Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 18

‘Ha Chọọ Chineke, Ha Ga-achọta Ya’

‘Ha Chọọ Chineke, Ha Ga-achọta Ya’

Pọl gbanwetụrụ otú o si ezi ozi ọma ma jiri ihe ya na ndị ọ na-agwa okwu kweere otu ihe na ya kụziere ha ihe

O Si n’Ọrụ Ndịozi 17:16-34

1-3. (a) Gịnị mere obi adịghị Pọl onyeozi mma n’Atens? (b) Olee ihe anyị ga-amụta ma anyị mụọ otú Pọl si zie ndị Atens ozi ọma?

 OBI adịghị Pọl mma. Ọ nọ n’Atens dị na Gris. E ji agụmakwụkwọ mara obodo a n’oge ochie. Ndị ọkà mmụta bụ́ Sọkretiz, Pleto, na Arịstọtụl kụziri ihe na ya. Ndị Atens anaghị eji okpukpe ha egwu egwu. Ebe ọ bụla Pọl lere anya, ma n’ụlọ nsọ ma n’ámá obodo ma n’okporo ámá, ihe ọ na-ahụ bụ arụsị dị iche iche, n’ihi na ndị Atens na-efe ọtụtụ chi. Pọl ma otú Jehova, bụ́ ezi Chineke, si ele ikpere arụsị anya. (Ọpụ. 20:4, 5) Ọ bụkwa otú ahụ ka Pọl, onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, si ele ya. Ọ kpọrọ ya asị.

2 Ihe Pọl hụrụ mgbe ọ banyere n’ahịa obodo ahụ wụrụ ya akpata oyi n’ahụ́. A kpụrụ ọtụtụ chi Hemis gba ọtọ n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ, n’akụkụ ebe e si abanye na ya. Ụlọ arụsị jukwara n’ahịa ahụ. Olee otú Pọl ga-esi zie ndị obodo a na-efe ọtụtụ arụsị ozi ọma? Ọ̀ ga-ejideli onwe ya ma chọta ihe ya na ha kweere otu ihe na ya ọ ga-eji zie ha ozi ọma? È nwere ndị ọ ga-enyeliri aka ka ha chọọ ezi Chineke ma chọta ya?

3 N’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi 17:22-31, e dere ihe Pọl gwara ndị Atens gụrụ oké akwụkwọ. O ji nghọta na akọ gwa ha okwu ruru ha n’obi. Anyị kwesịrị ime ka ya ma anyị ziwe ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị amụọ otú Pọl si zie ha ozi ọma, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere otú anyị ga-esi jiri ihe anyị na ndị mmadụ kweere otu ihe na ya na-ezi ha ozi ọma, mụtakwa otú anyị ga-esi eme ka ha chebara ihe anyị gwara ha echiche.

Izi Ihe “n’Ahịa” (Ọrụ 17:16-21)

4, 5. Olee ebe Pọl kwusara ozi ọma n’Atens, oleekwa ụdị ndị nọ ebe ahụ?

4 Pọl gara Atens ná nke ugboro abụọ ọ gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ, n’ihe dị ka afọ 50 O.N.K. a Mgbe Pọl nọ na-eche ka Saịlas na Timoti si Beria bịa, “ọ gara n’ụlọ nzukọ” “na-enyere [ndị Juu] aka ịghọta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ,” otú ọ na-emekarị. Ọ gakwara “n’ahịa” ebe ọ ga-ahụ ndị na-abụghị ndị Juu ka o zie ha ozi ọma. (Ọrụ 17:17) Ahịa ndị Atens dị nso n’ugwu a na-akpọ Akrọpọlis. Ọ bụ nnukwu ahịa. Ma, ọ bụghị naanị ahịa ka a na-azụ na ya, ọ bụkwa ebe ọhaneze na-ezukọ. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na ọ bụ ebe “ndị achụmnta ego, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọkachamara, na ndị na-ede akwụkwọ na-ezukọta.” Ọ na-atọ ndị Atens gụrụ oké akwụkwọ ụtọ izukọta ebe ahụ akparịta ụka.

5 Ndị Pọl ga-agwa okwu n’ahịa ahụ bụ ekwe ekwe. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik. Òtù abụọ a na-amarịta aka, ihe ha kweere dịkwa iche iche. b Ndị òtù Epikurọs kweere na ihe niile dị ndụ nọkatara dịrị. E nwere ike ikwu na otú ha si ele ndụ anya bụ: “Ịtụ egwu Chineke abaghị uru. Ihe anaghị afụ ndị nwụrụ anwụ ụfụ. Ihe ọma ga-eruli mmadụ aka. Mmadụ ga-edili ihe ọjọọ.” Ndị òtù Stoik kweere na mmadụ kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma ma na-eme ihe uche ya gwara ya. Ha ekweghịkwa na e nwere onye bụ́ Chineke. Ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik ekweghị na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ otú ndị na-eso ụzọ Kraịst kweere. N’eziokwu, ihe òtù abụọ a na-akụzi dị nnọọ iche n’eziokwu magburu onwe ya ezigbo Ndị Kraịst kweere, nke Pọl nọ na-ekwusa.

6, 7. Gịnị ka ụfọdụ ndị Grik gụrụ oké akwụkwọ mere mgbe ha nụrụ ihe Pọl na-akụzi, oleekwa otú ụfọdụ ndị si eme ụdị ihe ahụ taa?

6 Gịnị ka ndị Grik ahụ gụrụ oké akwụkwọ mere mgbe ha nụrụ ihe Pọl na-akụzi? Ụfọdụ kwuru na Pọl bụ “onye ekwurekwu.” (Ọrụ 17:18) Otu ọkà mmụta kwuru banyere okwu Grik a sụgharịrị “onye ekwurekwu,” sị: “Ọ bụ ihe a ka a na-akpọ nwa nnụnụ na-agagharị na-atụrụ ọka. O mechara bụrụ ihe a na-akpọ ndị na-atụtụ iberibe nri na ihe dị iche iche a tụfuru atụfu n’ahịa. O mechakwara bụrụ ihe a na-akpọ onye ọ na-abụ ya nụ ihe, ya eburu ya gawa, karịchaa, onye na-ekwu ihe na-edoghị ya anya.” Ihe ndị ahụ gụrụ oké akwụkwọ na-ekwu bụ na Pọl bụ onye iberiibe na-ekwu chọọ chọọ chọọ. Ma, anyị ga-ahụ na ọnụ ahụ a kọrọ Pọl emeghị ka obi daa ya mbà.

7 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. A na-akọkarị anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ọnụ n’ihi na ihe anyị kweere si na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị gụrụ oké akwụkwọ na-akụzi na ozizi evolushọn bụ eziokwu nakwa na onye ọ bụla ma ihe kwesịrị ikweta na ya. Ihe ọ pụtara bụ na ha na-ekwu na ndị na-ekweghị n’ozizi a amaghị ihe. Ha na-eme ka ndị mmadụ chee na anyị bụ ‘ndị ekwurekwu’ mgbe anyị na-agwa ha ihe Baịbụl kwuru ma na-egosi ha na e nwere onye kere ihe niile. Ma, ihe a anaghị eme ka obi daa anyị mbà. Kama, anyị na-eji obi ike eme ka ndị mmadụ mata na anyị kweere na ọ bụ Jehova Chineke, Onye ma ihe, kere ihe niile dị ndụ n’ụwa.​—Mkpu. 4:11.

8. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị Pọl ziri ozi ọma mere? (b) Mgbe e kwuru na a kpụgara Pọl n’Ariopagọs, gịnị ka o nwere ike ịpụta? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji nke 142.)

8 Ndị ọzọ nụrụ ihe Pọl kụziri n’ahịa emeghị ka ndị ahụ gụrụ oké akwụkwọ. Ha kwuru, sị: “Ọ dị ka ọ̀ na-ekwusa gbasara chi ndị mba ọzọ.” (Ọrụ 17:18) Ọ̀ bụ eziokwu na e nwere chi ọzọ Pọl na-agwa ndị Atens banyere ya? Nsogbu dịkwa ma ọ bụrụ ihe ọ na-eme n’ihi na ọ bụ ụdị ihe a mere e ji ma Sọkretiz ikpe ọnwụ ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. O jughị anyị anya na a kpụgaziri Pọl n’Ariopagọs ma sị ya kọwaa ihe ndị ọ nọ na-akụzi nke ndị Atens na-anụtụbeghị. c Olee otú Pọl ga-esi kọwaara ndị ahụ na-amaghị Akwụkwọ Nsọ ihe ọ na-ekwu?

“Ndị Atens, Ahụrụ M” (Ọrụ 17:22, 23)

9-11. (a) Olee otú Pọl si jiri ihe ya na ndị ọ na-agwa okwu kweere zie ha ozi ọma? (b) Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Pọl mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma?

9 Cheta na obi adịghị Pọl mma n’ihi arụsị niile ọ hụrụ n’obodo ahụ. Ma kama iji iwe katọọ arụsị ha na-efe, o jidere onwe ya. Pọl ji akọ gbalịa ikwu ihe ya na ndị ọ na-agwa okwu kweere otu ihe na ya. Ọ sịrị ha: “Ndị Atens, ahụrụ m na, n’ihe niile, o yiri ka ùnu na-ekpere chi dị iche iche karịa ndị ọzọ.” (Ọrụ 17:22) Ihe Pọl na-ekwu bụ, ‘Ahụrụ m na unu ejighị okpukpe egwu egwu.’ Pọl jara ha mma maka na ha ji okpukpe kpọrọ ihe. Ihe a o mere gosiri na ọ ma ihe. Ọ ghọtara na ụfọdụ ndị a kụziiri ozizi ụgha abụghị ndị ọjọọ, ha ka chọkwara ịmata eziokwu. A sị ka e kwuwe, Pọl ma na e nwere mgbe yanwa ‘na-amaghị ihe nakwa na o mere ihe n’ihi na ọ tụkwasịghị Chineke obi.’​—1 Tim. 1:13.

10 Pọl ji ihe ya na ndị Atens kweere otu ihe na ya gwa ha okwu. O kwuru na ya hụrụ ihe gosiri na ha ejighị okpukpe egwu egwu, ya bụ, otu ebe ịchụàjà ihe e dere n’elu ya bụ: “Nke A Bụ nke Chi A Na-amaghị Ama.” Otu akwụkwọ kwuru na “ndị Grik na ndị ọzọ na-arụrụ ‘chi a na-amaghị ama’ ebe ịchụàjà, a dịghị ama ama ya abụrụ na e nwere chi ha na-amaghị, nke nwere ike iwe iwe maka na ha anaghị efe ya.” Ebe ịchụàjà ahụ ndị Atens rụụrụ chi ahụ gosiri na ha kwetara na e nwere Chi ha na-amaghị. Pọl ji ebe ịchụàjà ahụ ha rụrụ malite izi ha ozi ọma. O kwuru, sị: “Ọ bụ chi unu na-amaghị, nke unu na-efe, ka m na-ekwusara unu.” (Ọrụ 17:23) Pọl ji akọ gwa ha okwu, ma ihe o kwuru gbara ọkpụrụkpụ. Ọ bụghị chi ọhụrụ ka ọ na-ekwusara ha, dị ka ụfọdụ kwuru. Kama, ọ na-akọrọ ha banyere Chi ha na-amaghị, ya bụ, ezi Chineke.

11 Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Pọl mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma? Ọ bụrụ na anya na-eru anyị ala, anyị nwere ike ịhụ ihe gosiri na mmadụ ejighị okpukpe ya egwu egwu. Anyị nwere ike ịhụ na o yi ihe ndị okpukpe na-eyi ma ọ bụkwanụ kowe ya n’ụlọ ma ọ bụ n’èzí. Anyị nwere ike ịsị ya: ‘Achọpụtara m na i jighị okpukpe gị egwu egwu. Ọ bụ ndị dị ka gị ka m na-achọ ka mụ na ha kwuo okwu.’ Ọ bụrụ na anyị ejiri akọ kwuo gbasara otu ihe o kweere nke anyịnwa kwekwaara, ọ ga-eme ka anyị gbakwasị ụkwụ n’ihe ahụ zie ya ozi ọma. Cheta na anyị ekwesịghị ịma ndị mmadụ ikpe n’ihi ihe ha kweere. Ọtụtụ ụmụnna anyị nwekwara mgbe ha ji obi ha niile kwere ozizi ụgha a kụziiri ha.

Gbalịa jiri ihe gị na ndị mmadụ kweere otu ihe na ya zie ha ozi ọma

Chineke “Nọ Onye Ọ Bụla n’Ime Anyị Nso” (Ọrụ 17:24-28)

12. Olee ihe Pọl gbanwere ka o nwee ike zie ndị ọ na-agwa okwu ozi ọma?

12 Pọl ejirila ihe ya na ndị ọ na-agwa okwu kweere otu ihe na ya malite okwu ya. Ma, ọ̀ ga-eji ya ziri ha ozi ọma na-aga? Ebe ọ ma na ọ bụ ndị ọkachamara Grik kụziiri ndị ọ na-agwa okwu ihe nakwa na ha amaghị Akwụkwọ Nsọ, ọ gbanwere ihe, si n’ụzọ ndị ọzọ zie ha ihe. Ihe mbụ o mere bụ ịkụzi ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ n’ekwughị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ihe nke abụọ abụrụ ime ka ndị ọ na-agwa okwu ghọta na ya na ha nọ n’otu ụgbọ. Dị ka ihe atụ, e nwere oge ndị o kwuru “anyị” mgbe ọ na-ekwu okwu. Ihe nke atọ o mere bụ na o kwuru ihe dị n’akwụkwọ ndị Grik iji gosi ha na e kwuru ụfọdụ ihe ọ na-agwa ha n’akwụkwọ ha. Ka anyị lebazie anya n’okwu ahụ gbara ọkpụrụkpụ Pọl kwuru. Olee eziokwu ndị o mere ka a mata banyere Chi ahụ ndị Atens na-amaghị?

13. Gịnị ka Pọl kwuru na ọ bụ otú eluigwe na ụwa si malite, gịnịkwa ka ihe o kwuru pụtara?

13 Ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa. Pọl kwuru, sị: “Chineke, onye kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, anaghị ebi n’ụlọ nsọ e ji aka rụọ n’ihi na ọ bụ Onyenwe eluigwe na ụwa.” d (Ọrụ 17:24) Eluigwe na ụwa anọkataghị dịrị. Ọ bụ ezi Chineke kere ihe niile. (Ọma 146:6) Ọkaakaa Onyenwe eluigwe na ụwa adịghị ka Atena ma ọ bụ chi ndị ọzọ a na-asọpụrụ n’ihi ụdị ụlọ a rụụrụ ha, otú e si rụọ ihu arụsị ha, nakwa ebe a na-achụrụ ha àjà. Ụlọ nsọ mmadụ rụrụ enweghị ike ịba Chineke. (1 Eze 8:27) Ihe Pọl na-ekwu doro anya: Chineke karịrị arụsị ọ bụla mmadụ mere bụ́ ndị a na-edowe n’ụlọ ndị mmadụ rụụrụ ha.​—Aịza. 40:18-26.

14. Olee otú Pọl si gosi na ọ bụghị ụmụ mmadụ na-egboro Chineke mkpa ya?

14 Ọ bụghị ụmụ mmadụ na-egboro Chineke mkpa ya. Ndị na-ekpere arụsị na-eyiwekarị arụsị ha uwe ndị dị oké ọnụ, na-enye ha onyinye ndị dị oké ọnụ, ma ọ bụkwanụ na-ewetara ha nri na mmanya, ka à ga-asị na ihe ndị ahụ dị arụsị ha mkpa. Ma, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị ọkachamara Grik Pọl gwara okwu kweere na ọ bụghị mmadụ kwesịrị igboro chi ya mkpa ya. Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ha kwetara ihe Pọl kwuru nke bụ́ na Chineke ‘anaghị atụ anya ka ụmụ mmadụ nyere ya aka dị ka à ga-asị na o nwere ihe na-akpa ya.’ N’eziokwu, e nweghị ihe a na-ahụ anya ụmụ mmadụ nwere ike inye Onye kere ha iji gbooro ya mkpa. Kama, ọ bụ yanwa na-enye ụmụ mmadụ ihe ndị dị ha mkpa, ya bụ, “ndụ na ume na ihe niile,” ma anyanwụ, mmiri ozuzo, ma ala nke na-emepụta ihe. (Ọrụ 17:25; Jen. 2:7) N’ihi ya, ọ bụghị ụmụ mmadụ na-egboro Chineke mkpa ya, kama ọ bụ yanwa na-enye ụmụ mmadụ ihe.

15. Olee otú Pọl si mee ka ndị Atens ghọta na ha ekwesịghị iche na ha ka ndị na-abụghị ndị Grik mma, oleekwa ezigbo ihe anyị na-amụta n’ihe o mere?

15 Ọ bụ Chineke kere mmadụ. Ndị Atens chere na ha ka ndị na-abụghị ndị Grik mma. Ma Baịbụl gwara anyị na agbụrụ anyị ma ọ bụ mba anyị ekwesịghị ịna-ebu anyị isi. (Diut. 10:17) Pọl ji akọ mee ka ihe a Baịbụl kwuru doo anya. Mgbe o kwuru na “Chineke sikwa n’otu mmadụ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị,” ọ ga-abụ na ihe a o kwuru mere ka ndị ọ na-agwa okwu chee echiche. (Ọrụ 17:26) Pọl na-akọrọ ha ihe e kwuru na Jenesis banyere Adam, onye bụ́ nna mmadụ niile. (Jen. 1:26-28) Ebe ọ bụ na mmadụ niile si n’otu nna, e nweghị agbụrụ ma ọ bụ mba ka ibe ya. O doro anya na ndị Pọl na-agwa okwu ghọtara ihe ọ na-ekwu. E nwere ezigbo ihe anyị na-amụta n’ihe Pọl mere. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị iji akọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ma gosi na anyị na-echebara ha echiche, anyị ekwesịghị ịgwa ha naanị ihe ha chọrọ ịnụ maka na anyị chọrọ ka ha gee anyị ntị.

16. Gịnị ka Onye kere ụmụ mmadụ bu n’obi kee ha?

16 Chineke chọrọ ka ya na ụmụ mmadụ dịrị ná mma. Ọ bụrụgodị na ndị ọkachamara ndị so ná ndị Pọl na-agwa okwu arụrịtaala ụka ọtụtụ afọ banyere ihe mere mmadụ ji dịrị ndụ, ha enweghị ike ịkọwa ya nke ọma. Ma, Pọl mere ka ihe Onye kere ụmụ mmadụ bu n’obi kee ha doo anya, ya bụ, na ọ “chọrọ ka ndị mmadụ chọọ ya. Ọ bụrụkwa na ha agbaa mbọ chọọ ya, ha ga-achọta ya. N’eziokwu, ọ nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.” (Ọrụ 17:27) Chi ahụ ndị Atens na-amaghị abụghị Chi a na-enweghị ike ịmata amata. N’eziokwu, ọ nọghị ndị ji obi ha niile na-achọ ya ma na-agbalị ịmụta banyere ya n’ebe dị anya. (Ọma 145:18) Echefula na mgbe Pọl sịrị “anyị,” ọ gụnyere onwe ya ná ndị kwesịrị ‘ịchọ’ Chineke na ndị ‘ga-agba mbọ chọọ’ ya.

17, 18. Gịnị mere o ji kwesị ịna-agụ ụmụ mmadụ agụụ ka ha na Chineke dịrị ná mma, oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Pọl si mee ka ihe ọ na-ekwu ruo ndị ọ na-agwa ya n’obi?

17 O kwesịrị ịgụ ụmụ mmadụ agụụ ka ha na Chineke dịrị ná mma. Pọl kwuru banyere Chineke, sị: “Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-eje ije, na-adịkwa ndụ.” Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sịrị na Pọl na-ekwu ihe Epimenides kwuru. Epimenides bụ onye Krit na-ede uri. Ọ dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ isii (2,600) gara aga, bụrụkwa “onye ọnụ na-eru n’okwu n’omenala ndị Atens.” Pọl kwuru ihe ọzọ mere o kwesịrị iji na-agụ ụmụ mmadụ agụụ ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ sịrị: “Ụfọdụ n’ime unu ndị na-ede uri kwuru, sị: ‘N’ihi na anyị niile bụ ụmụ ya.’” (Ọrụ 17:28) Ụmụ mmadụ kwesịrị ịchọ ka ha bịa Chineke nso n’ihi na ọ bụ ya kere nwoke mbụ mmadụ niile si n’aka ya. Pọl chọrọ ka ndị ọ na-agwa okwu gee ya ntị, ọ bụ ya mere o ji kwuo ihe ndị Grik dere. Ọ ga-abụkwa na ndị ọ na-agwa okwu na-akwanyere ndị dere ihe ndị ahụ ùgwù. e Dị ka Pọl mere, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ikwutụ ihe e dere n’akwụkwọ ụfọdụ a na-akwanyere ùgwù, dị ka akwụkwọ na-akọ ihe mere eme, akwụkwọ ndị ọkà mmụta, ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ e ji eme nchọnchọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ekwuo ihe akwụkwọ a ma ama kwuru, o nwere ike ime ka onye na-abụghị Onyeàmà Jehova ghọta otú ememme ndị okpukpe ụgha ma ọ bụ nkụzi ha si malite.

18 N’ihe niile Pọl kwurula, o mere ka a mata eziokwu gbara ọkpụrụkpụ banyere Chineke, jiri nkà kwuo ha otú ga-eme ka ndị ọ na-agwa okwu gee ya ntị. Gịnị ka onyeozi a chọrọ ka ndị Atens ọ na-agwa okwu jiri ezigbo ihe a ọ na-agwa ha mee? N’egbughị oge, ọ bụ ihe ọ malitere ikwu.

“Ọ Na-agwa Mmadụ Niile n’Ebe Niile Ka Ha Chegharịa” (Ọrụ 17:29-31)

19, 20. (a) Olee otú Pọl si jiri akọ mee ka a ghọta na ikpere arụsị mmadụ mere bụ izuzu nzuzu? (b) Gịnị ka ndị Pọl gwara okwu kwesịrị ime?

19 Pọl adịla njikere ịgwa ndị na-ege ya ntị ihe ha kwesịrị ime. Ọ gbakwasịrị ụkwụ n’ihe ahụ dị n’akwụkwọ ndị Grik dere kwuo, sị: “Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume. Anyị ekwesịghịkwa iche na ọ dị ka ihe ụmụ mmadụ chepụtara kpụọ.” (Ọrụ 17:29) N’eziokwu, ọ bụrụ na ụmụ mmadụ bụ ọrụ aka Chineke, oleezi otú Chineke ga-esi yie arụsị, bụ́ ọrụ aka mmadụ? Otú Pọl si jiri akọ kwuo okwu mere ka a ghọta na ife arụsị mmadụ mere bụ izuzu nzuzu. (Ọma 115:4-8; Aịza. 44:9-20) Mgbe Pọl kwuru anyị ekwesịghị,” ọ ga-abụ na otú ahụ o si gụnye onwe ya mere ka ọ dịrị ndị ọ na-agwa okwu mfe ịnabata ihe ọ na-ekwu.

20 Pọl mere ka o doo ha anya na ha kwesịrị ime ihe. Ọ sịrị: “Chineke elefurula oge ahụ ndị mmadụ na-amaghị ihe ha na-eme anya [ya bụ, oge ahụ a na-eche na ndị na-ekpere arụsị na-eme ihe dị Chineke mma]. Ma ugbu a, ọ na-agwa mmadụ niile n’ebe niile ka ha chegharịa.” (Ọrụ 17:30) Ọ ga-abụ na o juru ụfọdụ ndị Pọl na-agwa okwu anya mgbe ọ gwara ha ka ha chegharịa. Ma okwu ahụ gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara ha mere ka o doo anya na ọ bụ Chineke nyere ha ndụ, nakwa na ha ga-aza ya ajụjụ maka otú ha si bie ndụ. Ha kwesịrị ịchọ Chineke, mụta eziokwu banyere ya, biwekwa ndụ otú Chineke chọrọ. Ọ pụtara na ndị Atens ga-aghọta na ikpere arụsị bụ mmehie ma kwụsị ya.

21, 22. Olee ihe dị ezigbo mkpa Pọl ji mechie okwu ya, oleekwa ihe anyị ga-amụta na ya?

21 Pọl kwuziri ihe dị ezigbo mkpa ná mmechi okwu ya. Ọ sịrị: ‘Chineke ewepụtala otu ụbọchị ọ ga-esi n’aka otu nwoke ọ họpụtara kpee mmadụ niile bi n’ụwa ikpe n’eleghị ha anya n’ihu. O meekwala ka obi sie mmadụ niile ike na ọ ga-eme ya, n’ihi na ọ kpọlitere nwoke ahụ n’ọnwụ.’ (Ọrụ 17:31) Ebe ọ bụ na ha amatala na Ụbọchị Ikpe na-abịa, ha kwesịrị ịchọ ezi Chineke ma chọta ya. Pọl akpọghị onye ga-ekpe ikpe ahụ aha. Kama, ihe o kwuru banyere ya juru ndị ọ na-agwa okwu anya. Ọ gwara ha na onye ahụ ebiela ndụ ka mmadụ, nwụọ, Chineke akpọlitekwa ya n’ọnwụ.

22 E nwere ọtụtụ ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ na-eru n’obi Pọl kwuru ná mmechi okwu ya. Anyị ma na onye Chineke họpụtara ka o kpee ikpe ahụ bụ Jizọs Kraịst ọ kpọlitere n’ọnwụ. (Jọn 5:22) Anyị makwa na Ụbọchị Ikpe ahụ ga-abụ otu puku afọ, nakwa na o ji ọsọ na-abịa. (Mkpu. 20:4, 6) Anyị anaghị atụ Ụbọchị Ikpe ahụ ụjọ, n’ihi na anyị ma na ọ ga-ewetara ndị e kpebiri na ha bụ ndị ezi omume ngọzi ndị na-enweghị atụ. Ihe mere obi ji sie anyị ike na Chineke ga-emezu ihe niile magburu onwe ha anyị na-atụ anya ha bụ ọrụ ebube kachanụ ọ rụrụ, ya bụ, mkpọlite ọ kpọlitere Jizọs Kraịst n’ọnwụ.

‘Ụfọdụ Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs’ (Ọrụ 17:32-34)

23. Olee ihe dị iche iche ndị mmadụ mere mgbe Pọl gwachara ha okwu?

23 Mgbe Pọl kwuchara okwu, a bịara nwee ndị kwe na ndị ekweghị. “Ụfọdụ malitere ịkwa ya emo” mgbe ha nụrụ banyere ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ. E nwekwara ndị na-emeghị ka a mata ebe ha kwụ. Ha sịrị: “Anyị ga-achọ ịnụ gbasara ihe a n’oge ọzọ.” (Ọrụ 17:32) Ma, mmadụ ole na ole nabatara ihe Pọl kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị sooro ya, ghọọkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha bụ Dayọnisiọs, onye bụ́ ọkàikpe n’ụlọikpe Ariopagọs, na otu nwaanyị aha ya bụ Damaris, nakwa ndị ọzọ.” (Ọrụ 17:34) Ndị mmadụ na-emekwa ụdị ihe a ma anyị zie ha ozi ọma. Ụfọdụ ndị nwere ike ịkparị anyị. E nwekwara ndị na-agaghị egosicha ebe ha kwụ. Ma, obi na-atọgbu anyị atọgbu ma ụfọdụ ndị nabata ozi Alaeze Chineke ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

24. Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe Pọl kwuru mgbe ọ nọ n’Ariopagọs?

24 Ọ bụrụ na anyị echebara ihe Pọl kwuru echiche, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe gbasara otú anyị ga-esi na-akọwa ihe anyị na-ekwu ka o ruo ndị mmadụ n’obi ma mee ka ha kweta na ihe anyị na-akụziri ha bụ eziokwu. Anyị ga-amụtakwa na anyị kwesịrị inwe ndidi ma dịrị akọ mgbe anyị na-agwa ndị a kụziiri ozizi ụgha okwu. Ihe ọzọ dị mkpa anyị ga-amụta bụ na anyị ekwesịghị ịgwa ndị mmadụ naanị ihe ha chọrọ ịnụ maka na anyị chọrọ ka ha gee anyị ntị. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Pọl onyeozi, anyị ga na-akụzikwu ihe nke ọma mgbe anyị na-ezi ozi ọma. Ihe ọzọ bụ na ndị okenye ga na-akụzikwu ihe nke ọma n’ọgbakọ. Anyị ga-esi otú ahụ kwadebe nke ọma inyere ndị ọzọ aka ‘ịchọ Chineke ma chọta ya.’​—Ọrụ 17:27.

c Ariopagọs dị n’otu ugwu dị n’Akrọpọlis, ọ bụkwa na ya ka ndị ọchịchị Atens na-enwe nzukọ ha. E kwuo “Ariopagọs,” o nwere ike ịbụ ndị ọchịchị obodo ahụ ma ọ bụ ugwu ahụ ka a na-ekwu. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta enweghị otu olu gbasara ebe a kpọgara Pọl. Ụfọdụ na-asị na a kpọgara ya n’ugwu ahụ ma ọ bụ n’ebe dị nso n’ugwu ahụ, ndị ọzọ ana-asị na a kpọgara ya n’ebe ọzọ ndị ọchịchị obodo ahụ zukọrọ, dị ka n’ahịa.

d Okwu Grik a sụgharịrị “ụwa” bụ koʹsmos. Ọ bụ ihe ndị Grik na-akpọ eluigwe na ala. Ọ ga-abụkwa ya ka Pọl na-ekwu ebe a ebe ọ bụ na ọ na-agbalị iji ihe ya na ndị Grik ọ na-agwa okwu kweere otu ihe na ya gwa ha okwu.

e Pọl kwuru ihe e dere n’otu uri a na-akpọ Phaenomena. Ọ bụ onye na-ede uri so ná ndị òtù Stoik aha ya bụ Aratus dere ya. E kwukwara ihe yiri ihe ahụ Pọl kwuru n’akwụkwọ ndị ọzọ ndị Grik dere, dị ka akwụkwọ a kpọrọ Hymn to Zeus (Abụ A Na-abụrụ Zus). Ọ bụ Klientis, onye so ná ndị òtù Stoik, dere ya.