Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 10

Ịgbanwe Ụda Olu

Ịgbanwe Ụda Olu

Ilu 8:4, 7

IHE Ị GA-EME: Na-agbanwe ụda olu gị. I welitụ olu gị elu, gị ewedatụ ya ala, i kwutụ okwu ọsọ ọsọ, gị ejiritụ ya nwayọọ. Ọ ga-eme ka ihe ị na-ekwu doo ndị ị na-agwa ya anya, ruokwa ha n’obi.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Na-ewelitụ ma ọ bụ na-ewedatatụ olu gị. Welie olu iji mee ka ihe ndị bụ́ isi doo anya na iji kpalie mmasị ndị ị na-agwa okwu. Meekwa otú ahụ mgbe ị na-agụ okwu amamikpe n’Akwụkwọ Nsọ. Wetuo olu gị mgbe ị na-ekwu ihe na-emenye ụjọ, ihe na-eme ka mmadụ chegbuwe onwe ya ma ọ bụ ihe ga-eme ka mmadụ tụwa anya ihe na-aga ime.

  • Na-agbanwe ụda olu gị. Na-eweli olu gị iji gosi na ihe na-anụ gị ọkụ n’obi ma ọ bụ iji gosi otú ihe bururu n’ibu ma ọ bụ otú o toruru n’ogologo. Wetuokwa olu gị iji gosi na ihe ị na-ekwu na-ewute ewute ma ọ bụ na-eme ka mmadụ chegbuwe onwe ya.

  • I kwutu okwu ọsọ ọsọ, gị ekwutu okwu nwayọọ nwayọọ. Kwuo okwu ọsọ ọsọ iji gosi na obi dị gị ụtọ. I kwuwe ihe ndị dị mkpa, agbala ha ọsọ.