ISI NKE 16
“Bịa na Masedonia Nyere Anyị Aka”
A gọziri ọtụtụ ndị maka na Pọl na ndị ibe ya nabatara ọrụ e nyere ha, jirikwa ọṅụ die mkpagbu
O Si n’Ọrụ Ndịozi 16:6-40
1-3. (a) Olee otú mmụọ nsọ si duo Pọl na ndị ya na ha so? (b) Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha?
E NWERE ụfọdụ ụmụ nwaanyị si n’obodo Filipaị nke dị na Masedonia na-apụta. Obere oge, ha rutere n’obere mmiri a na-akpọ osimiri Gangitis. Ha nọdụrụ ala n’akụkụ osimiri ahụ ka ha gwa Chineke Izrel okwu n’ekpere, otú ha na-emekarị. Jehova nọkwa na-ahụ ha.—2 Ihe 16:9; Ọma 65:2.
2 Ka ihe a na-eme, e nwere ụmụ nwoke si n’obodo Listra, nke dị n’ebe ndịda Galeshia, na-apụta. Ebe ha nọ dị ihe karịrị narị kilomita asatọ (800) ma e si ya gawa ebe ọwụwa anyanwụ Filipaị. Mgbe ụbọchị ole na ole gachara, ha rutere n’ezigbo okporo ụzọ ndị Rom rụrụ nke gawara ebe ọdịda anyanwụ, bụ́ ebe e si aga n’ebe ndị mmadụ kacha biri n’ógbè Eshia. Ụmụ nwoke ahụ bụ Pọl, Saịlas, na Timoti. Ha chọrọ isi n’ụzọ ahụ gaa Efesọs na obodo ndị ọzọ e nwere ọtụtụ puku mmadụ kwesịrị ịnụ banyere Kraịst. Ma, tupu ha agawa ebe ahụ, mmụọ nsọ gbochiri ha. Baịbụl ekwughịkwanụ otú o si gbochie ha. A gwara ha ka ha ghara ịga kwusaa ozi ọma n’Eshia. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jizọs chọrọ iji mmụọ nsọ Chineke duru Pọl na ndị ya na ha so si n’Eshia Maịnọ gafere Oké Osimiri Ejiyan, ka ha rute n’akụkụ obere mmiri ahụ a na-akpọ osimiri Gangitis.
3 Taa, e nwere ọtụtụ ihe bara uru anyị ga-amụta n’otú Jizọs si duru Pọl na ndị ya na ha so gaa Masedonia. N’ihi ya, ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ mere ná nke ugboro abụọ Pọl gara mba ọzọ ikwusa ozi ọma. Ọ malitere njem ahụ n’ihe dị ka afọ 49 O.N.K.
“Chineke Agwala Anyị Ka Anyị Kwusaara Ha Ozi Ọma” (Ọrụ 16:6-15)
4, 5. (a) Gịnị mere Pọl na ndị ya na ha so mgbe ha rutewere Bitinia? (b) Olee ihe ha kpebiri ime, oleekwa uru ọ baara ha?
4 Ebe ọ bụ na mmụọ nsọ gbochiri Pọl na ndị ya na ha so ịga kwusaa ozi ọma n’Eshia, ha gawaziri n’ebe ugwu ka ha kwusaa ozi ọma n’obodo ndị dị na Bitinia. Iji ruo Bitinia, ọ ga-abụ na ha ji ụkwụ gaa ije ọtụtụ ụbọchị n’okporo ụzọ ndị na-adịghị mma e nwere n’agbata ógbè Frijia na ógbè Galeshia, bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-ebighị. Ma mgbe ha rutewere Bitinia, Jizọs jikwa mmụọ nsọ gbochie ha ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ. (Ọrụ 16:6, 7) Ọ ga-abụrịrị na ihe a gbagwojuru ụmụ nwoke ahụ anya. Ha ma ihe ha ga-ezi ndị mmadụ n’ozi ọma nakwa otú ha ga-esi ezi ya, ma ha amaghị ebe ha ga-aga zie ya. E nwere ike ịsị na ha akụọla aka n’ọnụ ụzọ e si abanye Eshia, ma e kweghị ha banye, kụọkwa na nke e si abanye Bitinia, e kweghịkwa ha banye. N’agbanyeghị ya, Pọl kpebisiri ike na ya ga-anọgide na-akụ aka ruo mgbe e mepeere ha ụzọ. Ihe ụmụ nwoke a kpebiziri ime yiri ihe na-enweghị isi. Ha tinyere isi n’ebe ọdịda anyanwụ, jiri ụkwụ gaa narị kilomita ise na iri ise (550). Ha gafere ọtụtụ obodo ruo mgbe ha rutere n’ọdụ ụgbọ mmiri Troas, bụ́ ebe ha ga-esi banye Masedonia. (Ọrụ 16:8) N’ebe a, Pọl kụrụ aka n’ọnụ ụzọ nke ugboro atọ, e mepeziere ya ụzọ.
5 Luk, onye dere Ozi Ọma Luk, gakwuuru Pọl na ndị ya na ha so na Troas. Ọ kọziri ihe merenụ. Ọ sịrị: “N’abalị, Pọl hụrụ ọhụụ. Ọ hụrụ otu nwoke Masedonia guzo na-arịọ ya, sị: ‘Bịa na Masedonia nyere anyị aka.’ Ozugbo ọ hụrụ ọhụụ a, anyị gbalịrị ịbanye Masedonia, n’ihi na anyị matara na Chineke agwala anyị ka anyị kwusaara ha ozi ọma.” a (Ọrụ 16:9, 10) Pọl emechaala mata ebe ha ga-aga kwusaa ozi ọma. Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Pọl ụtọ na ike agwụghị ya ịchọ ndị ọ ga-ekwusara ozi ọma. Ha anọ banyere ụgbọ mmiri ozugbo gawa Masedonia.
6, 7. (a) Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe mere mgbe Pọl na-eje ozi ya? (b) Gịnị mere akụkọ ihe mere Pọl ji agba anyị ume?
6 Gịnị ka anyị ga-amụta n’akụkọ a? Cheta na ọ bụ naanị mgbe Pọl chọwara ịga Eshia ka mmụọ nsọ Chineke gbochiri ya ịga. Ọ bụkwa naanị mgbe o rutewere Bitinia ka Jizọs gbochiri ya ịga. Ọ bụkwa naanị mgbe Pọl rutere Troas ka Jizọs gwara ya gawa Masedonia. Jizọs, Onyeisi ọgbakọ, nwekwara ike ime anyị ụdị ihe ahụ taa. (Kọl. 1:18) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ dịtụla anya anyị chewere echiche ịbụ ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa Alaeze. Ma, o nwere ike ịbụ naanị mgbe anyị merela ihe ndị a hụrụ anya iji mezuo ihe anyị bu n’obi ime ka Jizọs ga-eji mmụọ nsọ Chineke duzie anyị. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Chebagodịrị ihe atụ a echiche: Ọkwọ ụgbọala nwere ike ịkwọrọ ụgbọala ya gaa aka nri ma ọ bụ aka ekpe. Ma, naanị mgbe ọ ga-emeli ya bụ mgbe ụgbọala ahụ na-agba agba. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ozi anyị. Jizọs ga-eduzi anyị ka anyị na-emekwu nke ọma n’ozi anyị naanị ma ọ bụrụ na anyị na-agbasi mbọ ike n’ozi anyị.
7 Ma gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na mbọ anyị gbara arụpụtaghị ihe ozugbo? Ike ò kwesịrị ịgwụ anyị, anyị echee na mmụọ nsọ Chineke anaghị eduzi anyị? Mba. Cheta na mbọ Pọl gbara arụpụtaghị ihe ngwa ngwa. Ma, ọ kwụsịghị ịgba mbọ ka ọ chọta ebe ọ ga-ezi ozi ọma ruo mgbe ọ chọtara ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụrụ na anyị atachie obi ka anyị na-achọ “nnukwu ohere ịrụ ọrụ Onyenwe anyị,” Jehova ga-agọzi mbọ anyị.—1 Kọr. 16:9.
8. (a) Kọọ otú Filipaị dị. (b) Olee ihe na-eme obi ụtọ merenụ mgbe Pọl kwusara ozi ọma ‘n’ebe a na-ekpe ekpere’?
8 Mgbe Pọl na ndị ya na ha so rutere Masedonia, ha gawara Filipaị. Isi na-ebu ndị bi na Filipaị maka na ha bụ ụmụ amaala Rom. Ọ na-adị ndị agha Rom lara ezumike nká bi na Filipaị ka hà nọ n’Ịtali dị na Rom n’ihi otú ihe ndị dị na Filipaị si yie ihe ndị dị na Rom. N’ihu ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, n’akụkụ otu obere osimiri, Pọl na ndị ya na ha so hụrụ otu ebe ha chere na ọ bụ “ebe a na-ekpe ekpere.” b N’Ụbọchị Izu Ike, ha gawara ebe ahụ ma hụ ka ọtụtụ ụmụ nwaanyị zukọrọ ebe ahụ ife Chineke. Pọl na ndị ya na ha so nọdụrụ ala ma gwa ha okwu Chineke. Otu nwaanyị aha ya bụ Lidia “nọkwa na-ege ntị.” “Jehova wee meghee obi ya.” Ihe Lidia mụtara n’aka Pọl na ndị ibe ya ruru ya n’obi nke na ya na ndị ezinụlọ ya mere baptizim. Lidia rịọziri ha ka ha bịa nọrọ n’ụlọ ya, ha agaa. c—Ọrụ 16:13-15.
9. Olee otú ọtụtụ ndị taa sirila mee ka Pọl, oleekwa otú Jehova sirila gọzie ha?
9 Chegodị otú obi si tọọ Pọl na ndị ibe ya ụtọ mgbe e mere Lidia baptizim. Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ Pọl ezigbo ụtọ maka na o kwetara ‘ịbịa na Masedonia’ nakwa maka na Jehova kpebiri iji ya na ndị ibe ya zaa ụmụ nwaanyị ahụ na-atụ egwu Chineke ekpere. Taa, ọtụtụ ụmụnna anyị, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, ma ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ndị na-alụghị, na-akwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa Alaeze. Ọ bụ eziokwu na ihe na-esitụrụ ha ike, ma e nweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ụdị obi ụtọ ha na-enwe ma ha nweta ndị dị ka Lidia, ndị na-anabata eziokwu Baịbụl. Ì nwere ike ịgbanwe ihe ụfọdụ ka i nwee ike ‘ịga’ n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa Alaeze? I mee otú ahụ, Jehova ga-agọzi gị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwoke aha ya bụ Aaron kwagara n’otu obodo dị n’Ebe Ndịda Kọntinent Nọt Amerịka mgbe ọ bụ okorobịa. O kwuru ihe ọtụtụ ndị jerela ozi ná mba ọzọ kwurula. Ọ sịrị: “Ije ozi ná mba ọzọ enyerela m aka imekwu nke ọma n’ọgbakọ na ịbịarukwu Jehova nso. Ịga ozi ọma n’ebe a na-atọ m ụtọ, m na-amụkwara mmadụ asatọ Baịbụl.”
“Mmadụ Niile Nọ Ebe Ahụ Wee Jiri Iwe Gwa Ha Okwu” (Ọrụ 16:16-24)
10. Olee ihe ndị mmụọ ọjọọ mere iji kpatara Pọl na ndị ibe ya nsogbu?
10 N’eziokwu, iwe juru Setan obi mgbe ọ hụrụ na ozi ọma agbanyela mgbọrọgwụ n’ebe a na-enwebeghị onye mara ya na ndị mmụọ ọjọọ ya aka. N’ihi ya, o jughị anyị anya na ndị mmụọ ọjọọ so kpatara Pọl na ndị ibe ya nsogbu. Mgbe ha nọ na-aga ebe ahụ a na-ekpe ekpere, ha hụrụ otu nwa agbọghọ mmụọ ọjọọ ji, onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. O ji ihe a ọ na-akọ na-enwetara ndị nna ya ukwu ezigbo ego. Ọ nọ na-esogharị Pọl na ndị ibe ya, na-eti mkpu, sị: “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye Kacha Elu. Ha na-ekwusara unu otú a ga-esi zọpụta unu.” O nwere ike ịbụ mmụọ ọjọọ ahụ mere ka nwa agbọghọ ahụ kwuo ihe a ka o yie ka ihe ndị ahụ ọ na-akọ ga-eme n’ọdịnihu nakwa ihe Pọl na-akụzi hà si otu ebe. O nweziri ike ime ka ndị mmadụ ghara ige ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst ntị. Ma Pọl chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, si otú ahụ mee ka nwa agbọghọ ahụ kwụsị ikwu ihe ndị ahụ ọ na-ekwu.—Ọrụ 16:16-18.
11. Gịnị mere Pọl na Saịlas mgbe ha chụpụchara mmụọ ọjọọ ji nwa agbọghọ ahụ?
11 Mgbe ndị nna ukwu nwa agbọghọ ahụ hụrụ na ụzọ ha si enweta ego ngwa ngwa emechiela, iwe juru ha obi. Ha dọkpụụrụ Pọl na Saịlas banye n’ọma ahịa, bụ́ ebe ndị isi obodo, ndị na-anọchite anya Rom, na-anọ ekpe ikpe. Ndị nna ukwu nwa agbọghọ ahụ ma na ndị ikpe ahụ kpọrọ ndị Juu asị, marakwa na isi na-ebu ha maka na ha bụ ndị Rom. N’ihi ya, ha gwara ndị ikpe ahụ na ‘ndị Juu a na-akpata nsogbu n’obodo ha n’ihi na ha na-akụzi omenala ndị hanwa bụ́ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata.’ Ihe ahụ ha kwuru kpatara nsogbu ozugbo. “Mmadụ niile nọ [n’ọma ahịa] wee jiri iwe gwa ha [ya bụ, Pọl na Saịlas] okwu.” Ndị isi obodo nyekwara iwu “ka a pịa ha ụtarị.” Mgbe a pịachara Pọl na Saịlas ihe, a kpụụrụ ha gaa n’ụlọ mkpọrọ. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ tụbara ụmụ nwoke ahụ e merụchara ahụ́ n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ime ma tụọ ha ọtọsị n’ụkwụ. (Ọrụ 16:19-24) Mgbe onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ mechiri ụzọ, o doro anya na ụdị ọchịchịrị gbara n’ụlọ mkpọrọ ahụ mere ka o siere Pọl na Saịlas ike ịhụ ibe ha. Ma, Jehova nọ na-ahụ ha.—Ọma 139:12.
12. (a) Olee otú ndị na-eso ụzọ Kraịst si lee mkpagbu anya, gịnịkwa mere ha ji lee ya anya otú ahụ? (b) Olee otú Setan na ndị o ji kwara ngwá ọrụ si emegide ndị na-eso ụzọ Kraịst n’oge anyị a?
12 Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ha ga-akpagbu unu.’ (Jọn 15:20) N’ihi ya, mgbe Pọl na ndị ibe ya gara Masedonia, ha ma na a ga-akpagbu ha. Mgbe a malitere ịkpagbu ha, ha ma na ọ pụtaghị na Jehova na-ewesa ha iwe, kama ọ na-egosi na iwe na-ewe Setan. Taa, ndị Setan ji kwara ngwá ọrụ ka na-akpagbu Ndị Kraịst otú ahụ e si kpagbuo Pọl na Saịlas n’obodo Filipaị. Ndị na-emegide anyị na-eji aghụghọ ekwu ihe na-abụghị eziokwu banyere anyị n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe anyị na-arụ ọrụ, si otú ahụ na-eme ka a na-emegide anyị. Ná mba ụfọdụ, ndị okpukpe na-ebo anyị ebubo n’ụlọikpe. Ha na-ekwu na ‘Ndịàmà Jehova na-akpata nsogbu n’obodo ha n’ihi na ha na-akụzi omenala hanwa bụ́ ndị obodo na-enweghị ike ịnabata.’ N’ebe ụfọdụ, a na-akụ ụmụnna anyị ihe ma tụọ ha mkpọrọ. Ma, Jehova na-ahụ ihe na-emenụ.—1 Pita 3:12.
‘E Mere Ha Baptizim n’Egbughị Oge’ (Ọrụ 16:25-34)
13. Gịnị mere onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ ji jụọ, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”
13 O doro anya na Pọl na Saịlas kwesịrị inwetatụ onwe ha n’ihi ihe ọjọọ merenụ n’ụbọchị ahụ. Ma n’etiti abalị, ha enwetatụla onwe ha nke na ha “nọ na-ekpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke.” Ala ọma jijiji meziri n’ụlọ mkpọrọ ahụ na mberede. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ tetara, hụ na ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ meghechara emeghe, ya echee na ndị mkpọrọ ahụ agbaala ọsọ. Ebe ọ ma na a ga-ata ya ahụhụ maka ikwe ka ha gbapụ, “ọ mịịrị mma agha ya ma chọọ igbu onwe ya.” Ma Pọl tiri mkpu, sị: “Emerụla onwe gị ahụ́, n’ihi na anyị niile nọ ebe a!” Onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ obi kooro n’elu jụrụ, sị: “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” Pọl na Saịlas agaghị azọpụtali ya, naanị Jizọs ga-emeli ya. N’ihi ya, ha gwara ya, sị: “Kwere n’Onyenwe anyị Jizọs, a ga-azọpụta gị.”—Ọrụ 16:25-31.
14. (a) Olee otú Pọl na Saịlas si nyere onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ aka? (b) Olee otú Chineke si gọzie Pọl na Saịlas maka na ha ji ọṅụ die mkpagbu?
14 Ajụjụ onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ jụrụ ò si ya n’obi? Pọl enweghị obi abụọ ma ajụjụ ahụ ò si ya n’obi. Onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ bụ onye Jentaịl. N’ihi ya, ọ maghị Akwụkwọ Nsọ. Tupu ya enwee ike ịghọ Onye Kraịst, o kwesịrị ịmụta ihe ndị bụ́ isi Akwụkwọ Nsọ na-akụzi ma kwere na ha. N’ihi ya, Pọl na Saịlas wepụtara oge gwa ya “okwu Jehova.” Ọ ga-abụ na mgbe ha nọ na-akụziri ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ha chefuru ụfụ ihe a pịara ha na-afụ ha. Ma, onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ hụrụ ebe ụtarị a pịara ha n’azụ merụchara ha ahụ́, ya asaa ha ọnyá ndị ahụ. E meziri ‘ya na ndị ezinụlọ ya baptizim n’egbughị oge.’ Chineke si otú a gọzie Pọl na Saịlas maka iji ọṅụ die mkpagbu.—Ọrụ 16:32-34.
15. (a) Olee otú ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’oge a sirila mee ka Pọl na Saịlas? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agaghachi ugboro ugboro na nke ndị bi n’ókèala anyị?
15 N’oge anyị a, ọtụtụ Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha anọrọla n’ụlọ mkpọrọ kwusaa ozi ọma otú Pọl na Saịlas mere. Jehova agọziekwala mbọ ha gbara. Dị ka ihe atụ, n’otu mba a machiri ọrụ anyị iwu, e nwere mgbe ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ n’ụlọ mkpọrọ ka ọkara Ndịàmà Jehova niile bi ná mba ahụ nọ mụta banyere Jehova. (Aịza. 54:17) Cheta na ọ bụ naanị mgbe ala ọma jijiji mechara ka onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ rịọrọ ka e nyere ya aka. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ụfọdụ ndị na-egetụbeghị ntị n’ozi Alaeze nwere ike ige ntị naanị mgbe nsogbu bịachaara ha. Ọ bụrụ na anyị ana-agaghachi ugboro ugboro na nke ndị bi n’ókèala anyị, anyị ga-egosi na anyị dị njikere inyere ha aka mgbe ha chọrọ enyemaka.
“Hà Na-achụpụzi Anyị na Nzuzo?” (Ọrụ 16:35-40)
16. Olee otú egwú si dagharịa n’ụbọchị sotere ụbọchị a pịara Pọl na Saịlas ihe?
16 N’ụtụtụ ụbọchị sotere ụbọchị a pịara Pọl na Saịlas ihe, ndị isi obodo nyere iwu ka a hapụ ha. Ma Pọl sịrị ha: “Ha pịara anyị ihe n’ihu ọha n’amaghị anyị ikpe, n’agbanyeghị na anyị bụ ndị Rom. Ha tụbakwara anyị n’ụlọ mkpọrọ. Hà na-achụpụzi anyị na nzuzo? Mbanụ! Ha bịa n’onwe ha kpọpụta anyị.” Mgbe ndị isi obodo nụrụ na Pọl na Saịlas bụ ndị Rom, “ụjọ tụwara ha” n’ihi na ha emeela Pọl na Saịlas ihe a na-ekwesịghị ime ụmụ amaala Rom. d Egwú dagharịziri. Ebe ọ bụ na a pịara ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs ihe n’ihu ọha, ndị isi obodo kwesịkwara ịrịọ ha arịrịọ n’ihu ọha. Ha rịọziri Pọl na Saịlas ka ha si na Filipaị pụọ. Ha abụọ kwetara, ma ha bu ụzọ gbaa ndị ọhụrụ niile ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ume. Ọ bụzi mgbe ahụ ka ha si n’obodo ahụ pụọ.
17. Olee ihe dị mkpa ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ mụtara mgbe ha hụrụ otú Pọl na Saịlas si tachie obi?
17 A sị na Pọl na Saịlas kwuru na ha bụ ụmụ amaala Rom, e nwere ike a garaghị apịa ha ihe. (Ọrụ 22:25, 26) Ma, ọ gaara eme ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Filipaị chewe na Pọl na Saịlas achọghị ịta ahụhụ maka Kraịst n’ihi na ha bụ ụmụ amaala Rom. Ọ̀ bụ na ọ garaghị akpa okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-abụghị ụmụ amaala Rom aka ọjọọ ebe ọ bụ na iwu ndị Rom agaghị eme ka a ghara ịpịa hanwa ihe? N’ihi ya, otú ahụ Pọl na Saịlas si die ahụhụ a tara ha gosiri ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ na ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-atachili obi mgbe a na-akpagbu ha. Ihe ọzọ bụ na otú ahụ Pọl na Saịlas si mechaa mee ka a mata na ha bụ ụmụ amaala Rom mere ka o doo ọhaneze anya na ndị isi obodo ahụ dara iwu. O nweziri ike ime ka ha ghara ịkpagbu ụmụnna Pọl ndị ọzọ, meekwa ka a ghara ịta ha ahụhụ n’ọdịnihu n’ihi na iwu akwadoghị ya.
18. (a) Olee otú ndị okenye taa si eme ka Pọl? (b) Olee otú anyị si ‘agbachitere ozi ọma, jirikwa ihe iwu kwuru na-akwado izisa ozi ọma’ n’oge anyị a?
18 N’ọgbakọ Ndị Kraịst taa, ndị okenye anaghị eme soro okwu ọnụ m esola omume m. Ha na-adị njikere ime ihe ọ bụla ha chọrọ ka ụmụnna ha mee. Dị ka Pọl, anyị na-elezi anya ka anyị mara otú anyị ga-esi eji ihe iwu kwuru eme ka a ghara inye anyị nsogbu nakwa mgbe anyị kwesịrị iji ya. Mgbe ọ bụla ọ dị mkpa, anyị na-agba akwụkwọ n’ụlọikpe ndị dị n’obodo anyị nakwa ndị dị ná mba ọzọ ka e nye anyị ikike ga-eme ka ndị mmadụ ghara inye anyị nsogbu mgbe anyị na-efe Jehova. Ihe mere anyị ji eme ya abụghị ka anyị gbanwee ihe n’obodo, kama ọ bụ ka anyị ‘gbachitere ozi ọma, jirikwa ihe iwu kwuru kwado izisa ozi ọma,’ otú Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ dị na Filipaị ihe dị ka afọ iri a kpọchichara ya n’ụlọ mkpọrọ n’ebe ahụ. (Fil. 1:7) N’agbanyeghị ihe ụlọikpe kpebiri n’ikpe ndị ahụ, anyị kpebisiri ike ime ihe Pọl na ndị ibe ya mere, ya bụ, ‘ikwusa ozi ọma’ n’ebe ọ bụla mmụọ nsọ Chineke ga-eduga anyị.—Ọrụ 16:10.
a Gụọ igbe bụ́ “ Luk, Onye Dere Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi.”
b Ọ ga-abụ na e kweghị ka ndị Juu nwee ụlọ nzukọ na Filipaị n’ihi ọtụtụ ndị agha lara ezumike nká bi na ya. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ụmụ nwoke bụ́ ndị Juu bi na ya erughị iri. Obodo ọ bụla na-enwerughị ụmụ nwoke iri bụ́ ndị Juu agaghị enwe ụlọ nzukọ ndị Juu.
c Gụọ igbe bụ́ “ Lidia Na-ere Ákwà Na-acha Pọpụl.”
d Iwu ndị Rom kwuru na e kwesịrị ikpe onye ọ bụla bụ́ nwa amaala Rom ikpe n’ụlọikpe nakwa na e kwesịghị ịta ya ahụhụ n’ihu ọha ma ọ bụrụ na a maghị ya ikpe.