Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 22

Jizọs Akpọọ Mmadụ Anọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-akụta Mmadụ

Jizọs Akpọọ Mmadụ Anọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-akụta Mmadụ

MATIU 4:13-22 MAK 1:16-20 LUK 5:1-11

  • JIZỌS AKPỌỌ NDỊ GA NA-ESO YA OGE NIILE

  • NDỊ ỌKỤ AZỤ̀ AGHỌỌ NDỊ NA-AKỤTA MMADỤ

Mgbe ndị Nazaret gbalịchara igbu Jizọs, ọ gawara obodo Kapaniọm nke dị nso n’Oké Osimiri Galili. A na-akpọkwa ebe ahụ “ọdọ mmiri Genesaret.” (Luk 5:1) Ihe a mezuru amụma e buru n’akwụkwọ Aịzaya na ndị Galili bi n’akụkụ oké osimiri ga-ahụ oké ìhè.—Aịzaya 9:1, 2.

Na Galili ebe a, Jizọs gara n’ihu na-ekwusa na “alaeze eluigwe eruwo nso.” (Matiu 4:17) Jizọs hụrụ mmadụ anọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya. Ha sobu Jizọs gaa ebe ụfọdụ ọ gara. Ma mgbe ha na ya sichara Judia lọta, ha bidoghachiri ọrụ ịkụ azụ̀ ha. (Jọn 1:35-42) Ma, oge eruola ugbu a ka ha sowe Jizọs mgbe niile ka o nwee ike inye ha ọzụzụ ga-enyere ha aka ịnọgide na-ezisa ozi ọma ma Jizọs laghachi eluigwe.

Ka Jizọs nọ na-aga n’ụsọ oké osimiri, ọ hụrụ Saịmọn Pita na nwanne ya nwoke bụ́ Andru, nakwa ụfọdụ ndị ya na ha na-arụ ọrụ ka ha na-asacha ụgbụ ha. Ọ gakwuuru ha, banye n’ụgbọ Pita, ma gwa ya ka ọ kwọrọ ụgbọ ahụ banye na mmiri. Mgbe ha gatụrụ obere, Jizọs nọdụrụ ala n’ụgbọ ahụ malite ịkụziri ìgwè mmadụ gbakọrọ n’ụsọ oké osimiri ahụ eziokwu banyere Alaeze Chineke.

Mgbe e mechara, Jizọs gwara Pita, sị: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe dị omimi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu wee gbute azụ̀.” Pita sịrị ya: “Onye ozizi, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ abalị dum n’egbuteghị ihe ọ bụla, ma ebe i kwuru ya, aga m awụnye ụgbụ.”—Luk 5:4, 5.

Ha wụnyere ụgbụ ha ma gbute azụ̀ hiri nne nke na ụgbụ ha malitere ịdọka. Ozugbo ahụ, ha feere ndị ọkụ azụ̀ ibe ha nọ n’ụgbọ dị nso ebe ahụ aka ka ha bịa nyere ha aka. O teghị aka azụ̀ eju ụgbọ abụọ ahụ nke na ụgbọ ndị ahụ malitere imikpu ná mmiri. Mgbe Pita hụrụ ihe a, ọ dara n’ihu Jizọs ma sị ya: “Onyenwe anyị, si n’ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.” Jizọs sịrị ya: “Kwụsị ịtụ egwu. Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.”—Luk 5:8, 10.

Jizọs gwara Pita na Andru sị: “Soronụ m, m ga-eme unu ndị na-akụta mmadụ.” (Matiu 4:19) Ọ kpọkwara ndị ọkụ azụ̀ abụọ ọzọ ka ha sowe ya. Ha bụ Jems na Jọn, ụmụ Zebedi. Ha abụọ sowekwara ya n’egbughị oge. Mmadụ anọ a hapụrụ ọrụ ịkụ azụ̀ ha na-arụ ma ghọọ ndị mbụ malitere iso Jizọs mgbe niile.