Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 12

‘Jehova Na-enye Ha Ike, Ha Ana-ekwu Okwu Ya n’Atụghị Egwu’

‘Jehova Na-enye Ha Ike, Ha Ana-ekwu Okwu Ya n’Atụghị Egwu’

Pọl na Banabas dị umeala n’obi, ha tachiri obi, ha atụghịkwa egwu

O Si n’Ọrụ Ndịozi 14:1-28

1, 2. Olee ihe ndị mere mgbe Pọl na Banabas nọ na Listra?

 EBE niile nọ na-agba ghara ghara na Listra. Otu nwoke bụ́ onye ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya nọ na-awụli elu, na-aṅụrị ọṅụ mgbe mmadụ abụọ ọ na-amaghị ndị ha bụ gwọrọ ya. Ihe a riri ìgwè mmadụ gbakọtara ebe ahụ ọnụ, ha echee na mmadụ abụọ ahụ bụ chi. Onye nchụàjà Zus wetara okooko osisi ọ ga-ekpuwe ha n’isi, kpụtakwa oké ehi ndị ọ na-ejikere igbu. Ma, Pọl na Banabas tisiri mkpu ike ka ìgwè mmadụ ahụ ghara ime ihe ahụ ha chọrọ ime. Ha dọwakwara uwe ha, maba n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, jisie ike rịọta ha ka ha ghara ife ha ofufe.

2 E nweziri ndị Juu na-emegide Ndị Kraịst ndị si n’Antiọk dị na Pisidia nakwa n’Aịkoniọm bịa. Ha kwutọrọ Pọl na Banabas, mebiekwa obi ndị Listra. Ìgwè mmadụ ndị chọburu ife Pọl gbaziri ya gburugburu, na-atụ ya nkume ruo mgbe ọ tụbọrọ. Ha mechara dọkpụrụ ya gaa n’azụ obodo ma hapụ ya ebe ahụ, chee na ọ nwụọla.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Gịnị kpatara ihe a merenụ? Gịnị ka ndị na-ekwusa ozi ọma n’oge anyị a ga-amụta n’ihe mere Banabas, Pọl, na ndị bi na Listra, bụ́ ndị gbanwere obi ha ọsọ ọsọ? Oleekwa otú ndị okenye ga-esi na-eme ka Banabas na Pọl, bụ́ ndị tachiri obi n’ozi ha, ‘ndị Jehova nyekwara ike, ha ana-ekwu okwu ya n’atụghị egwu’?​—Ọrụ 14:3.

‘Ọtụtụ Ndị Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs’ (Ọrụ 14:1-7)

4, 5. Gịnị mere Pọl na Banabas ji gaa Aịkoniọm, gịnịkwa mere n’ebe ahụ?

4 Abalị ole na ole tupu ihe a emee, a chụpụrụ Pọl na Banabas n’obodo ndị Rom a na-akpọ Antiọk dị na Pisidia mgbe ndị Juu bụ́ ndị na-emegide ha kpataara ha nsogbu. Ma kama ikwe ka ike gwụ ha, ha abụọ ‘tichapụụrụ ndị obodo ahụ obi kpọrọ nkụ ájá dị ha n’ụkwụ.’ (Ọrụ 13:50-52; Mat. 10:14) Pọl na Banabas si ebe ahụ pụọrọ onwe ha, hapụ ndị ahụ na-emegide ha ka ha chee aka ghọrọ ihe Chineke ga-eme ha. (Ọrụ 18:5, 6; 20:26) Pọl na Banabas ekweghị ka ihe ahụ merenụ mebie ha obi. Ha kwusaara ozi ọma na-aga. Ha ji ụkwụ gaa ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise (150) n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ. Ha rutere n’otu ala dị larịị nke dị n’agbata ugwu Tọrọs na ugwu Sọltan.

5 Pọl na Banabas bu ụzọ kwụsịtụ n’Aịkoniọm, bụ́ ebe a ka na-eme omenala ndị Grik n’oge ahụ, bụrụkwa otu n’ime obodo ndị a ma ama na Galeshia, bụ́ ógbè ndị Rom. a Ndị Juu a ma ama na ọtụtụ ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu bi n’Aịkoniọm. Pọl na Banabas banyere n’ụlọ nzukọ malite ikwusa ozi ọma, otú ha na-emekarị. (Ọrụ 13:5, 14) Ha kwuru “okwu otú mere ka ọtụtụ ndị, ma ndị Juu ma ndị Grik, ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.”​—Ọrụ 14:1.

6. Gịnị mere Pọl na Banabas ji bụrụ ezigbo ndị nkụzi, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ha?

6 Gịnị mere ihe Pọl na Banabas kwuru ji ruo ndị mmadụ n’obi? Pọl ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ọ kọrọ akụkọ ndị dị na Baịbụl, kwuo ihe ndị e buru n’amụma, nakwa ihe ndị dị n’Iwu Mosis. O ji ha niile mee ka o doo anya na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. (Ọrụ 13:15-31; 26:22, 23) Otú Banabas si kwuo okwu gosiri na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi. (Ọrụ 4:36, 37; 9:27; 11:23, 24) E nweghị onye n’ime ha ji amamihe nke ya kwuo okwu, kama ọ bụ ‘Jehova nyere ha ike ha ji kwuo okwu.’ Olee otú ị ga-esi na-eme ka Pọl na Banabas mgbe ị na-ekwusa ozi ọma? Lekwa ihe ndị i kwesịrị ịna-eme: Mata Okwu Chineke nke ọma. Họrọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị i chere ga-akacha amasị ndị ị na-agwa okwu. Chọta ụzọ ndị bara uru ị ga-esi na-akasi ndị ị na-ezi ozi ọma obi. Na-akụzi ihe si n’Okwu Jehova, ọ bụghị ihe i chepụtara n’onwe gị.

7. (a) Olee ihe ndị mmadụ na-eme ma ha nụ ozi ọma? (b) Ọ bụrụ na ezinụlọ unu kewara ekewa maka na ị na-eme ihe e ziri gị n’ozi ọma, gịnị ka i kwesịrị icheta?

7 Ma, ọ bụghị mmadụ niile nọ n’Aịkoniọm ka obi dị ụtọ mgbe ha nụrụ ihe Pọl na Banabas kwuru. Luk kọrọ, sị: “Ndị Juu na-anabataghị ihe ụmụnna ndị a kwuru mere ka ndị mba ọzọ megidewe ha.” Pọl na Banabas chọpụtara na ha kwesịrị ịnọtụkwu ebe ahụ ma gbachitere ozi ọma. ‘Ha wee nọtụkwuo izu ole na ole ebe ahụ, na-ekwu okwu Jehova n’atụghị egwu.’ N’ihi ya, “ndị obodo ahụ kewara abụọ. Ụfọdụ nọ na-akwado ndị Juu, ndị ọzọ ana-akwado Pọl na Banabas.” (Ọrụ 14:2-4) Ụdị ihe a na-emekwa n’oge a ma e zie ndị mmadụ ozi ọma. Ozi ọma na-eme ka ụfọdụ ndị dịrị n’otu, ma ọ na-emekwa ka ndị ọzọ kewaa. (Mat. 10:34-36) Ọ bụrụ na ezinụlọ unu kewara ekewa maka na ị na-eme ihe e ziri gị n’ozi ọma, cheta na ihe na-akpatakarị mmegide bụ na ndị mmadụ kweere asịrị a kọrọ gbasara anyị ma ọ bụ ụgha a ghagidere anyị. Omume ọma gị nwere ike ime ka a mata na asịrị ahụ niile abụghị eziokwu. O nwekwara ike ime ka obi jụrụ ndị na-emegide gị.​—1 Pita 2:12; 3:1, 2.

8. Gịnị mere Pọl na Banabas ji hapụ Aịkoniọm, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ha mere?

8 Mgbe obere oge gafere, ndị mmegide nọ n’Aịkoniọm kpara nkata ịtụ Pọl na Banabas nkume. Mgbe Pọl na Banabas matara, ha gawara ikwusa ozi ọma n’ebe ọzọ. (Ọrụ 14:5-7) Ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze na-emekwa ụdị ihe a n’oge a. Ndị mmadụ katọwa anyị, anyị na-ekwu okwu n’atụghị egwu. (Fil. 1:7; 1 Pita 3:13-15) Ma, ha chọwa imemila anyị, anyị anaghị eme ka ànyị bụ anwụ anwụ n’ihi na ime otú ahụ nwere ike ịta isi anyị ma ọ bụ nke ụmụnna anyị.​—Ilu 22:3.

“Bịa Fewe Chineke Dị Ndụ” (Ọrụ 14:8-19)

9, 10. Olee ebe Listra dị, oleekwa ihe anyị ma banyere ndị bi na ya?

9 Pọl na Banabas gawara Listra, bụ́ obodo ndị Rom na-achị. Ọ dị ihe dị ka kilomita iri atọ ma e si n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Aịkoniọm gawa ya. E nwere ọtụtụ ihe jikọrọ Listra na Antiọk dị na Pisidia, ma ọtụtụ ndị Juu ebighị na Listra otú ha bi n’Antiọk. N’agbanyeghị na ọ ga-abụ na ndị bi na Listra na-asụ Grik, asụsụ obodo ha bụ Likeonia. Pọl na Banabas malitere ikwusa ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọ maka na ọ ga-abụ na e nweghị ụlọ nzukọ ndị Juu n’obodo ahụ. Mgbe Pita nọ na Jeruselem, ọ gwọrọ otu nwoke nwere nkwarụ kemgbe a mụrụ ya. Na Listra, Pọl gwọrọ otu nwoke dara ngwọrọ kemgbe a mụrụ ya. (Ọrụ 14:8-10) Ọrụ ebube ahụ Pita rụrụ mere ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Ọrụ 3:1-10) Ma, ihe ndị mmadụ mere mgbe Pọl rụrụ ọrụ ebube nke ya dị nnọọ iche.

10 Dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a, mgbe onye ngwọrọ ahụ maliri elu gawa ije, ìgwè mmadụ ndị na-ekpere arụsị na Listra chere na Pọl na Banabas bụ chi. Ha kpọrọ Banabas Zus, kpọọkwa Pọl Hemis. Zus bụ chi ha kachanụ, Hemis abụrụ nwa Zus na ọnụ na-ekwuchitere chi ha ndị ọzọ. (Gụọ igbe bụ́ “ Ndị Listra Na-efe Zus na Hemis.”) Ma, Banabas na Pọl kpebisiri ike na ha ga-eme ka ìgwè mmadụ ahụ ghọta na ọ bụghị arụsị nyere ha ike ha ji kwuo okwu ma rụọ ọrụ ebube ahụ, kama na ọ bụ Jehova, Onye naanị ya bụ ezi Chineke nyere ha ike.​—Ọrụ 14:11-14.

“Unu kwụsị ife ihe efu ndị a ma bịa fewe Chineke dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa.”​—Ọrụ 14:15

11-13. (a) Gịnị ka Pọl na Banabas gwara ndị bi na Listra? (b) Olee otu ihe anyị na-amụta n’ihe Pọl na Banabas kwuru?

11 N’agbanyeghị ihe ìgwè mmadụ ahụ mere, Pọl na Banabas gbalịsiri ike ịchọta otú ha ga-esi kwuo ihe ga-eru ndị ha na-agwa okwu n’obi. Ihe a Luk kọrọ nyeere anyị aka ịmata otú dị mma anyị ga-esi na-ezi ndị na-ekpere arụsị ozi ọma. Ị̀ hụrụ na Pọl na Banabas kwuru ihe mere ka ndị ha na-agwa okwu chee echiche? Ha sịrị ha: “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị bụ mmadụ nkịtị otú unu bụ. Anyị na-ezisara unu ozi ọma, ka unu kwụsị ife ihe efu ndị a ma bịa fewe Chineke dị ndụ, onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha. N’oge ochie, ọ hapụrụ ndị mba ọzọ niile ka ha na-eme otú masịrị ha. Ma, ihe ọma ndị ọ na-eme na-egosi unu ụdị onye ọ bụ. Ọ na-eme ka mmiri si n’eluigwe zooro unu, na-eme ka mkpụrụ unu kụrụ na-amị n’oge ya n’uju, na-enye unu nri hiri nne, na-emekwa ka unu na-enwe obi ụtọ.”​—Ọrụ 14:15-17.

12 Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’ihe Pọl na Banabas gwara ndị ahụ? Nke mbụ bụ na Pọl na Banabas ewereghị ya na ha ka ndị ha na-agwa okwu. Ha emeghị ka hà bụ ihe ha na-abụghị. Kama nke ahụ, ha ji obi umeala kwuo na ha bụ mmadụ nkịtị na-ezughị okè otú ndị ahụ na-ekpere arụsị ha na-agwa okwu bụ. N’eziokwu, e nyere Pọl na Banabas mmụọ nsọ, meekwa ka ha nwere onwe ha n’ozizi ụgha. E mere ka ha nwee olileanya iso Kraịst chịa n’eluigwe. Ma, ha ghọtara na ọ bụrụ na ndị bi na Listra erubere Kraịst isi, e nwekwara ike inye ha onyinye ndị ahụ.

13 Olee otú anyịnwa si ele ndị anyị na-ezi ozi ọma anya? Ànyị na-ele ha anya ka ndị anyị na ha hà? Mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke, ànyị na-eme ka Pọl na Banabas, ghara ịchọ ka ndị mmadụ towe anyị? E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’aka Nwanna Charles Taze Russell n’okwu a. Ọ bụ onye na-akụzi ihe nke ọma, o butekwara ụzọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma malite n’ihe dị ka afọ 1870 ruo afọ 1916. O dere, sị: “Anyị achọghị ka a na-eto anyị ma ọ bụ na-asọpụrụ anyị n’ihi ihe ndị anyị na-ede. Anyị achọghịkwa ka a na-akpọ anyị Ụkọchukwu ma ọ bụ Rabaị.” Nwanna Russell dị umeala n’obi ka Pọl na Banabas. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ihe mere anyị ji ekwusa ozi ọma abụghị ka ndị mmadụ na-eto anyị, kama ọ bụ ka anyị nyere ha aka ịbịa fewe “Chineke dị ndụ.”

14-16. Olee ihe nke abụọ na nke atọ anyị ga-amụta n’ihe Pọl na Banabas gwara ndị Listra?

14 Ka anyị leba anya n’ihe nke abụọ anyị ga-amụta n’ihe Pọl na Banabas gwara ndị ahụ. Pọl na Banabas na-agbanwe otú ha si ezi ozi ọma mgbe ọ dị mkpa ka ha mee otú ahụ. Ndị bi na Listra adịghị ka ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu nọ n’Aịkoniọm. E nweghị ezigbo ihe ndị Listra ma banyere Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ banyere otú ndị Izrel na Chineke si mekọrịta ihe. Ma, ndị ahụ Pọl na Banabas gwara okwu bụ ndị ọrụ ubi. Mmiri na-ezo nke ọma na Listra, ala ha na-emekwa nri nke ọma. Ha na-esi n’ihe ọma dị iche iche ala ha na-emepụta ahụ ọmarịcha àgwà ndị Onye kere ihe niile nwere. Pọl na Banabas ji ihe a ndị Listra ma nke ọma zie ha ozi ọma.​—Rom 1:19, 20.

15 Ànyị nwere ike ịna-eme ka Pọl na Banabas? Onye ọrụ ubi nwere ike ịkụ otu ụdị mkpụrụ n’ala ya dị iche iche, ma ọ bụghị otu ụzọ ka ọ na-esi akwadebe ala ndị ahụ. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ala ya esighị ike. Naanị ihe ọ ga-emezi bụ ịkụ ihe na ha. Ma, o nwere ike ịdị mkpa ka a kọọ ala ndị ọzọ akọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịkụ mkpụrụ Alaeze. Ọ bụ otu mkpụrụ ka anyị na-akụ, ya bụ, ozi Alaeze nke dị n’Okwu Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị na-eme ka Pọl na Banabas, anyị ga na-agbalị ịghọta otú ihe si dịrị ndị anyị na-ezi ozi ọma nakwa ihe ndị ha kweere. Anyị ejirizie ihe ndị anyị ghọtara mata otú anyị ga-esi ezi ha ozi Alaeze Chineke.​—Luk 8:11, 15.

16 E nwere ihe nke atọ anyị ga-amụta n’ihe a kọrọ banyere Pọl, Banabas, na ndị Listra. N’agbanyeghị otú anyị si gbalịsie ike, mgbe ụfọdụ, ajọ onye ahụ na-abịa pụnara ndị mmadụ mkpụrụ anyị ghara n’obi ha ma ọ bụkwanụ mkpụrụ ahụ adaa n’ala nkume. (Mat. 13:18-21) Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee gị, adala mbà. Dị ka Pọl mechara chetara ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Rom, “onye ọ bụla n’ime anyị [ma onye ọ bụla anyị ziri ozi ọma] ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”​—Rom 14:12.

‘Ha Nyefere Ha n’Aka Jehova’ (Ọrụ 14:20-28)

17. Mgbe Pọl na Banabas hapụrụ Dabe, olee ebe ndị ha gara? Hà gakwaranụ ime gịnị?

17 Mgbe ìgwè mmadụ kpụụrụ Pọl gaa kpụsa n’azụ obodo Listra, chee na ọ nwụọla, ndị na-eso ụzọ Jizọs gbara ya gburugburu, ya ebilie. Ha gosikwara ya ebe ọ ga-ehi n’abalị ahụ. N’echi ya, Pọl na Banabas gawara Dabe. Isi Listra gaa Dabe dị otu narị (100) kilomita. Chegodị otú ahụ́ si na-egbu Pọl mgbu mgbe ha na-aga Dabe, ebe ọ bụ na a ka tụchara ya nkume awa ole na ole gara aga. N’agbanyeghị nke ahụ, ya na Banabas jisiri ike na-aga. Mgbe ha rutere Dabe, ha mere ka “ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” Mgbe ha mechara, kama isi n’ụzọ ka nso laghachi n’ebe ha bi n’Antiọk nke Siria, “ha laghachiri Listra, Aịkoniọm, na Antiọk [dị na Pisidia].” Hà gara ime gịnị? Ọ bụ ‘ịgba ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ebe ndị ahụ ume ka ha sie ike n’okwukwe.’ (Ọrụ 14:20-22) Ụmụ nwoke abụọ ahụ mere ihe anyị kwesịrị iṅomi. Ihe ka ha mkpa bụ ihe ga-abara ọgbakọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara hanwa uru. N’oge anyị a, ndị nlekọta sekit na ndị ozi ala ọzọ na-emekwa ka Pọl na Banabas.

18. Olee otú e si ahọpụta ndị okenye?

18 Ihe Pọl na Banabas mere abụghị naanị ikwu na ime ihe gbara ndị na-eso ụzọ Jizọs ume, kama ha “họpụtakwara ndị okenye n’ọgbakọ nke ọ bụla.” N’agbanyeghị na ọ bụ “Chineke ji mmụọ nsọ ya zipụ” Pọl na Banabas mgbe ha na-aga mba ọzọ ikwusa ozi ọma, ha ka kpekwara ekpere ma buo ọnụ mgbe ‘ha nyefere ndị okenye ahụ n’aka Jehova.’ (Ọrụ 13:1-4; 14:23) Otú ahụ ka a na-eme n’ọgbakọ taa. Tupu ndị okenye ọgbakọ atụọ aro ka a họpụta nwanna, ha na-ekpe ekpere tụlee ma nwanna ahụ ò nwere àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru nwanna ga-enwe tupu a họpụta ya. (1 Tim. 3:1-10, 12, 13; Taị. 1:5-9; Jems 3:17, 18; 1 Pita 5:2, 3) Ihe kacha mkpa abụghị afọ ole nwanna ahụ bụrụla Onye Kraịst. Kama, ọ bụ ma okwu nwanna ahụ, omume ya, na otú e si ele ya anya hà na-egosi na ọ na-ekwe ka mmụọ nsọ na-eduzi ya n’ihe niile ọ na-eme? Ọ bụ inwe àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị nlekọta kwesịrị inwe ga-eme ka nwanna ruo eruo ịbụ onye ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ. (Gal. 5:22, 23) Ọ bụ onye nlekọta sekit ka ọ dị n’aka ịhọpụta okenye.​—I nwere ike ịtụle 1 Timoti 5:22.

19. Ònye ka ndị okenye ma na ha ga-aza ajụjụ, oleekwa otú ha si eme ka Pọl na Banabas?

19 Ndị okenye ma na ha ga-aza Chineke ajụjụ maka otú ha si emeso ọgbakọ. (Hib. 13:17) Ndị okenye na-ebute ụzọ n’ikwusa ozi ọma otú ahụ Pọl na Banabas mere. Ha na-ekwu okwu na-agba Ndị Kraịst ibe ha ume. Ihe ka ha mkpa bụ ihe ga-abara ọgbakọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara hanwa uru.​—Fil. 2:3, 4.

20. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-agụ banyere ọrụ ụmụnna anyị ji obi ha niile na-arụ?

20 Mgbe Pọl na Banabas mechara laghachi Antiọk nke Siria, bụ́ ebe ha si gawa mba ọzọ ikwusa ozi ọma, ha kọrọ “ọtụtụ ihe Chineke si n’aka ha mee, kọọkwa na o megheerela ndị mba ọzọ ụzọ ha ga-esi kwere na ya.” (Ọrụ 14:27) Mgbe ọ bụla anyị na-agụ banyere ọrụ ụmụnna anyị ji obi ha niile na-arụ ma hụ otú Jehova si gọzie mgbalị ha, ‘Jehova na-enye anyị ike, anyị anọgide na-ekwu okwu ya n’atụghị egwu.’

a Gụọ igbe bụ́ “ Aịkoniọm Bụ Obodo Ndị Frijia.”