Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 6 • Ọrụ 15:36–18:22

“Bịa Ka Anyị Gaa Leta Ụmụnna”

“Bịa Ka Anyị Gaa Leta Ụmụnna”

ỌRỤ 15:36

Olee ọrụ dị mkpa ndị nlekọta sekit na-arụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst? Olee ngọzi ndị anyị na-enweta ma anyị jiri obi anyị niile nabata ọrụ nzukọ Jehova nyere anyị? Olee otú anyị ga-esi nyere ndị mmadụ aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ nke ọma, gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji na-agbanwetụ otú anyị si ezi ụdị mmadụ dị iche iche ozi ọma? Anyị ga-amata azịza ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ ka anyị na-amụ banyere njem nke abụọ Pọl mere gaa kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ.