Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 6

Nwa ahụ E Kwere ná Nkwa

Nwa ahụ E Kwere ná Nkwa

LUK 2:21-39

  • E BIRI JIZỌS ÚGWÙ, MECHAA KURU YA BỊA N’ỤLỌ NSỌ

Josef na Meri alaghachighị Nazaret ozugbo, ha nọtụrụ na Betlehem. Mgbe Jizọs nọrọ abalị asatọ, ha biri ya úgwù otú e kwuru n’Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel. (Levitikọs 12:2, 3) Ọ bụkwa omenala na a ga-agụ nwa nwoke aha n’ụbọchị ahụ e biri ya úgwù. Ha gụrụ nwa ha Jizọs otú mmụọ ozi Gebriel gwara ha.

Ihe karịrị otu ọnwa agaala. Jizọs dịzi ụbọchị iri anọ ugbu a. Ebee ka ndị mụrụ ya ku ya na-aga ugbu a? Ha ku ya na-aga n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, nke na-adịchaghị anya n’ebe ha bi. Iwu ahụ e nyere ụmụ Izrel kwuru na mgbe ụbọchị iri anọ a mụrụ nwa nwoke gachara, nne ya ga-eweta ihe a ga-eji chụọ àjà e ji eme ka mmadụ dị ọcha n’ụlọ nsọ.—Levitikọs 12:4-8.

Meri mere otú a. O wetara ụmụ nnụnụ abụọ. Ụmụ nnụnụ abụọ a o wetara gosiri na ya na Josef abaghị ọgaranya. Ihe Iwu ahụ kwuru gosiri na ihe e kwesịrị iweta bụ nwa ebule na nnụnụ. Ma, ọ bụrụ na aka nne ahụ erughị iweta otu ebule, o nweziri ike iweta nduru abụọ ma ọ bụ kpalakwukwu abụọ. Meri wetara nduru abụọ na kpalakwukwu abụọ n’ihi na ọ bụ ihe aka ya ruru.

Mgbe Josef na Meri rutere n’ụlọ nsọ ahụ, otu agadi nwoke bịakwutere ha. Aha ya bụ Simiọn. Chineke ekpugheerela Simiọn na tupu ya anwụọ, ọ ga-ahụ Kraịst, ma ọ bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. N’ụbọchị a Josef na Meri gara n’ụlọ nsọ, mmụọ nsọ mere ka Simiọn gaa n’ụlọ nsọ, bụ́ ebe ọ hụrụ Josef na Meri na nwa ọhụrụ ha. Simiọn kuuru nwa ahụ n’aka.

Mgbe o ku Jizọs, o kelere Chineke, sị: “Ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị, ị ga-ahapụ ohu gị ka ọ nwụọ n’udo dị ka i kwuru; n’ihi na anya m ahụwo onye ị ga-esi n’aka ya weta nzọpụta, bụ́ onye i wepụtara n’ihu mba niile. Onye a bụ ìhè nke ga-ewepụ ihe kpuchiri anya mba niile nakwa ebube nke ndị gị bụ́ Izrel.”—Luk 2:29-32.

Ọ tụrụ Josef na Meri n’anya mgbe ha nụrụ ihe a Simiọn kwuru. Simiọn gọzikwara ha ma gwa Meri na ‘e debere nwa ya a ka ọ bụrụ onye ga-akpata ọdịda na mbili nke ọtụtụ ndị n’Izrel.’ O kwukwara na Meri ga-enwe ezigbo mwute ga-adị ka è ji mma agha manye ya n’obi.—Luk 2:34.

E nwere onye ọzọ nọ n’ụlọ nsọ n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ Ana, onye amụma nwaanyị dị afọ iri asatọ na anọ. Ọ naghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ. N’otu oge ahụkwa, ọ bịakwutere Josef na Meri na nwa ọhụrụ ha bụ́ Jizọs. Ana bidoro ikele Chineke, na-agwakwa ndị niile nọ ebe ahụ banyere Jizọs.

Cheedị ụdị obi ụtọ Josef na Meri nwere ka ha na-ahụ ihe a na-eme n’ụlọ nsọ. N’eziokwu, ihe a niile mere ka o dokwuo ha anya na nwa ha a bụ Onye ahụ Chineke Kwere ná Nkwa.