Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 15

Gosi na I Kwetasiri ike n’Ihe Ị Na-ekwu

Gosi na I Kwetasiri ike n’Ihe Ị Na-ekwu

1 Ndị Tesalonaịka 1:5

IHE Ị GA-EME: Kwuo okwu otú ga-egosi ndị ị na-agwa okwu na i kwetasiri ike na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu nakwa na ọ dị ezigbo mkpa.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Kwadebe nke ọma. Mụọ ihe omume gị nke ọma ruo mgbe ị ghọtara otú amaokwu ndị dị na ya si gosi na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu. Gbalịa ka i jiri okwu ndị dị mfe kọwaa isi ihe ndị dị n’ihe omume gị. Lekwasị anya n’uru ọ ga-abara ndị na-ege gị ntị. Kpeekwa ekpere ka Chineke nye gị mmụọ nsọ ya.

  • Jiri okwu ndị ga-egosi na obi siri gị ike n’ihe ị na-ekwu mee ihe omume gị. Kama ịgụpụtawa ihe e dere n’akwụkwọ, jiri okwu nke aka gị kwuo ya. Jiri okwu ndị ga-egosi na ihe ị na-ekwu doro gị anya mee ihe omume gị.

  • Jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu. Welite olu mgbe ị na-ekwu okwu. Na-ele ndị ị na-agwa okwu anya ma ọ bụrụ na ọ dịghị njọ ime otú ahụ n’obodo unu.