Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 53

Onye Ọchịchị nke Nwere Ikike Ime Ka Ebili Mmiri na Oké Ifufe Dajụọ

Onye Ọchịchị nke Nwere Ikike Ime Ka Ebili Mmiri na Oké Ifufe Dajụọ

MATIU 14:22-36 MAK 6:45-56 JỌN 6:14-25

  • NDỊ MMADỤ ACHỌỌ IME JIZỌS EZE

  • JIZỌS AGAA IJE N’ELU MMIRI, MEEKWA KA OKÉ IFUFE DAJỤỌ

Ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ ruru ndị mmadụ n’ahụ́. O mere ka ha kwuo na “n’ezie, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa n’ụwa,” ya bụ, Mesaya ahụ. Ha makwa na Jizọs ga-abụ ezigbo onye ọchịchị. (Jọn 6:14; Diuterọnọmi 18:18) N’ihi ya, ha mere atụmatụ ijide Jizọs mee ya eze.

Ma, Jizọs matara ihe ha na-achọ ime. Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa, gwazie ndị na-eso ụzọ ya ka ha banyeghachi n’ụgbọ ha. Ebee ka ndị na-eso ụzọ ya na-aga, oleekwa ụzọ ha ga-esi? Ha chọrọ itinye isi n’ụzọ Betseida, sizie ya gawa Kapaniọm. Ma, Jizọs gbagoro n’ugwu dị ebe ahụ ka naanị ya nọrọ kpee ekpere n’abalị ahụ.

Mgbe ọ fọrọ obere ka chi bọọ, ọnwa na-etinụ mere ka Jizọs nwee ike ịnọ ebe dị anya hụ ụgbọ ahụ ndị na-eso ụzọ ya nọ na ya. Oké ifufe mere ka ebili mmiri na-eme n’oké osimiri ahụ. Ọ nọkwa ‘na-esiri ndịozi Jizọs ike ịkwọ ụgbọ ahụ n’ihi na ifufe na-efegide ha.’ (Mak 6:48) Jizọs si n’ugwu ahụ rịdata, gara ije n’elu ebili mmiri ahụ bịakwutewe ndị na-eso ụzọ ya. Ka ọ dị ugbu a, ‘ha akwọọla ụgbọ ahụ ruo ihe dị ka maịl atọ ma ọ bụ anọ.’ (Jọn 6:19) Mgbe ndị na-eso ụzọ ya chọpụtara na ọ dị ka Jizọs ọ̀ na-achọ ịgafe ha, ha ji ụjọ tie mkpu, sị: “Ọ bụ onyinyo ụgha!”—Mak 6:49.

Ma, Jizọs sịrị ha: “Nweenụ obi ike, ọ bụ m; unu atụla egwu.” Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri,” Jizọs asị ya: “Bịa!” Mgbe o kwuru otú ahụ, Pita si n’ụgbọ ahụ pụta gawa ije n’elu mmiri, na-agakwuru Jizọs. Ma, mgbe o lere anya n’oké ifufe ahụ, ụjọ tụwara ya, ya amalite imikpu. O tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m!” Jizọs matịrị aka ya, jide Pita ma sị ya: “Gị onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”—Matiu 14:27-31.

Mgbe Pita na Jizọs banyere n’ime ụgbọ ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị. Ihe a juru ndị na-eso ụzọ ya anya. Ma, ò kwesịrị iju ha anya? Ọ bụrụ na ha ghọtara “ihe achịcha ahụ pụtara,” ya bụ, ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ awa ole na ole gara aga nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ, o kwesịghị iju ha anya na ọ gara ije n’elu mmiri, meekwa ka ifufe dajụọ. Ihe ha meziri bụ ịkpọrọ ya isiala, sị ya: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’ezie.”—Mak 6:52; Matiu 14:33.

O teghị aka, ha eruo Genesaret, bụ́ obodo mara mma, nke ala ya na-eme nri. Obodo a dị n’ebe ndịda Kapaniọm. Ha kwụsịrị ụgbọ mmiri ha ma pụta. Ndị obodo a matara Jizọs. Ha na ndị ọzọ sí n’obodo ndị dị nso ebe ahụ kpọtakwaara Jizọs ndị ahụ́ na-adịghị. Mgbe ndị ahụ ahụ́ na-adịghị metụrụ naanị ọnụ ọnụ uwe Jizọs aka, ha niile gbakere.

Ka ihe a nọ na-eme, ìgwè mmadụ ahụ Jizọs rụrụ ọrụ ebube nyejuo afọ amatala na Jizọs apụọla. Mgbe obere ụgbọ mmiri ndị sí Taịbirias bịara, ha banyere ha chọrọ Jizọs gawa Kapaniọm. Mgbe ha chọtara ya, ha jụrụ ya, sị: “Rabaị, olee mgbe i ji rute ebe a?” (Jọn 6:25) Ma, Jizọs baara ha mba. O nwere ezigbo ihe mere o ji bara ha mba. Anyị ga-achọpụta ihe ọ bụ n’isiokwu na-esonụ.