Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 16

Okwu Na-agba Ume Ma Na-aba Uru

Okwu Na-agba Ume Ma Na-aba Uru

Job 16:5

IHE Ị GA-EME: Lekwasị anya n’ihe ndị ga-eme ka ihe kakwuo mma nakwa n’ihe ndị ga-agba ndị mmadụ ume.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Na-ele ndị ị na-agwa okwu anya otú kwesịrị ekwesị. Buru n’obi na ụmụnna gị chọrọ ịna-erubere Jehova isi. Ọ bụrụgodị na i kwesịrị inye ha ndụmọdụ, si n’ala ala obi gị jagodị ha mma mgbe ọ dị mkpa.

  • Ka ihe ndị na-anaghị agba ume ị ga-ekwu dịrị ole na ole. Naanị mgbe ị ga-ekwu ihe na-anaghị agba ume n’okwu gị bụ mgbe ị ga-eji ya mee ka ihe dokwuo anya. Ka okwu gị jupụta n’ihe ndị na-agba ume.

  • Jiri Okwu Chineke na-akụzi ihe nke ọma. Mee ka ndị ị na-agwa okwu ghọta ihe ndị Jehova merela, ihe ndị ọ na-eme, na ihe ndị ọ ga-emere ụmụ mmadụ. Mee ka ndị ị na-agwa okwu nwee olileanya na obi ike.