Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 10

Jizọs na Ezinụlọ Ya Agaa Jeruselem

Jizọs na Ezinụlọ Ya Agaa Jeruselem

LUK 2:40-52

  • JIZỌS NỌ NA-AJỤ NDỊ NKUZI OKPUKPE AJỤJỤ MGBE Ọ DỊ AFỌ IRI NA ABỤỌ

  • JIZỌS KPỌRỌ JEHOVA “NNA M”

O ruola oge opupu ihe ubi. Ọ bụ oge a ka ndị ezinụlọ Josef na ndị ikwu na ndị enyi ha ji aga Jeruselem kwa afọ. Ha na-aga ebe ahụ maka Ememme Ngabiga e kwuru n’Iwu Mozis ka ha na-eme. (Diuterọnọmi 16:16) Isi Nazaret gaa Jeruselem dị ihe dị ka otu narị na iri kilomita abụọ. Ọ na-abụ oge obi ụtọ, onye ọ bụla na-esokwa akwadebe maka ememme a. Jizọs dị afọ iri na abụọ ugbu a, ọ na-atụsikwa anya ike ka oge ememme a ruo n’ihi na ọ na-eme ka o nwee ike ịna-aga n’ụlọ nsọ Chineke.

Jizọs na ezinụlọ ya ewereghị Ememme Ngabiga a ka naanị ihe otu ụbọchị. Ụbọchị na-eso Ememme Ngabiga bụ mbido Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko nke a na-eme ụbọchị asaa. (Mak 14:1) A na-ewere ya na o so n’ihe a na-eme n’oge Ememme Ngabiga. Ma isi Nazaret gaa Jeruselem, ma ịnọ na Jeruselem, ma ịlaghachi n’ụlọ ha, na-ewe Jizọs hà izu abụọ. Ma, nke afọ a were ha ihe karịtụrụ izu abụọ n’ihi otu ihe Jizọs mere. Ha chọpụtara ihe ahụ o mere mgbe ha nọ n’okporo ụzọ, si Jeruselem na-alaghachi.

Mgbe ha nọ na-ala, Josef na Meri chere na Jizọs so ndị ikwu na ndị enyi ha na-ala. Ma, mgbe ha kwụsịrị ebe ha ga-ehi ụra abalị, ha ahụghị ya. Ha gara chọọ ya ebe ndị ikwu ha na ndị enyi ha nọ, ma ọ nọghị ebe ahụ. Ha chọrọ ya ebe ahụ niile, ma ha ahụghị ya. Josef na Meri laghachiziri Jeruselem ka ha chọọ ya ebe ahụ.

Ha chọrọ ya n’ụbọchị mbụ, ha ahụghị ya, chọọkwa ya n’ụbọchị nke abụọ, ma ha ahụghị ya. N’ikpeazụ, n’ụbọchị nke atọ, ha hụrụ ya n’otu n’ime ụlọ ndị dị n’ụlọ nsọ. Ha hụrụ Jizọs ka ya na ndị nkụzi okpukpe ndị Juu nọ. Ọ nọ na-ege ha ntị, na-ajụkwa ha ajụjụ. Ụdị amamihe Jizọs nwere jukwara ndị nkụzi ahụ anya.

Meri jụrụ ya, sị: “Nwa m, gịnị mere i ji meso anyị otú a? Lee, mụ na nna gị chị obi n’aka na-achọgharị gị.”—Luk 2:48.

O juru Jizọs anya na ha amaghị ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha sị: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”—Luk 2:49.

Ugbu a ha chọtara ya, o sooro ha laghachi Nazaret. Ọ nọgidekwara na-erubere ha isi. Ọ nọkwa na-enwekwu amamihe, na-etokwukwa eto. N’agbanyeghị na ọ ka dị obere, ihe ya nọ na-amasị ma Chineke ma ndị mmadụ. N’eziokwu, si mgbe Jizọs bụ nwata gawa, ọ bụ onye e ji ama atụ ma n’ihe gbasara ofufe Chineke ma n’irubere ndị mụrụ ya isi.