Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 60

Nnwogha Kraịst Gosiri Otú Ebube Ya Ga-adị n’Ọdịnihu

Nnwogha Kraịst Gosiri Otú Ebube Ya Ga-adị n’Ọdịnihu

MATIU 16:28–17:13 MAK 9:1-13 LUK 9:27-36

  • ỌHỤỤ NNWOGHA

  • NDỊOZI JIZỌS ANỤ OLU CHINEKE

Ka Jizọs nọ na-akụziri ndị mmadụ ihe na Sesaria Filipaị, nke dị ihe dị ka kilomita iri abụọ na ise ma e si ya gawa Ugwu Hemọn, o nwere otu ihe o kwuru gbara ndịozi ya gharịị. Ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo n’ebe a bụ́ ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.”—Matiu 16:28.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-eche ihe ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara. Mgbe ihe dị ka otu izu gachara, Jizọs kpọọrọ mmadụ atọ n’ime ndịozi ya, ya bụ, Pita, Jems, na Jọn gbagoo n’otu ugwu dị ezigbo elu. O nwere ike ịbụ na chi ejiela mgbe ahụ n’ihi na ndịozi ya atọ a nọ na-ero ụra. Ka Jizọs nọ na-ekpe ekpere, o nwoghara n’ihu ha. Ndịozi ya a hụrụ ka ihu ya na-acha ka anyanwụ, hụkwa ka uwe ya na-enwu gbaa dị ka ìhè.

Ozugbo ahụ, mmadụ abụọ a kpọrọ “Mozis na Ịlaịja” pụtara. Ha malitere ịgwa Jizọs banyere “ọlịla ya nke a kara aka na ọ ga-emezu na Jeruselem.” (Luk 9:30, 31) Ọlịla a Jizọs ga-esi na Jeruselem laa pụtara ogbugbu a ga-egbu ya ma mechaa kpọlite ya n’ọnwụ. (Matiu 16:21) Ihe a ha gwara Jizọs gosiri na ọnwụ ihere Jizọs na-aga ịnwụ abụghị ihe a ga-asị ka a gbaara ọsọ otú ahụ Pita chere.

Ụra mechara pụọ ndịozi atọ ahụ n’anya, ha ana-ele ihe na-emenụ, na-egekwa ihe Jizọs na ndị ahụ na-ekwu. Ihe a ha na-ahụ bụ ọhụụ. Ma, ọ dị ha ka ọ̀ na-eme eme n’eziokwu. Ọ bụ ya mere Pita ji gwawa Jizọs, sị: “Rabaị, ọ dị mma na anyị nọ n’ebe a, ya mere, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mozis, otu maka Ịlaịja.” (Mak 9:5) O nwere ike ịbụ na ihe mere Pita ji kwuo ka ha maara ha ụlọikwuu bụ ka ọhụụ ahụ ghara ịkwụsị.

Ka Pita kpụ okwu n’ọnụ, ígwé ojii kpuchiri ha, otu olu sikwa n’ígwé ojii ahụ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m; geenụ ya ntị.” Ọ bụ Chineke nwe olu a. Mgbe ndịozi ahụ nụrụ ya, ezigbo ụjọ bịara ha, ha ekpudo ihu n’ala. Ma, Jizọs gwara ha, sị: “Bilienụ ọtọ, unu atụkwala egwu.” (Matiu 17:5-7) Mgbe ha welitere ihu ha, ọ bụzi naanị Jizọs ka ha hụrụ. Ọhụụ ahụ agwụla. Ka ha si n’ugwu ahụ na-arịdata mgbe chi bọrọ, Jizọs nyere ha iwu, sị: “Unu akọrọla onye ọ bụla ọhụụ a ruo mgbe e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Nwa nke mmadụ.”—Matiu 17:9.

Ọhụhụ ahụ ndịozi ahụ hụrụ Ịlaịja mere ka ha jụwa Jizọs, sị: “Gịnịzi mere ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa?” Jizọs zara ha, sị: “Ịlaịja abịaworị ma ha amataghị ya.” (Matiu 17:10-12) Ịlaịja Jizọs na-ekwu okwu ya bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Ọrụ Jọn rụrụ yiri nke Ịlaịja rụrụ. Ịlaịja kwadebeere Ịlaịsha ụzọ, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka Jọn meere Kraịst.

O doro anya na ọhụụ a mere ka obi sikwuo Jizọs na ndịozi ya ike. Ha hụpeere ebube nke Alaeze Kraịst. Ndị na-eso ụzọ ya si otú ahụ hụ “Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya,” otú ahụ Jizọs kwere ha nkwa na ha ga-ahụ ya. (Matiu 16:28) Mgbe ahụ ha nọ n’ugwu ahụ, ndịozi Jizọs “ji anya ha hụ ịdị ebube ya.” Jizọs egosighị ndị Farisii ihe ịrịba ama na-egosi na ọ bụ ya ka Chineke ga-ahọpụta ka ọ bụrụ Eze n’agbanyeghị na ha nọ na-achọ ka o gosi ha ya. Ma, e mere ka ụfọdụ ndịozi Jizọs hụ mgbe Jizọs nwoghara nke mere ka obi sikwuo ha ike na ọ bụ Jizọs ka e buru n’amụma na ọ bụ ya ga-achị n’Alaeze Mesaya ahụ. Ọ bụ ya mere Pita ji mechaa dee, sị: “E mewo ka okwu amụma ahụ bụrụ ihe anyị ji n’aka karị.”—2 Pita 1:16-19.