Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 11

Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”

Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”

Ihe anyị ga-amụta n’aka Pọl mgbe o zutere ndị mmegide na-achọghị ịnụ ozi ọma

O Si n’Ọrụ Ndịozi 13:1-52

1, 2. Olee ihe mere njem Banabas na Sọl na-aga ime ji pụọ iche, oleekwa otú ọrụ ha na-aga ịrụ ga-esi eme ka Ọrụ Ndịozi 1:8 mezuo?

 IHE mere otu ụbọchị tọrọ ọgbakọ dị n’Antiọk ụtọ. N’ime ndị amụma niile na ndị niile na-akụzi ihe n’ọgbakọ ahụ, mmụọ nsọ họpụtara Banabas na Sọl ka ha gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ndị dị anya. a (Ọrụ 13:1, 2) N’eziokwu, e nweela mgbe e zipụrụ ụmụ nwoke ruru eru ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Ma ebe ndị e zigara ha bụ ebe e nwerela ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 8:14; 11:22) Na nke ugbu a, a ga-eziga Banabas, Sọl, na Jọn Mak, bụ́ onye ga na-ejere ha ozi, ka ha gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ọtụtụ mmadụ na-anụbeghị ozi ọma.

2 Ihe dị ka afọ iri na anọ tupu mgbe ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia na Sameria, ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Nhọpụta a họpụtara Banabas na Sọl ka ha gaa kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ ga-eso mee ka amụma ahụ Jizọs buru mezuo. b

“Kpọpụtaranụ M Banabas na Sọl Maka . . . Ọrụ” (Ọrụ 13:1-12)

3. Gịnị mere ịga ebe ndị dị anya ji esi ike n’oge ndịozi?

3 Taa, ndị mmadụ nwere ike iji naanị otu awa ma ọ bụ abụọ gaa ebe dị ezigbo anya n’ihi na e nweela ihe ndị dị ka ụgbọala na ụgbọelu. Ma, ọ dịghị otú ahụ n’oge ndịozi. N’oge ahụ, ọ bụ ụkwụ ka ndị mmadụ na-ejikarị aga n’okporo ụzọ, ụzọ na-ajọkarịkwa njọ. Ihe ndị mmadụ na-ejili ụkwụ aga n’otu ụbọchị bụ naanị ihe dị ka kilomita iri atọ. Ịga ya na-agwụkwa ezigbo ike. c N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na ọ na-agụsi Banabas na Sọl agụụ ike ịmalite ozi ha, o doro anya na ha ghọtara na ime njem a agaghị adị mfe. E nwere ihe ndị ọ ga-efu ha.​—Mat. 16:24.

4. (a) Olee otú e si họpụta Banabas na Sọl, oleekwa ihe Ndị Kraịst ibe ha mere mgbe a họpụtachara ha? (b) Olee otú anyị ga-esi na-akwado ndị e nyere ọrụ n’ọgbakọ?

4 Ma gịnị mere mmụọ nsọ ji sị ka ‘a kpọpụta Banabas na Sọl iche maka na e nwere ọrụ’ ha ga-arụ? (Ọrụ 13:2) Baịbụl ekwughị ihe kpatara ya. Ihe anyị ma bụ na ọ bụ mmụọ nsọ mere ka a họpụta ha. E nweghị ihe gosiri na ndị amụma na ndị na-akụzi ihe n’ọgbakọ dị n’Antiọk gbara mkpebi ahụ ụkwụ. Kama, ha kwadosiri ya ike. Ha emereghị Banabas na Sọl anyaụfụ. Chegodị otú obi dị Banabas na Sọl mgbe ụmụnna ha buru ọnụ, kpee ekpere ma ‘bikwasị ha aka n’isi wee sị ha gaa nke ọma.’ (Ọrụ 13:3) Anyị kwesịkwara ịna-akwado ndị e nyere ọrụ n’ọgbakọ, ma ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị okenye n’ọgbakọ. Kama imere ha anyaụfụ, anyị kwesịrị ‘iji ha kpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi ọrụ ha.’​—1 Tesa. 5:13.

5. Kọwaa otú Banabas na Sọl si kwusaa ozi ọma na Saịprọs.

5 Mgbe Banabas na Sọl ji ụkwụ ruo Seliushia, bụ́ ebe e nwere ọdụ ụgbọ mmiri nke dị nso n’Antiọk, ha banyere n’ụgbọ mmiri gawa agwaetiti Saịprọs. Njem a dị ihe dị ka narị kilomita abụọ. d Ebe ọ bụ na Banabas bụ nwa amaala Saịprọs, ọ ga-abụ na ọ gụsiri ya agụụ ike izi ndị obodo ya ozi ọma. Mgbe ha ruru Salamis, bụ́ obodo dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Saịprọs, ha egbughị oge ọ bụla. Ozugbo ahụ, “ha malitere ikwusa okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu.” e (Ọrụ 13:5) Banabas na Sọl gazuru Saịprọs niile. Ọ ga-abụ na ha kwusara ozi ọma ná nnukwu obodo ndị e nwere n’ebe ahụ. O nwere ike ịbụ na ha gara ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri abụọ, dabere n’ụzọ ha si.

6, 7. (a) Ònye bụ Sajiọs Pọlọs, gịnịkwa mere Baa-Jizọs ji chọọ igbochi ya ịnabata ozi ọma? (b) Gịnị ka Sọl mere iji kụghasịa atụmatụ Baa-Jizọs?

6 N’oge ndịozi, e ji ife arụsị mara ndị bi na Saịprọs. Mgbe Banabas na Sọl ruru na Pefọs, ha chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Pefọs dị n’ebe ọdịda anyanwụ Saịprọs. N’ebe ahụ, ha hụrụ “otu nwoke onye Juu, bụ́ dibịa afa. Aha ya bụ Baa-Jizọs. Ọ bụkwa onye amụma ụgha. Ya na onye na-achị ebe ahụ nọ. Aha onye a bụ Sajiọs Pọlọs. Ọ bụ nwoke ma ihe.” f N’oge ahụ, ọtụtụ ndị Rom a ma ama na-agakwuru onye na-agba afa ma ọ bụ onye na-agụ kpakpando ka o nyere ha aka ime mkpebi ndị dị mkpa. Sajiọs Pọlọs, bụ́ “nwoke ma ihe,” medịrị otú ahụ. Ma, ozi Alaeze Chineke masịrị Sajiọs Pọlọs, ya ‘achọọ ịnụ okwu Chineke.’ Ma, obi adịghị Baa-Jizọs, onye a na-etu Elimas, mma. A na-etu ya aha a n’ihi ọrụ ọ na-arụ. Elimas pụtara “dibịa afa.”​—Ọrụ 13:6-8.

7 Baa-Jizọs ejighị ntị anụ ozi Alaeze Chineke. E mere ya onye ndụmọdụ Sajiọs Pọlọs. N’eziokwu, naanị otú ọ ga-esi eme ka a ghara ịnapụ ya nnukwu ọrụ a e nyere ya bụ “ime ka onye ahụ na-achị ebe ahụ ghara ikwere n’Onyenwe anyị.” (Ọrụ 13:8) Ma Sọl agaghị ekwe ka nwoke a na-eme anwansi n’obí eze megharịa Sajiọs Pọlọs anya. Gịnịzi ka Sọl mere? Baịbụl kwuru, sị: “Sọl, onye a na-akpọkwa Pọl, jupụtara na mmụọ nsọ, wee legidesie ya [ya bụ, Baa-Jizọs] anya ike, sị ya: ‘Gị onye ụdị aghụghọ ọ bụla na ụdị arụrụala ọ bụla juru n’obi, nwa Ekwensu, onye iro nke ihe niile dị mma, gịnị mere i ji akpọdo eziokwu Jehova isi n’ala? Ugbu a, Jehova ga-ata gị ahụhụ. Ị ga-ekpu ìsì, ị gaghịkwa ahụ ìhè anyanwụ ruo nwa oge.’ N’otu ntabi anya ahụ, alụlụụ na ọchịchịrị kpuchiri ya anya, ya ana-asọ ìsì na-achọ onye ga-ejide ya n’aka na-edu ya.” g Gịnị meziri mgbe Pọl rụchara ọrụ ebube ahụ? “Mgbe onye ahụ na-achị ebe ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, n’ihi na ihe ndị ọ nụrụ gbasara Jehova tụrụ ya n’anya.”​—Ọrụ 13:9-12.

Anyị na-eme ka Pọl, na-agbachitere eziokwu dị na Baịbụl n’atụghị egwu mgbe a na-akpagbu anyị

8. Olee otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu ka Pọl?

8 Pọl atụghị Baa-Jizọs ụjọ. Anyịnwa ekwesịghịkwa ịtụ ndị mmegide ụjọ mgbe ha na-agbalị ime ka okwukwe ndị nwere mmasị n’ozi Alaeze Chineke nyụọ ka ọkụ. Ma, anyị kwesịrị ime ka okwu anyị “na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu.” (Kọl. 4:6) Ọ pụtaghị na anyị ga-akwụsị ịkụziri ndị nwere mmasị okwu Chineke maka na anyị chọrọ ịgbara nsogbu ọsọ. Ụjọ ekwesịghịkwa ime ka anyị ghara ịna-agba okpukpe ụgha n’anwụ ebe ọ bụ na ha na-eme ka Baa-Jizọs, ‘na-akpọdo eziokwu Jehova isi n’ala.’ (Ọrụ 13:10) Ka anyị gbalịa na-eme ka Pọl, na-akụziri ndị nwere ezi obi eziokwu dị na Baịbụl n’atụghị egwu. E nwere ike Chineke agaghị enye anyị ikike ịrụ ọrụ ebube otú o nyere Pọl, ma obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya na-adọta ndị kwesịrị ekwesị ka ha mụta eziokwu.​—Jọn 6:44.

“Okwu Ga-agba Anyị Ume” (Ọrụ 13:13-43)

9. Gịnị ka Pọl na Banabas mere nke ndị na-eduzi ọgbakọ taa kwesịrị ịna-eme?

9 Ọ ga-abụ na ihe gbanwere mgbe ha hapụrụ Pefọs banye ụgbọ mmiri gaa ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri ise ruo Paga. Paga dị n’akụkụ oké osimiri dị n’Eshia Maịnọ. N’Ọrụ Ndịozi 13:13, a kpọrọ ha “Pọl na ndị ya na ha so.” Ihe a gosiri na ọ ga-abụzi Pọl na-edu ndị ya na ha so. Mana, e nweghị ihe gosiri na Banabas meere Pọl anyaụfụ. Kama ime otú ahụ, ha abụọ nọgidere na-arụkọ ọrụ iji mezuo uche Chineke. Ndị na-eduzi ọgbakọ Jehova taa kwesịrị ịmụta ihe n’ihe Pọl na Banabas mere. Kama ịzọwa onye ka ibe ya n’ọgbakọ, Ndị Kraịst na-echeta na Jizọs sịrị: “Unu niile bụ ụmụnna.” Ọ sịkwara: “Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala. Onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”​—Mat. 23:8, 12.

10. Kọwaa otú isi Paga gaa Antiọk dị na Pisidia dịịrị Pọl na Banabas.

10 Mgbe ha rutere Paga, Jọn Mak hapụrụ Pọl na Banabas laghachi Jeruselem. Baịbụl ekwughị ihe mere o ji laa na mberede. Ma Pọl na Banabas akwụsịghị ozi ha, ha si Paga gaa Antiọk dị na Pisidia, n’ógbè Galeshia. Iji ụkwụ aga ebe a adịghị mfe n’ihi na Antiọk a dị n’elu ugwu. Ụzọ ndị e si aga ya jọrọ njọ, ndị ohi na-anọkarịkwa na ha. Nsogbu ọzọ bụ na ọ dị ka Pọl ọ̀ na-arịa ọrịa mgbe ahụ. h

11, 12. Olee otú Pọl si mee ka ndị ọ gwara okwu n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’Antiọk nwee mmasị n’ihe ọ na-ekwu?

11 Mgbe Pọl na Banabas rutere n’Antiọk dị na Pisidia, ha banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu n’Ụbọchị Izu Ike. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe a gụpụtachaara ndị mmadụ Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma, ndị isi oche ụlọ nzukọ ahụ sịrị ha: ‘Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ga-agba anyị ume, kwuwenụ ya.’” (Ọrụ 13:15) Pọl biliri ọtọ ikwu okwu.

12 Otú Pọl si malite okwu ya bụ na ọ kpọrọ ndị na-ege ya ntị “ndị Izrel na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke.” (Ọrụ 13:16) Ndị Pọl na-agwa okwu bụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. Olee otú Pọl si mee ka ha nwee mmasị n’ihe ọ na-ekwu, ebe ọ bụ na ha amaghị ọrụ Jizọs na-arụ n’imezu nzube Chineke? Ihe mbụ Pọl mere bụ ịkọtụrụ ha ihe ndị Jehova meere mba Izrel. Ọ kọwara otú Jehova si ‘mee ka ha bụrụ mba dị ike mgbe ha bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt’ nakwa otú o si ‘die omume ọjọọ ha nọ na-eme n’ala ịkpa’ ruo afọ iri anọ mgbe ọ napụtachara ha. Pọl kọkwara otú ndị Izrel si nweta Ala Nkwa ahụ nakwa otú Jehova si ‘nye ndị nna nna ha ala ha.’ (Ọrụ 13:17-19) Ụfọdụ ndị ekwuola na ọ ga-abụ ihe ndị a gụpụtara n’Akwụkwọ Nsọ n’ụbọchị ahụ, otú a na-eme n’Ụbọchị Izu Ike, ka Pọl nọ na-ekwu gbasara ha. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ na-egosi na Pọl ma otú e si ‘eme ihe niile iji nyere ụdị mmadụ niile aka.’​—1 Kọr. 9:22.

13. Olee otú anyị ga na-esi eme ka ihe anyị na-ekwu ruo ndị anyị na-ezi ozi ọma n’obi?

13 Anyị kwesịkwara ịna-ekwu ihe ndị ga-eme ka ndị anyị na-ezi ozi ọma nwee mmasị n’ihe anyị na-agwa ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị amata ụdị okpukpe mmadụ na-ekpe, ọ ga-enyere anyị aka ịma isiokwu ga-amasị ya. Anyị nwekwara ike ịgwa ya ihe ndị dị n’amaokwu Baịbụl ndị ọ ma ama. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịka mma ka o si na Baịbụl nke ya gụpụta amaokwu unu na-ekwu gbasara ya. Anyị kwesịrị ịna-achọta ụzọ ndị anyị ga-esi eme ka ihe anyị na-ekwu ruo ndị anyị na-ezi ozi ọma n’obi.

14. (a) Olee otú Pọl si ziwezie ndị ọ na-agwa okwu ozi ọma banyere Jizọs, oleekwa aka ná ntị ọ dọrọ ha? (b) Gịnị ka ha mere mgbe Pọl gwachara ha okwu?

14 Ihe ọzọ Pọl kwuru bụ otú e si si n’agbụrụ ndị eze Izrel nweta “onye nzọpụta bụ́ Jizọs” nakwa otú Jọn Onye Na-eme Baptizim si kwadebe ndị Izrel ka ha nabata Jizọs. Pọl kọwaziri otú e si gbuo Jizọs na otú e si kpọlite ya n’ọnwụ. (Ọrụ 13:20-37) Pọl kwuru, sị: “N’ihi ya, ụmụnna m, ya doo unu anya na ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke na-esi n’aka ya agbaghara anyị mmehie. Ọ bụ ihe a ka a na-ekwusara unu. . . . Chineke ga-agụ onye ọ bụla kweere na ya n’onye ezi omume.” Onyeozi a dọziri ndị ahụ ọ na-agwa okwu aka ná ntị, sị: “Kpacharanụ anya ka ihe e kwuru n’Akwụkwọ Ndị Amụma ghara ime unu. E kwuru, sị: ‘Unu ndị ọ na-amasị ilelị ihe anya, hụnụ ọrụ m na-arụ n’oge unu. Ọ bụ ọrụ unu na-agaghị ekweta na m rụrụ ọ bụrụgodị na mmadụ akọọrọ unu ya nke ọma. Ma, ọ ga-eju unu anya, unu ga-alakwa n’iyi.’” Mgbe Pọl kwuchara, ihe ndị ọ gwara okwu mere tụrụ ya n’anya. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị Juu rịọrọ ha ka ha gwakwuo ha ihe ndị a n’Ụbọchị Izu Ike na-abịanụ.” Ihe ọzọ bụ na mgbe ndị ahụ zukọrọ n’ụlọ nzukọ ahụ gbasara, “ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu sooro Pọl na Banabas.”​—Ọrụ 13:38-43.

“Anyị Na-agakwuru Ndị Mba Ọzọ” (Ọrụ 13:44-52)

15. Olee ihe mere n’Ụbọchị Izu Ike mgbe Pọl kwuchara okwu?

15 N’Ụbọchị Izu Ike ọzọ, “ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ obodo ahụ niile zukọrọ” ka ha gee Pọl ntị. Ihe a were ụfọdụ ndị Juu iwe, ha ‘amalite ịgbagha ihe Pọl na-ekwu, si otú ahụ kwuluo Chineke.’ Ya na Banabas gwara ha hoo haa, sị: “Ọ dị mma na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke. Ma, ebe ọ bụ na unu jụrụ ya, meekwa onwe unu ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ. N’ihi na Jehova gwara anyị, sị: ‘Ahọpụtala m gị ka ị bụụrụ mba dị iche iche ìhè, ka i wee gaa n’ebe niile n’ụwa kwusaa otú m ga-esi azọpụta ndị mmadụ.’”​—Ọrụ 13:44-47; Aịza. 49:6.

“Ndị Juu mere ka [e] megidewe Pọl na Banabas. . . . Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee na-ejupụta na mmụọ nsọ, obi ana-abụkwa ha sọ aṅụrị.”​—Ọrụ Ndịozi 13:50-52

16. Gịnị ka ndị Juu mere mgbe Pọl na Banabas gwachara ha okwu n’atụghị egwu, oleekwa ihe ndịozi ahụ mere mgbe a kpagbuwere ha?

16 Ndị Jentaịl ha gwara okwu ṅụrịrị ọṅụ, “ndị niile na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 13:48) N’oge na-adịghị anya, e kwusara okwu Jehova n’ebe niile ná mba ahụ. Ma, ihe ndị Juu mere dị nnọọ iche. Ihe ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ na-ekwu bụ na ndị Juu jụrụ Mezaya n’agbanyeghị na ọ bụ ha ka e bu ụzọ gwa Okwu Chineke. N’ihi ya, Chineke ga-ama ha ikpe. Ndị Juu mere ka ụmụ nwaanyị a ma ama na ụmụ nwoke nwere agba n’obodo ahụ “megidewe Pọl na Banabas. Ha wee mesie ha ike ma chụpụ ha n’obodo ha.” Gịnị ka Pọl na Banabas mere? Ha ‘tichapụụrụ ha ájá dị ha n’ụkwụ ma gawa Aịkoniọm.’ Ihe a ò mere ka a gharazie inwe ndị na-eso ụzọ Kraịst n’Antiọk dị na Pisidia? Mbanụ! Ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị ha hapụrụ ebe ahụ, nọ “na-ejupụta na mmụọ nsọ, obi ana-abụkwa ha sọ aṅụrị.”​—Ọrụ 13:50-52.

17-19. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Pọl na Banabas, oleekwa otú ime ka ha ga-esi eme ka anyị na-aṅụrị ọṅụ?

17 Anyị na-amụta ezigbo ihe n’ihe ndịozi ahụ mere mgbe a na-akpagbu ha. Anyị anaghị akwụsị ikwusa ozi ọma, ọ bụrụgodị na ndị a ma ama n’ụwa agbalịa ime ka anyị kwụsị. Ị̀ hụrụ na Pọl na Banabas ‘tichapụụrụ ndị Antiọk ájá dị ha n’ụkwụ’ mgbe ha jụrụ ozi ọma? Ihe a ha mere apụtaghị na ha na-ewe iwe, kama ọ pụtara na ọbara ndị obodo ahụ agaghị adị ha n’isi. Pọl na Banabas ghọtara na ha agaghị amanye ndị mmadụ amanye inwe okwukwe na Jizọs. Kama ihe ha ga-emeli bụ ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. Ha nọgidekwara na-ekwusa ya mgbe ha gara Aịkoniọm.

18 Oleekwanụ maka ndị na-eso ụzọ Jizọs ha hapụrụ n’Antiọk? N’eziokwu, ha bi n’ebe a na-akpagbu ha. Ma, ọ bụghị ọtụtụ ndị ịnabata ozi ọma ha na-ekwusa ga-eme ka ha nwee obi ụtọ. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụ ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.” (Luk 11:28) Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’Antiọk dị na Pisidia kpebisiri ike ime ihe a.

19 Anyị kwesịrị icheta mgbe niile na ọrụ anyị bụ ikwusa ozi ọma otú ahụ Pọl na Banabas mere. Ọ bụ ndị anyị na-ezi ozi ọma ga-ekpebi ma hà ga-anabata ozi anyị na-ezi ha ma hà ga-ajụ ya. Ọ bụrụ na o yie ka ndị anyị na-ezi ozi ọma enweghị mmasị, anyị kwesịrị ịmụta ihe n’aka ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ndịozi. Ọ bụrụ na anyị ejiri eziokwu a kpọrọ ihe ma kwe ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị, anyị ga na-aṅụrịkwa ọṅụ, ma mgbe a na-akpagbu anyị.​—Gal. 5:18, 22.

a Gụọ igbe bụ́ “ Banabas​—‘Nwa Nkasi Obi.’

b N’oge ahụ, e nweela ọgbakọ n’ebe dị iche iche ruodị n’Antiọk nke Siria, nke dị ihe dị ka narị kilomita ise na iri ise ma e si n’ebe ugwu Jeruselem gawa ya.

c Gụọ igbe bụ́ “ N’Okporo Ụzọ.”

d N’oge ndịozi, ọ bụrụ na ifufe enyeghị nsogbu, e nwere ike iji ụgbọ mmiri gaa ihe dị ka otu narị kilomita na iri ise n’otu ụbọchị. Ma, ọ bụrụ na ihu igwe adịghị mma, njem ahụ nwere ike ịkarị otu ụbọchị.

e Gụọ igbe bụ́ “ N’Ụlọ Nzukọ Ndị Juu.”

f Ọ bụ Ndị Omeiwu n’Ụlọ Nzụkọ Ndị Rom na-achị Saịprọs. Ha họpụtara gọvanọ na-achị àgwàetiti a ka ọ nọchite anya ha.

g Malite n’ebe a gawa, a kpọwara Sọl Pọl. Ụfọdụ ndị kwuru na ihe mere o ji zawa aha Rom bụ́ Pọl bụ iji kwanyere Sajiọs Pọlọs ùgwù. Ma, ebe ọ bụ na ọ ka nọ na-aza Pọl mgbe ọ hapụchara Saịprọs, ọ pụtara na e nwere ihe ọzọ kpatara ya. Ihe mere o ji kpebie ịzawa aha Rom ya bụ́ Pọl bụ na ọ bụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” O nwere ike ịbụ na ihe ọzọ kpatara ya bụ na aha Hibru ya bụ́ Sọl na-ada ka otu okwu Grik nwere ihe na-adịghị mma ọ pụtara.​—Rom 11:13.

h Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pọl degaara Ndị Galeshia akwụkwọ ozi. O dere n’akwụkwọ ozi ahụ, sị: “Ọ bụ ọrịa m rịara mere m ji nweta ohere mbụ m ji zie unu ozi ọma.”​—Gal. 4:13.