Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 7

Kụzie Ihe Bụ́ Eziokwu Otú Ga-eme Ka Ndị Ị Na-agwa Okwu Kweta Ya

Kụzie Ihe Bụ́ Eziokwu Otú Ga-eme Ka Ndị Ị Na-agwa Okwu Kweta Ya

Luk 1:3

IHE Ị GA-EME: Jiri ihe ndị e ji n’aka na ha mere eme nyere ndị ị na-agwa okwu aka ikweta n’ihe ị na-ekwu.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Jiri ihe ndị a tụkwasịrị obi mee nchọnchọ. Gbaa mbọ ka ihe ị ga-ekwu hiwe isi n’Okwu Chineke. O kwee mee, si na Baịbụl na-agụpụta amaokwu ndị ị chọrọ ịgụ. Ị chọọ iji ihe ndị sayensị kwuru, ihe e kwuru n’akwụkwọ akụkọ, ihe mere mmadụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ kwadoo okwu gị, buru ụzọ chọpụta na ebe i si nweta ha abụghị ebe a na-enyo enyo, hụkwa na a gbanwebeghị ihe na ya.

  • Jiri ihe ndị i metara na nchọnchọ kwuo okwu gị otú dabara adaba. Kọwaa amaokwu Baịbụl otú ọ ga-ekwekọ n’ihe amaokwu ndị gbara ya gburugburu na-ekwu, n’ihe Baịbụl dum na-ekwu nakwa n’ihe ndị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” na-ewepụta. (Mat. 24:45) Kwuokwa ihe i nwetara n’akwụkwọ ndị ọzọ ka ọ daba n’ihe e kwuru n’ebe i si nweta ya, ka ọ gharakwa ịdị iche n’ihe onye dere ya bu n’uche.

  • Mee ka ndị ị na-agwa okwu chee echiche. Ị gụchaa Baịbụl ma ọ bụ ihe i metara na nchọnchọ, jiri akọ jụọ ndị na-ege gị ntị ajụjụ ma ọ bụ mee ihe atụ ga-enyere ha aka ịmata nke bụ́ eziokwu.