Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 45

Jizọs Egosi na Ya Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ike

Jizọs Egosi na Ya Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ike

MATIU 8:28-34 MAK 5:1-20 LUK 8:26-39

  • JIZỌS ACHỤPỤ NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ HA ABANYE N’IME ÌGWÈ ÉZÌ

Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs pụtara n’elu ala, ka ha nwechara nsogbu ahụ ha nwere n’Oké Osimiri Galili, ha hụrụ ihe juru ha anya. Ụmụ nwoke abụọ ndị mmụọ ọjọọ ji, bụ́ ndị na-eme ihe ike, ndị anya na-achakwa ọkụ, si n’ebe a na-eli ozu dị nso n’ebe ahụ na-agbaga ebe Jizọs nọ. Otu n’ime ha kacha gbapụ iche n’ihi na ọ bụ ya kacha dịrị egwu n’anya, karakwa akpa ike. Ọ ga-abụ na ihe mere o ji akpa ike karịa nke ọzọ bụ n’ihi na ndị mmụọ ọjọọ ejiela yanwa ogologo oge karịa onye nke ọzọ.

O teela nwoke a gba ọtọ na-akpagharị. Ma n’ehihie ma n’abalị, ọ ‘na-eti mkpu n’ebe a na-eli ozu nakwa n’ugwu, jirikwa nkume na-ebekasị onwe ya ahụ́.’ (Mak 5:5) Otú o si akpa ajọ ike mere ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ si ụzọ ebe ọ nọ gafee. Ụfọdụ ndị ekeela ya agbụ, ma ọ dọbisịrị agbụ ígwè e kere ya, gbajiekwa ịgà a tụrụ ya n’ụkwụ. O nweghị onye na-ejituli ya.

Mgbe nwoke ahụ bịarutere ebe Jizọs nọ ma daa n’akụkụ ụkwụ ya, ndị mmụọ ọjọọ ahụ ji ya mere ka o tie mkpu, sị: “Jizọs, Ọkpara nke Chineke Onye Kasị Elu, gịnị jikọrọ mụ na gị? Jiri Chineke ṅụọrọ m iyi na ị gaghị emekpa m ahụ́.” Jizọs gosiri na ya ka ndị mmụọ ọjọọ ike. O nyere mmụọ ọjọọ ahụ iwu, sị: “Gị mmụọ na-adịghị ọcha, si n’ime nwoke a pụta.”—Mak 5:7, 8.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmụọ ọjọọ ji nwoke ahụ dị ọtụtụ. Mgbe Jizọs jụrụ ya, “Gịnị bụ aha gị?” ihe ọ zara ya bụ: “Aha m bụ Ụsụụ, n’ihi na anyị dị ọtụtụ.” (Mak 5:9) Na Rom, ụsụụ ndị agha bụ ndị agha dị ọtụtụ puku. N’ihi ya, ihe ọ pụtara bụ na ndị mmụọ ọjọọ ji nwoke a karịrị akarị. Ahụhụ nwoke a na-ata na-atọkwa ha ụtọ. Ha rịọrọ Jizọs “ka ọ ghara inye ha iwu ka ha pụọ baa n’ime abis.” O doro anya na ha ghọtara ihe a ga-emecha mee ha na onyeisi ha, bụ́ Setan.—Luk 8:31.

E nwere ihe dị ka puku ézì abụọ na-ata nri n’ebe dị nso ebe ahụ. N’Iwu Mozis, ézì bụ anụ rụrụ arụ nke ndị Juu na-ekwesịdịghị inwe. Ndị mmụọ ọjọọ ahụ sịrị Jizọs: “Ziga anyị n’ime ìgwè ézì ndị a, ka anyị banye n’ime ha.” (Mak 5:12) Jizọs gwara ha gawa, ha banyekwara n’ime ìgwè ézì ndị ahụ. Puku ézì abụọ ahụ kwooro maba n’osimiri dị ná mkpọda ebe ahụ, mmiri agbagbuo ha.

Mgbe ndị chị ézì ndị ahụ hụrụ ihe merenụ, ha gbaara gawa n’ime obodo ka ha kọọrọ ndị mmadụ ihe merenụ. Ndị mmadụ gbapụtara ka ha hụ ihe merenụ. Mgbe ha bịarutere, ha hụrụ na ahụ́ adịla nwoke ahụ a chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ya mma. Isi adịkwala ya mma. O yizi uwe ma nọrọ ọdụ n’akụkụ ụkwụ Jizọs.

Ụjọ jidere ndị hụrụ nwoke a na ndị nụrụ banyere ihe a n’ihi na ha amaghị ihe ọzọ Jizọs nwere ike ime. Ha gwara Jizọs ka o si n’obodo ha pụọ. Ka Jizọs na-abanye n’ụgbọ ka ọ pụwa, nwoke ahụ ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ n’ahụ́ ya rịọrọ ya ka ya soro ya. Ma, Jizọs gwara ya, sị: “Lakwuru ndị ikwu gị, kọọkwara ha ihe niile Jehova meere gị nakwa ebere o meere gị.”—Mak 5:19.

Jizọs na-agwakarị ndị ọ gwọrọ ọrịa ka ha ghara ịgwa ndị ọzọ banyere ya n’ihi na ọ chọghị ka akụkọ e tinyere nnu na ose a ga na-akọ gbasara ya mee ka ndị mmadụ ghara ịma nke bụ́ eziokwu. Ọ chọrọ ka ndị mmadụ mata onye ọ bụ n’eziokwu. Mana, na nke nwoke a mmụọ ọjọọ jibu, ihe mere ya bụ ihe ama a na-ahụ anya gosiri ụdị ikike Jizọs nwere. O nwekwara ike ịkọrọ ndị ọzọ banyere Jizọs, bụ́ ndị Jizọs nwere ike ọ gaghị enwe ohere ịga n’onwe ya zie ha ozi ọma. Ihe a mere nwoke a ga-emekwa ka ndị mmadụ ghara inwe ohere gewe akụkọ ụgha ọ bụla e nwere ike ịkọ banyere ézì ndị ahụ dabara ná mmiri. Nwoke ahụ pụwaziri na-aga na Dikapọlis niile na-akọ ihe Jizọs meere ya.