Gaa n'Isiokwu

NKE 1

Ezigbo Ìhè nke Ụwa

Ezigbo Ìhè nke Ụwa

Okwu ahụ na Chineke nọ ná mmalite, ọ bụkwa chi (gnj 1 00:00–00:43)

Chineke ji Okwu ahụ kee ihe ndị ọzọ niile (gnj 1 00:44–01:00)

Okwu ahụ mere ka ndụ na ìhè dịrị (gnj 1 01:01–02:11)

Ọchịchịrị akabeghị ìhè ahụ ike (gnj 1 02:12–03:59)

Luk gwara Tiofilọs ihe mere o ji dee akwụkwọ ya na ebe o si nweta ihe o dere (gnj 1 04:13–06:02)

Gebriel buru amụma na a ga-amụ Jọn Onye Na-eme Baptizim (gnj 1 06:04–13:53)

Gebriel buru amụma na a ga-amụ Jizọs (gnj 1 13:52–18:26)

Meri gawara ileta Elizabet onye ikwu ya (gnj 1 18:27–21:15)

Meri toro Jehova (gnj 1 21:14–24:00)

A mụrụ Jọn, gụọkwa ya aha (gnj 1 24:01–27:17)

Amụma Zekaraya buru (gnj 1 27:15–30:56)

Meri dị ime n’ike mmụọ nsọ; ihe Josef mere mgbe ọ matara (gnj 1 30:58–35:29)

Josef na Meri gawara Betlehem; a mụrụ Jizọs (gnj 1 35:30–39:53)

Ndị mmụọ ozi pụtara n’ihu ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa (gnj 1 39:54–41:40)

Ndị ọzụzụ atụrụ gara hụ nwa ọhụrụ ahụ dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri (gnj 1 41:41–43:53)

E ku Jizọs gaa n’ụlọ nsọ ka e gosi ya Jehova (gnj 1 43:56–45:02)

Chineke meere Simiọn ihe ọma mee ka ọ hụ Kraịst (gnj 1 45:04–48:50)

Ana gwara ndị mmadụ banyere nwa ahụ (gnj 1 48:52–50:21)

Ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu bịara Jeruselem; Herọd akpaa nkata ọjọọ (gnj 1 50:25–55:52)

Josef kpọọrọ Meri na Jizọs gbaga Ijipt (gnj 1 55:53–57:34)

Herọd gburu ụmụaka ndị nwoke niile na Betlehem na ógbè niile gbara ya gburugburu (gnj 1 57:35–59:32)

Ndị ezinụlọ Jizọs gara biri na Nazaret (gnj 1 59:34–1:03:55)

Jizọs gara n’ụlọ nsọ mgbe ọ dị afọ iri na abụọ (gnj 1 1:04:00–1:09:40)

Jizọs na nne na nna ya laghachiri Nazaret (gnj 1 1:09:41–1:10:27)

Oge eruwela ka ezigbo ìhè bịa n’ụwa (gnj 1 1:10:28–1:10:55)