Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 8

Jiri Ihe Atụ Na-akụzi Ihe

Jiri Ihe Atụ Na-akụzi Ihe

Matiu 13:34, 35

IHE Ị GA-EME: Jiri ihe atụ ndị dị mfe ga-amasị ndị ị na-agwa okwu mee ka otú i si akụzi ihe kakwuo mma.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Mee ihe atụ ndị dị mfe nghọta. Jiri obere ihe na-akọwa nnukwu ihe, jirikwa ihe ndị dị mfe nghọta na-akọwa ihe ndị siri ike nghọta, otú ahụ Jizọs mere. Ekwula ihe ndị na-adịchaghị mkpa ga-eme ka ihe atụ i mere gbagwojuo ndị na-ege gị ntị anya. Gbalịa hụ na ihe ndị i kwuru n’ihe atụ i mere gbasara ihe ị na-akụzi, ka uche ndị na-ege gị ntị ghara ịpụ n’ihe ị na-ekwu.

  • Buru ndị ị na-agwa okwu n’obi. Jiri ihe ndị na-ege gị ntị na-eme na ihe ndị ha ma nke ọma meere ha ihe atụ. Kpachara anya ka ihe atụ ị ga-eme ghara imenye ha ihere ma ọ bụ kpasuo ha iwe.

  • Kụzie ihe ndị dị mkpa. Ka mkpa gị bụrụ ime ka isi ihe ndị dị n’okwu gị doo anya, ọ bụghị ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Gbalịa ka ndị na-ege gị ntị nwee ike icheta ma ihe atụ gị ma ihe i ji ya kụziere ha.