụọ. Obi ruru ya ala, ọ tụkwasịkwara Jehova obi ma gwa ya ka ọ gbaghara ndị gburu ya. Stivin sịrị: “Onyenwe m Jizọs, ndụ m dị gị n’aka.” Ọ ga-abụ na ihe mere o ji kwuo ihe a bụ maka na ọ ka na-ahụ Nwa nke mmadụ n’ọhụụ ahụ ka ya na Nna ya nọ. O doro anya na Stivin ma okwu na-agba ume Jizọs kwuru nke bụ́: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.” (Jọn 11:25) N’ikpeazụ, Stivin kpere ekpere gwa Chineke n’olu dara ụda, sị: “Jehova, ka mmehie a ghara ịdị ha n’isi.” Mgbe o kwuchara ihe a, ọ nwụrụ.—Ọrụ 7:59, 60.

23 Otú a ka Stivin si bụrụ onye mbụ na-eso ụzọ Kraịst e gburu n’ihi okwukwe ya. (Gụọ igbe bụ́ “ Gịnị Mere E Ji Kwuo na ‘E Gburu Stivin n’Ihi Okwukwe Ya’?”) Ma, ọ dị mwute na ọ bụghị ya ga-abụ onye ikpeazụ a ga-egbu n’ihi okwukwe ya. Ruokwa n’oge anyị a, ndị okpukpe ha na-agba ara, ndị bú ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’isi, nakwa ndị ọzọ obi tara mmiri, egbuola ụfọdụ ndị ji obi ha niile na-erubere Jehova isi. N’agbanyeghị ya, obi kwesịrị isi anyị ike otú ahụ o siri Stivin. Jizọs bụ Eze ugbu a, o jikwa ike na-enweghị atụ Nna ya nyere ya na-akpa ike. O nweghị ihe ga-egbochi ya ịkpọlite ezigbo ndị na-eso ụzọ ya nwụrụ anwụ.—Jọn 5:28, 29.

24. Gịnị ka Sọl mere mgbe a na-egbu Stivin, oleekwa ihe ụfọdụ ọnwụ nwoke a rubeere Chineke isi rụpụtara?

24 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Sọl nọ na-ele ka ihe a niile na-eme. Ọ kwadoro ka e gbuo Stivin. Ọ nọdị na-elekọtara ndị na-atụ ya nkume uwe ha. Mgbe obere oge gachara, Sọl malitere ịkpagbu Ndị Kraịst mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Ma e nwere ezigbo ihe ọnwụ Stivin ga-arụpụta nke ga-aba uru ruo ogologo oge. Ihe o mere gbara Ndị Kraịst ndị ọzọ ume irubere Chineke isi ruo ọnwụ. Ihe ọzọ bụ na Sọl, onye e mechara kpọwa Pọl, ga-emecha kwaa mmakwaara n’ihi ihe ahụ o mere mgbe a na-egbu Stivin. (Ọrụ 22:20) O nyere aka gbuo Stivin, ma ọ ga-emecha ghọta na ya ‘na-ekwulu Chineke, na-akpagbu ndị mmadụ, na-akparịkwa ndị mmadụ.’ (1 Tim. 1:13) O doro anya na Pọl echefughị Stivin na okwu gbara ọkpụrụkpụ o kwuru n’ụbọchị ahụ. N’eziokwu, ihe ụfọdụ Stivin kwuru so n’ihe Pọl mechara kwuo ma dee gbasara ha. (Ọrụ 7:48; 17:24; Hib. 9:24) Pọl mechara nwee okwukwe na obi ike ka Stivin, bụ́ nwoke ‘Chineke meere amara, nyekwa ike.’ Ajụjụ bụzi, Ànyị ga-enwe okwukwe ka Stivin?

a Ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-emegide Stivin so n’òtù a na-akpọ “Ndị Nweere Onwe Ha.” O nwere ike ịbụ na ha bụ ndị ndị Rom jideburu n’agha ma mechaa hapụ, ma ọ bụkwanụ ha abụrụ ndị ohu nweere onwe ha, bụrụzie ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Silishia, bụ́ ebe Sọl onye Tasọs si. Baịbụl ekwughị ma Sọl ò so n’ụmụ nwoke ahụ na-enwelighị ike ịgbagha ihe Stivin na-ekwu.

b Mgbe Stivin na-ekwu okwu, e nwere ihe ndị o kwuru banyere Mosis a na-ekwughị ebe ọzọ na Baịbụl, dị ka ụlọ akwụkwọ Mosis gara n’Ijipt, afọ ole ọ dị mgbe mbụ o si n’Ijipt gbapụ, nakwa afọ ole ọ nọrọ na Midia.

c Ọ ga-abụ na iwu Ndị Rom enyeghị ndị Sanhedrin ikike igbu mmadụ. (Jọn 18:31) N’ihi ya, o nwere ịbụ ìgwè mmadụ iwe ji gburu Stivin, ọ bụghị ụlọikpe kwuru ka e gbuo ya.