Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 2

Ikwu Okwu Ka Ebe Mmadụ na Ibe Ya Na-akparịta Ụka

Ikwu Okwu Ka Ebe Mmadụ na Ibe Ya Na-akparịta Ụka

2 Ndị Kọrịnt 2:17

IHE Ị GA-EME: Kwuo okwu otú i si ekwu okwu, otú ga-eme ka ndị ị na-agwa okwu mata otú i si were ma hanwa ma ihe ị na-ekwu.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Kpee ekpere, kwadebekwa nke ọma. Kpee ekpere ka uche gị dịrị n’ihe ị na-ekwu, ọ bụghị n’ebe gịnwa nọ. Gbaa mbọ ghọta isi ihe ndị dị n’ihe omume gị. Jiri okwu nke aka gị kwuo ya, agụla ya agụ.

  • Si n’obi gị kwuo okwu. Chee banyere ihe mere okwu gị ji dị ndị na-ege gị ntị mkpa. Buru ha n’obi. Otú i si kwụrụ, otú i si na-emegharị ahụ́ gị na ihu gị, ga-egosi na ihe ị na-ekwu si gị n’obi, nakwa na ị na echebara ha echiche.

  • Na-ele ndị ị na-agwa okwu anya. Na-ele ndị ị na-agwa okwu anya ma ọ bụrụ na ọ dịghị njọ ime otú ahụ n’ógbè unu. Ị gwawa ọha mmadụ okwu, ọ ka mma i letụ otu onye anya, gị elee onye ọzọ, kama isi n’otu akụkụ lere mmadụ niile anya gaa n’akụkụ nke ọzọ.