Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 14

“Anyị Ji Otu Olu Kwekọrịta”

“Anyị Ji Otu Olu Kwekọrịta”

Otú òtù na-achị isi si mee mkpebi na otú mkpebi ahụ si mee ka ọgbakọ niile dịrị n’otu

O Si n’Ọrụ Ndịozi 15:13-35

1, 2. (a) Olee ajụjụ ndị dị mkpa òtù na-achị isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ kwesịrị ilebara anya? (b) Olee ihe nyeere ụmụnna ndị ahụ aka ime mkpebi dị mma?

 NDỊOZI na ndị okenye zukọrọ n’otu ọnụ ụlọ dị na Jeruselem. Ha niile nọ na-atụ anya ihe a ga-ekpebi ná nzukọ a. Ha lere ibe ha anya, mata na oge eruola ka ha kpebie ihe a ga-eme. Okwu banyere ibi úgwù emeela ka e nwee ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa e kwesịrị ịza. Ndị Kraịst hà kwesịrị idebe Iwu Mosis? È kwesịrị ịkpa ókè n’etiti ụmụnna ndị Juu na ụmụnna ndị Jentaịl?

2 Ụmụ nwoke ahụ na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst elebala anya n’ọtụtụ ihe a chọpụtara. Ha ekwuola gbasara amụma Jehova buru n’Okwu ya, lebakwa anya n’akaebe doro anya ndị mmadụ gbara, ndị gosiri na Jehova anabatala ndị Jentaịl. Ha niile ekwuola otú obi dị ha. A gbaakwala ọtụtụ akaebe n’okwu a. O doola ha anya na mmụọ Jehova na-eduzi ha. Hà ga-ekwe soro nduzi ahụ?

3. Olee uru anyị ga-erite ma anyị leba anya n’ihe a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi isi 15?

3 Ọ bụ inwe ezigbo okwukwe na obi ike ga-eme ka ha soro nduzi mmụọ nsọ n’okwu a. Ihe ha ga-ekpebi nwere ike ime ka ndị ndú okpukpe ndị Juu kpọkwuo ha asị. E nwere ike ụmụ nwoke ụfọdụ nọ n’ọgbakọ agaghị anabata ihe ha ga-ekpebi maka na ha chọrọ ime ka ndị Chineke na-eso Iwu Mosis. Gịnị ka òtù na-achị isi ga-eme? Ka anyị chọpụta. Anyị ga-amatakwa otú ha si mee ihe Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eme n’oge a. Ọ bụkwa ihe anyịnwa bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme mgbe ọ bụla anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme nakwa mgbe nsogbu bịaara anyị.

“Ihe A O Kwuru Dabara n’Ihe Ndị Amụma Dere” (Ọrụ 15:13-21)

4, 5. Olee amụma e buru n’Akwụkwọ Nsọ nke Jems kwuru gbasara ya?

4 Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, onye nne ji ya na ya, kwuru okwu. a Ọ dị ka ọ̀ bụ ya bụ onyeisi oche ná nzukọ a. Ọ ga-abụ na ihe o kwuru chịkọtara ihe òtù na-achị isi kpebiri n’okwu a. Jems gwara ndị ahụ zukọrọ n’ebe ahụ, sị: “Simiọn akọọrọla anyị nke ọma otú Chineke si cheta ndị mba ọzọ, malitezie isi n’ime ha na-ahọrọ ndị ga-aza aha ya. Ihe a o kwuru dabara n’ihe ndị amụma dere.”​—Ọrụ 15:14, 15.

5 Ọ ga-abụ na ihe Simiọn, ma ọ bụ Saịmọn Pita, kwuru, nakwa akaebe Banabas na Pọl gbara mere ka Jems cheta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị mere ka okwu ahụ ha na-eleba anya dokwuo anya. (Jọn 14:26) Mgbe Jems kwuchara na ihe Pita “kwuru dabara n’ihe ndị amụma dere,” o kwuziri ihe e dere n’Emọs 9:11, 12. Akwụkwọ Emọs so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị a na-akpọkarị “akwụkwọ Ndị Amụma.” (Mat. 22:40; Ọrụ 15:16-18) Ị ga-achọpụta na ihe Jems kwuru dịtụ iche n’ihe e dere n’akwụkwọ Emọs n’oge anyị a. O nwere ike ịbụ na Jems gụtara ihe o kwuru na Septuagint, ya bụ, Akwụkwọ Nsọ Hibru a sụgharịrị n’asụsụ Grik.

6. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si mee ka a ghọta ihe bụ́ uche Chineke n’okwu a?

6 Jehova si n’ọnụ Emọs onye amụma buo amụma na oge na-abịa mgbe ọ ga-ebulite “ụlọ ndò Devid,” ya bụ, agbụrụ ndị eze a ga-esi enweta Alaeze Mezaya. (Ezik. 21:26, 27) Jehova ọ̀ ga-eme ka ya na naanị mba Izrel mekọọ ihe ọzọ? Mba. Amụma ahụ kwukwara na a ga-achịkọta “ndị mba ọzọ niile” ka ha ‘na-aza aha Chineke.’ Cheta na ọ dịbeghị anya Pita gbara akaebe na ọ bụ ‘otú Chineke si were anyị [ya bụ, ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst] ka o sikwa were ha [ya bụ, ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst], n’ihi na o mere ka obi ha dị ọcha maka na ha nwere okwukwe.’ (Ọrụ 15:9) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ uche Chineke ka ndị Juu na ndị Jentaịl soro Kraịst keta Alaeze ya. (Rom 8:17; Efe. 2:17-19) O nweghị ebe amụma ahụ kwuru na a ga-ebu ụzọ bie ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst úgwù ma ọ bụkwanụ na ha ga-ebu ụzọ kpewe okpukpe ndị Juu tupu ha eketa Alaeze ahụ.

7, 8. (a) Gịnị ka Jems tụrụ aro ka e mee? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ihe Jems kwuru?

7 Ihe àmà ndị ahụ si n’Akwụkwọ Nsọ nakwa akaebe a na-agaghị agbagha agbagha Jems nụrụ mere ka ọ tụọ aro, sị: “N’ihi ya, uche m bụ ka a ghara inye ndị mba ọzọ chọrọ ife Chineke nsogbu. Kama ka e degara ha akwụkwọ ka ha jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị, ghara ịkwa iko, ghara iri anụ a nyagburu anyagbu, gharakwa iri ọbara. N’ihi na kemgbe oge ochie, e nwere ndị na-ekwusa banyere Mosis n’obodo dị iche iche, n’ihi na e nwere ndị na-agụpụta ihe ndị o dere n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike.”​—Ọrụ 15:19-21.

8 Mgbe Jems kwuru, sị, “n’ihi ya, uche m bụ,” ọ̀ na-amanye ụmụnna ya ndị ọzọ ime ihe o chere maka na ọ ga-abụ ya bụ onyeisi oche nzukọ ahụ, jirizie aka ya na-ekpebi ihe a ga-eme? Mbanụ! Okwu Grik a sụgharịrị “uche m bụ” nwekwara ike ịpụta “aro m na-atụ bụ.” Jems ekpebirighị ha ihe a ga-eme, kama akaebe a gbarala n’okwu ahụ nakwa ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ya mere ka ọ tụọ aro ihe e nwere ike ime.

9. Olee uru aro Jems tụrụ bara?

9 Aro Jems tụrụ ọ̀ dị mma? O doro anya na ọ dị, n’ihi na ndịozi na ndị okenye ahụ mechara nabata ya. Olee uru aro ahụ bara? Otu uru ọ bara bụ na isoro ya agaghị ‘enye ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst nsogbu’ ma ọ bụ mee ka ihe siere ha ike n’ihi na ọ gaghịzi adị mkpa ka ha na-edebe Iwu Mosis. (Ọrụ 15:19) Uru ọzọ ọ bara bụ na o gosiri na ha kwanyeere akọnuche ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ùgwù, bụ́ ndị nụrụla ka a “na-agụpụta ihe ndị [Mosis] dere n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike” kemgbe ọtụtụ afọ. b (Ọrụ 15:21) N’eziokwu, aro ahụ Jems tụrụ ga-eme ka ụmụnna ndị Juu na ụmụnna ndị Jentaịl dịkwuo ná mma. Nke kachanụ bụ na ọ ga-eme Jehova Chineke obi ụtọ ebe ọ bụ na ọ dabara n’uche ya. Otú a e si dozie nsogbu chọrọ itisa udo na ịdị n’otu e nwere n’ọgbakọ ndị Chineke magburu onwe ya. Ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge a kwesịkwara ịmụta ihe na ya.

Ebe Albert Schroeder na-ekwu okwu ná mgbakọ mba niile e nwere n’afọ 1998

10. Olee otú Òtù Na-achị Isi nke oge a si eme ihe òtù na-achị isi nke oge mbụ mere?

10 Dị ka e kwuru n’Isi nke 13, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova n’oge a na-eme ihe òtù na-achị isi e nwere n’oge ndịozi mere. Ha na-ekwe ka Jehova, bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ụwa, na Jizọs Kraịst, bụ́ Onyeisi ọgbakọ, na-eduzi ha n’ihe niile ha na-eme. c (1 Kọr. 11:3) Olee otú ha si eme ya? Albert D. Schroeder, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi malite n’afọ 1974 ruo mgbe o jechara ozi ya n’ụwa na Mach 2006, kwuru, sị: “Òtù Na-achị Isi na-enwe nzukọ n’ụbọchị Wenezdee ọ bụla. Ha na-eji ekpere amalite nzukọ ha ma rịọ Jehova ka o jiri mmụọ nsọ ya duzie ha. Ha na-agbalịsikwa ike ka ihe ọ bụla ha lebara anya na ya nakwa ihe ọ bụla ha kpebiri daba n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl.” Milton G. Henschel, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi ruo ogologo oge ma jechaa ozi ya n’ụwa na Mach 2003, jụrụ ụmụ akwụkwọ Gilied nọ na klas nke otu narị na otu (101) ajụjụ dị ezigbo mkpa, sị: “È nwere nzukọ ọzọ dị n’ụwa nke ndị na-elekọta ya na-eleba anya n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, tupu ha ekpebie ihe dị mkpa ha chọrọ ikpebi?” Azịza ya doro anya.

“Họpụta Ụmụ Nwoke Abụọ n’Ime Ha ma Ziga Ha” (Ọrụ 15:22-29)

11. Olee otú òtù na-achị isi si gwa ọgbakọ niile ihe ha kpebiri?

11 Òtù na-achị isi nọ na Jeruselem ji otu obi kpebie ihe a ga-eme banyere ibi úgwù. Ma, iji nyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ niile aka ime ihe ahụ e kpebiri, e kwesịrị ịgwa ha ya otú ọ ga-edo ha anya ma gbaa ha ume. Olee otú kacha mma a ga-esi eme ya? Baịbụl kwuru, sị: “Ndịozi na ndị okenye nakwa ndị niile nọ n’ọgbakọ wee kpebie ka ha họpụta ụmụ nwoke abụọ n’ime ha ma ziga ha na Pọl na Banabas Antiọk. Ha wee ziga Judas onye a na-akpọ Basabas nakwa Saịlas, ndị na-arụrụ ụmụnna ha ezigbo ọrụ n’ọgbakọ.” Ha dekwara akwụkwọ ozi ma nye ya ụmụ nwoke ahụ ka a gụọ ya n’ọgbakọ niile dị n’Antiọk, Siria, na Silishia.​—Ọrụ 15:22-26.

12, 13. (a) Olee uru nzipụ e zipụrụ Judas na Saịlas bara? (b) Oleekwa uru akwụkwọ ozi òtù na-achị isi dere bara?

12 Judas na Saịlas ruru eru ịnọchite anya òtù na-achị isi ebe ha “na-arụrụ ụmụnna ha ezigbo ọrụ n’ọgbakọ.” Ụmụ nwoke anọ ahụ e zipụrụ ga-eme ka o doo anya na ozi ha ji bịa abụghị naanị ihe òtù na-achị isi zara n’ajụjụ ha jụrụ, kama na ọ bụkwa ntụziaka ọhụrụ òtù na-achị isi nyere. ‘Ụmụ nwoke ahụ a họpụtara’ ga-eme ka ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi na Jeruselem na ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst bi n’ebe ndị ọzọ dị n’ezigbo mma. N’eziokwu, nzipụ e zipụrụ ha amaka. O doro anya na o mere ka ndị Chineke dịrị n’udo ma dịrị n’otu.

13 Akwụkwọ ozi ahụ kwuru ihe doro anya ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst ga na-eme ma n’okwu banyere ibi úgwù ma n’ihe ha ga na-eme ka ha na Jehova dịrị ná mma, ya agọziekwa ha. Isi ihe akwụkwọ ozi ahụ kwuru bụ: “Mmụọ nsọ enyerela anyị aka ikpebi na a gaghị ebo unu ibu arọ, ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa: ka unu jụ ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị, ghara iri ọbara, ghara iri anụ a nyagburu anyagbu, gharakwa ịkwa iko. Ọ bụrụ na unu elezie anya jụ ihe ndị a, ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma.”​—Ọrụ 15:28, 29.

14. Gịnị mere ndị Jehova ji dịrị n’otu n’ụwa a na-adịghị n’otu?

14 Taa, Ndịàmà Jehova kweere otu ihe, na-emekwa otu ihe n’agbanyeghị na ha karịrị nde mmadụ asatọ (8,000,000), nọrọkwa n’ọgbakọ karịrị otu narị puku (100,000) n’ụwa niile. Gịnị mere ha ji dị n’otu otú a, karịchaa, n’oge a ọgba aghara na obi abụghị otu juru n’ụwa? Isi ihe mere anyị ji dịrị n’otu bụ maka na Jizọs Kraịst, bụ́ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst, si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ya bụ, Òtù Na-achị Isi, na-enye anyị ntụziaka doro anya. (Mat. 24:45-47) Ihe ọzọ mere anyị ji dịrị n’otu bụ na ụmụnna anyị n’ụwa niile ji obi ha niile na-eme ihe Òtù Na-achị Isi kwuru.

“Ha Ṅụrịrị Ọṅụ n’Ihi na Ọ Gbara Ha Ume” (Ọrụ 15:30-35)

15, 16. Olee otú e si dozie okwu banyere ibi úgwù, gịnịkwa mere e ji nwee ike idozi ya?

15 Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi gwakwara anyị na mgbe ụmụnna ndị ahụ e si na Jeruselem zipụ garuru Antiọk, “ha kpọkọtara ndị na-eso ụzọ Jizọs ma nye ha akwụkwọ ozi ahụ.” Gịnị ka ụmụnna ahụ mere mgbe ha nụrụ ihe òtù na-achị isi kwuru ka e mee? “Mgbe ha gụchara [akwụkwọ ozi ahụ], ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi na ọ gbara ha ume.” (Ọrụ 15:30, 31) Judas na Saịlas gwakwara “ụmụnna ahụ ọtụtụ ihe gbara ha ume, meekwa ka okwukwe ha sie ike.” Ebe ọ bụ na ụmụ nwoke abụọ a mere ka a mara ihe bụ́ uche Chineke, e nwere ike ịkpọ ha “ndị amụma,” otú ahụ a kpọkwara Banabas, Pọl, na ndị ọzọ ndị amụma.​—Ọrụ 13:1; 15:32; Ọpụ. 7:1, 2.

16 O doro anya na Jehova gọziri ihe niile e mere iji dozie okwu ahụ nke ọma. Gịnị mere e ji nwee ike idozi ya? Ọ bụ n’ihi na òtù na-achị isi kwere ka mmụọ nsọ duzie ha, ha esikwa n’Okwu Chineke kwuo ihe doro anya e kwesịrị ime, kwuokwa ya n’oge kwesịrị ekwesị. Ihe ọzọ bụ na otú òtù na-achị isi si gwa ọgbakọ niile ihe ha kpebiri gosiri na ha hụrụ ha n’anya nakwa na ihe gbasara ha na-emetụ ha n’obi.

17. Olee otú ndị nlekọta sekit si eme ka Pọl, Banabas, Judas, na Saịlas?

17 Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-emekwa otú ahụ taa. Ha na-enye ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile ntụziaka n’oge kwesịrị ekwesị. Ha kpebie ihe a ga-eme, ha na-agwa ya ọgbakọ niile otú doro anya. Mgbe ụfọdụ, ha na-esi n’aka ndị nlekọta sekit agwa ya ọgbakọ. Ndị nlekọta ndị a na-anaghị achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru na-esi n’otu ọgbakọ aga ọgbakọ ọzọ, na-enye ụmụnna ntụziaka doro anya ma na-agba ha ezigbo ume. Ha na-eji oge buru ibu eje ozi, ‘na-akụzi ihe. Ha na ọtụtụ ndị ọzọ na-ekwusakwa ozi ọma banyere okwu Jehova,’ otú Pọl na Banabas mere. (Ọrụ 15:35) Ha ‘na-agwa ụmụnna ọtụtụ ihe na-agba ha ume, na-emekwa ka okwukwe ha sie ike,’ otú Judas na Saịlas mere.

18. Gịnị ka ndị na-efe Jehova ga-emerịrị ka o nwee ike ịgọzi ha?

18 Oleekwanụ ihe na-eme ka ọgbakọ dị iche iche e nwere n’ụwa niile dịrị n’udo ma na-emekọ ihe ọnụ? Cheta na ọ bụ Jems, onye na-eso ụzọ Jizọs, mechara dee, sị: “Amamihe nke si n’eluigwe na-ebu ụzọ eme ka obi mmadụ dị ọcha. Ọ na-emekwa ka onye ahụ na-eme udo, na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, na-eji obi ya niile erube isi . . . Ndị na-eme ka ha na ndị ọzọ dịrị ná mma na-eme ka udo dịrị na-aga, ọ na-emekwa ka ha na-eme ihe dị mma.” (Jems 3:17, 18) Anyị amaghị ma Jems ò chetara nzukọ ahụ ha nwere na Jeruselem mgbe ọ na-ede amaokwu ndị a. Ma, ihe anyị lebarala anya n’Ọrụ Ndịozi isi 15 mere ka o doo anya na ọ bụ naanị mgbe anyị dị n’otu ma na-emekọ ihe ọnụ ka Jehova na-agọzi anyị.

19, 20. (a) Olee ihe gosiri na e nweziri udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ dị n’Antiọk? (b) Gịnịzi ka Pọl na Banabas mewere?

19 O doro anya na e nweziri udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ dị n’Antiọk. Kama ịrụwa ụmụnna ahụ si Jeruselem ụka, obi dị ụmụnna nọ n’Antiọk ezigbo ụtọ na Judas na Saịlas bịara leta ha. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ha nọtụrụ ebe ahụ, ụmụnna ahụ dupụrụ ha ka ha laa. Ha sịkwara ha: ‘Lakwurunụ ndị zitere unu n’udo,’” ya bụ, ka ha laghachi Jeruselem. d (Ọrụ 15:33) Obi siri anyị ike na ụmụnna nọ na Jeruselem ṅụrịkwara ọṅụ mgbe ha nụrụ ihe Judas na Saịlas kọọrọ ha banyere njem ha. Njem ha gara siriri werere n’ihi amara Jehova.

20 Ugbu a e dozicharala okwu gbasara ibi úgwù, Pọl na Banabas nọgidere n’Antiọk. Ha lekwasịziri anya n’ọrụ ikwusa ozi ọma, otú ndị nlekọta sekit na-eme taa ma ha gaa ileta ọgbakọ ndị nọ na sekit ha. (Ọrụ 13:2, 3) Jehova ji ndị nlekọta sekit gọzie ọgbakọ ya. Ma olee ụzọ ndị ọzọ Jehova si jiri Pọl na Banabas, bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi n’ọrụ ikwusa ozi ọma, rụọ ọrụ? Oleekwa otú o si gọzikwuo ha? Anyị ga-achọpụta n’isiokwu na-eso nke a.

Ndị Kraịst n’oge a na-erite uru ná nri si n’Okwu Chineke ha si n’aka Òtù Na-achị Isi na ndị na-anọchite anya ha na-enweta

a Gụọ igbe bụ́ “ Jems, ‘Nwanne Onyenwe Anyị.’

b Jems mere ihe gosiri na ọ ma ihe. O kwuru ihe dị n’akwụkwọ ndị Mosis dere. Ọ bụkwanụghị naanị Iwu Mosis ka e dere n’akwụkwọ ndị ahụ, kama e dekwara akụkọ gosiri otú Chineke na ụmụ mmadụ si mekọrịta ihe nakwa ihe bụ́ uche ya tupudị e nwee Iwu Mosis. Dị ka ihe atụ, ihe e dere n’akwụkwọ Jenesis gosiri otú Chineke si ele ọbara, ịkwa iko, na ikpere arụsị, anya. (Jen. 9:3, 4; 20:2-9; 35:2, 4) Jehova si otú ahụ gosi ihe ọ chọrọ ka mmadụ niile na-eme, ma ndị Juu ma ndị Jentaịl.

d N’amaokwu nke 34, ụfọdụ nsụgharị Baịbụl kwuru ihe gosiri na Saịlas kpebiri ịnọrọzi n’Antiọk. (Bible Nsọ nke Union Version) Ma, ọ ga-abụ na a gbakwunyere okwu ndị ahụ mgbe e decharala akwụkwọ Ọrụ Ndịozi.