Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ỌMỤMỤ NKE 9

Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Akụzi Ihe nke Ọma

Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Akụzi Ihe nke Ọma

Jenesis 15:5

IHE Ị GA-EME: Jiri ihe ndị a na-ahụ anya mee ka isi ihe ị na-akụzi dokwuo anya.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Jiri ihe ndị a na-ahụ anya mee ka otú i si akụzi ihe kakwuo mma. Jiri foto, ihe osise, map, chaatị ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya mee ka isi ihe ị na-ekwu doo anya, ọ bụghị ihe ndị na-adịghị mkpa. Nyere ndị na-ege gị ntị aka icheta ma ihe ndị ahụ a na-ahụ anya ma ihe ndị bụ́ isi i kwuru n’okwu gị.

  • Hụ na ndị ị na-agwa okwu hụrụ ihe ahụ i ji akụziri ha ihe.