Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 13

‘Ha Nwere Nghọtahie’

‘Ha Nwere Nghọtahie’

E wegaara òtù na-achị isi okwu banyere ibi úgwù

O Si n’Ọrụ Ndịozi 15:1-12

1-3. (a) Olee ihe chọrọ ikewa ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ? (b) Olee uru anyị ga-erite ma anyị leba anya n’akụkọ a dị n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi?

 OBI na-atọ Pọl na Banabas ezigbo ụtọ. Ha ka si n’obodo Siria dị n’Antiọk lọta mgbe ha kwusachara ozi ọma nke mbụ ha ná mba ọzọ. Ihe na-eme ha obi ụtọ bụ na Jehova ‘emegheerela ndị mba ọzọ ụzọ ha ga-esi kwere na ya.’ (Ọrụ 14:26, 27) N’eziokwu, a na-ekwusa ozi ọma n’Antiọk niile, “ọtụtụ ndị” Jentaịl na-abatakwa n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ.​—Ọrụ 11:20-26.

2 Akụkọ banyere ndị ọhụrụ a na-abata n’ọgbakọ Antiọk ruru Judia n’oge na-adịghị anya. Ma kama ime mmadụ niile nọ ebe ahụ obi ụtọ, o mere ka e nwee ndị kwe na ndị ekweghị n’okwu gbasara ibi úgwù. Olee otú ụmụnna ndị Juu na ndị nke na-abụghị ndị Juu kwesịrị isi na-ele ibe ha anya, oleekwa otú ụmụnna na-abụghị ndị Juu kwesịrị isi were Iwu Mosis? Okwu a kpatara ezigbo nghọtahie nke chọrọ ikewa ọgbakọ Ndị Kraịst. Olee otú a ga-esi edozi ya?

3 Ka anyị na-eleba anya n’akụkọ a dị n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe bara uru. Ha ga-enyere anyị aka ịkpa àgwà ka ndị maara ihe ma e nwee okwu chọrọ ịkpata nkewa n’ọgbakọ n’oge anyị a.

“Ọ Bụrụ na E Bighị Unu Úgwù” (Ọrụ 15:1)

4. Olee ihe na-ezighị ezi ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na-esi ọnwụ ka e mee, oleekwa ajụjụ ihe a nwere ike ime ka anyị jụọ?

4 Luk onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: “E nwere ụmụ nwoke ụfọdụ si Judia bịa Antiọk ma malite ịkụziri ụmụnna, sị: ‘Ọ bụrụ na e bighị unu úgwù dị ka Iwu Mosis kwuru, a gaghị azọpụta unu.’” (Ọrụ 15:1) Baịbụl ekwughị ma ‘ụmụ nwoke ahụ si Judia’ hà bụ ndị Farisii tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. Ma hà bụbu ndị Farisii ma ọ bụ na ha abụghị, o yiri ka hà bu Iwu Mosis n’isi ka ndị Farisii. Ọ ga-abụkwa na ha sịrị na ihe ha na-ekwu bụ ihe ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem gwara ha kwuo. (Ọrụ 15:23, 24) Ma, gịnị mere Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ji ka na-esi ọnwụ na a ga-ebirịrị ndị Jentaịl úgwù, n’agbanyeghị na ihe dị ka afọ iri na atọ agafeela kemgbe Pita onyeozi nabatachara ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù n’ọgbakọ Ndị Kraịst, otú Chineke gwara ya mee? a​—Ọrụ 10:24-29, 44-48.

5, 6. (a) Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ji sie ọnwụ na a ga-ebirịrị ndị Jentaịl úgwù? (b) Ọgbụgba ndụ ibi úgwù ò so n’ọgbụgba ndụ Ebreham? Kọwaa. (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

5 E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata ya. Nke mbụ bụ na ọ bụ Jehova nyere iwu ka e bie nwoke ọ bụla úgwù. Ihe a na-egosi na mmadụ na Chineke dịzi n’ezigbo mma. Ebreham na ezinụlọ ya bụ ndị mbụ Jehova nyere iwu ka ha na-ebi úgwù. Ma, iwu a mechara soro n’iwu ndị dị n’ọgbụgba ndụ Iwu. b (Lev. 12:2, 3) Iwu Mosis kwuru na a ga-ebirịrị ndị mba ọzọ úgwù tupu ha esoro ndị Izrel na-eme ihe ụfọdụ, dị ka iri oriri Ngabiga. (Ọpụ. 12:43, 44, 48, 49) O doro anya na n’uche onye Juu, onye a na-ebighị úgwù bụ onye na-adịghị ọcha na onye rụrụ arụ.​—Aịza. 52:1.

6 N’ihi ya, ọ bụ okwukwe na ịdị umeala n’obi ga-eme ka ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nabata ihe ọhụrụ a a kụziiri ha. Ebe ọ bụ na e jirila ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie ọgbụgba ndụ Iwu, ịbụ onye Juu abụghịzi ihe na-eme ka mmadụ bụrụ onye Chineke. Ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi n’obodo ndị Juu, dị ka ndị nke bi na Judia, kwesịrị inwe obi ike ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịnọgide na-eso ụzọ Kraịst ma nabata na ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù bụ ụmụnna ha.​—Jere. 31:31-33; Luk 22:20.

7. Olee eziokwu ‘ụmụ nwoke si Judia’ na-aghọtaghị?

7 N’eziokwu, ihe Chineke chọrọ n’aka ndị na-efe ya agbanwebeghị. Ihe gosiri na ihe a bụ eziokwu bụ na ihe ndị bụ́ isi e kwuru n’Iwu Mosis dịkwa n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ. (Mat. 22:36-40) Dị ka ihe atụ, Pọl mechara dee banyere ibi úgwù, sị: “Ọ bụ onye bụ́ onye Juu n’obi bụ onye Juu, úgwù e biri ya bụkwa n’obi. E si na mmụọ nsọ bie ya úgwù, e sighị n’iwu e dere ede.” (Rom 2:29; Diut. 10:16) ‘Ụmụ nwoke ahụ si Judia’ aghọtabeghị eziokwu ndị a, kama ha nọ na-esi ọnwụ na Chineke akagbubeghị iwu ibi úgwù. Hà ga-anabata ihe ọhụrụ a a kụziri?

Ha “Nwere Nghọtahie, Rụọkwa Ezigbo Ụka” (Ọrụ 15:2)

8. Gịnị mere e ji wegara òtù na-achị isi nọ na Jeruselem okwu banyere ibi úgwù?

8 Luk kwukwara, sị: “Ha [ya bụ, ‘ụmụ nwoke ahụ si Judia’] na Pọl na Banabas nwere nghọtahie, rụọkwa ezigbo ụka. Ụmụnna meziri ndokwa ka Pọl na Banabas na ụfọdụ ụmụnna ndị ọzọ gakwuru ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem gbasara okwu a.” c (Ọrụ 15:2) Okwu bụ́ ‘nghọtahie na ịrụ ụka’ gosiri na ndị nke ọ bụla n’ime ha kwụsiri ike n’ebe ha kwụ, o nweghịkwa onye kwere ekweta ihe ibe ya na-ekwu. N’ihi ya, ọgbakọ dị n’Antiọk enweghị ike idozi ya. Iji mee ka e nwee udo na ịdị n’otu, ọgbakọ ahụ kpara àgwà ndị ma ihe. Ha kpebiri ka e were okwu ahụ gakwuru “ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem,” ndị bụ́ òtù na-achị isi n’oge ahụ. Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe a ndị okenye nọ n’Antiọk mere?

Ụfọdụ nọ na-esi ọnwụ, na-asị: ‘E kwesịrị ịgwa ndị Jentaịl ka ha na-edebe Iwu Mosis’

9, 10. Olee ihe Pọl na Banabas na ụmụnna nọ n’Antiọk mere nke anyị kwesịrị ịna-eme taa?

9 Otu ihe bara uru anyị mụtara bụ na anyị kwesịrị ịtụkwasị nzukọ Chineke obi. Chebagodịrị ihe a echiche: Ụmụnna nọ n’Antiọk ma na ọ bụ naanị Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu so n’òtù na-achị isi. N’agbanyeghị nke ahụ, ha tụkwasịrị ha obi na ha ga-eji Akwụkwọ Nsọ dozie okwu gbasara ibi úgwù. Gịnị mere ha ji tụkwasị ha obi? Ọ bụ n’ihi na obi siri ha ike na Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya na Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ Jizọs Kraịst, duzie òtù na-achị isi. (Mat. 28:18, 20; Efe. 1:22, 23) Ọ bụrụ na e nwee okwu tara akpụ taa, anyị kwesịrị ime ihe ahụ magburu onwe ya ụmụnna nọ n’Antiọk mere, ya bụ, ịtụkwasị nzukọ Chineke obi, tụkwasịkwa Òtù Na-achị Isi, nke ndị so na ya bụ ụmụnna nwoke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, obi.

10 Ihe ọzọ anyị mụtara bụ na ịdị umeala n’obi na inwe ndidi bara uru. N’agbanyeghị na mmụọ nsọ họpụtara Pọl na Banabas ije ozi ná mba ọzọ, ha echeghị na ha kwesịrị iji aka ha dozie nghọtahie ahụ e nwere n’Antiọk ozugbo. (Ọrụ 13:2, 3) Pọl mechadịrị dee, sị: “Ihe mere m ji gaa [Jeruselem] bụ maka na e kpugheere m ka m gaa” ebe ahụ. Ihe a o kwuru gosiri na ọ bụ Chineke gwara ya gaa. (Gal. 2:2) Taa, ndị okenye na-agbalị inwe ndidi na ịdị umeala n’obi ka Pọl na Banabas ma e nwee okwu nwere ike ịkpata nkewa n’ọgbakọ. Kama isewe okwu, ha na-enyocha Akwụkwọ Nsọ na ntụziaka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nyere iji mara ihe bụ́ uche Jehova n’okwu ahụ.​—Fil. 2:2, 3.

11, 12. Gịnị mere o ji dị mkpa ichere Jehova?

11 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị chere ka Jehova mee ka anyị ghọtakwuo ihe ụfọdụ. Cheta na ụmụnna ndị nọ n’oge Pọl cheere ruo ihe dị ka afọ iri na atọ tupu Jehova ekpebie ma è kwesịrị ibi ndị Jentaịl úgwù ma ọ bụ na e kwesịghị, ya bụ, malite mgbe e ji mmụọ nsọ tee Kọniliọs mmanụ n’afọ 36 O.N.K. ruo n’ihe dị ka afọ 49 O.N.K. Gịnị mere o ji wee ogologo oge? O nwere ike ịbụ na Chineke chọrọ inye ndị Juu obi ha dị ọcha oge buru ibu ha ga-eji nabata nnukwu mgbanwe ahụ. A sị ka e kwuwe, ịkagbu ọgbụgba ndụ ochie ahụ Chineke na nna nna ha Ebreham, bụ́ onye ha hụrụ n’anya, gbara kemgbe otu puku afọ na narị afọ itoolu (1,900) abụghị obere ihe.​—Jọn 16:12.

12 Obi dị anyị ụtọ na Nna anyị nke eluigwe ji ndidi na obiọma na-akụziri anyị ihe ma na-akpụzi anyị. Ihe ndị ọ na-akụziri anyị na-abakwara anyị uru mgbe niile. (Aịza. 48:17, 18; 64:8) N’ihi ya, ya enwekwala mgbe anyị ga-ekwe ka mpako mee ka anyị siwe ọnwụ n’ihe anyị chere ma ọ bụ wewe iwe n’ihi ihe ndị a gbanwere ná nzukọ Chineke ma ọ bụkwanụ n’otú anyị si ghọta amaokwu Baịbụl ụfọdụ. (Ekli. 7:8) Ị chọpụta na i nwetụrụ ụdị àgwà ahụ, chebara ezigbo ndụmọdụ ndị dị n’Ọrụ Ndịozi isi 15 echiche, rịọkwa Chineke ka o nyere gị aka ime ha eme. d

13. Olee otú anyị ga-esi na-enwe ndidi ka Jehova n’ozi anyị?

13 Anyị kwesịrị inwe ndidi ma ọ bụrụ na ọ na-esiri onye anyị na ya na-amụ Baịbụl ike ịhapụ ozizi ụgha ma ọ bụ omenala ndị na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ maara ya ahụ́. Ka anyị na-enyere ya aka, ọ ga-adị mma ka anyị chere ka mmụọ Chineke mee ka obi ya nabata ihe ọ na-amụ. (1 Kọr. 3:6, 7) Anyị kwesịkwara ịkọrọ ya Chineke n’ekpere. Chineke ga-emecha mee ka anyị mata ụzọ kacha mma anyị ga-esi enyere onye ahụ aka.​—1 Jọn 5:14.

Ha Kọrọ “Ihe Niile” Na-agba Ume Merenụ (Ọrụ 15:3-5)

14, 15. Olee otú ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị n’Antiọk si kwanyere Pọl, Banabas, na ndị ha na ha so ùgwù, oleekwa otú ọbịbịa ha si baara ụmụnna ha uru?

14 Luk kwuziri, sị: “Mgbe ọgbakọ ahụ dupụchara ụmụnna ndị a, Pọl na ndị ya na ha so gara Finishia, gaakwa Sameria, na-akọrọ ha ihe niile gbasara otú ndị mba ọzọ si na-echegharị. Obi bụkwa ụmụnna ahụ niile sọ aṅụrị mgbe ha nụrụ ihe ndị a.” (Ọrụ 15:3) Ndupụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ dupụrụ Pọl, Banabas, na ndị ha na ha so gosiri na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, na-akwanyere ha ùgwù ma chọọ ka Chineke gọzie ha. Ihe a bụ ihe ọzọ magburu onwe ya ụmụnna nọ n’Antiọk mere nke anyị kwesịrị ịna-eme. Ị̀ na-akwanyere ụmụnna gị ùgwù, “karịchaa, [ndị okenye] ndị na-agbasi mbọ ike n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe”?​—1 Tim. 5:17.

15 Mgbe Pọl na ndị ya na ha so nọ na-aga Jeruselem, ha kọọrọ ụmụnna ha nọ na Finishia na Sameria “ihe niile” gbasara otú ndị Jentaịl si na-echegharị, ihe a gbakwara ụmụnna ndị ahụ ume. Ọ ga-abụ na ụfọdụ ụmụnna ndị ha kọọrọ akụkọ ndị ahụ bụ ndị Juu, ndị gbagara n’obodo ndị ahụ mgbe e gbuchara Stivin n’ihi okwukwe ya. Taa, akụkọ ndị a na-akọrọ anyị banyere otú Jehova si agọzi ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-agbakwa ụmụnna anyị ume, karịchaa, ndị na-edi ọnwụnwa. N’ihi ya, na-eme ihe niile i nwere ike ime ka akụkọ ndị a na-agba ume a na-akọrọ anyị n’ọmụmụ ihe anyị, ná mgbakọ anyị dị iche iche, n’akwụkwọ anyị, nakwa na jw.org ghara ịkwa gị.

16. Olee ihe gosiri na okwu gbasara ibi úgwù abụghịzi obere okwu?

16 Mgbe Pọl na ndị ya na ha so si Antiọk gaa ihe dị ka narị kilomita ise na iri ise (550) n’ebe ndịda, ha ruru ebe ha na-aga. Luk dere, sị: “Mgbe ha ruru Jeruselem, ọgbakọ dị ebe ahụ na ndịozi na ndị okenye nabatara ha nke ọma. Pọl na Banabas kọkwaara ha ọtụtụ ihe Chineke si n’aka ha mee.” (Ọrụ 15:4) Ma, “ụfọdụ n’ime ndị nọbu n’òtù ndị Farisii, ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, biliri n’oche ha, sị: ‘E kwesịrị ibi ha úgwù, gwakwa ha ka ha na-edebe Iwu Mosis.’” (Ọrụ 15:5) O doro anya na ihe banyere ibi Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu úgwù abụghịzi obere okwu, e kwesịkwara idozi ya.

“Ndịozi na Ndị Okenye Wee Zukọta” (Ọrụ 15:6-12)

17. Olee ndị so n’òtù na-achị isi nọ na Jeruselem, oleekwa ihe ọ ga-abụ ya mere “ndị okenye” ji soro na ha?

17 Ilu 13:10 kwuru, sị: “Ndị na-achọ ka a dụọ ha ọdụ ma ihe.” “Ndịozi na ndị okenye” mere ihe amaokwu Baịbụl a kwuru. Ha ‘zukọtara ka ha leba anya n’okwu’ banyere ibi úgwù. (Ọrụ 15:6) “Ndịozi na ndị okenye” ahụ nọchitere anya ọgbakọ Ndị Kraịst niile, otú ahụ Òtù Na-achị Isi si anọchite anya ọgbakọ Ndị Kraịst taa. Gịnị mere “ndị okenye” ji soro ndịozi na-arụ ọrụ? Cheta na e gbuola Jems onyeozi. E nwekwara mgbe a tụrụ Pita onyeozi mkpọrọ. Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime ndịozi ndị ọzọ? Ịkpọbata ụmụnna nwoke ndị ọzọ ruru eru e tere mmanụ ka ha soro n’òtù na-achị isi ga-eme ka a nọgide na-enwe ndị ga na-elekọta ọrụ Ndị Kraịst.

18, 19. Olee okwu gbara ọkpụrụkpụ Pita kwuru, oleekwa ihe ndị ọ gwara okwu ahụ kwesịrị ịghọta?

18 Luk kwuziri, sị: “Mgbe ha kwutere okwu a aka, Pita biliri, sị . . . : ‘Ụmụnna m, unu ma nke ọma na Chineke si n’ime anyị niile họrọ m ná mmalite, ka ndị mba ọzọ si n’ọnụ m nụ ozi ọma ma kwere. Chineke, onye ma obi mmadụ, nyekwara ha mmụọ nsọ otú o nyere anyị, iji gosi na ọ nabatala ha. Otú o si were anyị ka o sikwa were ha, n’ihi na o mere ka obi ha dị ọcha maka na ha nwere okwukwe.’” (Ọrụ 15:7-9) Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu Grik a sụgharịrị ‘ikwute okwu aka’ n’amaokwu nke 7 pụtakwara ‘ịchọpụta ihe ma ọ bụ ịjụ ajụjụ.’ N’agbanyeghị na otú ụmụnna ndị ahụ si lee okwu ahụ anya dị iche iche, ha medara obi kwuo uche ha ma kparịta ya.

19 Pita kwuru okwu gbara ọkpụrụkpụ n’ụbọchị ahụ. N’okwu ahụ, o chetaara ndị niile nọ ebe ahụ na ya nọ mgbe mbụ Chineke ji mmụọ nsọ tee ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù mmanụ, ya bụ, Kọniliọs na ezinụlọ ya, n’afọ 36 O.N.K. N’ihi ya, ọ bụrụ na Jehova akwụsịla ịkpa ókè n’etiti ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu, mmadụ ò kwesịrị ịkpawa ókè? Ihe ọzọ bụ na ọ bụ inwe okwukwe na Kraịst na-eme ka Chineke nabata ofufe mmadụ, ọ bụghị idebe Iwu Mosis.​—Gal. 2:16.

20. Olee otú ndị na-achọ ka e bie ndị Jentaịl úgwù si ‘na-akpasu Chineke iwe’?

20 N’ihi ihe doro anya Chineke kwuru nakwa otú o si jiri mmụọ nsọ ya na-arụ ọrụ, Pita kwuru, sị: “Gịnịzi mere unu ji akpasu Chineke iwe? Unu na-ebokwasị ndị na-eso ụzọ Jizọs ibu nna nna anyị hà na anyịnwa na-ebulighị. Ma, obi siri anyị ike na a ga-esi n’amara Onyenwe anyị Jizọs zọpụta anyị otú ahụ a ga-azọpụta ha.” (Ọrụ 15:10, 11) N’eziokwu, ndị ahụ na-achọ ka e bie ndị Jentaịl úgwù ‘na-akpasu Chineke iwe.’ Otú e si sụgharịa ya na Baịbụl ọzọ bụ na ha “na-anwa Chineke.” Ha chọrọ ịmanye ndị Jentaịl ka ha na-edebe iwu hanwa bụ́ ndị Juu na-enweghị ike idebecha, nke mekwaranụ ka a ma ha ikpe ọnwụ. (Gal. 3:10) Ndị Juu ahụ Pita gwara okwu kwesịdịrị ịna-ekele Chineke maka amara o si n’aka Jizọs meere ha.

21. Gịnị ka Banabas na Pọl kwuru nke ga-enye aka n’okwu gbasara ibi úgwù?

21 O doro anya na ihe Pita kwuru ruru ndị ahụ n’obi n’ihi na mgbe o kwuchara, “ebe niile dara jụụ.” Banabas na Pọl kọziri “ọtụtụ ọrụ ebube Chineke si n’aka ha rụọrọ ndị mba ọzọ.” (Ọrụ 15:12) Ugbu a ndịozi na ndị okenye nụrụla ihe niile e kwuru na ihe niile a chọpụtara, ha nweziri ike ime mkpebi dabara n’uche Chineke n’okwu gbasara ibi úgwù.

22-24. (a) Olee otú Òtù Na-achị Isi nke oge a si eme ihe òtù na-achị isi nke oge ndịozi mere? (b) Olee otú ndị okenye niile ga-esi egosi na ha na-eme ihe otú Jehova chọrọ?

22 Taakwa, Òtù Na-achị Isi zukọọ, ha na-ekwe ka Okwu Chineke duzie ha, na-ekpesikwa ekpere ike ka Chineke nye ha mmụọ nsọ ya. (Ọma 119:105; Mat. 7:7-11) N’ihi ya, a na-ebu ụzọ enye onye ọ bụla n’ime ha ihe ndị ha ga-akpa ka o chebara ha echiche ma kpee ekpere banyere ha. (Ilu 15:28) Ụmụnna ndị a e tere mmanụ zukọọ, ha na-ekwu ihe dị ha n’obi ma kwanyere ibe ha ùgwù. Ha na-agụkwa Baịbụl ugboro ugboro.

23 Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịna-eme ka ha. Ọ bụrụ na e nwere okwu na-ekweghị ha ndozi ná nnọkọ ndị okenye, ha nwere ike ịkọrọ ya alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ha ma ọ bụ ndị na-anọchite anya ha, dị ka ndị nlekọta sekit. Alaka ụlọ ọrụ nwekwara ike ịkọrọ ya Òtù Na-achị Isi ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

24 N’eziokwu, Jehova na-agọzi ndị na-eme ihe ọ bụla nzukọ ya kwuru. Ọ na-agọzikwa ndị dị umeala n’obi, ndị na-enwe ndidi, na ndị ji obi ha niile na-efe ya. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-achọpụta na ihe Chineke ji akwụ ndị ya ụgwọ maka na ha na-eme ihe ndị a bụ ime ka ha dịrị n’udo, ime ka ha na-amụba, nakwa ime ka ha dịrị n’otu.

a Gụọ igbe bụ́ “ Ihe Ụmụnna Ụgha Na-akụzi.”

b Ọgbụgba ndụ ibi úgwù esoghị n’ọgbụgba ndụ Ebreham. Ọgbụgba ndụ Ebreham ka dị irè taa. Ọ malitere n’afọ 1943 T.O.N.K., mgbe Ebreham (onye a na-akpọ Ebram mgbe ahụ) gafere osimiri Yufretis n’oge ọ na-aga Kenan. Ọ dị afọ iri asaa na ise mgbe ahụ. Ọ bụ n’afọ 1919 T.O.N.K., mgbe Ebreham dị afọ iri itoolu na itoolu, ka ya na Chineke gbara ndụ ibi úgwù.​—Jen. 12:1-8; 17:1, 9-14; Gal. 3:17.

c Taịtọs bụ onye Grik ghọrọ Onye Kraịst. O mechara bụrụ onye ozi Pọl tụkwasịrị obi nke na-eso ya eme njem. O yikwara ka ò so ná ndị ahụ e zigara Jeruselem. (Gal. 2:1; Taị. 1:4) Ọ bụ onye Jentaịl a na-ebighị úgwù, bụrụkwa ezigbo nwanna e ji mmụọ nsọ tee mmanụ.​—Gal. 2:3.