Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 17

‘Ọ Nọ Na-enyere Ha Aka Ịghọta Akwụkwọ Nsọ’

‘Ọ Nọ Na-enyere Ha Aka Ịghọta Akwụkwọ Nsọ’

Ihe na-eme ka mmadụ na-akụzi ihe nke ọma na ihe anyị ga-amụta n’aka ndị Beria

O Si n’Ọrụ Ndịozi 17:1-15

1, 2. Olee ndị si Filipaị na-aga Tesalonaịka, gịnịkwa ka ha nwere ike ịna-eche?

 PỌL, Saịlas, na Timoti si Filipaị na-aga Tesalonaịka. Ha ga-aga ihe karịrị otu narị kilomita na iri atọ (130) tupu ha eruo, gafeekwa ugwu dị iche iche. Okporo ụzọ ha na-aga na ya bụ ụzọ ndị Rom rụrụ nke ọma. E nwekwara ọtụtụ ndị njem na-aga n’ụzọ ahụ, dị ka ndị agha, ndị ọrụ aka, na ndị ahịa. Ọ na-ekwo ekwo. Onye na-aga na ya ga na-anụ mkpọtụ ụkwụ ụgbọ ịnyịnya nakwa ubé jakị. Njem ahụ adịghị mfe. Ndị ọ kacha siere ike bụ Pọl na Saịlas n’ihi na ihe a pịara ha na Filipaị ka na-afụ ha ụfụ.​—Ọrụ 16:22, 23.

2 Gịnị nyeere ụmụ nwoke ahụ aka ka uche ha pụtụ n’ogologo njem ahụ? O doro anya na mkparịta ụka nyeere ha aka. Ha ka na-echeta ụdị obi ụtọ ha nwere na Filipaị mgbe onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ na ndị ezinụlọ ya chegharịrị. Ihe ahụ merenụ mere ka ụmụ nwoke ahụ kpebisikwuo ike ịnọgide na-ekwusa okwu Chineke. Ma, mgbe ha rutewere Tesalonaịka, bụ́ obodo dị n’akụkụ osimiri, o nwere ike ịbụ na ha nọ na-eche otú ndị Juu bi n’obodo ahụ ga-esi emeso ha. Hà ga-alụso ha ọgụ ma ọ bụdị pịa ha ihe, otú e mere ha na Filipaị?

3. Gịnị ka anyị ga-amụta n’otú Pọl si kata obi kwusaa ozi ọma?

3 Pọl mechara kwuo otú obi dị ya mgbe ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka. O kwuru, sị: “Unu ma na n’agbanyeghị na anyị bu ụzọ taa ahụhụ na Filipaị, a kparịakwa anyị, Chineke nyeere anyị aka, anyị akata obi zie unu ozi ọma Chineke n’agbanyeghị na a nọ na-akpagbu anyị nke ukwuu.” (1 Tesa. 2:2) Ihe a Pọl kwuru yiri ka ọ̀ na-egosi na obi akachaghị ya ịbanye n’obodo Tesalonaịka, karịchaa, n’ihi ihe e mere ha na Filipaị. Ị̀ ghọtara otú obi dị Pọl? È nwere mgbe ọ na-esiri gị ike ikwusa ozi ọma? Pọl tụkwasịrị Jehova obi ka o nyere ya aka, meekwa ka ọ kata obi. Ịmụ ihe Pọl mere ga-enyere gị aka ime ka ya.​—1 Kọr. 4:16.

‘Ọ Nọ Na-enyere Ha Aka Ịghọta Akwụkwọ Nsọ’ (Ọrụ 17:1-3)

4. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na Pọl nọfere izu atọ na Tesalonaịka?

4 Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gwara anyị na mgbe Pọl nọ na Tesalonaịka, o ziri ozi ọma n’ụlọ nzukọ ndị Juu ruo Ụbọchị Izu Ike atọ. Ọ̀ pụtara na ọ bụ naanị izu atọ ka ọ nọrọ n’obodo ahụ? Ọ bụghị ihe ọ pụtara. Anyị amaghị abalị ole Pọl nọrọ n’obodo ahụ tupu ya ebido ịga n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ihe ọzọ bụ na o kwuru n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Tesalonaịka na mgbe ya na ndị ibe ya nọ na Tesalonaịka, ha rụrụ ọrụ ego iji gbooro onwe ha mkpa ha. (1 Tesa. 2:9; 2 Tesa. 3:7, 8) N’oge ahụ Pọl nọ n’ebe ahụ, ụmụnna nọ na Filipaị zitekwaara ya onyinye ugboro abụọ. (Fil. 4:16) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ọ nọfere izu atọ na Tesalonaịka.

5. Olee otú Pọl si gbalịa ikwu ihe ga-eru ndị ọ na-agwa okwu n’obi?

5 Ebe ọ bụ na Pọl akatala obi, ọ gwara ndị zukọtara n’ụlọ nzukọ ahụ okwu. Dị ka ọ na-emekarị, ọ nọ “na-enyere ndị nọ ebe ahụ aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ ruo ụbọchị izu ike atọ. Ọ nọ na-akọwa Akwụkwọ Nsọ, jirikwa ihe e dere na ya na-egosi na Kraịst ga-atarịrị ahụhụ, nwụọ, ma si n’ọnwụ bilie. Ọ sịkwara: ‘Jizọs bụ Kraịst, onye m na-agwa unu gbasara ya.’” (Ọrụ 17:2, 3) Ị̀ chọpụtara na Pọl agwaghị ha ihe ga-atọ ha ụtọ ná ntị, kama ọ gwara ha ihe ga-eme ka ha chee echiche? Ọ ma na ndị na-abịa n’ụlọ nzukọ ahụ ma Akwụkwọ Nsọ, na-akwanyekwara Akwụkwọ Nsọ ùgwù. Ma, nsogbu ha bụ ịghọta Akwụkwọ Nsọ nke ọma. N’ihi ya, Pọl mere ka ha chebara ihe ha ma echiche, jirikwa Akwụkwọ Nsọ gosi ha na Jizọs onye Nazaret bụ Mezaya ma ọ bụ Kraịst ahụ e kwere ná nkwa.

6. Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ, oleekwa uru ọ baara ha?

6 Pọl mere ka Jizọs, bụ́ onye na-esi n’Akwụkwọ Nsọ akụzi ihe mgbe niile. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na Akwụkwọ Nsọ kwuru na Nwa nke mmadụ ga-ata ahụhụ, nwụọ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ. (Mat. 16:21) Mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilie, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya. O doro anya na naanị mpụta ọ pụtara n’ihu ha ga-eme ka o doo ha anya na ihe ọ gwara ha bụ eziokwu. Ma, Jizọs gwara ha ihe ndị ọzọ ga-eme ka obi sie ha ike. Baịbụl kwuru ihe ọ gwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ọ kọwaara ha ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ gbasara onwe ya, malite n’ihe Mosis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile.” Olee uru ọ baara ha? Ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Ka a sịkwa ihe mere okwu ya ji ruo anyị nnọọ n’obi mgbe ọ nọ na-agwa anyị okwu n’ụzọ, na-akọwakwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma.”​—Luk 24:13, 27, 32.

7. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-akụzi naanị ihe si n’Akwụkwọ Nsọ?

7 Okwu Chineke na-akpa ike. (Hib. 4:12) N’ihi ya, Ndị Kraịst taa na-akụzi naanị ihe si n’Okwu Chineke, otú ahụ Jizọs, Pọl, na ndịozi ndị ọzọ mere. Anyịnwa na-enyekwara ndị mmadụ aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ. Anyị na-akọwara ha ya ma na-egosi ha amaokwu ndị kwadoro ihe anyị na-akụzi. Ihe mere anyị ji eme otú ahụ bụ maka na ọ bụghị anyị nwe ozi anyị na-ezi ha. Anyị jiri Baịbụl na-ezi ndị mmadụ ozi ọma mgbe niile, ọ ga-eme ka ha ghọta na ihe anyị na-ekwu abụghị ihe anyị chere, kama ọ bụ ihe Chineke kwuru. Anyị kwesịkwara ịna-echeta na ozi anyị na-ezisa si n’Okwu Chineke. N’ihi ya, ọ bụ ozi a ga-atụkwasịli obi. Ihe a ọ́ naghị eme ka ị kata obi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ka Pọl?

“Ụfọdụ n’Ime Ha Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs” (Ọrụ 17:4-9)

8-10. (a) Olee ihe ndị bi na Tesalonaịka mere mgbe e ziri ha ozi ọma? (b) Gịnị mere ụfọdụ ndị Juu ji na-emere Pọl anyaụfụ? (ch) Gịnị ka ndị Juu na-emegide Ndị Kraịst mere?

8 Pọl achọpụtala na ihe Jizọs kwuru bụ eziokwu, ya bụ: “Ohu anaghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha mere ihe m kwuru, ha ga-emekwa ihe unu kwuru.” (Jọn 15:20) Ihe a Jizọs kwuru mere na Tesalonaịka mgbe Pọl zichara ndị mmadụ ozi ọma. Ụfọdụ ndị chọrọ ime ihe o kwuru, ma ndị ọzọ ekweghị eme ya. Luk dere banyere ndị nabatara ihe Pọl kwuru. Ọ sịrị: “Ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha na Pọl na Saịlas ana-anọkọ. Ìgwè ndị Grik na-atụ egwu Chineke na ọtụtụ ụmụ nwaanyị a ma ama mekwara otu ihe ahụ.” (Ọrụ 17:4) O doro anya na obi tọrọ ndị ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ezigbo ụtọ na e nyeere ha aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ.

9 Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nabatara ihe Pọl kụziri, ma e nwere ndị iwe juru obi. Ụfọdụ ndị Juu nọ na Tesalonaịka meere Pọl anyaụfụ n’ihi na “ìgwè ndị Grik” nabatara ozi ọma o ziri ha. Ndị Juu ahụ chọrọ ime ka ndị Grik ahụ soro ha kpewe okpukpe ndị Juu. Ha akụzierela ha Akwụkwọ Nsọ Hibru, werezie ha ka ndị na-eso ụzọ ha. Ma ugbu a, ọ dịzi ka Pọl ọ̀ bịara n’ụlọ nzukọ ndị Juu na-anara ha ndị Grik ahụ. Ihe a mere ka iwe ju ha obi.

“Ha gakwara . . . ka ha kpụrụ Pọl na Saịlas kpụnye ndị ahụ na-akpa aghara.”​—Ọrụ 17:5

10 Luk gwaziri anyị ihe merenụ. Ọ sịrị: “Iwe were ndị Juu, ha akpọkọta ụfọdụ ndị ọjọọ, ndị na-akwụgharị n’ọma ahịa, ha ekworo n’ìgwè, na-akpa aghara n’obodo ahụ niile. Ha gakwara n’ụlọ Jesin ka ha kpụrụ Pọl na Saịlas kpụnye ndị ahụ na-akpa aghara. Ma mgbe ha na-ahụghị ha, ha kpụụrụ Jesin na ụmụnna ụfọdụ gakwuru ndị na-achị obodo, sị: ‘Ndị a ọrụ ha bụ ịkpata ọgba aghara ebe niile abịala ebe a, Jesin nabatakwara ha. Ndị a niile na-emebi iwu Siza, na-ekwu na e nwere eze ọzọ a na-akpọ Jizọs.’” (Ọrụ 17:5-7) Gịnị ka Pọl na ndị ibe ya ga-eme n’ihi ìgwè mmadụ a bu ọgụ bịa?

11. Olee ebubo ndị e boro Pọl na ndị ibe ya, oleekwa iwu o nwere ike ịbụ ya ka ha na-ekwu na ha dara? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

11 Ìgwè mmadụ iwe ji na-akpatakarị nsogbu. Ha na-ekworo na-aga n’ike n’ike ka mmiri na-achị ọkụ. Ọ bụ ụdị ndị a ka ndị Juu kpọkọtara ka ha memilaara ha Pọl na Saịlas. Mgbe ha mechara ka ‘a kpawa aghara n’obodo ahụ niile,’ ha gbalịrị ime ka ndị na-achị obodo kweta na ebubo e boro Pọl na ndị ibe ya abụghị ihe a ga-eleghara anya. Ebubo nke mbụ bụ na “ọrụ ha bụ ịkpata ọgba aghara ebe niile,” n’agbanyeghị na ọ bụghị Pọl na ndị ibe ya kpatara ọgba aghara ahụ na Tesalonaịka. Ebubo nke abụọ kadị nke mbụ njọ. Ndị Juu kwuru na Pọl na ndị ibe ya na-ekwusa na e nwere Eze ọzọ bụ́ Jizọs, na ihe a ha na-eme bụ ịda iwu Siza. a

12. Gịnị gosiri na ebubo ndị e boro Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka gaara akpatara ha ezigbo nsogbu?

12 Ọ̀ kwa i chetara na ndị isi okpukpe bokwara Jizọs ụdị ebubo ahụ? Ha gwara Paịlet, sị: “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eme ka ndị obodo anyị na-emegide ndị ọchịchị. Ọ na-asịkwa . . . na ya bụ Kraịst, bụ́ eze.” (Luk 23:2) O nwere ike ịbụ na ihe mere Paịlet ji ma Jizọs ikpe ọnwụ bụ maka na ọ na-atụ ụjọ na Siza ga-eche na ọ na-akwado eze ọzọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ebubo ndị ahụ e boro Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka. Ọ gaara akpatara ha ezigbo nsogbu. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru, sị: “Ụdị nsogbu o tinyere ha abụghị ihe e ji ọnụ ekwu, n’ihi na ‘a na-egbukarị onye e boro ebubo na ọ na-agba ndị Eze Ukwu Rom mgba okpuru.’” Ihe ndị Juu ahụ bu n’obi ime Pọl na ndị ibe ya, ọ̀ gaziiri ha?

13, 14. (a) Gịnị mere ìgwè mmadụ ahụ iwe ji emelighị ka a kwụsị ikwusa ozi ọma? (b) Olee otú Pọl si gosi na ya dị akọ otú ahụ Jizọs kwuru, oleekwa otú anyị ga-esi eme ka ya?

13 Ìgwè mmadụ ahụ iwe ji emeghị ka a kwụsị ikwusa ozi ọma na Tesalonaịka. N’ihi gịnị? Ihe mbụ kpatara ya bụ na ha amaghị ebe Pọl na Saịlas nọ. Ihe ọzọ abụrụ na ọ dị ka obi akaghị ndị na-achị obodo ahụ na ebubo ndị ahụ e boro Pọl na ndị ibe ya bụ eziokwu. Mgbe ha natachara Jesin na ụmụnna ndị ọzọ a kpụtara n’ihu ha “ego ha kwụrụ iji gbapụta onwe ha,” ha hapụrụ ha ka ha lawa. (Ọrụ 17:8, 9) Pọl sooro ndụmọdụ Jizọs nyere, nke bụ́ “dịrịnụ akọ ka agwọ, bụrụkwanụ ndị na-adịghị aghụghọ otú ahụ nduru na-adịghị.” N’ihi ya, o ji akọ gbaara nsogbu ọsọ, ka o nwee ike kwusawa ozi ọma n’ebe ọzọ. (Mat. 10:16) O doro anya na obi ike Pọl nwere apụtaghị na o ji ndụ ya gwurie egwu. Olee otú Ndị Kraịst n’oge a ga-esi na-eme ka ya?

14 N’oge anyị a, e nweela ọtụtụ ugboro ndị ụkọchukwu mere ka ìgwè mmadụ iwe ji megidewe Ndịàmà Jehova. Ha na-agwa ndị ọchịchị na Ndịàmà Jehova na-ada iwu ha ma na-agba ha mgba okpuru. Ihe a na-emezi ka ndị ọchịchị nyewe Ndịàma Jehova nsogbu. Ọ bụ anyaụfụ mere e ji kpagbuo ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ndịozi, ọ bụkwa ya mere ọtụtụ ndị ji emegide Ndịàmà Jehova n’oge anyị a. Ma olee ihe ezigbo Ndị Kraịst na-eme ma a kpagbuwe ha? Anyị na-ezere nsogbu. Mgbe ọ bụla o kwere omume, anyị na-agbara ndị iwe ji ọsọ ebe ọ bụ na ha anaghị echezi echiche echezi. Anyị nwere ike ịlọghachi mgbe iwe ha dajụrụ n’ihi na anyị chọrọ ịnọgide na-arụ ọrụ anyị n’enweghị nsogbu.

Ha “Ka Ndị Bi na Tesalonaịka Achọ Ịmụta Ihe” (Ọrụ 17:10-15)

15. Olee ihe ndị Beria mere mgbe e ziri ha ozi ọma?

15 Iji chebe Pọl na Saịlas, ụmụnna zigara ha Beria. Isi Tesalonaịka ruo Beria dị ihe dị ka kilomita iri isii na ise. Mgbe ha ruru ebe ahụ, Pọl gara n’ụlọ nzukọ ndị Juu ma gwa ndị nọ ebe ahụ okwu. Obi dị ya ụtọ ịhụ ndị chọrọ ịnụ ozi ọma. Luk dere na ndị Juu bi na Beria “ka ndị bi na Tesalonaịka achọ ịmụta ihe, n’ihi na ha ji obi ha niile nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe a gwara ha ọ̀ bụ eziokwu.” (Ọrụ 17:10, 11) Ihe a o kwuru ọ̀ pụtara na ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na Tesalonaịka emeghị nke ọma? Mbanụ! Pọl mechara degara ha akwụkwọ ozi, sị: ‘Anyị na-ekele Chineke mgbe niile, n’ihi na mgbe unu nụrụ okwu Chineke nke anyị gwara unu, unu nabatara ya, ọ bụghị ka okwu ụmụ mmadụ, kama ka okwu Chineke. N’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke, ọ na-akpakwa ike n’ime unu ndị kwere ekwe.’ (1 Tesa. 2:13) Ma, gịnị mere e ji kwuo na ndị Beria ka ndị bi na Tesalonaịka achọ ịmụta ihe?

16. Gịnị mere o ji daba adaba ikwu na ndị Beria “ka ndị bi na Tesalonaịka achọ ịmụta ihe”?

16 N’agbanyeghị na ozi Pọl ziri ndị Beria bụ ozi ha na-anụtụbeghị, ha enweghị obi abụọ ma ọ bụ katọwa ya. Ma, ọ pụtaghị na ọ na-abụ ha nụ na ọ dị iri, ha achịrị wụnye n’akpa. Ihe mbụ ha mere bụ ige ntị nke ọma n’ihe Pọl chọrọ ikwu. Ha agazie n’Akwụkwọ Nsọ chọpụta ma ihe Pọl kụziiri ha ọ̀ bụ eziokwu. Ihe ọzọ bụ na ha mụsiri Okwu Chineke ike kwa ụbọchị, ọ bụghị naanị n’Ụbọchị Izu Ike. Ha ‘jikwa obi ha niile’ na-amụ ya, na-agba mbọ ka ha chọpụta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ihe ọhụrụ a Pọl kụziiri ha. Ha wedaziri onwe ha ala mee ihe ndị ha mụtara. Ọ bụ ya mere e ji kwuo na “ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” (Ọrụ 17:12) Ọ bụ ya mere Luk ji sị na ha “ka ndị bi na Tesalonaịka achọ ịmụta ihe.”

17. Gịnị mere ihe ndị Beria mere ji magbuo onwe ya, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ha ọ bụrụgodị na o teela anyị ghọrọ Ndị Kraịst?

17 Ndị Beria amaghị na a ga-ede otú ahụ ha si nabata ozi ọma n’Okwu Chineke ka anyịnwa nwee ike isi na ya mụta ihe. Ha mere kpọmkwem ihe Pọl nọ na-atụ anya ka ha mee, nakwa ihe Jehova Chineke chọrọ ka ha mee. Ọ bụkwa ihe anyị na-agba ndị mmadụ ume ka ha mee, ya bụ, ka ha nyochaa Baịbụl nke ọma, ka ihe ọ bụla ha ga-ekwere bụrụ ihe si n’Okwu Chineke. Ma, mgbe anyị ghọchara ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọ̀ pụtaziri na anyị ga-akwụsị ịchọ ịmụta ihe? Mba. Ọ bụdị mgbe ahụ ka ọ kacha mkpa ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-amụta ihe Jehova na-akụziri anyị ma na-eme ha n’egbughị oge. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị na-ekwe ka Jehova na-akpụzi anyị ma na-azụ anyị otú ọ chọrọ. (Aịza. 64:8) Anyị ga-esi otú ahụ na-abara Nna anyị nke eluigwe uru ma na-eme ihe dị ya mma.

18, 19. (a) Gịnị mere Pọl ji si na Beria pụọ, ma olee ihe ọ nọgidere na-eme nke anyị kwesịkwara ịna-eme taa? (b) Olee ndị ọzọ Pọl na-aga izi ozi ọma, n’ebeekwa?

18 Pọl anọteghị aka na Beria. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ndị Juu ndị si Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusakwa okwu Chineke na Beria, ha bịara ebe ahụ ka ha mee ka ndị mmadụ malite ịkpa aghara. Ụmụnna zipụrụ Pọl ozugbo ka ọ gawa n’akụkụ oké osimiri. Ma Saịlas na Timoti nọgidere ebe ahụ. Ma, ndị na-edupụ Pọl duuru ya ruo Atens. Mgbe Pọl gwachara ha ka ha gwa Saịlas na Timoti ka ha bịakwute ya ozugbo, ha lawara.” (Ọrụ 17:13-15) Ị̀ chọpụtara na ndị mmegide ahụ ekwebeghị ezu ike? Nchụpụ ha chụpụrụ Pọl na Tesalonaịka ezughịrị ha. Ha gakwara Beria, chọwa ime ka ndị mmadụ kpawakwa aghara n’ebe ahụ. Ma, mbọ ha kụrụ afọ n’ala. Pọl ma na ebe ọ ga-ekwusa ozi ọma buru ibu. N’ihi ya, ọ gawara ikwusa ozi ọma n’ebe ọzọ. Ka anyịnwa kpebisiekwa ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na e nwere ndị na-agbalị ime ka anyị kwụsị.

19 Mgbe Pọl gbachaara ndị Juu àmà nke ọma na Tesalonaịka nakwa na Beria, o doro anya na ọ mụtara na ịgba àmà n’atụghị egwu na inyere ndị mmadụ aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ bara ezigbo uru. Anyịnwa amụtakwala ya. Ma ugbu a, Pọl na-aga izi ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma, ya bụ, ndị Jentaịl bi n’Atens. Olee otú ozi ya ga-esi aga n’obodo ahụ? Anyị ga-achọpụta ya n’isiokwu na-eso nke a.

a Otu ọkà mmụta kwuru na Siza nyere iwu n’oge ahụ na e nweghị onye ọ bụla ga-ebu amụma na “a ga-enwe eze ọhụrụ ma ọ bụ alaeze ọhụrụ, karịchaa, ma ọ bụrụ na eze ahụ ma ọ bụ alaeze ahụ ga-anọchi Siza ma ọ bụ kpee ya ikpe.” O nwere ike ịbụ na ndị iro Pọl rọgharịrị ozi ọma o ziri, kwuo na ọ daala iwu. Gụọ igbe bụ́ “ Siza Ndị A Kpọrọ Aha n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi.”