Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 14

Mee Ka Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ n’Okwu Gị Doo Anya

Mee Ka Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ n’Okwu Gị Doo Anya

Ndị Hibru 8:1

IHE Ị GA-EME: Nyere ndị ị na-agwa okwu aka ka ha na-aghọta ihe niile ị na-ekwu. Meekwa ka ha ghọta otú nke ọ bụla n’ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’okwu gị si gbasa isiokwu gị na ihe i bu n’obi na-ekwu okwu ahụ.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Ghọta ihe mere i ji ekwu okwu gị. Chọpụta ma ihe omume gị ọ̀ bụ maka iji kụziere ndị mmadụ ihe, iji mee ka ihe doo ha anya ma ọ bụ iji kpalie ha ime ihe. Gbalịa hụ na ihe niile gbara ọkpụrụkpụ n’okwu gị ga-enyere gị aka imezu ihe i bu n’obi.

  • Mee ka isiokwu ihe omume gị doo anya. Na-ekwughachi isiokwu gị n’oge niile ị na-ekwu okwu. Otú ị ga-esi eme ya bụ ikwughachi okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ n’isiokwu gị ma ọ bụ okwu ndị yiri ha.

  • Mee ka isi ihe ndị dị n’okwu gị doo anya ma dị mfe nghọta. Họrọ naanị ihe ndị gbasara isiokwu gị nakwa ihe ndị ị ga-enwe ike ịkọwara ndị na-ege gị ntị nke ọma n’erighị oge. Mee ka isi ihe ndị ahụ dị ole na ole. I kwuchaa nke ọ bụla n’ime ha, gị echeretụ tupu gị ekwuo nke na-eso ya. Hụkwa na e nwere ihe jikọrọ nke ọ bụla na nke na-eso ya.