Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 61

Jizọs Agwọọ Nwata Nwoke Mmụọ Ọjọọ Ji

Jizọs Agwọọ Nwata Nwoke Mmụọ Ọjọọ Ji

MATIU 17:14-20 MAK 9:14-29 LUK 9:37-43

  • Ọ BỤ OKWUKWE SIRI IKE KA A GA-EJI AGWỌ NWATA NWOKE MMỤỌ ỌJỌỌ JI

Mgbe Jizọs, Pita, Jems na Jọn si n’ugwu rịdata, ha hụrụ ìgwè mmadụ. Ọ ga-abụrịrị na e nwere nsogbu dịnụ. Ndị odeakwụkwọ gbara ndị na-eso ụzọ Jizọs gburugburu, ha na ha ana-arụrịta ụka. Mgbe ndị nọ ebe ahụ hụrụ Jizọs, o juru ha anya, ha agbara gaa kelee ya. Jizọs jụziri ha, sị: “Gịnị ka unu na ha na-arụrịta ụka ya?”—Mak 9:16.

Otu nwoke si n’ime ìgwè mmadụ ahụ bịa gbusa ikpere n’ihu Jizọs, kọwaara ya ihe na-emenụ. Ọ sịrị Jizọs: “Onye Ozizi, m kpọtaara gị nwa m nwoke n’ihi na o nwere mmụọ na-eme ka mmadụ ghara ikwu okwu; ebe ọ bụla o jidere ya, ọ na-akụ ya n’ala, ọ na-agbọpụtakwa ụfụfụ, na-atakwa ikikere ezé, ọ dịkwaghị enwe ume. M wee gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike ịchụpụ ya.”—Mak 9:17, 18.

Ọ ga-abụ na ndị odeakwụkwọ ahụ nọ na-akatọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, na-akwakwa ha emo n’ihi na ha enwelighị ike ịgwọ nwata nwoke ahụ. Ma, Jizọs hapụgodiri nwoke ahụ ahụ́ na-adịghị nwa ya gwawa ìgwè mmadụ ahụ okwu, sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke gbagọkwara agbagọ, ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme?” Ndị Jizọs bu n’obi kwuo ihe a bụ ndị odeakwụkwọ ahụ na-enye ndị na-eso ụzọ ya nsogbu mgbe ọ na-anọghị ya. Jizọs tụgharịziri gwawa nwoke ahụ ahụ́ na-adịghị nwa ya, sị: “Kpọtara m ya ebe a.”—Matiu 17:17.

Ka ha rutewere Jizọs nso, mmụọ ọjọọ ahụ ji nwata nwoke ahụ tụrụ ya n’ala, meekwa ka ihe ọdụdọ dọwa ya. Nwa ahụ nọ na-atụgharị n’ala, na-agbọpụtakwa ụfụfụ n’ọnụ. Jizọs jụrụ nna nwa ahụ, sị: “Olee mgbe ihe a malitere ime ya?” Ọ zara Jizọs, sị: “Ọ malitere kemgbe ọ bụ nwata; mgbe mgbe, ọ na-atụba ya ma n’ime ọkụ ma n’ime mmiri ka o wee laa ya n’iyi.” Ọ rịọwaziri Jizọs, sị: “Ma ọ bụrụ na ị pụrụ ime ihe ọ bụla, nwee ọmịiko n’ebe anyị nọ ma nyere anyị aka.”—Mak 9:21, 22.

Obi ezughịzi nwoke a ike ebe ọ bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs enweghịdị ike ịgwọta nwa ya. N’ihi otú o si dịrị nwoke a, Jizọs mesiri ya obi ike, sị ya: “Okwu ahụ bụ́, ‘Ọ bụrụ na ị pụrụ’! N’ezie, ihe niile pụrụ ikwe mmadụ omume ma ọ bụrụ na mmadụ enwee okwukwe.” Nwoke ahụ tiri mkpu ozugbo ahụ, sị: “Enwere m okwukwe! Nyere m aka n’ebe okwukwe dị m mkpa!”—Mak 9:23, 24.

Ozugbo ahụ, ìgwè mmadụ gbakọtawara n’ebe ahụ ha nọ, onye ọ bụla ana-elekwa ka ọ mara ihe ga-emenụ. Jizọs baziiri mmụọ ọjọọ ahụ mba, sị ya: “Gị mmụọ na-eme ka mmadụ ghara ikwu okwu ma ghara ịnụ ihe, ana m enye gị iwu, si n’ime ya pụọ, abanyekwala n’ime ya ọzọ.” Ka mmụọ ọjọọ ahụ si n’ime nwa ahụ na-apụ, o mere ka nwa ahụ tie mkpu, ihe ọdụdọ adọọkwa ya ọtụtụ ugboro. Nwa ahụ bịaziri tọgbọrọ n’ala dị ka onye nwụrụ anwụ. Ọtụtụ ndị bidoro kwuwe na “ọ nwụọla!” (Mak 9:25, 26) Ma, mgbe Jizọs jidere ya aka, o biliri, e wee ‘gwọọ ya malite n’oge awa ahụ.’ (Matiu 17:18) O doro anya na ihe ahụ Jizọs mere tụrụ mmadụ niile nọ ebe ahụ n’anya.

N’oge gara aga, mgbe Jizọs zigara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ha na-achụpụli ndị mmụọ ọjọọ. Ọ bụ ya mere ndị na-eso ụzọ ya ji jụwa ya mgbe naanị ha na ya nọ n’ime ụlọ, sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?” Jizọs gwara ha na ihe kpatara ya bụ na ha enweghị okwukwe. Ọ sịkwara ha na “ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ ime ka ụdị a pụọ ma e wezụga ekpere.” (Mak 9:28, 29) Inwe okwukwe siri ike na ịrịọ Chineke ka o nyere ha aka bụ ihe gaara eme ka ha chụpụlie mmụọ ọjọọ ahụ siri ike.

Jizọs gwaziri ha, sị: “N’ihi na n’ezie, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-asị ugwu a, ‘Si n’ebe a gafee n’ebe nke ọzọ,’ ọ ga-agafe, ọ dịghịkwa ihe na-agaghị ekwe unu omume.” (Matiu 17:20) N’eziokwu, okwukwe na-akpa ike.

Ihe ndị na-enye anyị nsogbu n’ozi anyị na-ejere Jehova nwere ike ịdị ka ihe anyị na-agaghị emerili emeri. O nwekwara ike ịdị ka ugwu nọchiiri anyị ụzọ. Ma, ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike, anyị ga-emerili nsogbu ndị ahụ yiri ugwu.