Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

“Unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi.” (Hib. 5:12) Chetụgodị echiche ihe ọ dị ka ya na Jehova, bụ́ Onye Nkụzi kacha ndị nkụzi niile e nwere n’eluigwe na n’ụwa, gwara anyị ka anyị na-akụziri ndị ọzọ banyere ya. Ịkụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Jehova n’ezinụlọ, n’ọgbakọ ma ọ bụ n’ozi ọma abụghị obere ọrụ, ọ bụ ọrụ pụrụ iche. Olee otú anyị ga-esi rụọ ya nke ọma?

Azịza ya dị n’ihe Pọl onyeozi gwara Timoti. Ọ sịrị ya: ‘Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, na n’izi ihe.’ Pọl gwakwara ya, sị: “Site n’ime otú a, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.” (1 Tim. 4:13, 16) Ihe ị na-akụziri ndị mmadụ bụ ihe ga-azọ ha ndụ. N’ihi ya, i kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka otú i si agụ ihe na otú i si akụzi ihe kakwuo mma. Ọ bụ ya mere e ji bipụta broshọ a. Ụfọdụ ihe ị ga-ahụ n’ime ya bụ.

Amaokwu Baịbụl dị ná mbido peeji nke ọ bụla. Amaokwu nke ọ bụla kwuru ihe dabara n’ihe ọmụmụ dị na peeji ebe ọ dị, ma ọ bụ kwuo otú e nwere ike isi mee ya

Ọ bụ Jehova bụ “Onye Ozizi Ukwu.” (Aịza. 30:20) Ọ bụ eziokwu na broshọ a ga-enyere gị aka ịbụ aka ochie n’ịgụ ihe na n’ịkụzi ihe, echefula na ihe ị na-akụzi si n’aka Jehova, nakwa na ọ bụ ya na-adọta ndị mmadụ ka ha bịa fee ya. (Jọn 6:44) N’ihi ya, na-ekpe ekpere mgbe niile ka Jehova nye gị mmụọ nsọ ya. Jiri Okwu Chineke na-akụzi ihe mgbe niile. Na-akụzi ihe otú ga-eme ka a mata na ihe ị na-akụzi bụ uche Chineke, ọ bụghị uche gị. Gbalịsie ike ikwu okwu otú ga-eme ka ndị na-ege gị ntị jiri obi ha niile hụ Jehova n’anya.

Jehova enyela gị ọrụ ịkụziri ndị ọzọ ihe kacha mkpa a kụzitụụrụla ụmụ mmadụ. Obi siri anyị ike na ị ga na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na ị ‘dabere n’ike Chineke na-enye.’—1 Pita 4:11.

Anyị bụ ndị nkụzi ibe unu,

Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova