Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 15

Jizọs Arụọ Ọrụ Ebube Mbụ Ya

Jizọs Arụọ Ọrụ Ebube Mbụ Ya

JỌN 2:1-12

  • AGBAMAKWỤKWỌ E MERE NA KENA

  • JIZỌS EMEE MMIRI YA AGHỌỌ MMANYA

O meela abalị atọ ugbu a kemgbe Nataniel ghọchara onye na-eso ụzọ Jizọs. O so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Jizọs na ụfọdụ n’ime ndị mbụ a ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya gawara Galili nke dị n’ebe ugwu, bụ́ ebe ha niile si. Ha na-aga Kena, bụ́ obodo Nataniel si. Obodo Kena dị n’ebe ugwu Nazaret, ebe Jizọs nọ tolite. A kpọrọ ha oriri agbamakwụkwọ na Kena.

Meri nne Jizọs bịakwara agbamakwụkwọ ahụ. Ọ bụ enyi ndị ezinụlọ ahụ na-agba akwụkwọ. O yikwara ka ò so na-enyere ha aka ịhụ na e lekọtara ndị bịara agbamakwụkwọ ahụ. Ọ bụ ya mere o ji chọpụta ngwa ngwa na mmanya agwụwala ma gwa Jizọs, sị: “Ha enweghị mmanya.”—Jọn 2:3.

Ihe ọ pụtara bụ na Meri nọ na-agwa Jizọs ka o mee ihe banyere mmanya ahụ gwụwaralanụ. Jizọs gwara ya ihe gosiri na ya achọghị ka ọ bụrụ ya ga na-agwa ya ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị ya: “Nwaanyị, gịnị jikọrọ mụ na gị?” (Jọn 2:4) Ebe ọ bụ na Jizọs bụ Eze Chineke họpụtara, ọ bụ Nna ya nke eluigwe kwesịrị ịna-agwa ya ihe ọ ga-eme, ọ bụghị ndị ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị enyi ya. N’ihi ya, Meri mere ka nwaanyị ma ihe. Ọ hapụụrụ nwa ya nwoke okwu ahụ ma gwa ndị na-eke nri, sị: “Ihe ọ bụla ọ gwara unu, meenụ ya.”—Jọn 2:5.

E nwere ite mmiri isii dị ebe ahụ. Ite nke ọ bụla nwekwara ike ịba ihe karịrị lita mmiri iri anọ. Jizọs gwara ndị ahụ na-eke nri, sị: “Gbajuonụ mmiri n’ite mmiri ndị ahụ.” Mgbe ha gbajuchara ha, Jizọs sịrị ha: “Ugbu a, kutenụ ya bugaara onye nhazi oriri.”—Jọn 2:7, 8.

Mmanya ahụ tọrọ onye na-ahazi oriri ahụ ezigbo ụtọ. Mana, ọ maghị na e si n’ụzọ ọrụ ebube mepụta ya. Ọ kpọrọ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ sị ya: “Ndị ọzọ na-ebu ụzọ ebupụta mmanya dị mma, mgbe mmanya gbuwere ndị mmadụ, a na-ebupụta nke na-adịchaghị mma. I debere mmanya dị mma ruo ugbu a.”—Jọn 2:10.

Ihe a bụ ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ. Mgbe ndị mbụ a na-eso ụzọ ya hụrụ ọrụ ebube a, o mere ka okwukwe ha nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike. Jizọs na nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke mechara gawa obodo Kapaniọm, nke dị n’ụsọ Oké Osimiri Galili.