Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 1

Okwu Mmeghe Na-adọrọ Mmasị

Okwu Mmeghe Na-adọrọ Mmasị

Ọrụ Ndịozi 17:22

IHE Ị GA-EME: Okwu mmeghe gị kwesịrị ịdọrọ mmasị ndị ị na-agwa okwu, mee ka ihe ị na-ekwu doo anya, meekwa ka ha ghọta otú ọ ga-esi baara ha uru.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Dọta mmasị ha. Chọta ajụjụ, okwu, ihe ndị mere eme ma ọ bụkwanụ ihe ndị gbara n’akwụkwọ akụkọ ga-amasị ndị ị na-agwa okwu.

  • Mee ka ihe ị na-ekwu doo anya. Gbaa mbọ ka okwu mmeghe gị mee ka ndị ị na-agwa okwu mata ihe ị na-ekwu nakwa ihe mere i ji ekwu ya.

  • Gosi ihe mere ihe ị na-ekwu ji baa uru. Mee ka ihe ị na-ekwu daba n’ihe ndị ị chọpụtara gbasara ndị ị na-agwa okwu. Ha kwesịrị ịghọta otú ihe ị na-agwa ha ga-esi baara ha uru.