Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 4

Webata Akwụkwọ Nsọ Otú Dị Mma

Webata Akwụkwọ Nsọ Otú Dị Mma

Matiu 22:41-45

IHE I GA-EME: Buru ụzọ kwadebe obi ndị na-ege gị ntị tupu gị agụọrọ ha Akwụkwọ Nsọ.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Chọpụta ihe mere i ji agụ amaokwu ị chọrọ ịgụ. Buru ụzọ kwuo ihe ga-eme ka ndị na-ege gị ntị mata isi ihe mere i ji chọọ ịgụ ebe ị chọrọ ịgụ na Baịbụl.

  • Gosi na Baịbụl bụ o kwuchaa o bie. Mgbe ị na-agwa ndị kweere na Chineke okwu, mee ka ha mata na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Ọ ga-eme ka ha mata na ọ bụ na Baịbụl ka e si enweta amamihe kachanụ.

  • Mee ka ha nwee mmasị n’amaokwu ị chọrọ ịgụ. Jụọ ajụjụ amaokwu ị chọrọ ịgụ ga-aza. Gwa ha otu nsogbu ihe e dere n’amaokwu ahụ ga-egboro ha ma ọ bụkwanụ gị agwa ha ihe amaokwu ị chọrọ ịgụ ga-akọwa.